Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 9/8 p. 3-4
  • Ndị Amaala America—Ngwụsị nke Otu Oge

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ndị Amaala America—Ngwụsị nke Otu Oge
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Nguzogide Ikpeazụ nke Custer na Oké Mgbukpọ ahụ Mere na Wounded Knee
  • Otú Ụwa Ha Siri Fuo
    Teta!—1996
  • Gịnị Ka Ọdịnihu Ha Ga-abụ?
    Teta!—1996
  • Ndị India America Na Bible
    Teta!—1999
  • Olee Ebe Ha Si Bịa?
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1996
g96 9/8 p. 3-4

Ndị Amaala America—Ngwụsị nke Otu Oge

OLEE onye na-ekiribeghị ihe nkiri nke esemokwu ndị na-azụ ehi na ndị India? Ndị mmadụ n’ụwa nile anụwo banyere Wyatt Earp, Buffalo Bill na Lone Ranger na banyere ndị India bụ́ Geronimo, Sitting Bull, Crazy Horse, na Chiifu Joseph, tinyekwara ọtụtụ ndị ọzọ. Ma olee ókè ihe nkiri Hollywood siworo zie ezi? Ruo ókè hà aṅaa ka ha jiworo eleghị mmadụ anya n’ihu kọwaa ndị India?

Akụkọ banyere mmeri ndị Europe meriri Ndị Amaala Ebe Ugwu America (ndị India) na-akpalite ọtụtụ ajụjụ.a Akwụkwọ akụkọ ihe mere eme hà ejiriwo enweghị mbunobi kọọ banyere ndị India? È nwere ihe ọ bụla a ga-amụta banyere anyaukwu, mmegbu, ịkpa ókè agbụrụ, na arụrụala? Gịnị bụ akụkọ ziri ezi banyere ndị ahụ a na-akpọkarị ndị na-azụ ehi na ndị India?

Nguzogide Ikpeazụ nke Custer na Oké Mgbukpọ ahụ Mere na Wounded Knee

N’afọ 1876, dibịa afa, Sitting Bull nke Lakota (otu n’ime nkebi atọ nke ndị Sioux) bụ onye ndú n’ọgụ ahụ a ma ama a lụrụ n’Obere Osimiri Bighorn, na Montana. N’iji 650 ndị agha, Lieutenant Colonel Custer bụ́ “Agịrị Isi Ogologo,” chere na ya pụrụ imeri 1,000 ndị dike Sioux na Cheyenne n’ụzọ dị mfe. Nke a bụ mgbakọ hiere ajọ ụzọ. Ọ na-eche ihe bụ ma eleghị anya ìgwè kasị ukwuu nke ndị dike Ndị Amaala America a chikọtaworo mgbe ọ bụla ihu—ihe dị ka 3,000.

Custer kewara Ìgwè Ndị Agha Ịnyịnya nke 7 ya gaa n’ìgwè atọ. N’echereghị maka nkwado sitere n’abụọ ndị ọzọ, ìgwè nke ya wakporo ihe o chere na ọ ga-abụ akụkụ dị mfe mmeri nke ụlọikwuu ndị agha India. N’idu ndú nke Crazy Horse, Gall, na Sitting Bull, ndị India kpochapụrụ Custer na ìgwè ya nke ihe dị ka 225 ndị agha. Ọ bụ mmeri nwa oge nye mba ndị India, ma ọ bụ mmeri dị ilu nye Ndị Agha United States. Otú ọ dị, mmegwara dị egwu dị nanị afọ 14 n’ihu.

E mesịa, Sitting Bull chịliri aka elu, n’ịbụ onye e kweworo nkwa mgbaghara. Kama nke ahụ, a kpọchiri ya ruo oge ụfọdụ na Fort Randal, n’Ókèala Dakota. N’afọ agadi ya, ọ pụtara n’ihu ọha na njem ime ihe ngosi Wild West nke Buffalo Bill. Onye ahụ bụbu onye ndú a ma ama atụfuwo ikike na mmetụta ya dị ka dibịa afa a na-asọpụrụ, nke ọ bụ na mbụ.

Na 1890, ndị isi uwe ojii India e zigara ka ha jide Sitting Bull (aha Lakota ya bụ Tatanka Iyotake) gbagburu ya. Ndị gburu ya bụ ndị Sioux bụ́ “Obi Ígwè” (ihe e ji etinye baajị ndị uwe ojii), Lieutenant Bull Head na Sergeant Red Tomahawk.

N’otu afọ ahụ, e mesịrị gwepịa nnupụisi ndị India na-enupụrụ ọchịchị ndị ọcha n’oké mgbukpọ ahụ mere n’Ọnụ Mmiri nke Wounded Knee n’Oké Ala Dị Larịị nke America. N’ebe ahụ, ndị agha etiti na Mgbọ Ogbunigwe ha gburu ihe dị ka 320 ndị ikom, ndị inyom, na ụmụaka Sioux na-agbalaga agbalaga. Ndị agha ahụ turu ọnụ na nke a bụ mmegwara ha maka ogbugbu e gburu ndị enyi ha, bụ́ Custer na ndị ikom ya, n’ala dị wara wara nke dị ná ncherịta ihu Obere Osimiri Bighorn. Otú ahụ ka agha a lụọ a kwụsị na esemokwu nke dịworo ihe karịrị 200 afọ siri kwụsị, n’agbata ndị mwakpo bụ́ ndị America bịara abịa na ebo ndị bi ebi bụ́ ndị a wakporo awakpo.

Ma olee otú Ndị Amaala America si gbanye mkpọrọgwụ n’Ebe Ugwu America ná mmalite? Ụdị ụzọ ndụ dị aṅaa ka ha biri tupu ndị ọcha erute n’Ebe Ugwu America? Gịnị dugara ha n’ịbụ ndị e mesịrị merie ma doo n’okpuru? Gịnị bụkwa ọnọdụ ndị India ugbu a n’ime mba nke ụmụ ụmụ nke ndị mbụ si Europe kwafeta na-achị? A ga-atụle ajụjụ ndị a na ndị ọzọ n’isiokwu ndị na-esonụ.

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Ọ bụ ezie na ụfọdụ na-ahọrọ okwu bụ́ “Onye Amaala America,” a ka jikwa “onye India” eme ihe ugboro ugboro n’ọtụtụ akwụkwọ. Anyị ga na-eji okwu ndị a eme ihe, otu n’ọnọdụ ibe ya. “Onye India” bụ mkpọhie aha nke Columbus, bụ́ onye chere na ya erutewo India mgbe ọ kpara ụkwụ n’ala n’ebe a matara ugbu a dị ka West Indies, kpọrọ ndị amaala.

[Foto dị na peeji nke 3]

Ili ndị nwụrụ anwụ na Wounded Knee

[Ebe E Si Nweta Foto]

Montana Historical Society

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya