Otu Obodo Nta Zuru Ụwa Ọnụ Ma Bụrụkwa nke Kewara Ekewa
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA NIGERIA
Ị̀ NỤTỤWO akụkọ banyere otu agbụrụ nke ndị mmadụ na-enweghị ọnụ, n’ihi ya kwa ghara inwe ike iri ihe ma ọ bụ ịṅụ ihe? A sịrị na ha na-adị ndụ site n’ịnụrụ ísìsì, karịsịa mkpụrụ osisi apple. Ísìsì ọjọọ na-egbu ha.
E nwekwara akụkọ ifo banyere ndị Ebe Ọdịda Anyanwụ Africa bụ́ ndị nwere ọlaedo ha na-ere. Otu onye isi ụgbọ mmiri ndị Portugal n’oge ahụ kọrọ, sị: “Narị league abụọ gabiga alaeze [Mali ahụ], ị ga-ahụ otu mba nke ndị bi n’ime ya nwere isi na ezé nkịta na ọdụ dị ka nke nkịta. Ndị a bụ Ndị Ojii na-ajụ ịbanye ná mkparịta ụka n’ihi na ha achọghị ịhụ ndị ọzọ.” Ndị ahụ bụ ụfọdụ n’ime echiche ndị na-eju anya e nwere ọtụtụ afọ gara aga, tupu ọgbọ nke ime njem na nchọpụta.
Ndị Mmadụ Abịakọta Ọnụ
E weere akụkọ ndị dị otú ahụ dị ka eziokwu ruo ọtụtụ narị afọ. Ma ka ndị na-eme nnyocha na-enyocha mbara ụwa, ha ahụghị ndị na-enweghị ọnụ na-anụ ísìsì mkpụrụ osisi apple, e nweghị ndị mmadụ nwere isi nkịta. Taa e nweghị ihe omimi ọ bụla banyere ndị bi n’ofe ókèala anyị. Ụwa aghọwo otu obodo nta zuru ụwa ọnụ. Telivishọn na-eweta mba na ndị ofesi n’ime ụlọ obibi anyị. Njem ụgbọ elu na-eme ka o kwe omume ịga mba ndị ahụ n’ime hour ole na ole; ọtụtụ nde mmadụ na-eme otú ahụ kwa afọ. Ndị ọzọ na-eme njem n’ihi ihe ndị metụtara akụ̀ na ụba ma ọ bụ ndọrọ ndọrọ ọchịchị. Otu akụkọ nke Òtù Na-ahụ Maka Ụba Mmadụ nke Mba Ndị Dị n’Otu na-ekwu, sị: “Ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ a na-amaghị ama n’akụkọ ihe mere eme—nke na-aghaghịkwa ịmụba—ndị mmadụ n’ụwa nile na-akwapụ wee kwaga n’ebe ọzọ n’ọchịchọ ha na-achọ ndụ ka mma.” Ihe dị ka 100 nde mmadụ bi n’ebe na-abụghị mba a mụrụ ha.
N’ụzọ na-arịwanye elu, e nwere ndabererịta akụ̀ na ụba n’etiti mba dị iche iche. Otu njikọ nzirịta ozi zuru ụwa ọnụ, dị ka otu nnukwute usoro akwara bụ́ isi, na-ejikọta mba nile nke ụwa. Ka a na-agbanwerịta echiche, ihe ọmụma, na nkà na ụzụ, ọdịbendị na-ejikọta ma na-ekwekọ n’ibe ha. Gbaa ụwa gburugburu ndị mmadụ na-eji ejiji n’ụzọ ka yie onwe ha karịa mgbe ọ bụla ọzọ. Obodo ukwu dị iche iche nke ụwa nwere ọtụtụ ihe ha ji yie ibe ha—ndị uwe ojii, họtel okomoko, okporo ụzọ, ụlọ ahịa, ụlọ akụ̀, mmetọ. N’ihi ya, ka ndị bi n’ụwa na-abịakọta ọnụ, anyị na-ahụ ihe ụfọdụ ndị na-akọwa dị ka ọdịbendị ụwa na-ebilitenụ.
Ihe Mere Ndị Mmadụ Ji Nọgide n’Ịbụ Ndị E Kewara Ekewa
Ma ọ bụ ezie na ndị mmadụ na ọdịbendị na-agwakọrịta, o doro anya na ọ bụghị mmadụ nile na-ahụ onwe ha dị ka ụmụnne. “Onye ọ bụla na-adị ngwa ịta onye ọbịa ụta,” ka onye Gris na-ede ihe nkiri dere ihe karịrị 2,000 afọ gara aga. N’ụzọ dị mwute, otu ihe ahụ bụ eziokwu taa. A na-ahụ ihe àmà ya ebe nile n’akwụkwọ akụkọ banyere mbunobi, ịkpọ ndị mba ọzọ asị, “nhichapụ nke agbụrụ,” esemokwu agbụrụ, ngagharị iwe okpukpe, mgbukpọ nke ndị nkịtị, ebe igbu ọchụ, ebe ndina n’ike, mmekpọ ọnụ, ma ọ bụ mgbukpọ nke agbụrụ.
N’eziokwu, ọtụtụ n’ime anyị apụghị ime ihe ọ bụla iji gbanwee ịga n’ihu nke esemokwu agbụrụ. Ha nwere ike ọbụna ghara imetụta anyị kpọmkwem. Otú ọ dị, nye ọtụtụ n’ime anyị, nsogbu na-abịa site n’esoghị ndị mba ọzọ anyị na-ezute na-emekọrịta ihe—ndị agbata obi, ndị ọrụ ibe anyị, ma ọ bụ ụmụ akwụkwọ ibe anyị.
Ó yighị ihe na-ekwesịghị ekwesị na ndị nke agbụrụ dị iche iche na-ahụkarị ya dị ka ihe siri ike ịtụkwasị onwe ha obi na inwe mmasị n’ebe ibe ha nọ? E kwuwerị, mbara ụwa anyị bụ ebe e nwere ndịrịta iche dị ukwuu, ụdị ndị na-enweghị ọgwụgwụ. Ihe ka ọtụtụ n’ime anyị na-enwe mmasị n’ebe ụdị bara ụba nke nri, egwú, na àgwà dị, tinyekwara ọtụtụ ụdị osisi, nnụnụ, na anụmanụ. Ma n’ụzọ ụfọdụ mmasị anyị nwere n’ụdị dị iche iche adịghị agụnye mgbe nile ndị mmadụ na-adịghị eche echiche ma na-eme ihe n’otu ụzọ ahụ anyị si eme ya.
Kama ile anya n’akụkụ ndị ziri ezi nke ụdị dị iche iche n’etiti ndị mmadụ, ọtụtụ ndị na-elekwasịkarị anya ná ndịrịta iche, na-emekwa ka ha bụrụ ihe mgbakwasị ụkwụ maka esemokwu. Gịnị mere nke a ji dịrị otú ahụ? Olee abamuru e nwere n’irute ndị ọdịbendị ha dị iche na nke anyị nso? Olee otú anyị pụrụ isi tikpọọ mgbidi ndị na-egbochi nkwurịta okwu ma jiri àkwà dochie ha? Isiokwu ndị na-esonụ ga-agbalị ịza ajụjụ ndị ahụ.