Ndị Na-eto Eto Na-ajụ Sị . . .
M̀ Kwesịrị Ikwupụta Mmehie M?
“Ihere na-eme m nke ukwuu, amaghị m ihe m ga-eme. Achọrọ m ịgakwuru ndị mụrụ m, ma ihere na-emebiga m ókè.”—Lisa.a
OTÚ a ka otu nwa agbọghọ na-echegbu onwe ya dere. Ya na otu onye na-ekweghị ekwe anọwo na-enwe mmekọrịta ịhụnanya ruo afọ ole na ole ruo otu ụbọchị, n’anya mmanya, o sooro ya nwee mmekọahụ.
N’ụzọ dị mwute ikwu, ụdị ihe ahụ na-eme site n’oge ruo n’oge, ọbụna n’etiti ndị ntorobịa bụ́ ndị Kraịst. Ruo n’ókè anyị bụruru ụmụaka na ndị na-enweghị ahụmahụ, otú ahụ ka o yiri ka anyị ga-ehieru ụzọ. Ma ọ bụ ezie na ọ bụ otu ihe ihie ụzọ ná ntakịrị ihe, ọ bụ nnọọ ihe ọzọ itinye aka ná mmehie dị oké njọ, dị ka mmekọahụ rụrụ arụ. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10) Mgbe nke ahụ mere, ọ dị onye ntorobịa mkpa inweta enyemaka. Ihe bụ nsogbu bụ na ọ dịghị mfe mmadụ ikwupụta njehie ya.
Otu nwa agbọghọ bụ́ onye Kraịst nwere mmekọahụ tupu ọ lụọ di. O kpebiri ime nkwupụta gwa ndị okenye ọgbakọ ya, ọbụna kwuo ụbọchị ọ ga-eme ya. Ma o yigharịrị ụbọchị ahụ. Ka e mesịrị, o yigharịkwara ụbọchị ahụ ọzọ. N’egbughị oge, otu afọ zuru ezu agaala!
“Ọ Dịghị Ihe E Zoro Ezo”
Ọ bụrụ na ị dabawo ná mmehie dị oké njọ, ọ dị gị mkpa ịghọta na ịgbachi nkịtị bụ echiche dị oké njọ. Otu ihe bụ na, e kwuwerị, eziokwu na-apụtakarị ìhè. Mgbe ọ bụ nwatakịrị, Mark kụwara ihe nkụwa e ji chọọ ahụ ụlọ mma. “Agbalịrị m iji nlezianya nyakọta ya,” ka ọ na-echeta, “ma ọ dịghị anya tupu ndị mụrụ m achọpụta mgbawa ndị ahụ.” N’ezie, ị bụkwaghị nwatakịrị. Ma ihe ka ọtụtụ ná ndị mụrụ ụmụ na-enwekarị ike ịchọpụta mgbe ọ dị ihe na-enye ụmụ ha nsogbu.
“Agbalịrị m iji ụgha kpuchie nsogbu m,” ka Ann dị afọ 15 na-ekweta, “ma emere m ka ihe ka njọ n’ikpeazụ.” Ọtụtụ mgbe, ụgha na-apụtakarị ìhè. Mgbe ndị mụrụ gị chọpụtakwara na ị ghara ụgha, o yiri ka ọ ga-ewute ha—wute ha karịa otú ọ gaara ewute ha ma a sị na ị gwara ha eziokwu ná mmalite.
Ọbụna nke ka mkpa, Bible na-asị: “Ọ dịghị ihe e zoro ezo, nke a na-agaghị eme ka ọ pụta ìhè; ọ dịghịkwa ihe dị nzuzo, nke a na-agaghị ama meekwa ka ọ pụta ìhè.” (Luk 8:17) Jehova maara ihe anyị meworo na ihe anyị na-eme. Ị pụghị izonahụ ya dịkwa ka Adam na-enweghị ike. (Jenesis 3:8-11) Ka oge na-aga, ndị ọzọ pụkwara ịmata mmehie gị.—1 Timoti 5:24.
Ịgbachi nkịtị pụrụ imerụ gị ahụ n’ụzọ ndị ọzọkwa. Devid onye ọbụ abụ dere, sị: “Mgbe m gbara nkịtị, ọkpụkpụ m nile kara nká site n’ọgbụgbọ ụja m ogologo ụbọchị nile. N’ihi na ehihie na abalị aka Gị dị arọ n’ahụ m.” (Abụ Ọma 32:3, 4) Ee, nrụgide nke izochi ihe pụrụ ịkpata mbibi n’ụzọ mmetụta uche. Nchegbu na obi amamikpe, tinyere ụjọ nke ịbụ onye e kpughere, pụrụ ime ka i nwee nkụda mmụọ. Ị pụrụ ịmalite ikewapụ onwe gị n’ebe ndị enyi na ezinụlọ nọ. Ị pụrụ ọbụna iche na e kewapụwo gị n’ebe Chineke onwe ya nọ! “Anọwo m na-agbaso akọ na uche na-adịghị ọcha mgba n’ihi ịkpasu Jehova iwe,” ka otu onye ntorobịa aha ya bụ Andrew dere. “Ọ nọ na-eripịa m.”
Ịkwụsị Ịgba Nkịtị Ahụ
Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla a pụrụ isi nweta ahụ efe pụọ ná nsogbu mmetụta uche a? Ee, ọ dị! Ọbụ abụ ahụ kwuru, sị: “Ana m emerịị ka Ị mara mmehie m, ekpuchighịkwa m ajọ omume m. . . . Gị onwe gị bupụkwara ajọ omume nke mmehie m.” (Abụ Ọma 32:5; tụlee 1 Jọn 1:9.) N’otu aka ahụ Andrew nwetara ezi ahụ efe site n’ikwupụta mmehie ya. Ọ na-echeta, sị: “Agakwuuru m Jehova ma kpesie ekpere ike maka mgbaghara ya.”
Ị pụrụ ime otu ihe ahụ. Kpegara Jehova ekpere. Ọ maara ihe i meworo, ma jiri obi umeala kweta ya n’ihu ya n’ekpere. Rịọ mgbaghara, ọ bụghị ịla azụ n’ihi na i chere na ị bụ onye ajọ omume gabiga ókè nke na a pụghị inyere gị aka. Jisọs nwụrụ ka anyị wee nwee ike inwe nguzo dị mma n’ebe Chineke nọ n’agbanyeghị ezughị okè anyị. (1 Jọn 2:1, 2) Ị pụkwara ịrịọ maka ume iji mee mgbanwe ndị dị mkpa. Ịgụ Abụ Ọma 51 pụrụ inyere gị aka karịsịa n’ojije a ị ga-ejekwuru Chineke.
Ịgwa Ndị Mụrụ Gị
Otú ọ dị, a chọrọ ihe karịrị nanị ime nkwupụta gwa Chineke. Iwu jikwa gị ịgwa ndị mụrụ gị. Chineke enyewo ha iwu ịzụlite gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Ha pụrụ ime nke a nanị ma ọ bụrụ na ha mara nsogbu gị. Ọzọkwa, ịgwa ndị mụrụ gị nwere ike ọ gaghị adị mfe ma ọ bụ dị ụtọ. Ma mgbe mmeghachi omume ha mbụ gasịrị, o yiri ka ha ga-achịkwa mmetụta uche ha. Ha pụrụ ọbụna inwe obi ụtọ na ị tụkwasịwo ha obi ruo n’ókè nke ikpughere ha nsogbu gị. Ilu Jisọs banyere nwa mmefu ahụ na-akọ banyere otu nwa okorobịa nke dabara ná mmekọahụ rụrụ arụ. Ma mgbe o mesịrị mee nkwupụta, nna ya ji obi ụtọ nabata ya! (Luk 15:11-24) Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị mụrụ gị ga-enyere gị aka n’otu aka ahụ. E kwuwerị, ha ka hụrụ gị n’anya.
N’eziokwu, ị pụrụ ịtụ ụjọ na ị ga-akpasu ndị mụrụ gị iwe. Ma ọ bụghị nkwupụta mmehie ahụ na-akpasu ha iwe; ọ bụ ime mmehie ahụ na-eme otú ahụ! Ime nkwupụta bụ nzọụkwụ mbụ n’ibelata mkpasu iwe ahụ. Ann, onye e hotara na mbụ, gwara ndị mụrụ ya ma nwee ahụ efe dị ukwuu ka e mesịrị.b
Ma ihe mgbochi ọzọ dị n’ime nkwupụta bụ ihere na mmechuihu. Odeakwụkwọ ahụ kwesịrị ntụkwasị obi bụ́ Ezra emeghị mmehie ndị ahụ n’onwe ya, ma mgbe o kwupụtara mmehie nke ndị Juu ibe ya, ọ sịrị: “Ihere na-eme m, ihu m nwugharịkwara n’ihi ihere, iweliri Gị ihu m elu, Chineke m.” (Ezra 9:6) N’ezie, o kwesịrị ekwesị ime ihere mgbe i meworo ihe dị njọ. Ọ na-egosi na akọ na uche gị ka na-arụ ọrụ. Mgbe oge na-agakwa ime ihere ahụ ga-ebelata. Andrew si otú a tinye ya: “O siri ike ma bụrụ ihe mmechuihu gabiga ókè ime nkwupụta. Ma ịmata na Jehova ga-agbaghara n’ụba na-enye ahụ efe.”
Ịkpọku Ndị Okenye
Ọ bụrụ na ị bụ onye Kraịst, okwu ahụ ejedebeghị n’ịkọrọ ya ndị mụrụ gị. Andrew na-ekwu, sị: “Amaara m na mụ aghaghị iwere nsogbu m gakwuru ndị okenye ọgbakọ. Lee ihe ahụ efe ọ bụ ịmata na ha nọ ya inyere m aka!” Ee, ndị ntorobịa nọ n’etiti Ndịàmà Jehova pụrụ, ha kwesịkwara ịgakwuru ndị okenye ọgbakọ maka enyemaka na agbamume. Ma gịnị mere na ị gaghị nnọọ ekpegara Jehova ekpere ma hapụ ya otú ahụ? N’ihi na Jehova enyefewo ndị okenye ibu ọrụ nke ịdị “na-amụ anya n’ihi mkpụrụ obi unu.” (Ndị Hibru 13:17) Ha pụrụ inyere gị aka izere ịdabaghachi ná mmehie.—Tụlee Jemes 5:14-16.
Aghọla onwe gị aghụghọ n’iche na ị pụrụ inyere onwe gị aka. Ọ bụrụ na i siri ike n’ezie ime nke ahụ, ị̀ gaara adabadị ma ọlị ná mmehie? N’ụzọ doro anya, ọ dị gị mkpa ịchọ enyemaka onye ọzọ. Andrew ji obi ike mee otú ahụ. Gịnị bụ okwu ndụmọdụ ya? “Ana m agba onye ọ bụla na-etinye aka ná mmehie dị oké njọ, ma ọ bụ onye tinyeworo aka na ya, ume ka o megheere Jehova na otu n’ime ndị ọzụzụ atụrụ ya obi ya.”
Ma olee nnọọ otú ị pụrụ isi gakwuru onye okenye? Họrọ onye nke ị na-enwetụ ntụsara ahụ n’ebe ọ nọ. Ị pụrụ ịmalite site n’ikwu, sị: “Ọ dị ihe m chọrọ ịkọrọ gị” ma ọ bụ “Enwere m nsogbu” ma ọ bụ ọbụna “Enwere m nsogbu, achọkwara m enyemaka gị.” Gị ikwu eziokwu na ezoghịkwa ọnụ ga-egosipụta n’ezie nchegharị na ọchịchọ gị ịgbanwe.
‘Ana M Atụ Ụjọ Ịbụ Onye A Chụpụrụ’
Gịnị banyere nke ahụ ime? Ọ bụ eziokwu na ime mmehie dị oké njọ na-eme ka mmadụ bụrụ onye a pụrụ ịchụpụ, ma ọ bụghị iwu. Nchụpụ bụ maka ndị jụrụ ichegharị—ndị ji ịkpọ ekwo nkụ jụ ịgbanwe. Ilu 28:13 na-asị: “Onye na-ekpuchi njehie ya nile, ọ gaghị agara ya: ma onye na-ekwupụta ha, nke na-ahapụkwa ha, a ga-enwe obi ebere n’ahụ ya.” Eziokwu ahụ bụ na ị gakwuruwo ndị okenye maka enyemaka bụ ihe àmà nke ọchịchọ gị ịgbanwe. Ndị okenye bụ n’ụzọ bụ isi ndị na-agwọ ọrịa, ọ bụghị ndị na-enye ntaramahụhụ. Iwu ji ha imeso ndị Chineke n’obiọma na ná nkwanye ùgwù. Ha chọrọ inyere gị aka ‘ịkwara ụkwụ gị ụzọ nke na-eguzozi ọtọ.’—Ndị Hibru 12:13.
N’ụzọ a pụrụ ikweta, mgbe ọ gụnyere aghụghọ ma ọ bụ omume ime mmehie dị oké njọ ruo ogologo oge, ọ pụrụ ịbụ na e nweghị “ọrụ kwesịrị nchegharị” doro anya. (Ọrụ 26:20) Mgbe ụfọdụ ọ pụrụ ịrụpụta nchụpụ. Ọbụnakwa mgbe onye mmehie nwere nchegharị, iwu ji ndị okenye inye ụdị ịdọ aka ná ntị ụfọdụ. Ì kwesịrị iwe iwe ma ọ bụ nwee obi ọjọọ ná mkpebi ha? Ná Ndị Hibru 12:5, 6, Pọl na-agba ume, sị: “Nwa m, agụla ya n’ihe nta, bụ ozizi Onyenwe anyị na-ezi gị site n’inye gị ahụhụ, adakwala mbà mgbe Ọ na-atụ gị mmehie gị n’anya; n’ihi na onye Onyenwe anyị hụrụ n’anya ka Ọ na-ezi ihe site n’inye ya ahụhụ, Ọ na-apịakwa nwa ọ bụla Ọ na-anata ụtarị.” Ịdọ aka ná ntị ọ bụla ị natara, were ya dị ka ihe àmà na Chineke hụrụ gị n’anya. Cheta, ezi nchegharị ga-eme ka gị na Nna anyị dị ebere, bụ́ Jehova Chineke, nweghachi mmekọrịta kwesịrị ekwesị.
Ọ na-achọ obi ike iji kweta ihie ụzọ gị. Ma site n’ime otú ahụ, ị pụrụ idozi okwu ọ bụghị nanị gị na ndị mụrụ gị kama gị na Jehova Chineke onwe ya. Ekwela ka egwu, mpako, ma ọ bụ mmechuihu gbochie gị inweta enyemaka. Cheta: Jehova ‘ga-agbaghara n’ụba.’—Aịsaịa 55:7.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo ụfọdụ n’ime aha ndị ahụ.
b Iji nweta ihe ọmụma banyere ịgakwuru ndị mụrụ gị, lee isi nke 2 nke akwụkwọ bụ́ Questions Young People Ask—Answers That Work, nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]
‘Ana m agba ndị nile mehieworonụ ume imeghere Jehova obi ha.’—Andrew
[Foto dị na peeji nke 15]
Ikwupụta mmehie gị gwa ndị mụrụ gị pụrụ iduje ná mgbake ime mmụọ