N’ihi Gịnị Ka Mpụ A Haziri Ahazi Ji Enwe Ọganihu?
AL CAPONE, onye a ma ama so n’òtù ndị omempụ nke Ọgbọ Mmachibido nke United States (1920-1933), kwuru na ya bụ nanị onye ọchụ nta ego nke na-emezu iwu—iwu imepụta ihe n’ụzọ kwekọrọ n’ókè a chọrọ. Otu onye ọkàiwu maka òtù yakuza kasị buo ibu na Japan kwuru, sị: “O doro anya na a na-achọsi ihe omume [mmekọahụ, ọgwụ ọjọọ, na ịgba chaa chaa] ike.” Ọchịchọ ahụ na-akwalite mpụ a haziri ahazi. Ọ bụ ezie na ọ dịghị onye chọrọ ịbụ onye e mesoro mpụ, ụfọdụ pụrụ ichigharịkwuru òtù ndị na-eme mpụ ma kweta ịdị na-ejere ha ozi.
Were, dị ka ihe atụ, ego nchebe nke ndị so n’ìgwè ndị na-eme ihe ike n’ọtụtụ mba na-eji eme ihe dị ka ụzọ isi nweta ego. Ọ bụ ezie na ha, mgbe ụfọdụ, na-elekwasị anya n’ebe ndị na-akwụwa aka ọtọ nọ bụ́ ndị nwere ụlọ ahịa, ha na-anwụdekarị ndị nwere achụmnta ego a na-enyo enyo. Otu onye nwere ụlọ ọkụ na-eri ego na Shinjuku, Tokyo, nke na-arụ ọrụ achụmnta ego ya n’aha ebe a na-eme egwuregwu vidio kwuru, sị: “A mara otu onye akawo mma, narakwa ya nde 2 [yen ($20,000)]. Ma anyị agaghị akpọ ndị uwe ojii.” N’ihi gịnị? “Ebe anyị na-eme ihe iwu na-akwadoghị (ịgba chaa chaa), anyị achọghị ihe ọ bụla ga-ejikọta anyị na ndị uwe ojii. Mgbe otu onye ahịa malitere ịkpa aghara n’ụlọ ahịa anyị, anyị na-akpọ ndị yakuza.” Onye a nwere ụlọ ọkụ na-eri ego na-akwụ ndị yakuza $4,000 kwa ọnwa, ntakịrị ego ma e jiri ya tụnyere uru $300,000 ọ na-enweta site n’ọrụ ya iwu na-akwadoghị n’oge ahụ. Olee ebe ego ahụ si abịa? Site n’akpa ndị na-agba chaa chaa iwu na-akwadoghị.
Ọ bụkwa otu ihe ahụ banyere achụmnta ego ndị ziri ezi bụ́ ndị chọrọ ịgbanarị nsogbu. Otu onye ọnụ na-eru n’okwu na New York mere atụmatụ na otu onye ọrụ ngo na-ete ágbà nke na-enweta nde $15 n’otu afọ chekwara nde $3.8 site n’inye ndị so n’òtù ndị omempụ aka azụ. Nke a mere ka onye ọrụ ngo ahụ nwee ike iji ndị ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala mee ihe ma zere ya na òtù ndị ọrụ nke ìgwè ndị omekome na-achịkwa ịkwata. Na Japan, n’oge e nwere ọganihu akụ̀ na ụba, ndị o ji ego achụ ego wụbanyere ego ha n’ala na ụlọ ma bibie ụlọ na ụlọ ahịa ndị meworo ochie iji nye ohere maka ụlọ ndị gburu ego. Mgbe ndị bi na ha jụrụ ịpụ ma ọ bụ ire ala ha, ndị o ji ego achụ ego kpọrọ ndị jiageya, ndị ihe ka ukwuu n’ime ha bụ ụlọ ọrụ ndị e jikọrọ ha na yakuza, ịchụpụ ha.
Mgbe ndị yakuza hụrụ otú o si dị mfe ịgbaziri ego na ịkpata ego n’afọ ndị 1980, ha guzobere ụlọ ọrụ dị iche iche ma mabanye n’azụmahịa ala na ụlọ na ihe mbé. Ụlọ akụ̀ na ụlọ ọrụ ego dị iche iche wụbanyere ego n’ụlọ ọrụ ndị a, n’ụzọ doro anya na-ezubesi ike inweta uru nke ha. Ma mgbe ihe dagharịrị, o siiri ụlọ akụ̀ ndị ahụ ike inwetaghachi ego ha. N’ikwu okwu banyere ndakpọ akụ̀ na ụba ahụ na-ekweghị laa alaa na Japan, otu onye bụbu onye ọrụ uwe ojii kwuru na Newsweek, sị: “Ihe mere n’ezie na a pụghị idozi nsogbu nke ịkwụghachi ego ndị ahụ a gbazitere ngwa ngwa bụ n’ihi na akụkụ dị ukwuu n’ime ha metụtara mpụ a haziri ahazi.”
N’ezie, mpụ a haziri ahazi na-agbanye mkpọrọgwụ ma na-eme nke ọma n’ebe ndị mmadụ nwere ọchịchọ siri ike imejụ agụụ anụ ahụ ha, n’ụzọ ọ bụla. Anyaukwu maka ihe ụtọ, mmekọahụ, na ego na-eme ka e nwee ọnọdụ dị mma maka ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, ịgba akwụna, ịgba chaa chaa, na ịgbazinye ego n’ọmụrụ nwa dị elu. Itinye aka n’ụdị ihe omume ndị ahụ na-apụtakarị ịzụ na ime ka ìgwè ahụ na-eme ihe ike maa abụba. Lee ka o si bụrụ eziokwu na mpụ a haziri ahazi na-emejụ ọchịchọ nke ndị kpebisiri ike imejụ ọchịchọ ihe ụtọ anụ ahụ ha!
Usoro Ezinụlọ Adịgboroja
Tụkwasị n’ọchịchọ a na-achọ ihe omume ndị iwu na-akwadoghị, e nwere mkpa ọzọ taa nke mpụ a haziri ahazi na-eme nke ọma na ya. Onye isi nwụworo anwụ nke otu n’ime òtù yakuza kasị buo ibu na Japan siri ọnwụ na ya na-akpọrọ ndị mmebi iwu ma na-elekọta ha wee si otú a na-egbochi ha ịghọ ndị ọjọọ. O kwuru na ya bụ nna nke ndị so n’òtù ndị omempụ. Ihe ka n’ọnụ ọgụgụ n’òtù ndị omekome, n’agbanyeghị mba ha si, na-ewulite òtù ha n’ụdị mmekọrịta ezinụlọ adịgboroja dị otú ahụ.
Were, dị ka ihe atụ, Chi Sun,a onye si n’ezinụlọ dara ogbenye na Hong Kong. Nna ya na-etikasị ya ahụ ọtụtụ mgbe n’ihi ihe ndị na-erijughị afọ. Chi Sun na-eto eto ghọrọ onye nnupụisi ma mesịa sonyere òtù Mkpị Atọ ahụ a ma ama mgbe ọ dị afọ 12. N’òtù ndị na-eme mpụ, ọ chọtara ebe o nwere mmetụta na ya “kwekọrọ.” N’ihi ịbụ dike ya n’iji ngwá agha alụ ọgụ, n’oge na-adịghị anya e buliri ya n’ọkwá ebe o nwere ọtụtụ ndị ikom nọ ya n’okpuru. N’ikpeazụ, mgbe ọ dị nanị afọ 17, a tụrụ ya nga.
Ọtụtụ ndị yiri Chi Sun na-echigharịkwuru òtù ndị na-eme mpụ iji nweta nkekọ ezinụlọ nke na-adịghị n’ebe obibi. Ndị òtù ya na-ekwu na ha na-eche banyere ndị ọzọ, ma ndị ka na-eto eto na-enwekarị ndakpọ olileanya mgbe ha chọpụtara na onye òtù ọ bụla nwekarịrị mmasị n’onwe ya.
Mmụọ Ozi nke Ìhè
Mgbe a kpọrọ òtù mpụ kasị buo ibu na Japan ìgwè na-eme ihe ike n’ikwekọ n’iwu ọhụrụ machibidoro ìgwè ndị omempụ na 1992, otu n’ime ndị ndú ya nọgidere na-ekwu na ìgwè ahụ weere onwe ha dị ka “ndị dike,” na-alụso ihe ọjọọ ọgụ. Mgbe oké ala ọma jijiji ahụ mere na Kobe na 1995, ìgwè ndị omempụ ahụ kesaara ndị agbata obi ha ihe oriri, mmiri, na ihe enyemaka ndị ọzọ. “Ụdị mmesapụ aka ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ Asahi Evening News kọrọ, “aghaghị iwusikwu ike echiche na-adịte anya e nwere na Japan banyere òtù yakuza dị ka ndị mmebi iwu kwesịrị nkwanyere ùgwù.”
Ndị isi nke òtù ndị omekome agbalịwo ọtụtụ mgbe ịnọgide na-enye ngosi nke ịbụ ndị nwere obiọma. Pablo Escobar, onye isi a ma ama nke òtù ahịa ọgwụ ọjọọ na Medellín nke Colombia bụụrụ ndị bi n’ógbè ruru unyi n’obodo ukwu ya “onye dị n’akụkọ ọdịbendị—Mesaịa n’otu akụkụ, Robin Hood n’otu akụkụ, Onyenwenụ n’otu akụkụ n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’echiche oge ochie nke patrón, onye isi,” ka Ana Carrigan dere na magazin bụ́ Newsweek. O wuuru ụmụaka ogige ịgba roller skate na ụlọ ndị dị mma maka ndị ogbenye, o nyekwara ụmụaka n’enweghị ebe obibi ọrụ. Ọ bụ dike nye ndị ritere uru ná mmesapụ aka ya.
Otú ọ dị, ndị omekome ndị o yiri ka hà na-ezochisi ike n’azụ òtù mpụ ha bụ nanị ndị onye isi ndị omekome n’ụwa nile ji na-emezu nzube ya. Bible na-ekpughe onye onye ahụ bụ. “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè. Ya mere ọ bụghị ihe ukwu ma a sị na ndị na-ejere ya ozi na-emekwa onwe ha ka ha yie ndị na-eje ozi ezi omume; ndị ọgwụgwụ ha ga-adị ka ọrụ ha si dị.” (2 Ndị Kọrint 11:14, 15) Taa, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ekweghị na Setan bụ onye dị adị n’ezie. Onye France na-ede uri na narị afọ nke 19 kwuru, sị: “Atụmatụ kasị aghụghọ nke Ekwensu bụ ịrụgide gị ikwere na ọ dịghị.” Ọ na-ezo n’ebe a na-adịghị ahụ ya ma na-achịkwa ihe na-aganụ, ọ bụghị nanị n’òtù ndị omekome kama n’ụwa nile. “Ụwa dum na-atọgbọkwa n’aka ajọ onye ahụ,” ka Bible na-akọwa. Jisọs kọwara Setan dị ka “ogbu mmadụ site na mbụ, . . . onye ụgha, bụrụkwa nna ya.”—1 Jọn 5:19; Jọn 8:44.
Amụma dị iche iche nke Bible na-ekpughe na Setan bụ́ Ekwensu anọwo na-arụsi ọrụ ike karịsịa kemgbe 1914. Malite n’afọ ahụ gaa n’ihu, ọ nọwo na-achịkọta usuu ndị agha ya maka agha kpụ ọkụ n’ọnụ megide ndị Chineke. Ọ na-adọbanye ihe a kpọrọ mmadụ n’oké ọgba aghara. Ọ bụ Ekwensu bụ ihe kasịnụ mere mpụ na òtù ndị na-eme mpụ ji na-enwe ọganihu taa.—Mkpughe 12:9-12.
Ọ̀ dị mgbe a ga-ewepụ onye ahụ na-eduzi òtù dị iche iche na-eme mpụ nke ụwa? Ọ̀ dị mgbe ihe a kpọrọ mmadụ ga-enwe udo na ịdị n’usoro? Ị̀ pụrụ inwere onwe gị pụọ n’ajọ alaeze ukwu nke Setan wuliteworo n’ụwa taa?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ maka nchebe nke ndị o metụtara.
[Igbe dị na peeji nke 7]
Ụzọ Isi Chebe Ezinụlọ Gị
ENWEGHỊ ọnọdụ ezinụlọ na-ekpo ọkụ, nke dị n’otu pụrụ ime ka ndị na-eto eto bụrụ ndị òtù ndị omekome pụrụ ịnwụde n’ụzọ dị mfe. Na United States, a kọrọ na ihe ka ukwuu ná ndị na-eto eto ndị na-etinye aka n’igbu ọchụ nke òtù ndị omempụ si n’ezinụlọ ndị ihe na-adabachaghịrị ma ọ bụ ndị dakpọrọ adakpọ. “N’ịbụ ndị na-enwechaghị ihe,” ka otu onye ọrụ nke otu ụlọ nga dị na North Carolina na-ekwu, “ha na-abụ ndị a kpaliri n’ụzọ dị mfe site ná nkekọ siri ike dị n’agbata onye isi na ndị òtù a tụkwasịrị obi na mmetụta ịdị n’otu dị ka onye so n’otu òtù, bụ́ nke ha na-enwe ahụmahụ ya nke mbụ ná ndụ ha.”
N’otu aka ahụ, n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa otu onye na-eto eto so n’òtù yakuza, bụ́ onye dị njikere ịnwụchitere onye isi ya na-ekwu, sị: “N’ụlọ ana m anọ nanị m oge nile. Ọ bụ ezie na anyị bụ otu ezinụlọ, ọ dịtụbeghị m ka anyị pụrụ inwe nkwurịta okwu sitere n’obi. . . . Ma ugbu a a pụrụ m iso ndị òtù m nwee nkwurịta okwu sitere n’obi.” Ndị ntorobịa owu na-ama na-enwe ekele n’ebe ndị so n’òtù ndị na-eme mpụ nọ bụ́ ndị na-adọbanye ha n’usoro yiri nke ezinụlọ.
“Ndị yakuza na-echebara nnọọ ndị ọzọ echiche,” ka onye ndú nke ìgwè ụmụ agbọghọ na-anya ọgba tum tum n’Okinawa na-ekwu. “Ikekwe nke ahụ bụ aghụghọ ha; ma, ị hụla, ebe a na-emesotụbeghị anyị ihe n’ụzọ dị nro, nke a na-akpali anyị.” Onye isi nke otu ogige maka ụmụ agbọghọ isi ike na-akwado na ndị so n’òtù ndị omempụ “na-eme nke ọma n’inweta obi ụmụ agbọghọ.” Mgbe ụmụ agbọghọ owu na-ama kpọrọ ha n’etiti abalị, ndị so n’òtù ndị omempụ na-agbakwuru ha ma ṅaa ntị n’ihe ha nwere ikwu, n’emechaghị omume na-atụ aro mmekọahụ.
Omume nchebara echiche ha na-aga n’ihu nanị ruo mgbe ha nwetaworo n’ụzọ zuru ezu ndị ahụ na-eto eto ha na-ede. Ozugbo a nwụdere ndị ntorobịa ahụ, a na-erigbu ha—ụmụ agbọghọ n’òtù ịgba akwụna na ụmụ okoro n’òtù ndị na-eme mpụ.
Olee Otú Ị Pụrụ Isi Chebe Ndị Ị Hụrụ n’Anya?
“Ndị bụ nna, akpasula ụmụ unu iwe, ka obi ghara ifu ha,” ka Bible na-adụ n’ọdụ. (Ndị Kọlọsi 3:21) Nke a adịghị agba ndị mụrụ ụmụ ume inwe omume mere otú masịrị gị. Otu ilu Bible na-ekwu, sị: “Nwata nke a na-ahapụ n’onwe ya na-eme ka ihere mee nne ya.” (Ilu 29:15) Kama nke ahụ, Bible na-agba ndị bụ nna—nakwa ndị bụ nne—ume inwe ezi uche n’imeso ụmụ ha, ịṅa ha ntị, na inwe ụzọ nkwurịta okwu ghere oghe ha na ha. Mgbe ahụ, ụmụaka ahụ ga-abụ ndị a kpaliri ịkọrọ ndị mụrụ ha ihe nzuzo ha mgbe ha nwere ihe isi ike.
Tinyere inwe nkwurịta okwu ghere oghe, ọ dị ndị mụrụ ụmụ mkpa inye ụmụ ha ụkpụrụ ná ndụ. Olee ebe onye bụ nna pụrụ isi chọta nduzi ndị dị otú ahụ? Bible na-asị: “Ndị bụ nna, akpasukwala ụmụ unu iwe: kama na-azụpụta ha n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyị.” (Ndị Efesọs 6:4) Wepụta oge iji soro ụmụ gị tụlee Bible site ná nnọkọ ọmụmụ Bible ezinụlọ. Kụbanyekwa n’ime obi ha egwu dị mma maka Jehova ka ha wee na-agbaso nduzi Jehova mgbe nile maka abamuru nke ha.—Aịsaịa 48:17.