Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g97 11/8 p. 13
  • Agha Na-ata Isi Ndị Na-eto Eto

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Agha Na-ata Isi Ndị Na-eto Eto
  • Teta!—1997
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọdịdị nke Agha Agbanweela
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2004
  • Mgbanwe ná Ndị Na-anwụ n’Agha
    Teta!—2000
  • Ọdịnihu Mara Mma Maka Ụmụ Anyị
    Teta!—1997
  • Agha Hà Bụ Ihe A Na-apụghị Izere Ezere?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1994
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1997
g97 11/8 p. 13

Agha Na-ata Isi Ndị Na-eto Eto

OGE ịbụ nwata kwesịrị ịbụ oge obi ụtọ. Oge ịbụ onye a hụrụ n’anya, inweta nchebe. Oge amaghị ihe ọjọọ. A tụrụ anya ndị na-eto eto igwuri egwu, ịmụta ihe, na ịzụlite àgwà ndị ga-enyere ha aka ịghọ ndị toro eto maara ihe. Ụmụaka ekwesịghị ogbugbu, ha ekwesịtụghịkwa ịghọ ndị na-egbu mmadụ. Otú ọ dị, n’oge agha, ọtụtụ ihe ndị na-ekwesịghị ime na-eme.

N’ụzọ dị mwute, agha jupụtara n’ụwa nile, ọ na-atakwa isi ndị na-eto eto, na-ala ma ụmụaka ma oge ịbụ nwata n’iyi. Na 1993, a lụrụ oké ọgụ ná mba 42, ebe ime ihe ike ndọrọ ndọrọ ọchịchị tiwapụrụ na 37 ọzọ. Ụmụaka bikwa na nke ọ bụla n’ime mba 79 ndị a.

Ọtụtụ ndị na-eto eto taa amatụbeghị ihe a na-akpọ udo. Ka ọ na-erule ngwụsị 1995, agha agawo n’ihu n’Angola ruo ihe karịrị afọ 30, n’Afghanistan ruo afọ 17, na Sri Lanka ruo afọ 11, nakwa na Somalia ruo afọ 7. Site n’otu ebe ruo ebe ọzọ, ndị ọchịchị ji obi ike kwuo okwu banyere “atụmatụ ime udo,” ma atụmatụ ibu agha na-adịghị ebi ebi nọgidere na-ebibi ndụ ụmụ mmadụ.

Agha emerụwo ụmụaka ahụ mgbe nile, ma ọdịdị na-agbanwe agbanwe nke agha n’oge ndị a akpatawo ịrị elu ná ndị nkịtị na-anwụnụ, gụnyere ụmụaka. N’oge ọgụ nke narị afọ nke 18 na 19 nakwa n’akụkụ mmalite nke narị afọ a, ihe dị ka ọkara ndị nwụrụ n’agha bụ ndị nkịtị. N’Agha Ụwa nke Abụọ, nke a lụrụ malite na 1939 ruo 1945, ndị nkịtị nwụrụnụ rịrị elu ruo ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ndị nwụrụ n’agha ahụ, n’akụkụ ụfọdụ n’ihi oké bọmbụ a tụrụ n’obodo ukwu dị iche iche.

Ka ọ na-erule ngwụsị afọ ndị 1980, ndị nkịtị nwụrụ n’agha arịwo elu ruo ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 90 pasent! Otu ihe kpatara nke a bụ na agha adịwo mgbagwoju anya karị. Ndị agha adịkwaghị ezute onwe ha ihu na ihu nanị n’ọgbọ agha. Ihe ka ọtụtụ n’ọgụ nke taa abụghị n’agbata mba na mba, kama n’ime ha. Ọzọkwa, ọgụ na-ewere ọnọdụ n’ime obodo ma ọ bụ obodo ukwu dị iche iche, n’ebe ahụkwa, n’etiti obi ọjọọ na inyo mmadụ enyo, ndị na-egbu mmadụ amakebeghị ọdịiche dị n’etiti ndị iro na ndị aka ha dị ọcha guzo n’akụkụ.

Ihe o meworo ụmụaka adịwo njọ nke ukwuu. A na-eme atụmatụ na nanị n’ime afọ iri gara aga, dị ka Òtù Maka Ụmụaka nke Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, agha egbuwo nde ụmụaka abụọ, menyekwa nde anọ ruo nde ise ndị ọzọ ọrụsị. Agha anapụwo otu nde ụmụaka nne na nna, hapụkwa nde 12 n’ọnọdụ enweghị ebe obibi. N’ihi agha, ihe dị ka nde ụmụaka iri bụ ndị uche ha na-ezukwaghị ezu.

Ọbá akwụkwọ dị iche iche jupụtara n’akwụkwọ banyere agha. Ndị a na-akọ ụzọ e si na ihe mere e ji lụọ agha; ha na-akọwa ngwá agha na atụmatụ ndị e ji mee ihe; ha na-echeta ọchịagha ndị duziri oké mgbupịa ahụ. Ihe nkiri na-eme ka mkpali nke agha pụta ìhè ma na-eme ka nhụjuanya ya yie ihe nta. Akwụkwọ na ihe nkiri ndị dị otú ahụ adịghị ekwukebe okwu banyere ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ. Isiokwu ndị na-esonụ na-elenye anya n’ụzọ e siworo jiri aghụghọ mee ụmụaka ndị agha, ụzọ ha siworo bụrụ ndị kasị nọrọ n’ihe ize ndụ n’ime ndị nile na-anwụnụ, na ihe mere anyị ji ekwu na ụmụaka oge a pụrụ ịnụ ụtọ ọdịnihu mara mma n’ezie.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya