Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 10/8 p. 28-30
  • Ịtụ Osisi—Nkà Ochie nke Africa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ịtụ Osisi—Nkà Ochie nke Africa
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ịtụ Osisi Taa
  • Ịmụta Nkà Onye Na-atụ Ihe
  • Jehova Ji Ekpere Anyị Kpọrọ Ihe
    Usoro Ihe Omume—Ozi Anyị na Otú Anyị Si Ebi Ndụ—2022
  • Ihe Nwa Ahụhụ A Na-akpọ Silver Ant Na-eji Egbochi Okpomọkụ
    Teta!—2017
  • Olu Ndanda
    Teta!—2016
Teta!—1997
g97 10/8 p. 28-30

Ịtụ Osisi—Nkà Ochie nke Africa

Site n’aka onye nta akụkọ Teta! na Nigeria

NDỊ na-atụ osisi anọwo n’ọrụ eri ogologo oge na Benin City, nke dị n’ebe bụ ndịda anyanwụ Nigeria ugbu a. Narị afọ anọ gara aga, Benin City bụ isi obodo nke otu alaeze dị ike, nke a hazikwara nke ọma, nke dị n’ime oké ọhịa. O juru ndị ọbịa si Europe anya ịhụ okporo ámá obodo ahụ na-agbagọghị agbagọ, bụ́ ndị sara mbara, ụlọ ya ndị a haziri nke ọma, na ndị mmadụ ya nwere ùgwù ma na-erubere iwu isi. Ruo ọtụtụ narị afọ Benin City nwere ihe ịga nke ọma dị ka otu n’ime ebe azụmahịa na ọdịbendị ndị kasị mkpa n’ebe ọdịda anyanwụ Africa.

Usoro ndị eze a na-akpọ ndị ọba chịrị alaeze Benin. Ndị ọba ahụ kwadosiri ime nkà ike. Ihe ndị e ji chọọ ọmarịcha obí eze ha mma na Benin City bụ isi a tụrụ atụ, ihe ndị a na-ekowe n’ahụ ájá mara mma bụ́ ndị e jiri ọla bronze kpụọ, na ọdụ́ ndị e jiri nkà tụọ. Ọ bụ ezie na ihe ochie ndị ahụ e ji osisi tụọ alanarịghị mbibi nke oge na àkị́kà, o doro anya na ndị na-atụ osisi rụsiri ọrụ ike n’alaeze ahụ. Martins Akanbiemu, onye bụbu onye nlekọta nke Ebe Ngosi Ihe Mgbe Ochie nke Mba na Lagos, na-ede: “Òtù ndị na-atụ osisi . . . yiri ka ọ bụ nke kasị ochie rụụrụ Ọba ọrụ.”

Na 1897, ndị agha Britain kwakọọro ihe dị na Benin City ma buga Europe nkà ya bụ akụ̀ dị oké ọnụ ahịa ugbu a—ihe karịrị 2,000 n’ime ha. Taa, a kpọsara ihe kasị ukwuu ná nchịkọta nke nkà ndị Benin oge ochie n’ebe ngosi ihe mgbe ochie dị na London na Berlin, ọ bụghị na Nigeria.

Ịtụ Osisi Taa

Taa Benin City bụ obodo ukwu na-ekwo ekwo dịkwa nnọọ ka ọtụtụ ndị ọzọ na Nigeria. Ma, akara nke ebube mbụ ya ka dịkwa. E wugharịwo obí eze ahụ, ọba na-achị ugbu a bikwa n’ebe ahụ. Ị pụrụ ịhụ ihe àmà nke ekpé miri emi nke gbara obodo ochie ahụ gburugburu; i geekwa ntị nke ọma, ị pụrụ ịnụ ụda kpọm kpọm kpọm dị nro nke chisel a na-akpọ n’osisi.

Otu nwoke aha ya bụ Johnson anọwo na-atụ osisi na Benin City ruo afọ 20. N’ọtutụ narị afọ gara aga, isi ndị e ji osisi na ọla brass tụọ chekwara ncheta nke ndị nwụrụ anwụ; ha chọkwara ebe ịchụ àjà nke ofufe ndị nna ochie mma. Ma isi ndị Johnson na-atụ eyighị ndị ahụ e jiburu mee ihe maka nzube okpukpe. Nke ya bụ maka ịchọ mma nanị.

Johnson na-eji ebony, osisi siri ike, na-agbawa ngwa ngwa, nke dị mma maka ịtụ ihe ọ̀tụ̀tụ̀ arụ ọrụ. Ọ na-ejikarị etiti ogwe osisi eme ihe. Etiti ógwè osisi ebony Nigeria na-ejikarị oké ojii, ọ bụ ezie na osisi ụfọdụ na-enwe etiti ógwè osisi tụrụ àgwà ma ọ bụ nke na-achatatụ ntụ ntụ na ojii ojii. Ọ na-etinye ụfọdụ mkpo osisi, ma ọ bụ azụ osisi n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ; nke a na-etinye àgwà ọbara ọbara mara mma, nke na-akwalite nke ojii ahụ. Ma osisi ebony nke ọbara ọbara ma nke ojii ojii na-enyecha mgbukepụ mara mma.

Osisi ebony juru eju na Nigeria. Mgbe e gbutụrụ osisi ebony, a na-ahapụkarị ya n’ọhịa ruo ọnwa ole na ole ka ọ kpọọ akpọ. Ọbụna mgbe ogwe osisi ebony ahụ rutere n’ụlọ ọrụ ya, Johnson na-ahapụ osisi ahụ ka ọ kpọkwuo ruo ọtụtụ ọnwa karị tupu o jiri ya rụọ ọrụ. Nke a dị mkpa, ebe osisi na-akpọghị akpọ pụrụ ịgbanwe ọdịdị ma gbawaa.

Mgbe o jikeere ịtụ ihe, Johnson na-ewere mma ịwa osisi gbubita otu ibé dị ihe dị ka sentimita 40 n’ogologo. Mgbe o chesịworo otu izu ọzọ iji jide n’aka na ibé ahụ agbawaghị, Johnson na-aka osisi ahụ chọọkụ iji sepụta ọdịdị isi ọ chọrọ ịtụ, mgbe ahụzi ọ malite ọrụ.

Ná mmalite ọ na-eji chisel dị mbadamba eme ihe, e mesịa nke rọgọrọ arọgọ, e mesịakwa chisel dị nkọ karị. Mgbe nke ahụ gasịrị, ọ na-eji rasp akpụcha ya. A na-ejizi mma onye na-atụ ihe atụ ya n’ozuzu ya. Ka Johnson na-arụ ọrụ, ọ na-etinyesi uche ya ike n’osisi ahụ. Akpacharaghị anya pụrụ ịkpata inwe ihe a tụrụ atụ mmụmụ ọnụ ọchị ya na-adịghị mma ma ọ bụ otu anya na-ele ebe na-ekwesịghị ekwesị.

Mgbe a tụsịrị ihe ahụ, ụmụ ọrụ Johnson na-eji sandpaper ndị ọ̀tụ̀tụ̀ ịkwọ mụrụ mụrụ na-arịwanye elu na-akwọchasị ihe ahụ. N’ikpeazụ, ha na-ete ya pọlish osisi ma ọ bụ pọlish akpụkpọ ụkwụ ma jiri brọsh akpụkpọ ụkwụ hichaa ya iji mee ka ọ na-egbuke egbuke. Ọ na-ewe ụbọchị abụọ iji tụọ otu isi osisi dị ka nke dị n’ihe osise ndị a. Ọ na-ewe ụbọchị atọ ọzọ iji kwọchaa ma tee ya pọlish.

Mgbe a tụsịrị ihe ahụ, Johnson na-edebe ya n’akụkụ ruo ọnwa ole na ole iji jide n’aka na mgbawa ọ bụla apụtaghị. Ya bụrụ na osisi ahụ kpọrọ akpọ nke ọma tupu ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ amalite, agaghị enwe mgbawa ọ bụla. Otú ahụ ka ọ na-adịkarị. Ọ bụrụ na mgbawa ewere ọnọdụ, ihe ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ na-agaghachi n’ụlọ ọrụ maka ntechi, nkwọcha, na iteghachi ya pọlish.

Ịmụta Nkà Onye Na-atụ Ihe

Johnson nwere ụmụ ọrụ isii, na-amalite n’onye gbara afọ 10 ruo 18. Ha na-amụ ọrụ onye na-atụ ihe n’ụzọ ịla azụ, malite n’ọrụ ikpeazụ gaa ná nke mbụ. N’usoro a ihe mbụ nwa ọrụ na-amụ bụ ite pọlish. Mgbe ahụ ọ na-amụ ịkwọchasị ihe. E mesịa, a na-egosi ya ụzọ e si eji rasp arụ ọrụ. N’ikpeazụ, ụbọchị na-eru mgbe ọ ga-ewelite chisel dị mbadamba iji mee mgbupe nke mbụ ya n’otu ibé osisi ọhụrụ.

“Ọ bụghị mmadụ nile pụrụ ịbụ ndị na-atụ ihe,” ka Johnson na-ekwu. “Nke mbụ, ọ dị gị mkpa inwe nkà ebumpụta ụwa tinyere ikike itinye uche n’ihe. Ị ghaghịkwa ịmụta ụzọ ị ga-esi na-enwe ndidi n’ọganihu gị na otú ị ga-esi nagide ọdịda gị. Ịnọgidesi ike dịkwa gị mkpa, ebe ọ na-ewe ọ dịkarịa ala afọ atọ iji na-eme nke ọma n’ịtụ ihe. Ma nke ahụ abụghị njedebe ya—ịmụ ihe enweghị ọgwụgwụ. Site n’ịdị na-arụ ya mgbe mgbe, ị ga na-enwe ọganihu n’oge nile.”

[Igbe/Foto dị na peeji nke 30]

Àkị́kà na Onye Na-atụ Osisi

Ụfọdụ na-asị na nkà Africa ji àkị́kà ụgwọ. Onye na-atụ osisi na-atụ ihe, àkị́kà (site n’enyemaka ụfọdụ nke ihu igwe nke ebe okpomọkụ) na-ebibi ya, mgbe ụfọdụ n’ime ụbọchị ole na ole! N’ime ọ̀tụ̀tụ̀ narị afọ àkị́kà emewo ka onye na-atụ osisi na-enwe ọrụ. Ọ nọwo na-abụ otu usoro na-enweghị ọgwụgwụ ma n’otu mgbe ahụ nke na-akwalite ọganihu: Ahụhụ mebie, onye na-atụ ihe amaliteghachi n’isi, na-enwe ohere dị iche iche iji mee ka nkà ya ka mma ma zụlite ụdị ọhụrụ n’echiche ya.

Akwụkwọ bụ́ African Kingdoms na-ekwu, sị: “Ebu na àkị́kà dị uchu n’ọrụ wepụrụ n’ụzọ dị ukwuu ohere ọ bụla e nwere maka ọrụ ndị ka mee ochie inwe mmetụta n’ọrụ ọgbọ ndị na-esochi. N’ihi ya, tụkwasị ná mkpa na-adị mgbe mgbe maka ọrụ ọhụrụ, e nwekwara ohere ka ukwuu maka inwe ọdịiche n’ọdịdị; e nwere inyota ihe dị nnọọ ala karị, na ịdaberekarị nnọọ ná nkà na nchepụta onwe onye.”

Ụfọdụ na-asị na mmekọrịta a dị n’etiti ahụhụ na onye na-atụ osisi na-enye aka ịkọwa ime nkà magburu onwe ya nke meworo nkà Africa ihe na-ewu ewu otú a. N’akwụkwọ ya bụ́ Nigerian Images, ọkà mmụta bụ́ William Fagg na-ekwu, sị: “Ka anyị . . . jaa àkị́kà mma, nke, n’agbanyeghị otú ihe ka ukwuu n’ọrụ ya si bụrụ nke ndị mmadụ na-adịghị anabata, esorowo onye na-atụ osisi nke ebe okpomọkụ n’ọtụtụ narị afọ na narị afọ iri nwee mmekọrịta na-aga n’ihu na nke bara oké uru.”

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke Dr. Richard Bagine

[Foto ndị dị na peeji nke 29]

Ịtụ ihe:

1. ịhọrọ osisi kasị mma,

2. isepụta isi a gaje ịtụ,

3. iji chisel eme ihe, 4. nkwọchasị, 5. ite pọlish

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya