Agha Ntụte—‘Ajọ Ihe Mmegharị Anya’
SITE N’AKA ONYE NTA AKỤKỌ TETA! N’ITALI
IHE dị ka narị afọ itoolu gara aga, na 1096, Agha Ntụte Mbụ na-achọ ịmalite. A sị na i biri n’Ebe Ọdịda Anyanwụ Europe mgbe ahụ, ị gaara ahụ nnukwute ime njem nke ndị ikom, ụgbọala, ịnyịnya, na ụgbọ mmiri. Ha na-aga Jerusalem, obodo nsọ ahụ, nke nọworo n’okpuru nchịkwa ndị Alakụba eri narị afọ nke asaa O.A.
Nke ahụ bụ nke mbụ n’Agha Ntụte ndị ahụ. Ọtụtụ ndị ọkọ akụkọ ihe mere eme depụtara asatọ ndị gbara ọkpụrụkpụ. Njem ndị a tetọrọ akụkọ ihe mere eme nke mmekọrịta Ebe Ọwụwa Anyanwụ na Ọdịda Anyanwụ. Mgbuchapụ na mmekpọ ọnụ ndị e mere n’aha Chineke na Kraịst sonyeere ha. Agha Ntụte ikpeazụ gbara ọkpụrụkpụ malitere mgbe afọ 174 gasịrị, na 1270.
Okwu bụ “crusade” (agha ntụte) sitere n’okwu Latin bụ́ crux, nke pụtara “obe.” Ndị so n’ọtụtụ njem ahụ dụnyere akara obe n’uwe ha.
Ihe Ndị Kpatara Ha
Ebumnobi e kwupụtara ekwupụta maka Agha Ntụte ndị ahụ bụ iweghara Jerusalem na ihe ahụ a sị na ọ bụ ili nsọ n’aka ndị Alakụba. Ma ihe ndị kpatara ha karịrị nke ahụ. E wezụga ihe omume ole na ole, mmekọrịta dị n’etiti ndị kpọrọ onwe ha ndị Kraịst bi n’Etiti Ebe Ọwụwa Anyanwụ Ụwa na ndị Alakụba adịtụwo jụụ. Otu ihe dị mkpa nke dujere n’Agha Ntụte ndị ahụ bụ ọnọdụ oké ọgba aghara ndọrọ ndọrọ ọchịchị, akụ̀ na ụba, na okpukpe nke jupụtara na Europe.
Na narị afọ nke 11, a nọ na-eji ime obodo ndị ọhụrụ eme ihe maka ọrụ ubi, ná mgbalị ịmụba nkọpụta ihe oriri. Ógbè ndị dị n’obodo ukwu nọ na-enweta ndụ ọhụrụ. Ụba mmadụ ya nọ na-arị elu. Otú ọ dị, mgbe ụnwụ nri tinyere ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ndị nọ n’ọkwá dị ala n’ịda ogbenye, ọtụtụ nubara n’obodo ukwu dị iche iche, ebe enweghị ọrụ na nhụsianya chebiiri ha. Ime mkpesa tiwapụrụ mgbe mgbe.
Ndị nọ n’isi nke ọkwá ọha na eze bụ ọtụtụ ndị isi ala. Ndị a e ji ịlụ agha mara chọrọ iji oghere ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke ntisasị nke alaeze ukwu Charlemagne kpatara mee ihe ma lụta ala na ụlọ ndị ọhụrụ.
Chọọchị Rom nọkwa na-enwe oge oké ọgba aghara. Na 1054 o nwekwaghị ike ịchịkwa Chọọchị Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ọzọkwa, a nọ na-ebo ọtụtụ n’ime ndị ụkọchukwu ebubo ime omume rụrụ arụ na itinye aka na ndọrọ ndọrọ ọchịchị.
Arịrịọ A Rịọrọ na Clermont
N’ime ọnọdụ a Popu Urban nke Abụọ kpọrọ òkù ka e nwee Agha Ntụte Mbụ. N’echiche ya ịlụ agha iji merighachi Jerusalem na Palestine ga-emezu nzube dị iche iche. Ọ ga-ewusi ịdị n’otu nke Krisendọm Ebe Ọdịda Anyanwụ ike ma mesighachi ịkasị elu nke Chọọchị Rom ike. Ọ ga-enye ohere maka esemokwu na-adịghị agwụ agwụ n’etiti ndị nọ n’ọkwá dị elu. Iji gbanwere abamuru okpukpe na, karịsịa, nke akụ̀ na ụba, ndị a ga-eji nkà ịlụ agha ha rụọ ọrụ maka nzube “ziri ezi,” na-aghọ òtù agha nke bụ akụkụ nke chọọchị.
Na November 27, 1095, n’ihu otu kansụl na Clermont, France, Urban rịọrọ arịrịọ ya. Chọọchị ahụ nyere echiche ọjọọ banyere ndị iro ha, dị ka ndị kwesịrị ịnata nkwụghachi nke Chineke. Foucher de Chartres, onye ụkọchukwu nke keere òkè n’Agha Ntụte Mbụ ahụ, kwuru na agha ahụ dị mkpa iji chebe “ndị Kraịst” Ebe Ọwụwa Anyanwụ pụọ n’aka ndị Alakụba. E kwere nkwa mgbaghara mmehie dị ngwa maka ndị nwụrụ n’ụzọ ma ọ bụ n’ọgbọ agha. Ndị amadị ahụ pụrụ isi otú a tụgharịa ọgụ igbu nwanne dị n’etiti ha ịbụ agha “nsọ” megide “ndị na-ekweghị ekwe.” Na kansụl ahụ, e tiri mkpu dara ụda nke ga-emesịa bụrụ ụkpụrụ nduzi nke Agha Ntụte Mbụ ahụ: “Chineke zubere ya!”
Ọpụpụ Abụọ Ahụ
Ozugbo e yiri ụbọchị ọpụpụ ahụ, bụ́ August 15, 1096, popu kwere nkwa nkwado nke ndị amadị nkịtị, ndị e nyefere ihe omume agha n’aka. Chọọchị kwere nkwa ichebe ala na ụlọ ha n’ogologo oge ọrụ ahụ ga-ewe. A gbara ndị na-abachaghị ọgaranya ume iji onyinye kwadoo ozi ahụ.
Otú ọ dị, ụfọdụ pụrụ tupu ụbọchị ahụ e kwuru eruo. Nke a bụ ìgwè na-anataghị ọzụzụ, na-enweghịkwa nchịkwa ma gụnye ndị inyom na ụmụaka. A kpọrọ ha pauperes Christi (ndị ogbenye ọnụ ntụ nke Kraịst). Ebe ha na-aga: Jerusalem. Ndị na-akpasu ọgba aghara duru ha, ikekwe onye a kasị mara n’ime ha bụ Peter Onye Na-anọ Nanị Ya, onye mọnk nke malitewororị ikwu okwuchukwu n’etiti ìgwè ahụ ná ngwụsị 1095.
Dị ka onye na-edekọ ihe ndị mere mgbe ụwa na-emepechabeghị anya bụ́ Albert nke Aix si kwuo, Peter agaala Jerusalem na mbụ. E kwuru na n’otu abalị ọ hụrụ ọhụụ nke Kraịst nọ na ya gbaa ya ume ka ọ gakwuru nna ochie nke Jerusalem, onye ga-enye ya otu akwụkwọ ozi ikike ọ ga-eweghachi n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Albert kwuru na nrọ ahụ mezuru nakwa na mgbe ọ natasịrị akwụkwọ ozi ahụ, Peter jewere Rom, ebe o zutere popu. Ihe ndekọ Albert gwakọtara ihe mere eme na echiche efu, ma ihe ndị ahụ a sị bụ nrọ, ọhụụ, na akwụkwọ ozi bụ ngwá ọrụ dị ike n’idu ìgwè ahụ.
Ìgwè ahụ nke gbakọtara n’ebe Peter Onye Na-anọ Nanị Ya nọ hapụrụ Cologne n’April 20, 1096. N’enweghị ihe ndị dị mkpa maka njem oké osimiri ahụ, ndị pauperes ahụ aghaghị iji ụkwụ ma ọ bụ ụgbọala ndị mebisiworonụ mee ogologo njem ahụ ịga Ala Nsọ ahụ. N’ịchọta onwe ha n’oge na-adịchaghị anya dị ka ndị na-enweghị nri ma ọ bụ ngwá agha, n’ụzọ ha malitere ịkwakọrọ ihe ndị mmadụ bi n’ógbè ahụ, bụ́ ndị mbịarute nke ìgwè “ndị soja Kraịst” a na-enweghị nchịkwa gbagwojuru anya.
Ndị mbụ ha wakwasịrị bụ ndị Juu nke Europe, ndị e boro ebubo ịgbazinye ndị bishọp rụrụ arụ ego. Ụmụazụ Peter Onye Na-anọ Nanị Ya rụsara ndị Juu arụrụala, n’ebe ndị dị ka Rouen na Cologne, bụ́ obodo ukwu e si pụọ. Albert nke Aix na-ekwu na mgbe ndị Juu bi na Mainz “hụrụ na ndị Kraịst ahụ ahapụghị ọbụna ụmụaka ha ma ọ bụkwanụ nwee obi ebere n’ebe onye ọ bụla nọ, ha wakwasịrị ụmụnne ha ndị nwoke, ndị nwunye, ndị nne, na ụmụnne ha ndị nwanyị ma gburịta ibe ha. Ihe kasị na-agbawa obi bụ na ndị nne n’onwe ha gbubiri olu ụmụ ha na-aṅụ ara ma ọ bụ magbuo ha, na-ahọrọ ka ha nwụọ n’aka ha karịa ịbụ ndị e gburu site n’aka ndị a na-ebighị úgwù.”
E meghachiri ihe omume yiri ndị ahụ ná njem ịga mba ndị Balkan, n’ụzọ ịga Asia Minor. Ozugbo ìgwè ahụ ruru Constantinople, Eze Ukwu Alexius nke Mbụ, iji zere mmeghachi ọ bụla nke ụdị ọgba aghara ahụ, mere ka ngafere nke ndị pauperes ahụ n’ikpere mmiri Esia ka mfe. N’ebe ahụ, ndị agha Alakụba gburu ọtụtụ ndị inyom na ụmụaka tinyere ndị ọrịa na ndị agadi. Nanị mmadụ ole na ole lanarịrịnụ nwere ihe ịga nke ọma n’ịlaghachi Constantinople.
Ka ọ dị mgbe ahụ, n’oge okpomọkụ nke 1096, usuu ndị agha a zụrụ azụ buliri ije. Ndị ndú a ma ama n’oge ahụ duru ndị a. Ọpụpụ mbụ ahụ a na-achịkwaghị achịkwa nke ndị pauperes ahụ enyewo Popu Urban nchegbu, bụ́ onye mere ndokwa ịchịkwa ime njem gaa n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ndị na-aga ugbu a aghaghị igosi ụzọ isi nweta ihe nkwado zuru ezu. Nzube ya bụ iji belata ikere òkè nke ndị inyom, ụmụaka, ndị agadi, na ndị ogbenye.
Mmeri na Mgbuchapụ Ndị Ọzọ
Mgbe ha zukọtasịrị na Constantinople, ìgwè ndị agha, ndị amadị na ndị pauperes lanarịrịnụ jewere n’ebe ha na-eje. Ọzọkwa, e mere ihe ike dị iche iche n’aha Chineke. Onye na-edekọ ihe mere eme bụ́ Petrus Tudebodus na-akọ na n’oge a wakporo Antiọk, mgbe ha gbuchapụsịrị ndị iro ha, ndị agha ntụte ahụ “tụnyere ozu ha nile n’ime ili ọha ma bughachi isi ha e gbupụrụ egbupụ n’ọmụma ụlọikwuu [ha] iji mara ọnụ ọgụgụ ha, ma e wezụga ịnyịnya anọ bujuru isi mmadụ, ndị ha zijere n’ụsọ oké osimiri, nye ndị nnọchianya nke eze Babilọn.”
Na July 15, 1099, Jerusalem dara n’aka ndị agha ntụte ahụ. Raymond nke Aguilers na-akọ, sị: “A pụrụ ịhụ ọnọdụ na-atụ ụjọ. E gbupụwo isi ụfọdụ [n’ime ndị iro ahụ], ndị ọ dabaara; ndị ọzọ siri ná mgbidi daa, e jikwa akụ́ gbajasịa ha ahụ; ọkụ gbara ọtụtụ. A pụrụ ịhụ ikpo nke isi, aka, na ụkwụ e gbupụrụ egbupụ n’ámá nile nke obodo ukwu ahụ.” Ma ọzọkwa, ndị agha ntụte ahụ gbalịrị ịgọpụ ime ihe ike ahụ n’aha okpukpe.
Njedebe nke Ihe Mmegharị Anya
Mmeri ahụ dujere n’ikepụta Alaeze Jerusalem nke Latin. Ihe a e kepụtara akwụsighị ike n’ihi mmarịta aka nke malitere n’oge na-adịghị anya n’etiti ndị amadị ahụ bụ́ ndị gbaworo mkpọrọgwụ n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ. Ka ọ dị mgbe ahụ, ndị Alakụba hazigharịrị onwe ha maka ọgụ. Ọ bụghị uche ha ma ọlị ka a napụ ha ókèala na Palestine.
Ka oge na-aga, a haziri Agha Ntụte ndị ọzọ, nke ikpeazụ na 1270. Otú ọ dị, n’ihi mmeri dị iche iche, ọtụtụ ndị malitere inwe obi abụọ n’izi ezi nke ihe omume ndị dị otú ahụ e tinyere isi na ha n’aha okpukpe. Ọ bụrụ n’ezie na Chineke nwapụtara agha “nsọ” ndị a, ka ha chere, n’ezie ọ gaara egosi ndị ahụ zọọrọ iji ngọzi ya na-eme ihe ihu ọma. Ma, malite na narị afọ nke 13 gaa n’ihu, ndị ọkàiwu nke chọọchị gbalịrị ịgọpụ agha okpukpe ndị dị otú ahụ na òkè ndị ụkọchukwu keere na ha.
Ịnụ ọkụ n’obi nke kpaliri ndị agha ntụte mbụ ahụ dalatara. N’ụzọ bụ isi, mee elu mee ala agha ndị ahụ ịga n’ihu ga-emebi ọdịmma akụ̀ na ụba nke Ebe Ọdịda Anyanwụ. Ya mere ha malitere ịlụso ndị iro nọ n’ime nke Krisendọm nke Europe agha: ndị Arab nọ na Spain, “ndị jụrụ okwukwe,” na ndị na-ekpere arụsị nke Ebe Ugwu.
Na 1291 obodo ukwu bụ́ Acre, ebe e wusiri ike ikpeazụ nke agha ntụte, dara n’aka ndị Alakụba. Jerusalem na ‘Ili Nsọ’ ahụ nọgidere n’aka ndị Alakụba. Na narị afọ abụọ nke esemokwu, mmasị akụ̀ na ụba na nke ndọrọ ndọrọ ọchịchị achịkwawo okwu okpukpe. Onye Itali na-akọ akụkọ ihe mere eme bụ́ Franco Cardini na-ekwu, sị: “N’oge a Agha Ntụte ndị ahụ aghọwo ihe omume ndọrọ ndọrọ ọchịchị na nke akụ̀ na ụba siri ike nghọta, ịzọrịta ike dị mgbagwoju anya n’etiti ndị bishọp, ndị abbot, ndị eze, ndị na-anakọta onyinye, ndị ụlọ akụ̀. Ná mmarịta aka a . . . ọ bụ ili Jisọs ka ịdị mkpa ya nile funyụrụ anya.” Cardini sịkwara: “Akụkọ ihe mere eme nke Agha Ntụte ndị ahụ bụ akụkọ ihe mere eme nke ihie ụzọ kasịnụ, aghụghọ kasị dị mgbagwoju anya, ihe mmegharị anya kasị njọ nke Krisendọm nile, nakwa n’ụzọ ụfọdụ nke a kasị kwaa emo.”
Ihe Mmụta E Leghaara Anya
Agha Ntụte ndị ahụ na ọdịda ha kwesịrị ịkụziworị na anyaukwu nke akụ̀ na ụba na agụụ ịbụ onye a ma ama n’ọchịchị pụrụ iduje n’ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè na mgbuchapụ. Ma e legharawo ihe mmụta ahụ anya. Ihe na-agba akaebe ya bụ ọtụtụ esemokwu ndị nọgideworo jiri ọbara na-etetọ ọtụtụ akụkụ nke mbara ala anyị. N’ime ndị a, okpukpe na-ejekarị ozi dị ka ihe mkpuchi maka arụrụala dị iche iche.
Ma ọ gaghị adịte anya. N’oge na-adịchaghịkwa anya mmụọ ahụ nke kpaliri Agha Ntụte ndị ahụ, nke nọgidekwara na-akwali agha “nsọ” ndị nke oge a ga-agabiga ya na okpukpe ụgha nile na usoro ihe nile nọ n’okpuru ọchịchị Setan.—Abụ Ọma 46:8, 9; 1 Jọn 5:19; Mkpughe 18:4, 5, 24.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]
The Complete Encyclopedia of Illustration/J. G. Heck
[Foto ndị dị na peeji nke 15]
N’elu: Ebe ili ozu ndị Juu na Worms, Germany—ihe ncheta nke mgbuchapụ n’Agha Ntụte Mbụ ahụ
N’aka ekpe: Isi e ji nkume tụọ nke onye agha ntụte
N’isi isi aka ekpe: Akara nke ezinụlọ otu onye agha ntụte a ma ama
[Ebe E Si Nweta Foto]
Akara na isi: Israel Antiquities Authority; foto: Israel Museum, Jerusalem