N’ikpeazụ Achọtara M Eziokwu Ahụ
Ka ọ na-eru ngwụsị nke August 1939, akwụsịrị m na Moscow mgbe m na-ala Budapest, Hungary. A bịanyewo aka ná Nkwekọrịta Alụrịtaghị Agha nke ndị Germany na ndị Soviet ọtụtụ ụbọchị tupu ụbọchị ahụ, n’August 23, e jikwa ọkọlọtọ swastika nke ndị Nazi chọọ mgbidi Kremlin mma. Gịnị mere m ji nọrọ na Russia, gịnịkwa na-echere m n’ụlọ?
NKE mbụ, ka m laghachi azụ ná ntakịrị obodo Hungary bụ́ Veszprém, bụ́ ebe a mụrụ m na January 15, 1918. Abụ m nke mbụ n’ime ụmụ anọ, ndị mụrụ anyị hụkwara na anyị na-ejechi chọọchị anya. Mgbe m dị afọ ise, m na-enye aka n’ido Mas n’otu ebe obibi ndị nọn nke Roman Katọlik. N’ụlọ, m ga-eme ka m na-edoro ụmụnne m Mas, na-eyi uwe m ji akwụkwọ mee maka Mas ahụ.
Mgbe m dị afọ asatọ, papa m gbahapụrụ ezinụlọ anyị, mama m lekọtakwara anyị site n’enyemaka nne ya. N’afọ na-eso ya, mama m nwụrụ n’ihi ọrịa cancer. N’afọ ndị sochirinụ, a tụsasịrị anyị bụ ụmụaka ma tinye anyị n’ogige ụmụ mgbei na n’ebe obibi nkuchi dị iche iche. Ogige ikpeazụ ụmụ mgbei m biri dịdewere Budapest. Ọ bụ ndị Frères Maristes (Ụmụnna Meri), bụ́ òtù ndị nkụzi Katọlik nke France, na-elekọta ya. Enwere m ezi ịhụnanya n’ebe Chineke nọ, ya mere mgbe m gbara afọ 13, anakweere m onyinye agụmakwụkwọ nke òtù okpukpe ha nyere m.
Ọzụzụ Okpukpe Dị Ukwuu
N’afọ na-esonụ e zigara m Gris, bụ́ ebe m gara ụlọ akwụkwọ Frères Maristes nke e ji asụsụ French na-eduzi, bụ́ nke kwadebere m ịbụ onye nkụzi. Afọ anọ n’ihu, na 1936, agụsịrị m akwụkwọ na-enwe satifiketi mere ka m ruo eruo ịkụzi ihe n’ụlọ akwụkwọ elementrị. Mgbe m gụsịrị akwụkwọ aghọrọ m brọda n’òtù okpukpe ahụ, na-aṅụ iyi ahụ gbara mkpị atọ nke ịda ogbenye, nrubeisi, na ịdị ọcha. Ọ bụ ezie na anyị bụ ndị brọda na-eyi uwe okpukpe ma na-akụzi katkizim, ọ dịghị mgbe anyị mụrụ Bible.
N’oge okpomọkụ ahụ etinyere m akwụkwọ ịkụzi n’otu ụlọ akwụkwọ na China, a nabatakwara m. N’October 31, 1936, eji m ụgbọ mmiri hapụ Marseilles, France. Na December 3, 1936, erutere m Shanghai. M ji ụgbọ okporo ígwè si ebe ahụ gawa Beijing, bụ́ isi obodo, n’ebe ugwu China.
N’otu ógbè bụ ugwu ugwu nke dị ihe dị ka kilomita 25 site na Beijing, òtù okpukpe Frères Maristes ahụ nwere otu nnukwute ụlọ akwụkwọ, ebe obibi, na ụlọ ubi. Ọ dịdewere ebe obibi oge okpomọkụ nke eze ukwu ma nwee ubi ndị a kọziri nke ọma na osisi ndị na-amị mkpụrụ. N’ebe ahụ emikpuru m onwe m n’ụzọ siri ike n’ịmụ asụsụ Chinese na Bekee. Ma ọ dịghị mgbe anyị mụrụ Bible.
N’etiti Ọgba Aghara
Ná mmalite afọ ndị 1930, Japan jichiri Manchuria, bụ́ otu akụkụ nke China. Na July 1937, ndị agha Japan na China kwatara na nso nso Beijing. Ndị Japan ahụ meriri jiri ndị China ha họpụtara wee guzobe ọchịchị ọhụrụ. Nke a dujere ná ndị agha okpuru nke China ibuso ọchịchị ọhụrụ ahụ agha.
Ebe ọ bụ na a matara ebe obibi ndị mọnk anyị nke dị ná mpụga Beijing dị ka ókèala ndị France, e busoghị ya agha kpọmkwem. N’agbanyeghị nke ahụ, mgbọ na ụda égbè ndị hiere ụzọ tụrụ anyị bụ́ nke merụrụ ihe karịrị ndị China 5,000 ahụ, bụ́ ndị gbabatara n’ebe obibi ndị mọnk anyị maka nchebe. Ka ọ dịgodị, ndị agha okpuru nke China na-achị n’akụkụ obodo ndị dịpụrụ adịpụ.
Na September 1937 ihe dị ka ndị agha okpuru 300 nke China bụ́ ndị ji ngwá agha wakporo ụlọ anyị, na-achọ ngwá agha, ego, na ihe oriri. Eso m n’otu n’ime ndị Europe iri e jidere. Mgbe e jisịrị anyị ụbọchị isii, eso m ná ndị mbụ e ji eji a tọhapụrụ. Amalitela m ịrịa ọrịa n’ihi iri nri na-adịghị mma, ya mere anọrọ m otu ọnwa n’ụlọ ọgwụ.
Mgbe a tọhapụsịrị m n’ụlọ ọgwụ, a kpọfere m n’ụlọ akwụkwọ ọzọ nke òtù okpukpe ahụ na-elekọta, n’ógbè dị nchebe karị na Beijing. Na January 1938, e zigara m Shanghai ịkụzi nkụzi ma alaghachiri m Beijing na September ịkụzi n’ebe ahụ. Otú ọ dị, mgbe afọ agụmakwụkwọ ahụ gasịrị, aṅụghachighị m iyi okpukpe m. Ruo afọ asaa achụsowo m ndụ ikpe okpukpe na agụmakwụkwọ ma enwetaghị m afọ ojuju n’ọchịchọ m na-achọ eziokwu. Ya mere m hapụrụ òtù okpukpe ahụ iji laghachi Budapest.
Ka ọ na-erule mgbe ahụ, Agha Ụwa nke Abụọ nọ na-eru. Ndị isi m bụ́ ndị France gbara m ume isoro Ụzọ Okporo Ígwè Gafere Siberia, bụ́ nke si n’akụkụ ụfọdụ nke Soviet Union gafere. Ọ bụ ka m nọ na njem a ka m rutere Moscow n’August 27, 1939, wee hụ ka e ji ọkọlọtọ ndị Nazi chọọ mgbidi Kremlin mma.
Ụwa Nọ n’Agha
Erutere m ụlọ na Budapest n’August 31, 1939. N’echi ya, ndị Germany wakporo Poland, na-amalite Agha Ụwa nke Abụọ. Ka e mesịrị, Germany mebiri nkwekọrịta alụrịtaghị agha nke ya na Soviet Union, na June 22, 1941, kwa, ndị agha Hitler wakporo Soviet Union. Ha banyere ruo n’ime obodo ndị mepetụrụ emepe nke Moscow ma ha enweghị ike iweghara obodo ukwu ahụ.
Gọvanọ Hungary sooro Germany bịanye aka ná nkwekọrịta udo, e nyekwara ndị agha Germany nnwere onwe isi na Hungary na-agafe. Alụrụ m nwanyị na 1942, na 1943 kwa, e debanyere aha m n’Usuu Ndị Agha Hungary. Na March 1944, Germany wakporo Hungary n’ihi na Hitler enweghị afọ ojuju ná nkwado Hungary na-enye atụmatụ agha ya. A mụrụ nwa anyị nwoke n’afọ ahụ. Iji zere oké mwakpo nke Budapest, nwunye m na nwa m nwoke kwagara n’akụkụ dị ná mpụga obodo isoro ndị mụrụ ya biri.
Otú agha ahụ si aga dagharịrị, Usuu Ndị Agha Soviet chere ihu na Budapest, na-erute na December 24, 1944. Ndị Russia jidere m, aghọkwara m onye e jidere n’agha. A manyere ọtụtụ puku n’ime anyị bụ́ ndị e ji eji iji ụkwụ gaa ihe karịrị kilomita 160 ruo Baja, Hungary. N’ebe ahụ, a fọjuru anyị n’ụgbọ okporo ígwè e ji ebu ehi ma buga anyị Timisoara ma tinye anyị n’otu ogige buru ibu. Ma ọ dịkarịa ala 20,000 n’ime 45,000 ndị ahụ e ji eji nwụrụ ná mmalite nke 1945 n’oge ntiwapụ ahụ ọkụ typhoid.
N’August, a kpọọrọ 25,000 ndị fọrọ ndụ n’ogige ahụ gaa Osimiri Ojii. E si ebe ahụ buru ihe dị ka 20,000 gaa Soviet Union. Otú ọ dị, a kpọghachiri ihe dị ka 5,000 ndị ọzọ na-arịa ọrịa, tinyere m, Hungary ma tọhapụ anyị. N’ụzọ dị otú a, ọnwa asatọ jọgburu onwe ha nke ịbụ onye e ji eji gwụsịrị. Izu ole na ole n’ihu, e jikọtaghachiri mụ na nwunye m na nwa m nwoke, anyị laghachikwara Budapest ije biri.
Ka agha ahụ gasịrị, ọtụtụ ndị ka nọgidere na-ata ahụhụ. Ihe oriri dị ụkọ, ịrị elu nke ọnụ ahịa na-eri ọnụ. Ihe otu pengö ndị Hungary ga-azụta na 1938 were ihe karịrị ijeri kwuru ijeri (1,000,000,000,000,000,000,000,000,000,000) pengö iji zụta ya na 1946! Ka oge na-aga, ihe kawanyeere anyị mma mgbe m nwetara ọrụ ọfịs n’ụlọ ọrụ ụgbọ okporo ígwè.
Ịchọta Eziokwu Ahụ
Na 1955 otu onye n’ime Ndịàmà Jehova anyị na ya bi n’ụlọ anyị na Budapest malitere ịgwa nwunye m, bụ́ Anna, okwu banyere Bible. A kpaliri mmasị m mgbe Anna gwara m na Bible adịghị akụzi na hel bụ ebe mmekpa ahụ. (Eklisiastis 9:5, 10; Ọrụ 2:31) Dị ka onye Katọlik, amụtụbeghị m Bible, ọbụna mgbe m na-anara ọzụzụ pụrụ iche n’ụlọ akwụkwọ chọọchị. Nanị ihe m mere bụ ikwere ozizi Katọlik ndị na-esiteghị n’Akwụkwọ Nsọ, dị ka ọkụ ala mmụọ. Ugbu a abịara m nwee mmasị n’eziokwu Bible, karịsịa ndị metụtara Alaeze Chineke na otú ọ ga-esi mezuo nzube Chineke ime ka ụwa ghọọ paradaịs. (Matiu 6:9, 10; Luk 23:42, 43; Mkpughe 21:3, 4) Enwere m obi ụtọ dị ukwuu m na-enwetụbeghị mbụ.
N’oge ahụ a nọ na-achụgharị ma na-atụ Ndịàmà Jehova nọ na Hungary mkpọrọ n’ihi na ha ji obi ike na-akụzi eziokwu banyere Alaeze Chineke. Agụrụ m akwụkwọ Ndịàmà nile m pụrụ inweta n’asụsụ Hungarian, nweekwa ike inweta mbipụta ha na Bekee na French ndị a na-asụgharịbeghị gaa n’asụsụ Hungarian. Lee ka m si nwee ekele na mụ amụwo asụsụ ndị ọzọ a!
N’October 1956, ndị Hungary nupụrụ isi n’ọchịchị Kọmunist nke ndị Russia tụkwasịrị ha. Ọgụ a lụrụ na Budapest kpụ ọkụ n’ọnụ. A tọhapụrụ ọtụtụ ndị nọ n’ụlọ mkpọrọ, gụnyere Ndịàmà Jehova. N’oge a, e mere mụ na nwunye m baptism iji gosipụta nrara anyị nye Jehova Chineke. Otu izu ka e mesịrị, ndị agha Russia bịanyụrụ mgbanwe ahụ. A kpọghachiri Ndịàmà ahụ a tọhapụburu n’ụlọ mkpọrọ.
Ihe Ùgwù Dị Oké Ọnụ Ahịa
Ebe ihe ka n’ọnụ ọgụgụ ná Ndịàmà na-ahụ maka ọrụ nkwusa ahụ nọ n’ụlọ mkpọrọ, otu onye Kraịst ibe m bịakwutere m ma jụọ ma m nwere ike ịsụgharị ụfọdụ n’ime akwụkwọ anyị ndị e ji amụ Bible. Na mbụ e nyere m akwụkwọ ozi onwe onye ndị sitere Switzerland ndị isiokwu Ụlọ Nche ndị e ji ígwè bie n’asụsụ French dị n’ime ha. Asụgharịrị m ndị a gaa n’asụsụ Hungarian, mgbe ahụ a na-eme ka ọgbakọ dị iche iche nweta isiokwu ndị ahụ a sụgharịrị.
Mgbe a tọhapụrụ ohu alaka Hungary, bụ́ János Konrád, na 1959 mgbe ọ nọsịrị afọ 12 n’ụlọ mkpọrọ n’ihi nnọpụiche ndị Kraịst, a họpụtara m ịbụ onye nsụgharị. Mgbe ahụ enwetara m ihe odide Bekee ịsụgharị. Ọ bụ nwanyị na-ebu ozi, nke m na-amaghị aha ya, na-ewetakarị ya. N’ụzọ dị otú a, ọ bụrụ na o nwee ka e si jide m ma mekpaa m ahụ, agaghị m enwe ike ikwu aha ya.
Mgbe m sụgharịsịrị Ụlọ Nche, Nwanna Konrád ga-agụgharị ya iji hụ na o ziri ezi. Mgbe ahụ ụmụnna nwanyị ga-eji ígwè bie isiokwu ndị ahụ a sụgharịrị ná mpempe akwụkwọ dị nnọọ feke feke, na-eji carbon paper emepụta ihe ruru mkpụrụ 12. Otú a, mgbe ụfọdụ, mmadụ nile na-abịa Ọmụmụ Ihe Ụlọ Nche na-enwe ihe ọmụmụ nke ha e ji ígwè bie. Mgbe ọ gasịrị, ha na-enyefe ìgwè ọmụmụ ihe ọzọ akwụkwọ ha. Otú ọ dị, ọtụtụ mgbe anyị na-enwe ike emepụta nanị otu mkpụrụ Ụlọ Nche maka ìgwè ọmụmụ ihe nke ọ bụla. Mgbe ahụ ndị nile bịaranụ aghaghị ige ntị nke ọma ma na-edetu ihe iji rite uru n’ụzọ zuru ezu site ná nkwurịta okwu Bible ahụ.
Malite n’oge m bidoro ime nsụgharị na 1956 ruo na 1978, e kesara Ụlọ Nche n’asụsụ Hungarian nanị n’ụdị e ji ígwè typewriter dee. Malite na 1978 ruo 1990, e nwere mkpụrụ Ụlọ Nche ndị e ji ígwè mimeograph bie. Leekwa ngọzi ọ bụworo kemgbe January 1990 ibi ma magazin Ụlọ Nche ma Teta! n’asụsụ Hungarian n’àgwà zuru ezu mara mma!
N’okpuru ọchịchị Kọmunist, onye ọ bụla aghaghị inwe ọrụ ego. Ya mere ruo afọ 22, ruo mgbe m lara ezumike nká n’ọrụ ego na 1978, m na-eme nsụgharị n’oge hour mgbe m na-adịghị arụ ọrụ ego. Nke ahụ na-abụkarị n’isi ụtụtụ na n’ime abalị. Mgbe m lasịrị ezumike nká, ejere m ozi oge nile dị ka onye nsụgharị. N’oge ahụ, onye nsụgharị ọ bụla na-anọ n’ụlọ arụ ọrụ, n’ihi mmachibido ahụkwa, o siiri anyị ike iso ibe anyị na-ezikọrịta ozi. Na 1964 ndị uwe ojii wakporo ebe obibi dị iche iche nke ndị nsụgharị n’otu oge ahụ ma jichie ngwá ọrụ anyị. Ruo ọtụtụ afọ ka nke ahụ gasịrị, ndị uwe ojii na-abịakarị na nke anyị.
Ngọzi Ndị Dị Ebube
Na 1969 a nabatara akwụkwọ m tinyere maka akwụkwọ ikike ngafe, ya mere mụ na János Konrád nwere ike isi Hungary gaa Paris iji jee Mgbakọ Mba Nile nke “Udo n’Elu Ụwa” nke Ndịàmà Jehova n’ebe ahụ. Lee ngọzi ọ bụ izute Ndịàmà ibe anyị si ala ndị ọzọ na ịnọtụ ụbọchị ole na ole n’alaka ụlọ ọrụ Ndịàmà Jehova dị na Bern, Switzerland! N’afọ ndị 1970 ọtụtụ Ndịàmà si Hungary nwere ike ịga Austria na Switzerland maka mgbakọ.
Mgbe ọtụtụ afọ nke mmachibido gọọmenti gasịrị, na 1986 anyị nwere mgbakọ mbụ anyị Ọchịchị kwadoro, n’Ogige Ndị Ntorobịa nke Kamaraerdő, Budapest. Anya mmiri nke ọṅụ dị ihe karịrị mmadụ 4,000 bịaranụ n’anya ka ha na-ekele ụmụnna ha nwoke na nwanyị ma na-agụ ozi nnabata ná nzukọ anyị bụ́ nke e dekwasịrị n’elu ọnụ ụzọ e si abata n’ogige ahụ.
N’ikpeazụ, na June 27, 1989, gọọmenti nyere Ndịàmà Jehova nkwado iwu. A mara ọkwa akụkọ ahụ na telivishọn na redio Hungary n’ụzọ nyere ụmụnna anyị nwoke na nwanyị ọṅụ. N’afọ ahụ anyị nwere, n’enweghị ihe mgbochi ọ bụla, mgbakọ distrikti ndị mbụ anyị kemgbe a machibidoro ọrụ anyị n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ afọ 40 tupu mgbe ahụ. Ihe karịrị mmadụ 10,000 bịara nnọkọ ahụ na Budapest, ọtụtụ puku karị gakwara mgbakọ anọ ndị ọzọ e nwere ná mba ahụ. Lee ka m si nwee obi ụtọ ịhụ ka e mere nwanne m nwoke nke ikpeazụ, bụ́ László, na nwunye ya baptism na Budapest!
Ka e mesịrị, na July 1991, anyị nwetara ngọzi karịrị ihe anyị tụworo anya ya—mgbakọ ná nnukwute Népstadion nke Budapest, nke ihe karịrị ndị ọbịa 40,000 bịara. N’ebe ahụ enwere m ihe ùgwù nke ịtụgharị okwu nke ndị so ná ndị ọrụ nke isi ụlọ ọrụ dị na Brooklyn kwuru.
Taa mụ na Anna, tinyere ihe karịrị ụmụnna anyị nwoke na nwanyị 40 ndị anyị hụrụ n’anya, na-arụ ọrụ n’alaka ụlọ ọrụ mara mma nke Ndịàmà Jehova dị n’ógbè mepetụrụ emepe na Budapest. N’ebe a, m na-eje ozi ná Ngalaba Nsụgharị anyị, mụ na ìgwè ọma nke ndị na-eto eto, Anna na-ekerekwa òkè n’ọrụ ụlọ gburugburu ihe owuwu ahụ.
N’agbanyeghị mgbalị anyị ịkụnye eziokwu Bible n’ime nwa anyị nwoke, mgbe o tolitere, ọ nakwereghị ya. Otú ọ dị, ọ na-enwe mmasị ugbu a n’eziokwu ahụ, anyị na-enwekwa olileanya na ka oge na-aga ọ ga-efe Jehova.
Mụ na nwunye m nwere ekele n’ezie na anyị achọtawo eziokwu ahụ banyere Chineke anyị na-ahụ n’anya, bụ́ Jehova, na anyị enwewokwa ike ijere ya ozi ruo ihe karịrị afọ 40 ugbu a.—Dị ka Endre Szanyi si kọọ.
[Foto dị na peeji nke 21]
Mụ na nwunye m