Ụwa Mpụ Na-adịghị—n’Ụzọ Dị Aṅaa?
ỌGỤ a na-alụso mpụ a haziri ahazi na-aga n’ihu n’ụwa nile. “E nwewo ọganihu dị ịrịba ama megide ndị òtù Mafia n’ime mkpirikpi oge,” ka magazin bụ́ U.S.News & World Report kwuru, “n’ụzọ dị ukwuu n’ihi otu iwu, Iwu Machibidoro Òtù Ndị Ego Iwu Na-akwadoghị Na-emetụta na Ndị Rụrụ Arụ, ma ọ bụ RICO.” Ọ na-eme ka e nwee ike ịma òtù ndị na-eme mpụ ikpe ná ndabere nke omume ịnara ndị mmadụ ego n’ụzọ iwu na-akwadoghị, ọ bụghị nanị ndị e mere otu ugboro. Nke a tinyere ihe ọmụma e nwetara site n’ígwè ọrụ e ji ege ntị ná mkparịta ụka fon ndị ọzọ na-enwe na site n’aka ndị so n’òtù ndị omempụ bụ́ ndị mgbaàmà ndị na-achọ ka e meere ha ebere ekerewo òkè n’ihe ịga nke ọma e nwere n’ọgụ a na-alụso ndị òtù Mafia na United States.
N’Itali kwa, ndị isi na-emegidesi òtù ndị omempụ ike. N’ógbè ndị dị ka Sicily, Sardinia, na Calabria, bụ́ ebe mpụ a haziri ahazi siri ike, e zipụwo ìgwè ndị agha ịgagharị gburugburu ihe owuwu ọha na eze na ógbè ndị dị mkpa iji gbochie ndị omekome ịwakpo ha. Gọọmenti na-ele nke a anya dị ka nke yiri nnọọ agha ime obodo. Ebe ndị isi a ma ama nke òtù ndị omekome nọ n’ụlọ mkpọrọ, a gbaakwa otu onye bụbu praịm minista akwụkwọ n’ihi njikọ a sị na ya na ndị òtù Mafia nwere, Itali na-enweta ihe ụfọdụ si na ya pụta.
Na Japan, gọọmenti machibidoro òtù yakuza mgbe o tiri Iwu Machibidoro Mpụ A Haziri Ahazi na March 1, 1992. N’ikwekọ n’iwu a, ozugbo a kpọrọ otu òtù ndị omempụ òtù na-eme mpụ a haziri ahazi, a machibidoro ya pụọ n’omume 11 nke iji ike arụgide mmadụ, tinyere ịchọ ego aka azụ, itinye aka n’ịnara ego nchebe nke iwu na-akwadoghị, na itinye aka n’idozi esemokwu iji nweta ego. Site n’itinye iwu a n’ọrụ, gọọmenti bu n’obi imechi ebe nile ìgwè ndị na-eme ihe ike si enweta ego. Iwu ahụ akpawo òtù ndị na-eme mpụ aka ọjọọ. Ìgwè ụfọdụ agbasawo, otu onye isi mpụ gbukwara onwe ya—n’ụzọ doro anya n’ihi itinye iwu ahụ n’ọrụ n’ụzọ siri ike.
N’ezie, gọọmenti na ụlọ ọrụ dị iche iche na-ahụ na e debere iwu na-alụsosi mpụ a haziri ahazi ọgụ ike. N’agbanyeghị nke ahụ, akwụkwọ akụkọ bụ́ Mainichi Daily News, mgbe ọ na-akọ banyere otu nzukọ nke ndị ọkàikpe na ndị ọrụ uwe ojii sitere n’akụkụ nile nke ụwa nwere na 1994, kwuru, sị: “Mpụ a haziri ahazi na-esiwanye ike ma na-aba ọgaranya karị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ n’akụkụ nile nke ụwa, na-enukọta ihe ruru 1 puku ijeri dollar n’otu afọ dị ka ego ha nwetara.” N’ụzọ dị mwute, mgbalị ụmụ mmadụ ikpochapụ òtù ndị omekome n’elu ala bụ nke a kpaara ókè. Otu ihe kpatara nke a bụ na n’ọtụtụ ọnọdụ ikpe ziri abụghị nke na-abịa ọsọ ọsọ na nke e ji n’aka. Nye ọtụtụ ndị, iwu dị iche iche na-eyikarị ka hà na-adabara onye omempụ, ọ bụghị onye e mesoro mpụ. Bible kwuru n’ihe dị ka afọ 3,000 gara aga, sị: “N’ihi na e meghị ihe e kpere n’ikpe megide ọrụ ọjọọ ọsọ ọsọ, n’ihi nke a obi ụmụ mmadụ juru eju n’ime ha ime ihe ọjọọ.”—Eklisiastis 8:11.
Isi n’Òtù Ndị Na-eme Mpụ Pụta
Tinyere igbochi mpụ a haziri ahazi site n’èzí, gọọmenti dị iche iche anwalewo inyere ndị nọ n’ime aka isi n’òtù mpụ dị iche iche pụta. Ime otú ahụ adịghị mfe. Dị ka otu ilu ochie na-ekwu, “nanị ụzọ isi pụọ n’òtù Mafia bụ site n’igbe ozu.” Ka onye so n’ìgwè na-eme ihe ike wee hapụ otu òtù yakuza, ọ ga-akwụ ego buru ibu ma ọ bụ e bepụ obere mkpịsị aka ya ma ọ bụ akụkụ ya ụfọdụ. Iji tụkwasị ihe n’egwu dị n’ịkwụsị iso ndị omekome na-emekọrịta, onye bụbu onye omempụ aghaghị iche eziokwu dị n’ibi ndụ kwụ ọtọ ihu. Ọtụtụ mgbe a ga-ajụ akwụkwọ ana m achọ ọrụ ya. Otú ọ dị, ná mba ụfọdụ, e nwere nọmba fon nke ndị uwe ojii iji nyere ndị so n’òtù ndị omempụ aka bụ́ ndị na-achọ ịpụta ma na-enwe ihe isi ike ịchọta ezigbo ọrụ.
Iji chee nrụgide ndị na-esi n’ezinụlọ nke òtù ndị omempụ abịa na ajọ mbunobi nke ọha na eze ihu, ọ dị onye so n’ìgwè na-eme ihe ike mkpa inwe ihe mkpali siri ike iji kwụsị. Gịnị pụrụ ịkpali ya? Ọ pụrụ ịbụ ịhụnanya o nwere maka ezinụlọ ya, agụụ ibi ndụ udo, ma ọ bụ ọchịchọ ime ihe ziri ezi.
Ọtụtụ narị mmadụ agbanwewo ndụ ha kpam kpam. Àgwà ndị yiri nke anụ ọhịa ndị ha gosiburu abụrụwo ndị e ji mmadụ ọhụrụ ahụ “e kere dị ka Chineke chọrọ n’ime ezi omume na ịdị ọcha nke eziokwu ahụ” dochie. (Ndị Efesọs 4:24) Ugbu a, ndị yiri anụ ọhịa wolf na-ebi n’udo n’etiti ụmụ amaala dị nwayọọ n’obi, ndị yiri atụrụ, ha na-enyekwara ọbụna ndị ọzọ aka!—Aịsaịa 11:6.
Nwere Onwe Gị Pụọ ná Mmụọ nke Ụwa
Dị ka e kwuru n’isiokwu bu ụzọ, ọ bụghị nanị na òtù ndị omekome nile nọ n’okpuru ikike a na-adịghị ahụ anya nke Setan bụ́ Ekwensu kama ụwa dum nọ n’okpuru ya. Ndị mmadụ amadịghị, ma Setan ahaziwo ụwa iji mezuo nzube mpụ ya. Dị nnọọ ka òtù mpụ dị iche iche si enye akụ̀ na ụba na usoro ezinụlọ adịgboroja, ọ na-eme dị ka nna ukwu na-emesapụ aka site n’inye ndị mmadụ akụ̀ na ụba, ihe ụtọ, na mmetụta nke ịdị n’otu. Ọ bụ ezie na i nwere ike ị gaghị ama, ọ pụrụ ịbụ na o jiriwo atụmatụ ọjọọ ya ghọgbuo gị. (Ndị Rom 1:28-32) Bible na-agwa anyị na “ịbụ enyi nke ụwa bụ ịbụ onye iro nke Chineke.” (Jemes 4:4) Ọ dị ize ndụ mmadụ ime onwe ya enyi nke ụwa a, nke nọ n’okpuru mmetụta Setan. Onye Okike nke eluigwe na ụwa nwere usuu ndị mmụọ ozi nọ n’okpuru Jisọs Kraịst ndị dị njikere ijide Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya iji mee ka ụwa dị ọcha pụọ ná mmetụta ọjọọ ha.—Mkpughe 11:18; 16:14, 16; 20:1-3.
Mgbe ahụ olee otú ị pụrụ isi si ná mmetụta nke ụwa Setan pụta? Ọ bụghị site n’ibi ndụ ikewapụ onwe onye iche kama site n’iwepụ onwe onye n’àgwà na usoro iche echiche nke na-achịkwa ụwa taa. Iji mee otú ahụ, ọ ga-adị gị mkpa ịlụso atụmatụ mmenye ụjọ nke Setan ma guzogide ihe mkpali ndị ọ na-enye iji jigidesie ndị mmadụ aka ike. (Ndị Efesọs 6:11, 12) Nke a ga-agụnye àjà dị iche iche, ma ị pụrụ inwere onwe gị dị nnọọ ka ndị ọzọ nwerewooro onwe ha ma ọ bụrụ na i kpebisie ike ma nweta enyemaka nke Ndịàmà Jehova na-enye.
Gịnị ga-esochi ihe omume Chineke nke ihichapụ mpụ n’ime ụwa a nọ n’ọgba aghara? “A ga-ebipụ mkpụrụ ndị na-emebi iwu,” ka Bible na-ekwu, ọ gakwara n’ihu, sị: “Ndị ezi omume ga-enweta ala, birikwa n’elu ya ruo mgbe ebighị ebi.” (Abụ Ọma 37:28, 29) Mgbe ahụ, agaghị enwe ihe mere a ga-eji maa jijiji n’ebe ndị nwere àgwà ndị yiri nke anụ ọhịa nọ, n’ihi na “ihe ọmụma Jehova,” nke ga-ejupụta ụwa, ga-agbanweworị ha.—Aịsaịa 11:9; Ezikiel 34:28.
[Foto dị na peeji nke 10]
N’ime ụwa ọhụrụ Chineke, mmadụ nile ga-anụ ụtọ nke ọrụ aka ha