Ikiri Ụwa
Nwee Obi Dị Ọcha —Nweekwa Ahụ Ike Ka Mma!
“Site n’ime ihe ọchị, ndị mmadụ na-aghọ ndị na-ekwe ka ibe ha nọrọ, na-anagide nkụda mmụọ nke ọma, na-enwekwa ahụ ike nke elu ahụ na nke uche,” ka Prọfesọ Sueli Damergian nke Mahadum São Paulo na-ekwu. Dị ka otu akụkọ dị n’akwụkwọ akụkọ Brazil bụ́ O Estado de S. Paulo si kwuo, a pụrụ ịmụta ime ihe ọchị dị mma—dị nnọọ ka ịgụ ihe na ide ihe. N’ụzọ doro anya, nke a na-achọ mgbanwe n’ụzọ onye na-adịghị nkọ si eche echiche. Prọfesọ nkà mmụta akparamàgwà, bụ́ Raquel Rodrigues Kerbauy, na-akọwa, sị: “Ọ bụrụ na mmadụ echee na ya ga-enwe ike ịmụmụ ọnụ ọchị nanị mgbe ihe ọjọọ na-adịghị n’ụwa, ọ ga-enwe obi ọjọọ ruo mgbe ebighị ebi. E kwuwerị, e nwere ikpe na-ezighị ezi n’ebe nile.” Ọbụna mgbe e nwere usoro ihe omume na-adịghị enye ohere, ndị nwere omume ọma na-anụ ụtọ mmekọrịta ọha na eze, ka akụkọ ahụ na-ekwu. Ha na-ewere obere ihe ndị dị ka “obere nkwurịta okwu, ihe nracha, ma ọ bụ minit ise nke egwú dị mma” n’ihe bara uru. Otú ọ dị, Damergian na-adụ ọdụ, sị: “Mmadụ ekwesịghị ịghọtahie ihe ọchị dị mma na ihe na-abaghị uru na ihe na-adịghị mma.”
Nnụnụ Hà Nọ n’Ihe Ize Ndụ Site n’Aka Ndị Hụrụ Nnụnụ n’Anya?
Ndị hụrụ nnụnụ n’anya pụrụ ịdị na-emebi ihe karịa ịdị na-emezi ihe site n’ịhapụ nri n’ubi ha ka nnụnụ wee rie, ka The Sunday Times nke London na-akọ. Nsí nri nke nje salmonella, nje, na otu nje ọzọ a na-apụghị iji anya efu ahụ nke a na-amatabeghị kpatara egbuwo n’oge na-adịbeghị anya, ọtụtụ iri puku nke nnụnụ ubi a kasị nwee mmasị na ha na Britain. James Kirkwood, onye isi ndị na-ahụ maka ụmụ anụmanụ n’Ogige A Na-edebe Anụ Ọhịa na London, nwere nchegbu na a pụrụ ikpochapụ ụdị nnụnụ ụfọdụ n’ebe ụfọdụ. Nje ndị ahụ bụ anwụghị anwụ na-adị ndụ ruo ọtụtụ ụbọchị site n’iri nsị dị n’elu table nnụnụ ma ọ bụ n’ala. Mkpụrụ osisi mkpo ha rere ure na-adị ize ndụ karịsịa, ka Prọfesọ Chris Perrins, nke Mahadum Oxford, na-adọ aka ná ntị. “Gọọmenti na-amachibido iresị ụmụ mmadụ mkpụrụ osisi ndị nwere nje, ma ha na-ahapụ ha ná nri nnụnụ,” ka ọ na-ekwu, na-agbakwụnye, sị: “Ha na-egbu ọtụtụ nnụnụ.”
Ebe Obibi Dị Akpịrị Mma n’Ahụ
Ọnọdụ ihu igwe dị oké oyi na-egbuchapụ akpịrị na mbụ. Ma ihe na-agbanwe, ka magazin Britain bụ́ New Scientist na-akọ. “N’ihe karịrị iri afọ gara aga e nwewo ọnọdụ na-arị elu nke akpịrị nwa mbá,” ka John Maunder, nke Ụlọ Ọrụ Nkà Mmụta Ọgwụgwụ Ụmụ Ahụhụ na Cambridge, na-ekwu. Ụlọ ọgbara ọhụrụ na-aghọzi ebe nzopụ dị akpịrị ndị a mma n’ahụ, bụ ndị na-ebikwa n’ahụ nkịta. N’oge gara aga, ọnọdụ ihu igwe dị oyi na-akpata ndalata n’ịdịtụ udè—ihe otiti dị oké njọ nye àkwá akpịrị. “Ugbu a,” ka Maunder na-ekwu, “ebe ikuku si abata n’ọtụtụ ebe obibi adịghị mma ma ọlị nke na ịdị udè dị nta na-adị elu, ọbụna ọnọdụ ihu igwe dị oyi ruo ogologo oge adịghịkwa egbu akpịrị ndị ahụ.”
Ụzọ Isi Nagide Ndị Mmekpa Ahụ Ụlọ Akwụkwọ
N’ihi mgbasa e mere n’oge na-adịbeghị anya banyere imekpa mmadụ ahụ n’ụlọ akwụkwọ, Minista Mmụta na Japan duziri otu nnyocha nke ụmụntakịrị 9,420 na ndị mụrụ ha na ndị nkụzi. Nchọpụta ndị e mere kpughere na ihe ruru 70 pasent nke ndị nne na nna ụmụ akwụkwọ praịmarị na ụlọ akwụkwọ dị elu nke obere e mekpara ahụ amaghị banyere nsogbu ahụ ma ọ bụ ejighị mkpesa ụmụ ha kpọrọ oké ihe. N’ịtụ egwu mmegwara, ọtụtụ ndị e mekpara ahụ adịghị agwa onye nkụzi ha na a na-emekpa ha ahụ. Otú ọ dị, nnyocha ahụ gosiri na mgbe onye nkụzi mere ihe n’ụzọ siri ike banyere nsogbu ahụ, nanị 2 pasent nke ndị nile e mekpara ahụ nwere mmegwara, mmekpa ahụ ahụ na-akwụsịkwa maka ihe dị ka 40 pasent nke ụmụ akwụkwọ e mekpara ahụ. Prọfesọ Yoji Morita, nke Mahadum Osaka City kwuru, sị: “O doro m anya karịa mgbe ọ bụla ọzọ na a pụrụ imeri mmekpa ahụ ma ọ bụrụ na ndị e mekpara ahụ ekpesara ndị nkụzi ha, ndị nkụzi ewee hụkwa maka ya n’ụzọ kwesịrị ekwesị.”
Ihe Ụmụaka Hụrụ n’Anya na Ihe Ha Kpọrọ Asị
Olee ihe ụmụntakịrị na-adịghị enwekebe mmasị ime? N’otu ihe ọmụmụ nke ndị dị afọ 6 ruo 11, nke Prọfesọ Gustavo Pietropolli Charmet, nke Mahadum Milan, Itali, mere, ihe ka ọtụtụ n’ụmụntakịrị kwuru, sị: “Ịnọ n’ụlọ na-ekiri TV,” ma ọ bụ “Isoro mama m nọrọ n’ụlọ iji rụọ ọrụ ụlọ akwụkwọ n’ụlọ.” Ihe na-adịghị enye ọṅụ ma ọlị ha na-eme, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ La Repubblica na-ekwu, bụ “iyi agba,” ya bụ, site n’ịga nara ihe ọmụmụ n’ite egwú, n’asụsụ Bekee, n’ịpị piano, na ihe ndị ọzọ, gbaga n’ọzọ. Ihe ọzọ a na-akpọkarị asị bụ “ịnọ nanị ha.” N’aka nke ọzọ, 49 pasent nke ụmụ okoro na-achọ ka ndị mụrụ ụmụ “hapụ ụmụntakịrị ka ha gwuo egwu n’èzí,” ebe ụmụ agbọghọ na-eche na ndị mụrụ ụmụ ‘ga-enwe obi ụtọ isoro ụmụ ha na-egwuri egwu.’ Ha na-asị, n’ikwu ya n’ụzọ ọzọ: ‘Mgbe mama m sooro m na-egwu egwu, ọ ghaghị ịbụ egwu ka ọ na-egwu n’ezie. Ị pụrụ ịmata ma ọ bụrụ na ọ dịghị atọ ya ụtọ, mgbe ahụ kwa adịghị m enwe obi ụtọ n’otu aka ahụ.’
Kadinal Jara Ọrụ Ndịàmà Mma
Kadinal Suenens, nke Belgium, onye nkwalite nke ihe omume njikọ okpukpe Katọlik na òtù ụka mmụọ nsọ, nwụrụ n’oge na-adịbeghị anya mgbe ọ dị afọ 91. Akwụkwọ akụkọ Belgium bụ́ Het Belang van Limburg kwuru na ọ bụ ezie na Suenens rụzuru ọtụtụ ihe, o mezughị nrọ ya ná ndụ. Onye nọchiri ya, bụ́ Kadinal Danneels, kwuru na Suenens “anọwo na-achọ ka ndị Kraịst na-arụsikwu ọrụ ike. Ọ . . . jụrụ onwe ya ma ànyị kwesịrị ịga site n’ụlọ ruo n’ụlọ dị nnọọ ka Ndịàmà Jehova na-eme. N’ikpeazụkwa, ọ chọpụtara na nke a abụghị ụzọ dị njọ. Okwu a na-anụkarị n’ọnụ ya bụ: ‘Ị bụ ezi onye Kraịst nanị ma ọ bụrụ na i mewo ka onye ọzọ bụrụkwa onye Kraịst.’”
Ime Ka Oké Osimiri Dị Ọcha
Ọbụna n’ụbọchị mmiri na-ezoghị, ọtụtụ iri nde galọn mmiri e metọrọ emetọ na-asọ asọ na ngwongwo na ngwongwo na-esite n’okporo ámá ndị dị n’obodo ukwu na-asọbanye n’osimiri ndị dị gburugburu Los Angeles, California. N’ụbọchị mmiri zoro, mmiri ndị na-asọ asọ pụrụ iru ọtụtụ ijeri galọn! Gọọmenti obodo ahụ kwadoro otu ihe omume iji gwa ndị bi n’ime ya na ihe nile e kpokọbara ekpokọba, a sara asa, ma ọ bụ a zanyere n’okporo ámá dị iche iche na-aga kpọmkwem n’oké osimiri site n’awara oké mmiri ozuzo si asọfe—n’abụghị nke e tinyere ọgwụ! Nke a na-agụnye mmanụ na ihe ndị ọzọ dị mmiri mmiri na-esite n’ụgbọala, ihe ndị a sụchapụtara n’ebe obibi, ihe mkpofu, na nsị anụmanụ e ji mere enyi. Iji zere imebi gburugburu ebe obibi nke dị n’akụkụ Ọnụ Mmiri Santa Monica, a na-agba ndị bi n’ime ya ume: Ịghara ikpokọba ihe mkpofu n’okporo ámá mgbe ọ bụla; ịzacha okporo ụzọ ndị ji ụkwụ si aga kama iji mmiri gbachapụ ha; ihichasị nsị anụ e ji mere enyi; idozi ebe ụgbọala na-ehi mmanụ; na imepụtagharị mmanụ ụgbọala. Akwụkwọ akụkọ bụ́ The Wall Street Journal na-akọ na ndị na-egwu mmiri n’ebe dị nso n’awara oké mmiri ozuzo si asọfe nwere 50 pasent ohere nke ịmalite ịrịa ahụ ọkụ, ịgbọ agbọ, ọrịa usoro iku ume, ma ọ bụ ntị mgbu karịa ndị na-anọ ma ọ dịkarịa ala 360 mita site n’ebe ahụ.
Anụ Okpuru Mmiri Ajị́ Juru Ahụ
Ndị Agha Mmiri Sweden nwere njikọ nke ígwè okwu iji chọpụta ụda nke ụfụfụ mmiri ndị ọ bụ ntụgharị nke propeller ụgbọ okpuru mmiri na-akpata, dị ka magazin bụ́ New Scientist si kwuo. Inyocha akụkọ 6,000 banyere “ihe omume okpuru mmiri nke dị iche,” ndị dabeere n’usoro ígwè okwu ahụ na ihe ọha na eze hụrụ, otu òtù ọrụ gọọmenti chọpụtara ihe àmà siri ike nke ihe omume okpuru mmiri n’oge isii nanị. Ọtụtụ n’ime mgbaàmà ndị ọzọ pụrụ ịbụworị nke “ụkwụ nta ndị na-aga ọkụ ọkụ” kpatara, ka akụkọ ahụ na-ekwu. O yiri ka anụ mink na otter ndị na-egwu mmiri na-akpata ụda yiri nke propeller ụgbọ okpuru mmiri, wee si otú a na-emegharị ndị agha mmiri na-ege ntị anya.
Ụmụntakịrị Imetọ Ụmụntakịrị
Ọtụtụ puku ụmụaka nọ na South Africa ka ụmụaka ndị ọzọ na-emetọ n’ụzọ mmekọahụ, ka akwụkwọ akụkọ Johannesburg bụ́ Saturday Star na-akọ. Evanthe Schurink, nke Òtù Nnyocha Sayensị Mmadụ, na-ekwu na ihe so na-akpata mmetọ a bụ ndị na-eto eto na-eme ya ịbụ ndị a na-emeso ihe ike n’onwe ha. Marilyn Donaldson, onye ndụmọdụ ụmụaka n’Ụlọ Ọrụ Maka Ihe Ọmụmụ Ime Ihe Ike na Ụlọ Ọgwụ nke Ndozigharị Mkpasasị Uche, na-ekwenye, na-asị: “N’ọtụtụ . . . ebe obibi, a na-ekpughepụ ụmụntakịrị a nye ajọ ime ihe ike n’ebe obibi, ọtụtụ mgbekwa ndị ha na-emetọ na-abụ akụkụ ezinụlọ ha gbasapụrụ agbasapụ.” Ọ na-atakwa enweghị mmasị na nleghara anya nke nne na nna ụta maka ihe ka ukwuu ná mmetọ ahụ. “Ọ dịghị onye ya na ụmụntakịrị na-anọ n’ụlọ mgbe nne na nna na-arụ ọrụ,” ka ọ na-ekwu, “n’ihi ya ha adịghị enwe ike n’ebe ndị na-emetọ ha nọ.” N’ịrụtụ aka n’ihe ize ndụ ọzọ, Donaldson kwuru na ya na-ahụ mmụba nke “obere ụmụntakịrị dị afọ 6 ruo 10 ka ha na-ebu ọrịa Aids ha buteworo site ná mmekọahụ na-abata n’ụlọ ọrụ ahụ.”
Mmanya Na-aba n’Anya n’Oge A Dị Ime
“Nchọpụta ọhụrụ akwadowo njikọ dị n’etiti nne ịṅụ mmanya na-aba n’anya n’oge ọ dị ime na ihe ize ndụ dị elu nke nwa ọhụrụ ịrịa ọrịa leukemia,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Medical Post, nke Canada na-akọ. Ihe ọmụmụ ahụ metụtara 302 ndị na-arịa ọrịa leukemia, bụ́ ndị dị ọnwa 18 ma ọ bụ na-erubeghị otú ahụ n’afọ ndụ mgbe a chọpụtara ọrịa ahụ, tinyere otu ìgwè a chịkwara achịkwa nke ụmụ ọhụrụ 558 ndị ọzọ. Nye ụmụntakịrị nne ha ṅụrụ mmanya na-aba n’anya n’ọnwa isii ma ọ bụ itoolu nke afọ ime, ihe ize ndụ nke ịmalite ịrịa myeloid leukemia fọrọ nke nta ka o jiri ugboro iri dị elu karịa nke ndị nne ha na-aṅụghị. E kwuru na nchọpụta ọhụrụ ahụ kwekọrọ n’ihe ọmụmụ ndị ọzọ banyere ndị nne dị ime ọmụmụ na-aṅụ mmanya na-aba n’anya na ihe ize ndụ dị elu ụmụ ha nwere ịrịa leukemia.