Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g96 10/8 p. 9-11
  • N’ikpeazụ—Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • N’ikpeazụ—Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ
  • Teta!—1996
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Ọdachi Zuru Ụwa Ọnụ”
  • Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ
  • Ụwa nke Mpụ Na-adịghị
  • Mgbe Mpụ Na-adịghị
    Teta!—1998
  • Ime Mgbalị Iji Kwụsị Mpụ
    Teta!—1996
  • Ọgụ Na-enweghị Isi A Na-alụso Mpụ
    Teta!—1998
  • Olee Mba nke Na-enweghị Mpụ?
    Teta!—1996
Teta!—1996
g96 10/8 p. 9-11

N’ikpeazụ—Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ

BIBLE buru amụma na n’ụbọchị anyị ndị mmadụ ga-abụ “ndị na-ahụ nanị onwe ha n’anya, ndị na-ahụ ego n’anya, ndị na-anya isi, ndị mpako, ndị nkwulu, ndị na-ekwenyeghị ndị mụrụ ha, ndị na-enweghị ekele, ndị na-adịghị ọcha n’obi, ndị ihe mmadụ ibe ha na-adịghị atọ ụtọ, ndị na-adịghị agba ndụ, ndị na-ebo ebubo ụgha, ndị na-adịghị ejide onwe ha, ndị dị ka anụ ọhịa, ndị na-adịghị ahụ ezi ihe n’anya.” (2 Timoti 3:2, 3) Ụdị ndị mmadụ dị otú ahụ na-eme mpụ.

Ebe ọ bụ na ndị mmadụ na-eme mpụ, ruo n’ókè ha mere mgbanwe iji mee ihe ka mma, mpụ na-ebelata. Ma ọ dịbeghị mgbe ọ dịrị ndị mmadụ mfe ime mgbanwe iji mee ihe ka mma. Taa, o siri ike karịa mgbe ọ bụla ọzọ, n’ihi na eri 1914, bụ́ akara ụbọchị usoro ngụkọ oge Bible kwadoro, anyị anọwo na-ebi na “mgbe ikpeazụ” nke usoro ihe nke a. Dị ka Bible buru n’amụma, e ji “oge dị oké egwu” mara oge a. Setan bụ́ Ekwensu, bụ́ onye omekome kasịnụ, onye nwere “oké ọnụma, ebe ọ matara na o nwere nanị nwa oge,” na-eme ka oge ndị a dị oké egwu.—2 Timoti 3:1; Mkpughe 12:12.

Nke ahụ bụ ihe kpatara oké ịrị elu na mpụ, Setan maara na a ga-ebibi ya na usoro ihe ya n’isi nso. N’ime mkpirikpi oge fọdụrụnụ, ọ na-achọ ụzọ nile kwere omume ịzụlite àgwà ndị ahụ e kwuru na 2 Timoti isi 3 n’ime ụmụ mmadụ. N’ihi ya, ka gọọmenti wee nwee ike ịkwụsị mpụ, ọ ghaghị ikpochapụ mmetụta Setan ma nyekwara ndị mmadụ aka ịgbanwe ka ha wee kwụsị ịkpa àgwà n’ụzọ ahụ a kọwara n’elu. Ma è nwere gọọmenti nwere ike ịrụzu ọrụ nke a karịrị ike mmadụ?

E nweghị gọọmenti mmadụ nwere ike ime nke a. J. Vaskovich, onye nkụzi nke nkà iwu na Ukraine, na-egosi mkpa e nwere maka “otu òtù e nwekọrọ ọnụ nke nwere ike, nke ga-ejikọ ma hazie mgbalị steti na òtù nile nke ọha mmadụ.” N’otu nzukọ ụwa maka mpụ, President Fidel Ramos nke Philippines kwuru, sị: “N’ihi na ihe ọgbara ọhụrụ dị iche iche emewo ka ụwa anyị dịkwuo nta, mpụ enwewo ike ịgabiga ókèala mba dị iche iche, ọ ghọwokwa nsogbu gabigara ókèala mba nile. Ya mere, ihe ngwọta kwesịrị ịgabiga ókèala mba nile n’otu aka ahụ.”

“Ọdachi Zuru Ụwa Ọnụ”

Mba Ndị Dị n’Otu bụ òtù (mba nile) gabigara ókèala mba nile. Kemgbe e hiwere ya, ọ gbalịwo ịlụso mpụ ọgụ. Ma o nweghị ihe ngwọta dị nnọọ ka gọọmenti mba na-enweghị. Akwụkwọ bụ́ The United Nations and Crime Prevention na-ekwu, sị: “Mpụ a na-eme ná mba akarịwo nchịkwa nke ihe ka ọtụtụ ná mba n’otu n’otu, mpụ ndị gabigara ókèala mba nile arịwokwa elu gabiga ebe mba nile pụrụ ịchịkwa ugbu a. . . . Mpụ nke ìgwè mpụ a haziri ahazi na-eme agbasawo ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-akpata ụjọ, nke na-akpatakarị ihe ndị dị njọ n’ihe banyere ime ihe ike anụ ahụ, mmenye ụjọ na ịkpa àgwà na-ezighị ezi nke ndị ọrụ ọha na eze. Iyi ọha egwu akpatawo ọnwụ nke ọtụtụ puku ndị mmadụ aka ha dị ọcha. Ịzụ ahịa uru n’ọgwụ ndị na-eri ahụ abụrụwo ọdachi zuru ụwa ọnụ.”

James Madison, president nke anọ nke United States, kwuru n’otu oge, sị: “N’iguzobe gọọmenti nke mmadụ na-achị isi n’elu mmadụ, oké ihe isi ike dị na nke a: ị ghaghị ịbụ ụzọ mee ka gọọmenti nwee ike ịchịkwa ndị a na-achị achị; n’aka nke ọzọkwa, mee ka ọ bụrụ ọrụ ya ịchịkwa onwe ya.” (Tụlee Eklisiastis 8:9.) Ya mere ihe ngwọta dị mma ga-abụ iji usoro nke Chineke ga-achị dochie anya gọọmenti nke “mmadụ na-achị isi n’elu mmadụ.” Ma ihe ngwọta dị otú ahụ ò kwere omume?

Ọchịchị nke Ga-akwụsị Mpụ

Ezi ndị Kraịst kwere n’ihe Bible na-ekwu banyere Alaeze Chineke.a Ọ bụ ọchịchị dị adị. Ọ bụ ezie na a pụghị ịhụ Alaeze ahụ anya n’ihi na ọ dị n’eluigwe, a na-ahụ ihe ndi ọ na-arụzu n’ụwa. (Matiu 6:9, 10) Ndị mejupụtara ya bụ Kraịst Jisọs na mmadụ 144,000 a kpọpụtara ‘site n’ebo nile ọ bụla, na asụsụ nile ọ bụla, na ndị nile ọ bụla, na mba nile ọ bụla, pụta. Ha bụkwa eze n’elu ụwa.’ Ọchịchị nke a dị ike ga-achị isi n’elu “oké igwe mmadụ” nke ndị nọ n’okpuru ya bụ́ ndị, dị ka Bible na-ebu n’amụma, sikwa ná “mba nile ọ bụla, na ebo nile, na ndị nile, na asụsụ nile, pụta.” (Mkpughe 5:9, 10; 7:9, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụzọ dị iche.) N’ihi ya, ma ndị na-achị isi ma ndị ha na-achị si mba nile ná nzụlite, ụmụ mmadụ dị n’otu n’ezie ndị si mba nile pụta, na-enwe ihu ọma Chineke.

N’ịnakwere ịchịisi Chineke, Ndịàmà Jehova emeriwo nsogbu nke mpụ ná nzukọ ha ruo n’ọ̀tụ̀tụ̀ dị ukwuu. N’ụzọ dị aṅaa? Site n’ịmụta inwe ekele maka amamihe nke ụkpụrụ Bible, site n’itinye ha n’ọrụ ná ndụ ha, na site n’ikwe ka ike kasịnụ n’eluigwe na ala, bụ́ mmụọ Chineke, na mkpụrụ ya—ịhụnanya—kpalie ha. Okwu Chineke na-asị: “Yikwasịnụ ịhụnanya, nke bụ ihe nkekọ nke izu okè.” (Ndị Kọlọsi 3:14) N’ime ihe karịrị ala 230, Ndịàmà Jehova na-etinye ịhụnanya na ịdị n’otu a n’ọrụ, na-egosi otú Alaeze Chineke siwororị na-ewere nzọụkwụ iji kwụsị mpụ.

A pụrụ ịma atụ nke a site n’ihe si ná nnyocha e mere na 1994 nke Ndịàmà Jehova dị 145,958 keere òkè na ya na Germany pụta. Ọtụtụ n’ime ha kwenyere na ha meriri adịghị ike ndị dị oké njọ iji bụrụ Ndịàmà. Ọmụmụ Bible ha kpaliri ha ime otú ahụ. Dị ka ihe atụ, 30,060 meriri iri ahụ nke ụtaba ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ; 1,437 kwụsịrị ịgba chaa chaa; 4,362 gbanwere àgwà ime ihe ike ma ọ bụ nke ime mpụ; 11,149 meriri àgwà ndị dị ka ekworo ma ọ bụ ịkpọasị; 12,820 weghachikwara ịdị jụụ ebe obibi ná ndụ ezinụlọ nwere oké nsogbu.

Ọ bụ ezie na nchọpụta ndị a metụtara Ndịàmà Jehova nọ nanị n’otu mba, ha bụ ihe atụ nke Ndịàmà n’ụwa nile. Were, dị ka ihe atụ, otu onye Ukraine na-eto eto aha ha bụ Yuri. N’oge ọ malitere iso Ndịàmà Jehova na-amụ Bible, ọ bụ onye aka n’akpa. Ọbụna na o mere njem gaa Moscow ebe ọ maara na ìgwè mmadụ ga-eme ka “ọrụ” ya dị mfe karị.

Na 1993, Yuri nọ na Moscow ọzọ, n’etiti ìgwè mmadụ. Ma ọ dịghị otu n’ime ihe karịrị mmadụ 23,000 nọ n’Ámá Egwuregwu Locomotive na Friday, July 23, tụrụ ya egwu, n’ihi na ọ bụzi otu n’ime Ndịàmà Jehova. N’ezie, Yuri nọ n’ebe ikpo okwu na-ekere òkè n’usoro ihe omume a na-eme n’ihu ndị na-ege ntị si ná mba dị iche iche. N’ịbụ onye a gbanwere gaa n’ime ihe dị mma, ọ na-erubere iwu Bible isi: “Ka onye na-ezu ohi ghara izukwa ohi ọzọ.”—Ndị Efesọs 4:28.

Ọtụtụ ndị ọzọ dị ka Yuri agbahapụwo ndụ nke ime mpụ iji ruo eru maka ndụ n’ụwa ọhụrụ ezi omume nke Chineke. Nke a na-emesi ike ịbụ eziokwu nke ihe Sir Peter Imbert, onye bụbu onye isi ndị uwe ojii nke Britain, kwuru: “A pụrụ ịchịkwa mpụ n’otu ụbọchị ma ọ bụrụ na onye ọ bụla dị njikere ime mgbalị.” Usoro nkụzi Bible nke ọchịchị Chineke na-enye, na-enye ndị nwere obi eziokwu mkpali dị ha mkpa iji ‘mee mgbalị.’

Ụwa nke Mpụ Na-adịghị

Mpụ n’ụdị ọ bụla na-egosipụta enweghị ịhụnanya maka ndị ọzọ. Ndị Kraịst na-agbaso ihe nlereanya Jisọs, onye sịrị: “Ị ga-ewere obi gị dum, werekwa mkpụrụ obi gị dum, werekwa uche gị dum, hụ Onyenwe anyị Chineke gị n’anya. Nke a bụ ihe ukwu na ihe mbụ e nyere n’iwu. Ihe nke abụọ nke yiri ya bụ nke a, Ị ga-ahụ onye agbata obi gị n’anya dị ka onwe gị.”—Matiu 22:37-39.

Nanị ọchịchị nke raara onwe ya nye n’ịkwụsị mpụ site n’ịkụziri ndị mmadụ irube isi n’iwu abụọ ndị a bụ Alaeze Chineke. Taa, ihe karịrị nde Ndịàmà ise nke Jehova na-erite uru site ná nkụzi a. Ha na-ekpebisi ike ịghara ikwe ka ọchịchọ ime mpụ gbanye mkpọrọgwụ n’obi ha, ha dị njikere ime mgbalị onwe onye ọ bụla dị mkpa iji tụnye ụtụ n’ụwa nke mpụ na-adịghị. Ihe Chineke rụzuworo ná ndụ ha bụ nanị ihe atụ dị nta nke ihe ọ ga-eme n’ụwa ọhụrụ ya n’okpuru ịchịisi ọchịchị eluigwe ya. Chee echiche banyere ụwa a na-enweghị mkpa maka ndị uwe ojii, ndị ọkàikpe, ndị ọkàiwu, ma ọ bụ ụlọ mkpọrọ!

Inweta nke a n’ọ̀tụ̀tụ̀ zuru ụwa ọnụ ga-agụnye oké mgbanwe gọọmenti kasịnụ n’akụkọ ihe mere eme, site n’aka Chineke n’onwe ya. Daniel 2:44 na-asị: “N’ụbọchị ha bụ eze ndị a [dị taa], ka Chineke nke eluigwe ga-eme ka otu alaeze [eluigwe] bilie, nke a gaghị emebi emebi ruo mgbe ebighị ebi, ọ bụkwa ọbụbụeze ya ka a na-agaghị ahapụrụ ndị ọzọ; ọ ga-etipịa alaeze ndị a nile mee ka ha gwụsịa, ma ya onwe ya ga-eguzosi ike ruo mgbe ebighị ebi.” Chineke ga-egwepịakwa Setan, na-eweta mmetụta ọjọọ ya ná njedebe.—Ndị Rom 16:20.

Ozugbo ọchịchị eluigwe nke Chineke nọchiworo gọọmenti ụmụ mmadụ, ụmụ mmadụ agaghị achị isi n’elu ibe ha ọzọ. Ndị eze eluigwe—ndị eze dị elu karịa ọbụna ndị mmụọ ozi—ga-ezi ihe a kpọrọ mmadụ ihe n’ụzọ ezi omume. Mgbe ahụ, a gaghị enwekwa igbu ọchụ, mwakpo nsí gas, ma ọ bụ bọmbụ ndị na-eyi ọha egwu! A gaghị enwekwa ikpe na-ezighị ezi nke na-akpata mpụ! A gaghị enwekwa ndị nwere oké akụ̀ na ụba na ndị ogbenye!

Prọfesọ S. A. Aluko, nke Mahadum Obafemi Awolowo na Nigeria, kwuru, sị: “Ndị ogbenye apụghị ịrahụ ụra n’abalị n’ihi na agụụ na-agụ ha; ndị bara ọgaranya apụghị ịrahụ ụra n’ihi na ndị ogbenye mụ anya.” Ma n’isi nso onye ọ bụla ga-enwe ike ịrahụ ụra nke ọma n’ịmata na gọọmenti—ọchịchị Chineke—emesịwo kwụsị mpụ!

[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]

a Maka nkọwa zuru ezu nke ihe Alaeze Chineke bụ na otú ọ ga-esi bara ihe a kpọrọ mmadụ kwere ekwe uru, biko gụọ akwụkwọ bụ́ Ihe Ọmụma nke Na-eduba ná Ndụ Ebighị Ebi, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.

[Foto dị na peeji nke 10]

Onye bụbu onye ohi na onye o zuburu ohi, dị n’otu ugbu a dị ka ụmụnna ndị Kraịst

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya