Ụzọ Mpụ A Haziri Ahazi Si Emetụta Gị
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA JAPAN
Onye isi (onye ndú) nke otu ezinụlọ Mafia ji ihe dụpuo mkpịsị aka nke onye ọhụrụ ahụ. Ọbara na-atakwasị n’elu foto nke otu “senti.” Ọzọ, ọkụ agbaa foto ahụ. ‘Ọ bụrụ na i kpughee ihe nzuzo ọ bụla nke òtù a, mkpụrụ obi gị ga-agba ọkụ dị ka senti a,’ ka onye isi ahụ na-agwa nwa okorobịa ahụ.
IWU ịgba nkịtị—n’asụsụ Italian, omertà—mere ka mpụ a haziri ahazi bụrụ nnọọ ihe nzuzo ruo ọtụtụ afọ. Otú ọ dị, taa, òtù ndị omempụ na-aghọ isi akụkọ ebe nile ka ụfọdụ ndị so n’ìgwè na-eme ihe ike na-aghọ ndị na-agba ha àmà. Onye a ma ama karịsịa nke ndị pentiti a, ma ọ bụ ndị òtù Mafia chegharịrịnụ, boro ebubo bụ Giulio Andreotti, onye bụrụ praịm minista Itali ugboro asaa, nke a na-ekpekwa ikpe ugbu a maka njikọ nke ya na ndị òtù Mafia.
Òtù ndị na-eme mpụ dị ebe nile agbasapụwo alaka ha banye n’akụkụ nile nke ndụ: òtù Mafia dị n’Itali na United States, bụ́ ebe a na-akpọkwa ya Cosa Nostra; òtù ahịa ọgwụ ọjọọ na Ndịda America; Mkpị Atọ nke China; yakuza na Japan. Ọrụ ọjọọ ha na-emetụta anyị nile ma na-eme ka ihe e ji ebi ndụ na-ada ọnụ karị.
Na United States, ka a na-ekwu, ndị òtù Mafia kewara obodo ukwu bụ́ New York n’etiti ezinụlọ ise, na-enweta ọtụtụ ijeri dollar site ná mpụnara ihe, ego nchebe, ịgbazinye ego n’ọmụrụ nwa dị elu, ịgba chaa chaa, ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, na ịgba akwụna. A na-ekwu na ezinụlọ Mafia dị iche iche ji òtù ndị ọrụ ndị na-arụ ọrụ ibupụ ihe mkpofu, iji ụgbọala achụ nta ego, iwu ihe, nkesa ihe oriri, na imepụta ákwà aka n’ụzọ siri ike. N’ihi ike ha nwere n’ahụ òtù ndị ọrụ ndị ahụ, ha pụrụ idozi esemokwu ndị ọrụ ma ọ bụ gbaa otu ihe owuwu mgba okpuru. Dị ka ihe atụ, n’ebe a na-ewu ihe, ígwè ọrụ bulldozer agaghị emegharị ahụ otu ụbọchị, ụbọchị ọzọ breki nke ígwè ọrụ e ji egwu ala ga-emebi, ndị injinịa na-arụ ọrụ “na-adọghachi” ihe owuwu ahụ azụ—ihe ndị a na ọtụtụ ndị ọzọ na-adịgide ruo mgbe onye ahụ na-ewu ihe kwetara ime ihe ìgwè na-eme ihe ike kwuru, ma hà bụ aka azụ ma ọ bụ ọrụ ngo. N’ezie, “inye Ìgwè Na-eme Ihe Ike aka azụ pụrụ ime ka ndị ọchụ nta ego jide n’aka ịdị na-enweta ihe ọrụ n’oge, udo n’etiti ndị ọrụ na inwe ike inweta ndị ọrụ dị ọnụ ala karị,” ka magazin Time na-akọ.
Òtù abụọ na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na Colombia nọgidere na-amarịta ibe ha aka ruo mgbe a gbagburu Pablo Escobar, bụ́ onye isi nke òtù ahịa ọgwụ ọjọọ nke Medellín, na 1993. Mgbe nke ahụ gasịrị, òtù ahịa ọgwụ ọjọọ nke Cali weghaara azụmahịa ọgwụ cocaine n’ụwa. N’inweta ijeri $7 na 1994 na United States nanị, ọ ghọrọ ma eleghị anya òtù mpụ a haziri ahazi kasị buo ibu n’ụwa. Ma njide e jidere onye na-eduzi ya, bụ́ José Santacruz Londoño, na 1995 kpara òtù ndị ahịa ahụ aka ọjọọ. Otú ọ dị, a na-enwe mgbe nile onye ọ na-agụsi agụụ ike ịnọchi, onye nọ na-echere iweghara ọrụ dị ka onye isi ọzọ.
Mgbe e wepụrụ Ihe Mgbochi ahụ, òtù Mafia nke Russia pụtara nke mbụ ya n’etiti mba ụwa. N’ihi ya, “achụmnta ego ọ bụla dị na Russia na ndị òtù mafia aghaghị imekọ ihe,” ka otu onye ọrụ ụlọ akụ̀ e hotara na Newsweek kwuru. Ọbụna na Brighton Beach, New York, a kọrọ na òtù Mafia nke Russia na-ekpokọta uru site n’atụmatụ wayo dị mgbagwoju anya ndị metụtara mmanụ ụgbọala. Ndị nwere ụgbọala na-akwụzi ọnụ ahịa ka elu, ụtụ isi na-efunahụkwa gọọmenti. Òtù ndị omempụ ndị dị na Russia nwekwara ìgwè ndị akwụna n’Ọwụwa Anyanwụ Europe. Ha na-alafere n’ihe ka ukwuu ná mpụ ha n’enweghị ihe e mere ha. Ònye na-anwa anwa iche ndị na-emebụ egwuregwu na ndị bụbu ndị soja n’agha Afghanistan bụ́ ndị bujuru ngwá agha ihu?
Ọ bụ otu ihe ahụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa. Na Japan, ndị na-eme ihe ngosi aghaghị ịtụ anya ụdị nsogbu nile ọ gwụla ma hà kwanyeere ìgwè ndi yakuza nọ n’ógbè ahụ ùgwù ma tụọ ụtụ isi nye ha. N’ebe a kwa, a na-achọ ego nchebe site n’aka ụlọ mmanya dị iche iche na ọbụna ndị ọkụ elu. Tụkwasị na nke ahụ, ndị yakuza abamiwo n’akụ̀ na ụba Japan site n’iguzobe ụlọ ọrụ ndị nke ha, ịpụnara oké azụmahịa ego, na iso òtù mpụ ndị nọ ná mba ọzọ jikọọ aka.
Òtù na-eme mpụ ndị nwere isi ọnọdụ ha na Hong Kong na Taiwan na-agbasakwa alaka ha n’ụwa nile. E wezụga aha ha, bụ́ Mkpị Atọ, a maghị ihe buru ibu banyere otú e si hazie ha. Ha malitere laa azụ na narị afọ nke 17, mgbe ndị mọnk nke China jikọtara aka ọnụ imegide ndị Manchuria weghaara China. Ọ bụ ezie na ndị òtù ha ruru ọtụtụ iri puku n’ọnụ ọgụgụ, a na-ekwu na Mkpị Atọ nọ na Hong Kong na-eguzobe òtù mpụ ndị na-adịghị adịte anya maka otu mpụ kpọmkwem ma ọ bụ ọtụtụ mpụ, na-eme ka o siere ndị uwe ojii ike ịmata ha. Ha na-enweta ọtụtụ ijeri dollar site n’ịzụ ahịa ọgwụ heroin, ha emewokwa ka Hong Kong ghọọ ebe bụ isi a na-emepụta kaadị igo ihe n’aka nke adịgboroja.
N’akwụkwọ ya bụ́ The New Ethnic Mobs, William Kleinknecht na-ede banyere mpụ na United States, sị: “N’ụwa ọgbara ọhụrụ nke mpụ a haziri ahazi, ọ dịghị ndị so n’òtù ndị omempụ nke agbụrụ ndị nwere ọdịnihu buru ibu karịa ndị China. . . . Ìgwè mpụ dị iche iche nke China ji ọsọ ọsọ na-enwetakwu ike n’obodo ukwu ndị dị ná mba ahụ. . . . Ọ dịghị ndị karịrị ha ma e wezụga òtù Mafia dị na New York.”
Banyere ụdị ịzụ ahịa ọzọ iwu na-akwadoghị nke na-amalite na Hong Kong, otu onye ọrụ ná Ngalaba Okwu Ikpe nke United States na-ekwu, sị: “Ịkpọbata ndị ala ọzọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị bụ mpụta ìhè nke mpụ a haziri ahazi.” Ụfọdụ ndị ọrụ na-eme atụmatụ na ndị China 100,000 na-abanye United States kwa afọ n’ụzọ iwu na-akwadoghị. Onye e si mba ọzọ kpọbata n’ụzọ iwu na-akwadoghị aghaghị ịkwụ $15,000 ma ọ dịkarịa ala maka ịkpọbata ya ná mba bara ọgaranya, na-akwụchapụ ihe ka ukwuu n’ime ya mgbe o ruru ebe ọ na-eje. N’ihi ya, nye ọtụtụ ndị si mba ọzọ kwabata, ndụ n’ala gụrụ ha agụụ na-aghọ ahụmahụ ọjọọ nke ọrụ a manyere amanye n’ụlọ ọrụ a na-akwụ ụgwọ dị ala na ụlọ ndị akwụna.
N’ihi na ị dịghị etinye aka na mpụ, ị pụrụ iche na mpụ a haziri ahazi adịghị emetụta gị. Ma ọ̀ bụ eziokwu? Ọtụtụ ndị ọgwụ ọjọọ riworo ahụ, ndị bi n’ọtụtụ kọntinent na-etinye aka na mpụ iji kwụọ ụgwọ ọgwụ ọjọọ nke òtù ndị na-azụ ahịa ọgwụ ọjọọ na Ndịda America bunyere ha. Mpụ a haziri ahazi na-ahụ na ọrụ ngo maka ozi ọha na eze bụ nke e nyere ụlọ ọrụ ndị ya na ha nwere njikọ; n’ihi ya, ụmụ amaala na-akwụ ụgwọ ka elu. Òtù Ọrụ President Maka Mpụ A Haziri Ahazi kwuru n’otu oge na na United States, “mpụ a haziri ahazi na-agbanwe ọnụ ahịa site n’izu ohi, mpụnara ihe, inye aka azụ, ikwu ọnụ ahịa ihe na igbochi azụmahịa” nakwa na a na-amanye ndị na-azụ azụ ịkwụ òtù Mafia “ihe a pụrụ ịkpọ ụgwọ ntụkwasị.” Ya mere, ọ dịghị onye na-agbanarị mmetụta nke mpụ. Anyị nile na-akwụ ụgwọ ya.
Ma n’ihi gịnị ka mpụ a haziri ahazi ji enwe ọganihu taa?
[[Igbe dị na peeji nke 5]
Òtù Mafia—Mmalite Ya
“Òtù Mafia bilitere na Sicily n’oge Mgbe Ụwa Na-emepechabeghị Anya, bụ́ ebe ọ malitere ikekwe dị ka òtù nzuzo nke raara onwe ya nye n’ịkwatu ọchịchị nke ndị mmeri dị iche iche si ala ọzọ nke àgwàetiti ahụ—dị ka ihe atụ, ndị Saracen, ndị Normandy, na ndị Spain. Òtù Mafia malitere ma nweta ndị òtù ya site n’ọtụtụ òtù ndị agha nọọrọ onwe ha, ma ọ bụ mafie, ndị ndị nwere ala bụ́ ndị na-anọghị n’ụlọ goro ọrụ ichebe ihe onwunwe ha pụọ n’aka ndị ohi n’ọnọdụ enweghị iwu ahụ nke jupụtara n’ihe dị ukwuu na Sicily eri ọtụtụ narị afọ. N’ime narị afọ nke 18 na nke 19, ndị agamevu ahụ nwere ume ndị nọ n’òtù ndị agha ndị a nọọrọ onwe ha chịkọtara onwe ha ma ghọọ nke dị oké ike nke na ha tụgharịrị megide ndị nwere ala ma ghọọ ndị na-ekwu ihe a ga-eme n’ọtụtụ n’ime ihe onwunwe ndị ahụ, na-apụnara ndị nwere ala ego maka ichebere ha ihe ọkụkụ ha.” (The New Encyclopædia Britannica) Ịpụnara ego ghọrọ ụzọ ha si arụ ọrụ. Ha weere ụzọ ime ihe ha gaa United States, bụ́ ebe ha banyere n’ịgba chaa chaa, ịchịkwa òtù ndị ọrụ, ịgbazinye ego n’ọmụrụ nwa dị elu, ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ, na ịgba akwụna.