Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 18-19
  • Kaba—Ụdị Uwe Africa nke Mara Mma

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Kaba—Ụdị Uwe Africa nke Mara Mma
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kaba Aghọọ Ihe Na-ewu Ewu
  • Mgbanwe Ejiji Na-agbanwe
    Teta!—2003
  • Ụdị Uwe Ị Na-eyi Ọ̀ Na-eme Ka E Too Chineke?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2016
  • Imeru Ihe n’Ókè n’Uwe na n’Ejiji
    Ozi Alaeze Anyi—2002
  • Ụdị Uwe Anyị Na-eyi—Ọ̀ Dị Ihe O Mere N’ezie?
    Teta!—1999
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 1/8 p. 18-19

Kaba—Ụdị Uwe Africa nke Mara Mma

SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! NA GHANA

KABA—ị pụrụ ịhụ ya n’ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ ebe nile na Ghana ebe a na ná mba Ọdịda Anyanwụ Africa ndị agbata obi ya. A na-eyi ya n’oge dị iche iche—site n’ememe olili ozu ruo ná nnọkọ na-enye ọṅụ nke ndị Kraịst. E nwekwara kaba n’ụdị na ụcha dị iche iche.

Gịnịkwanụ bụ kaba? Ọ bụ ụdị uwe na-ewu ewu nke ụmụ nwanyị. Aha ahụ na-ezo aka n’uwe elu nke na-esite n’olu gbadaruo n’úkwù. Otú ọ dị, a naghị eyi nanị ya. Na-adabere n’ụdị ya, úkwù ákwà dị mita abụọ n’ogologo nke a maara ebe a n’ọha dị ka wax print, ma ọ bụ java print, na-eso ya. N’ịbụ nke a na-ama n’úkwù, na-akwụsịkwa na nkwonkwo ụkwụ, a na-akpọ ákwà a asetam. Ekike ahụ na-ezu ezu nanị mgbe a makwasịrị ya úkwù ákwà abụọ ọzọ dị mita abụọ a na-akpọ nguso. A pụrụ iji nguso mee ihe n’ụzọ dị iche iche, a pụkwara ike ya dị ka ịchafụ kwekọrọ ekwekọ ma ọ bụ dị ka ihe iji kwọrọ nwa n’azụ.

Ọ bụ nanị n’Africa ka a na-eyi kaba, ma e ji aha dị iche iche mara ya na kọntinent ahụ nile. Ndị Liberia na-akpọ ya uwe lappa. Na Benin ọ bụ genwu. Ndị Sierra Leone na-akpọ ya docket na lappa. Otú ọ dị, n’oge na-adịbeghị anya, a maghị kaba n’ala Africa. Dị ka ihe atụ, na Ghana ebe a, ụdị uwe bụ́ dansenkran wuru ewu n’etiti ndị inyom na-asụ Akan. Úkwù ákwà abụọ mejupụtara nke a, mgbe ụfọdụ ndị bụ́ otu ụdị. A na-ama otu obi n’úkwù ma jiri ajị̀ kesie ya ike. A na-achịkwasịkarị úkwù nke abụọ, nke na-akakarị ibu, n’ubu aka ekpe, na-agafe obi na azụ. A na-ejikarịkwa ụdị isi pụrụ iche, nke a na-akpọkwa dansenkran, eyi uwe a.

Otú ọ dị, site ná mwebata nke ígwè e ji akwa ákwà, ụfọdụ ndị inyom Africa malitere imepụta ákwà ndị yiri uwe elu ndị inyom nke Ebe Ọdịda Anyanwụ. Nzube ya bụ iji kpuchie ubu dị ka ndị inyom Ebe Ọdịda Anyanwụ si eme. Otu akụkọ na-ekwu na o siiri ụfọdụ ike ịkpọpụta okwu Bekee bụ́ “cover the shoulders” (kpuchie ubu). Okwu ahụ bụ́ “cover” si otú a ghọọ kaba.

Kaba Aghọọ Ihe Na-ewu Ewu

Malite ná ndị ọrụ ọfịs ruo ná ndị ọrụ ugbo, ndị inyom nọgidere na-eyi kaba. N’ezie, ọ ghọwo ọbụna ngwá ahịa a na-ebuje ná mba ọzọ! Otú ọ dị, iwu ewu dị otú ahụ malitetụrụ ọhụrụ.

Otu ihe bụ na ọ bụghị ndị inyom nile nwere mmasị n’ụdị kaba wurunụ afọ 40 ma ọ bụ karị gara aga. Onye ọrụ ebere laworo ezumike nká aha ya bụ́ Agnes, gbara afọ 62, gwara Teta! na ụfọdụ n’ime ụdị ndị ahụ gara aga “na-atọ ọchị.” Nye ndị inyom ndị ọzọ, iyizi kaba eyizi, ya na asetam na nguso ya, chọrọ ndidi na nkà ime ihe gabigara ókè. Elizabeth, onye nwere ụlọ ọrụ na-akwa ákwà, na-echeta: “O siiri anyị bụ ụmụ ada na-eto eto ike ịmụta nkà iyi asetam na nguso. Ọ dịghị mgbe m mụtara nkà ahụ,” ka o kwetara.

Ịkpa ókè n’ihi ọkwá keere òkè n’ibelata iwu ewu nke ụdị uwe a. Serwah, gbara afọ 65, gwara Teta! na ruo na nso nso a, ụfọdụ chere na ụdị uwe Ebe Ọdịda Anyanwụ bụ maka ndị gụrụ akwụkwọ, ebe kaba bụ nke ndị na-agụghị akwụkwọ.

Otú ọ dị, nghọta ọhụrụ nke ọdịbendị emewo ka ọtụtụ ndị inyom Africa lee kaba anya ugbo abụọ. Ndị nkà ịkwa ákwà enyewokwa ejiji a nkwalite dị ịrịba ama. Otu ihe bụ na ha mepụtara uwe ọhụrụ a na-akpọ slit. N’ibụ nke a kwara dị ka sket ma na-eru na nkwonkwo ụkwụ, o gboro nsogbu ụfọdụ ndị inyom nwere n’ịmazi asetam na nguso amazi. Ihe ngosi dị iche iche ekerewokwa òkè dị ukwuu n’ịkwalite kaba dị ka ákwà na-ewu nnọọ ewu.

Otú ọ dị, dị ka ọ dị n’ihe metụtara ejiji na-ewu ewu n’ọtụtụ ala, ụdị ụfọdụ kasị ọhụrụ na-elekwasị anya nke ukwuu ná mkpali ihe ụtọ. Clara, gbara afọ 69, na-arụ ụka na ụdị uwe ahụ na-ekpughe akụkụ ahụ ụfọdụ na-eyi ka ọ na-emebi “nzube mbụ nke kaba,” nke bụ “ikpuchi ọbụna ubu.” Ya mere, ndị inyom bụ́ ndị Kraịst na-eburu n’uche ndụmọdụ Pọl onyeozi: “Otú ahụ, ezubere m ka ndị inyom were ihe ịchọ mma kwesịrị ekwesị chọọ onwe ha mma, ya na nsọpụrụ na uche zuru okè.”—1 Timoti 2:9; 1 Ndị Kọrint 10:29.

Nye ndị inyom ndị ji amamihe na-eme nhọrọ, kaba pụrụ ịbụ ụdị uwe mara mma, kwesịkwara ekwesị. Ọ bụkwa ezie na ọtụtụ uwe ọdịnala Africa ewuchawo, ruo ugbu a kaba ejisiwo ike dịgide dị ka otu ụdị nke na-egosipụta ọdịbendị na gburugburu ebe obibi Africa n’ụzọ na-adọrọ adọrọ, nke makwara mma.

[Foto dị na peeji nke 18]

“Nguso,” e ji ya mee ihe ebe a dị ka ịchafụ

[Foto dị na peeji nke 19]

“Nguso,” e ji ya kwọrọ nwa

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya