Ịzọ Otu Ebe “Nsọ”
NA July 15, 1099, Agha Ntụte Mbụ, bụ́ nke popu Rom nyere ikike ya, mezuru nzube ya nke iweghara Jerusalem. Ogbugbu ahụ na-eyi egwu! Nanị ndị bi ebe ahụ lanarịrịnụ bụ gọvanọ na onye na-eche ya nche, mgbe e nyesịrị aka azụ buru ibu. N’akwụkwọ ya bụ́ The Crusades, ụkọchukwu bụ́ Antony Bridge kọrọ banyere ihe mere ndị Alakụba na ndị Juu fọdụrụnụ bụ́ ndị bi n’ebe ahụ: “Ozugbo e nyere Ndị Agha Ntụte ahụ ohere ịbanye n’obodo ahụ, ha mejuru oké ọchịchị nke ịwụfu ọbara dị egwu. . . . Ha gburu nwoke, nwanyị, na nwatakịrị ọ bụla ha hụrụ n’obodo ahụ . . . Mgbe ọ na-adịghịzi onye ọzọ ha ga-egbu, ndị ahụ meririnụ kwụrụ n’ahịrị gafere okporo ámá obodo ahụ . . . gaa na Chọọchị nke Ili ahụ Dị Nsọ ịga kelee Chineke.”
Eri ndị agha ntụte ahụ merisịrị, ihe kara ọnụnọ Krisendọm nọ na Jerusalem akara abụrụwo esemokwu dị n’etiti Roman Katọlik, Ọtọdọks Ebe Ọwụwa Anyanwụ, na okpukpe ndị ọzọ a sị na ha bụ nke ndị Kraịst. Na 1850 otu esemokwu e nwere n’etiti ndị ndú chọọchị dị iche iche n’ihi ebe nsọ ndị dị na Jerusalem na gburugburu ha bụ isi ihe kpatara Agha Crimea. England, France, na obodo Ottoman lụsoro Russia agha, na-egbu ọkara nde mmadụ.
Agha ahụ akwụsịghị esemokwu Krisendọm na-enwe n’ihi Jerusalem na ebe nsọ ya dị iche iche. Ndị Ottoman, bụ́ ndị na-achị mba ahụ n’oge ahụ, gbalịrị iweta udo site n’ikewa ebe nsọ ndị ahụ n’etiti okpukpe dị iche iche. Dr. Menashe Har-el na-akọwa n’akwụkwọ ya bụ́ This Is Jerusalem, na “Mba Ndị Dị n’Otu ji Mkpebi Banyere Nkewa ahụ nke November 1947 . . . nakwere ụkpụrụ a. N’ihi ya ọ bụ akụkụ nke iwu mba nile.” N’ihi ya, ekewawo Chọọchị nke Ili ahụ Dị Nsọ n’etiti ndị Roman Katọlik, Grik Ọtọdọks, ndị Armenia, ndị Siria, na ndị Copt. N’ikpeazụ, ndị Etiopia na-egosipụta na ha so nwere chọọchị a site n’ime ka ụfọdụ ndị òtù ha biri n’obere ụlọ ndị dị n’elu ụlọ chọọchị ahụ. Ọtụtụ ndị na-ele Chọọchị nke Ili ahụ Dị Nsọ anya dị ka ebe kasị nsọ nke Krisendọm. O jupụtara n’òkwù arụsị, onyinyo, na ihe oyiyi. Ndị Protestant ụfọdụ na-asọpụrụ ebe ọzọ a sị na ọ bụ ebe nsọ, bụ́ Gordon’s Calvary, dị ka ebe e weere na ọ bụ ebe e gburu ma lie Jisọs.
N’ogologo oge gara aga Jisọs gwara otu nwanyị kwere n’ebe ndị dị nsọ, sị: “Oge awa na-abịa, mgbe unu na-agaghị akpọ isi ala nye Nna m, ma ọ bụ n’ugwu a, ma ọ̀ bụ na Jerusalem. . . . Ndị na-akpọ isi ala n’ezie ga-akpọ isi ala nye Nna m n’ime mmụọ na eziokwu.” (Jọn 4:21-24) Ya mere, ezi ndị Kraịst adịghị asọpụrụ ebe ndị dị nsọ. Mbibi usuu ndị agha Rom bibiri Jerusalem na-ekwesịghị ntụkwasị obi na 70 O.A. bụ ihe ịdọ aka ná ntị nye Krisendọm. Ikpere arụsị, nkewa, na ikpe ọbara mara ya na-emegide nzọrọ ọ na-azọrọ ịbụ nke Kraịst. Ya mere, ọ ga-enweta ọdachi ahụ Chineke buworo n’amụma maka okpukpe nile mejupụtara Babilọn Ukwu ahụ.—Mkpughe 18:2-8.