Ugbu A Obi Dị M Ụtọ Ịdị Ndụ!
“Ị maara na ị ga-anwụ, ọ̀ kwa ị ma?” ka dọkịta ahụ jụrụ. N’ụzọ dị iche, ugboro abụọ tupu mgbe ahụ, ọnwụ gaara abụ ahụ efe a nabatara. Ma ọ bụghị n’oge a. Ka m kọwaa.
A ZỤLITERE m n’otu ógbè dịpụrụ adịpụ nke Long Island, New York, ebe papa m bụ ọkwọ ụgbọala asọmpi a ma ama. Ọ bụ onye na-achọkarị izu okè nke na-eme nke ọma n’asọmpi. Ọ na-ewekwa iwe ọkụ ma sie nnọọ ike imeta mma. Mama m, n’aka nke ọzọ, bụ onye udo, dị jụụ karị, nke na-atụ oké egwu banyere asọmpi ịkwọ ụgbọala nke papa m nke na obi adịghị ekwe ya kirie ya ka ọ na-agba ọsọ.
Mụ na nwanne m nwoke si na nwata mụta ịdị na-ebi ndụ apụtaghị ìhè n’ụlọ, ihe mawooro mama m ahụ ime. Ma o siri ike. Anyị nile na-atụ papa m egwu. O metụtara m n’ihi na echetụbeghị m na m pụrụ imeta ihe ọ bụla nke ọma. Ùgwù onwe onye m dalatakwuru mgbe, ná mmalite afọ iri na ụma m, otu “enyi” ezinụlọ anyị metọrọ m n’ụzọ mmekọahụ. Ebe m na-enweghị ike ịnagide mmetụta m, anwara m igbu onwe m. Nke ahụ bụ mgbe mbụ m chere na ọnwụ ga-abụ ahụ efe a nabatara.
Enwere m mmetụta nke abaghị n’ihe na ịbụ onye a na-ahụghị n’anya ma nwee nsogbu iri ihe nke ụmụ agbọghọ ndị nwere ùgwù onwe onye dị ala na-enwekarị. Amalitere m ibi ndụ ịchọ ihe mkpali, ịṅụ ọgwụ ọjọọ, ịkwa iko, na isikwopụ afọ ime—“na-achọgharị ịhụnanya n’ebe nile ọ na-adịghị,” dị ka otu ahịrị sitere n’otu egwú na-ekwu. Etinyere m aka n’ịnya ọgba tum tum, iji ụgbọala asọ mpi, na iji scuba na-egwu mmiri, mgbe mgbe kwa emere m njem ịgba chaa chaa gaa Las Vegas. Achọkwara m okwu ndụmọdụ nke otu dibịa afa ma jiri bọọdụ Ouija gwurie egwu, n’amataghị ihe ize ndụ ndị dị ná mgbaasị.—Deuterọnọmi 18:10-12.
Tụkwasịkwa, ịchọ ihe mkpali dubara n’itinye aka n’ihe ndị megidere iwu dị ka ire ọgwụ ọjọọ na ịtụtụ aka n’ụlọ ahịa. Ọchịchọ m na-achọ ịhụnanya na ihu ọma rụpụtakwara ọtụtụ ndị enyi nwoke na ndị chọrọ ịlụ m. Ihe a nile jikọtara aka mepụta ụzọ ndụ nke dị ize ndụ karịa ka m ghọtara.
Otu abalị, mgbe m ṅụsịrị ma mmanya na-aba n’anya ma ọgwụ ọjọọ n’ebe ndozi ụgbọala n’akụkụ ụzọ ebe a na-asọ mpi, n’ụzọ amamihe na-adịghị ya ekwere m ka enyi m nwoke kwọlaa m. Mgbe m na-amakwaghị ihe na-aga n’oche ihu, o yikwara ka otu ihe ahụ o mere ya. Mmetụta nke nkụkọta kpọtere m n’ike. E nyere m àkwà n’ụlọ ọgwụ n’ihi inwe ọtụtụ mmerụ ahụ, ma emesịrị m gbakee na-enwe nanị ikpere aka nri nwere nkwarụ.
Ọchịchọ Maka Ihe Ka Mma
Ọ bụ ezie na mụ ejichaghị ndụ m kpọrọ ihe, enwere m nnọọ nchegbu banyere nchebe na ihe ruuru ụmụaka na anụmanụ na banyere ichebe gburugburu ebe obibi. Ọ gụrụ m agụụ ịhụ ụwa ka mma, ná mgbalị inye aka kepụta otu, esokwa m n’ọtụtụ òtù. Ọchịchọ a maka ụwa ka mma bụ ihe mbụ dọtara m n’ihe ndị otu onye ọrụ ibe m, bụ́ otu n’ime Ndịàmà Jehova, na-ekwu. Ọ nọgidere na-ezo aka ‘n’usoro ihe a’ n’ụzọ obi nkoropụ mgbe ọ bụla ihe gajọrọ n’ọrụ. Mgbe m jụrụ ya ihe o bu n’uche, ọ kọwara na otu ụbọchị n’isi nso ndụ ga-enwere onwe ya pụọ ná nchekasị nile. Ebe m na-akwanyere ya ùgwù nke ukwuu, ejiri m mmasị dị ukwuu gee ya ntị.
N’ụzọ dị mwute, anyị anụkwaghị ihe ọ bụla site n’aka ibe anyị, ma ọ dịghị mgbe m chezọrọ ihe ndị o kwuru. Amatara m na otu ụbọchị m gaje ime oké mgbanwe n’ụzọ ndụ m iji na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ. Ma adịghị m njikere. Ma, m ga-agwa ndị ga-achọ ịlụ m na n’otu ụbọchị m ga-aghọ Onyeàmà, ọ bụrụkwa na nke ahụ amasịghị ha, ugbu a bụ oge ịgbasa.
N’ihi ya, enyi m nwoke nke ikpeazụ chọrọ ịmatakwu banyere ya, na-asị na ọ bụrụ na m nwere mmasị, na ya nwekwara ike inwe. Ya mere anyị malitere ịchọ Ndịàmà. Kama nke ahụ, ha chọtara anyị mgbe ha bịara n’ọnụ ụzọ ihu ụlọ m. A malitere ọmụmụ Bible, ma ka e mesịrị, enyi m nwoke họọrọ ịkwụsị ịmụ ihe ma laghachikwuru nwunye ya.
Ọmụmụ Bible m adịghị echicha anya. O were m oge iji ghọta echiche Jehova banyere ịdị nsọ nke ndụ. Ma, ozugbo m gbanwere echiche m, ahụrụ m mkpa ọ dị ịkagbu egwuregwu isi n’ụgbọelu mapụ na ịkwụsị ise siga. Ka ndụ na-adịwanye oké ọnụ ahịa nye m, adị m njikere ịnọru ala ma ghara ịdị na-emekwa ihe ndị dị ize ndụ ọzọ. N’October 18, 1985, egosipụtara m nraranye m nye Jehova site na baptism ime mmiri. Amaghị m na ndụ m ga-anọ n’ihe ize ndụ n’isi nso.
Ịchọkwa Ịnwụ Ọzọ
Ọnwa ole na ole n’ihu—n’abalị March 22, 1986—anọ m n’ihu ụlọ m, na-achịpụta ákwà a sụrụ asụ dị n’ime ụgbọala m, mgbe otu ụgbọala ji oké ọsọ kụrụ m ma dọkpụrụ m gbaa ihe karịrị mita 30! Enwere m ihe ọghọm a kụtuo a gbalaga. Ọ bụ ezie na m nwere mmerụ ahụ n’isi, amaara m onwe m n’oge ahụ nile.
N’ikpudo ihu n’ala n’etiti okporo ụzọ gbara ọchịchịrị, apụrụ m nanị iche banyere ụjọ nke ịbụ onye ụgbọala ọzọ kụrụ. Ihe mgbu ahụ dị ukwuu, karịa otú m pụrụ idili. Ya mere m nọgidere na-ekpere Jehova ekpere ka o kwe ka m nwụọ. (Job 14:13) Otu nwanyị nke bụ onye nọọsụ pụtara. Arịọrọ m ya ka o wegharịa ụkwụ m, ebe a kụjasịrị ha. O mere otú ahụ, ọ dọkakwaara ákwà ya wee mere bandeji, iji kwụsị ọbara na-agba n’ọtụtụ ebe m merụrụ ahụ n’otu ụkwụ. A chọtara buut m n’ógbè ụlọ nke dịpụrụ adịpụ, jupụta n’ọbara!
Ndị na-agafe, n’amataghị na m ji ụkwụ na-aga, nọgidere na-ajụ m ebe ụgbọala m dị. N’amaghị ebe a kpụruru m, echere m na m ka nọ n’akụkụ ya! Mgbe ndị enyemaka n’ịgwọ ọrịa bịarutere, ha chere na m gaje ịnwụ. Ya mere ha kpọrọ ndị uwe ojii nchọpụta ihe, ebe iji ụgbọala gbuo mmadụ pụrụ ịbụ ajọ mpụ. E mesịrị jide ọkwọ ụgbọala ahụ. Ha gechibidoro ógbè ahụ dum dị ka ebe e mere mpụ ma kpụrụ ụgbọala m dị ka ihe akaebe. A kụpụwo ọnụ ụzọ ya abụọ dị n’otu akụkụ.
Iche Nsogbu Ihu
Ka ọ dịgodị, mgbe m rutere n’ebe a na-agwọ mkpasasị uche, m nọgidere na-ekwu, ọbụna site n’ihe mkpuchi ihu ikuku oxygen: “Amịnyela m ọbara, amịnyela m ọbara. Abụ m otu n’ime Ndịàmà Jehova!” Ihe ikpeazụ m chetara bụ inwe mmetụta nke nnukwute mkpà uwe ịga n’azụ m na ịnụ ka ìgwè ndị ahụ na-agwọ mkpasasị uche na-enye ọda n’ike n’ike.
Mgbe m tetara, ọ tụrụ m n’anya ịnọ ndụ. M matatụ onwe m, m gakwaghị ama onwe m. Mgbe ọ bụla m tetara, m na-agwa ndị ezinụlọ m ka ha kpọtụrụ di na nwunye ahụ mụụrụ m Bible. Ezinụlọ m enweghị obi ụtọ na mụ aghọwo Onyeàmà, ya mere ha mechiiri ahụ “chezọọ” ịgwa ha. Ma esiri m ọnwụ—ọ bụ ihe mbụ m na-ajụ banyere ya mgbe ọ bụla m mepere anya. N’ikpeazụ, nnọgidesi ike m nwetara ụgwọ ọrụ, otu ụbọchị kwa mgbe m tetara, ha nọ n’ebe ahụ. Lee ihe ahụ efe ọ bụ! Ndị Jehova maara ebe m nọ.
Ma, ọṅụ m adịteghị anya n’ihi na ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m malitere ịgbada, enwekwara m oké ahụ ọkụ. E wepụrụ ọkpụkpụ ndị e chere na ha na-akpata ọrịa, a ganyekwara ígwè anọ n’ụkwụ m. Ma n’isi nso oké ahụ ọkụ ahụ bịaghachiri, ụkwụ m malitekwara iji ojii. Ọnyá gangrene abatawo, nlanarị dabekwara n’ibepụ ụkwụ ahụ.
A Rụgidere M Ịnara Ọbara
Ebe ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara m gbadaworo nke ukwuu, e chere na ịwa ahụ bụ ihe a na-apụghị ime eme n’amịnyeghị ọbara. A kpọrọ ndị dọkịta, nọọsụ, ndị òtù ezinụlọ, na ndị enyi ochie ịbịa rụgide m. Mgbe ahụ, ịgba izu malitere n’ọnụ ụzọ m. Anụchatara m ka ndị dọkịta na-eme atụmatụ otu ihe, ma apụghị m ịghọta ihe ọ bụ. Ọ dabara na otu Onyeàmà letara m mgbe ahụ nụchatara atụmatụ ahụ nke ịnwa ịmịnye m ọbara n’ike. O jekwuuru ndị okenye bụ́ ndị Kraịst nọ n’ógbè anyị ozugbo, bụ́ ndị bịara nyere m aka.
E goro dibịa na-agwọ ọrịa uche ọrụ ile ọnọdụ uche m. Nzube ya doro anya bụ ikwu na mụ enweghị ikike wee si otú ahụ kagbuo ọchịchọ m. Atụmatụ a kụrụ afọ n’ala. Mgbe ahụ, a kpọrọ otu onye ụkọchukwu, onye narabuuru mmịnye ọbara n’onwe ya, ime ka m kweta na ịnara ọbara dị mma. N’ikpeazụ, ezinụlọ m chọrọ inweta ikike ụlọikpe ịmịnye m ọbara n’ike.
N’ihe dị ka n’elekere abụọ n’ụtụtụ, ìgwè ndị dọkịta, odeakwụkwọ ụlọikpe, oje ozi ụlọikpe, ndị ọkàiwu na-anọchite anya ụlọ ọgwụ ahụ, na otu ọkàikpe zọbatara n’ọnụ ụlọ m n’ụlọ ọgwụ. Ikpe na-aga n’ihu. E bughị ụzọ mee ka m mara, enweghị m Bible, enweghị m onye nnọchiteanya, e nyekwara m ọgwụ ahụ mgbu dị ukwuu. Gịnị si ná nnọkọ ahụ pụta? Ọkàikpe ahụ jụrụ iwu ụlọikpe, na-asị na nguzosi ike n’ezi ihe nke Ndịàmà Jehova metụtara ya n’ahụ nke ukwuu ọbụna karịa otú o metụworo ya na mbụ.
Otu ụlọ ọgwụ dị na Camden, New Jersey, kwetara ilekọta m. Ebe ndị ọrụ ụlọ ọgwụ ahụ dị na New York jupụtara n’ọnụma, ha jụrụ inye m ọgwụgwọ nile, gụnyere ọgwụ ahụ mgbu. Ha jụkwara ikwe ka helikọpta ga-ebuga m ụlọ ọgwụ New Jersey daa. Ọ bụ ihe obi ụtọ na alanarịrị m njem ụgbọala ụlọ ọgwụ bugara m n’ebe ahụ. Mgbe m rutere, anụrụ m okwu ndị ahụ e hotara ná mmalite akụkọ a: “Ị maara na ị ga-anwụ, ọ̀ kwa ị ma?”
Ịwa Ahụ—Ihe Gara nke Ọma
Ike adịghị m ma ọlị nke na onye nọọsụ aghaghị inyere m aka idenye akara X na fọm nkwenye iji nye ikike maka ịwa ahụ. A ghaghị ibepụ ụkwụ aka nri m site n’ikpere. Mgbe ọ gasịrị, ọ̀tụ̀tụ̀ hemoglobin m erukwaghị 2, ndị dọkịta chekwara na ọ bụ mbibi ụbụrụ kpatara ya. Nke a bụ n’ihi na ha enwetaghị nzaghachi mgbe ha na-eti ná ntị m, “Virginia, Virginia”—aha dị n’akwụkwọ nnabata m. Ma mgbe m nụrụ, “Ginger, Ginger,” ka e ji nwayọọ takwụnye ya ná ntị m nwa oge n’ihu, emeghere m anya m wee hụ otu nwa amadị m na-ahụtụbeghị mbụ.
Bill Turpin si n’otu n’ime ọgbakọ Ndịàmà Jehova ndị dị n’ógbè ahụ na New Jersey. Ọ matawo utu aha m bụ́ Ginger—nke e jiworo mara m ná ndụ m nile—site n’aka Ndịàmà bi na New York. Ọ jụrụ ajụjụ ndị m pụrụ iji ntabi anya zaa, ebe a kwụnyere m ígwè e ji eku ume, apụghịkwa m ikwu okwu ma ọlị. “Ị̀ chọrọ ka m nọgide na-agbalị ileta gị,” ka ọ jụrụ, “na ịgwa Ndịàmà bi na New York banyere gị?” Apụghị m ịkwụsị ịtabi anya! Nwanna Turpin emewo ihe dị ize ndụ site n’igbebata n’ọnụ ụlọ m, ebe ezinụlọ m nyeworo iwu na m gajeghị inwe ndị nleta ọ bụla bụ́ Ndịàmà.
Mgbe ọnwa isii nke ịnọ n’ụlọ ọgwụ gasịrị, m ka pụrụ nanị ịrụ ọrụ ndị bụ isi n’ụbọchị, dị ka inye onwe m nri na ịsa ezé m. E mesịa, anatara m ụkwụ aka mere wee nwee ike iji mkpara na-agagharịtụ. Mgbe m hapụrụ ụlọ ọgwụ ahụ na September 1986 ma laghachi n’ebe obibi m, onye enyemaka ahụ ike nọnyeere m n’ụlọ ruo ihe dị ka ọnwa isii ọzọ iji nyere m aka.
Enyemaka Site n’Aka Òtù Ụmụnna Anyị
Ọbụna tupu m laruo ụlọ, amalitere m n’ezie ịhụ ihe ọ pụtara bụ́ ịbụ akụkụ nke òtù ụmụnna ndị Kraịst. (Mak 10:29, 30) Ụmụnna nwoke na nwanyị ndị ahụ ji ịhụnanya lekọta ọ bụghị nanị mkpa anụ ahụ m kama ndị nke ime mmụọ m kwa. Site n’enyemaka ịhụnanya ha, enwere m ike ịmaliteghachi ịga nzukọ ndị Kraịst na, ka oge na-aga, ọbụna ikere òkè n’ihe a na-akpọ ozi ọsụ ụzọ inyeaka.
E kpechara ikpe akwụkwọ a gbara ọkwọ ụgbọala ahụ, bụ́ nke na-ewekarị ma ọ dịkarịa ala afọ ise ọbụna tupu ọ pụta ná ndepụta ụlọikpe, n’ime ọnwa ole na ole—dị ka ihe ịtụnanya nye ọkàiwu m. Site n’ego a kwụrụ m, enwere m ike ịkwaga n’ụlọ kaara mfe ibi. Tụkwasị na nke a, azụtara m ụgbọ nwere ihe mbuli oche nkwagharị na ihe nchịkwa a na-eji n’aka. N’ihi ya, na 1988, esonyeere m ìgwè ndị ọsụ ụzọ oge nile, na-etinye ma ọ dịkarịa ala hour 1,000 n’ọrụ nkwusa kwa afọ. Eri ọtụtụ afọ, anụwo m ụtọ ịrụ ọrụ n’ókèala ndị dị na steeti North Dakota, Alabama, na Kentucky. Ejiwo m ụgbọ m gbaa ihe karịrị kilomita 150,000, ihe ka ukwuu n’ime ha n’ozi ndị Kraịst.
Enwewo m ọtụtụ ahụmahụ na-atọ ọchị n’iji ụgbọ ụkwụ atọ m ji ike eletrik arụ ọrụ eme ihe. Akpọkasịwo m ya ugboro abụọ ka mụ na ndị nwunye ndị nlekọta na-ejegharị ejegharị na-arụkọ ọrụ. Otu ugbo, n’Alabama, echere m n’ụzọ na-ezighị ezi na m pụrụ iji ya wụfere otu obere ọwa mmiri ma enwetara m onwe m n’ala, jupụta n’apịtị. Ma, inwe omume ịkpa ọchị na ejighị onwe m kpọrọ ihe gabiga ókè enyeworo m aka ịnọgide na-enwe àgwà ziri ezi.
Onye Olileanya E Ji n’Aka Kwagidere
Mgbe ụfọdụ nsogbu ahụ ike na-afọ nke nta ka o rikpuo m. Aghaghị m ịkwụsị ịsụ ụzọ ugboro abụọ n’afọ ole na ole gara aga n’ihi na o yiri ka ọ ga-adị mkpa ibepụ ụkwụ m nke ọzọ. Iyi egwu nke ụkwụ m ifunahụ m dị mgbe nile ugbu a, n’ime afọ ise gakwara aga, anaghị m esi n’oche nkwagharị ebilite ma ọlị. Na 1994, agbajiri m aka m. Enyemaka dị m mkpa iji saa ahụ, iyiri uwe, isi nri, na ihichasị ihe, a ghaghịkwa ibuga m ebe ọ bụla ebuga. Ma, n’ihi enyemaka ụmụnna, enwere m ike ịga n’ihu n’ịsụ ụzọ gabiga ihe ndọghachi azụ a.
N’ime ndụ m nile achọgharịrị m ihe yiri ka ọ bụ ihe mkpali, ma ugbu a amatara m na oge kasị na-akpali akpali dị n’ihu. Nkwenyesi ike m na Chineke ga-agwọta ahụ adịghị ike nile dị ugbu a n’ụwa ọhụrụ ya ji ọsọ na-abịa bụ ihe na-eme m obi ụtọ ịnọ ndụ ugbu a. (Aịsaịa 35:4-6) N’ime ụwa ọhụrụ ahụ, ana m elepụ anya n’ihu maka iso azụ whale na dolphin na-egwugharị mmiri, iso ọdụm na ụmụ ya na-awagharị n’ugwu, na ime ihe dị mfe dị ka ịga ije n’ụsọ mmiri. Ọ na-enye m obi ụtọ iji anya nke uche na-ahụ ka m na-eme ihe nile Chineke kere anyị ịnụ ụtọ ha n’elu ala Paradaịs ahụ.—Dị ka Ginger Klauss si kọọ.
[Foto dị na peeji nke 21]
Mgbe ịgba chaa chaa bụ akụkụ ndụ m
[Foto dị na peeji nke 23]
Nkwa Chineke na-akwagide m