Agha Hà Bụ Ihe A Na-apụghị Izere Ezere?
AGHA bụ ihe na-egbu mmụọ na-apụta n’akụkọ. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ihe akụkọ ndị ahụ nke mmekpọ ọnụ na-awụ gị akpata oyi. Ma ma eleghị anya, ha na-emekwa ka ị jụọ ihe mere ngwá agha na-aghaghị iji bụrụ ihe e ji edozi ọtụtụ esemokwu. Ọ̀ bụ na ụmụ mmadụ adịghị mgbe ha ga-amụta ibi n’udo?
Ihe ngwọta maka ihe otiti nke agha yiri ihe a na-apụghị inweta enweta karịa ihe ngwọta maka ọrịa AIDS. N’ime narị afọ nke 20, a kwadebewo mba dum maka agha, a tụbanyewo ọtụtụ nde mmadụ n’ọgbọ agha, e tikpọsịwokwa ọtụtụ narị obodo ukwu. E nweghị olileanya ọ bụla maka ọgwụgwụ nke oké igbu ọchụ ahụ. Azụmahịa ngwá agha na-enye ego na-eme ka e jide n’aka na ndị agha nile nke ụwa—na ndị agha okpuru—ga-anọgide na-akpa ike ọjọọ.
Ka ngwá agha na-aghọ ndị na-akpata ọnwụ karị, ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ na-arị elu ọjị. Ihe karịrị ọkara nke 65 nde ndị soja lụrụ ọgụ n’Agha Ụwa Mbụ bụ ndị e gburu ma ọ bụ merụọ ahụ. Ihe dị ka 30 afọ mgbe nke ahụ gasịrị, nanị bọmbụ atọm abụọ napụrụ ihe karịrị 150,000 mmadụ ndị nkịtị bụ́ ndị Japan ndụ ha. Eri Agha Ụwa nke Abụọ, esemokwu dị iche iche abụrụwo ndị na-emekarị n’ógbè dị iche iche. Ka o sina dị, ha na-eweta ọnwụ, karịsịa nye ndị nkịtị, bụ́ ndị na-emejupụta ugbu a 80 pasent nke ndị a na-egbu.
N’ụzọ na-agba gharịị, oké mgbukpọ nke a ewerewo ọnọdụ n’ọgbọ nke hụworo mgbalị na-enweghị atụ iji machibido agha iwu dị ka ụzọ isi na-edozi esemokwu n’etiti mba dị iche iche. Site ná ngwụsị na-adịbeghị anya nke Agha Nzuzo ahụ, olileanya rịrị elu na ndokwa ụwa ọhụrụ nke dị n’udo ga-apụta. Otú ọ dị, udo ụwa dum ka bụkwa nrọ efu dị ka n’oge ọzọ nile. N’ihi gịnị?
Ọ̀ Bụ Ihe Dị Mkpa Maka Usoro Ndụ?
Ụfọdụ ndị na-akọ akụkọ ihe mere eme na ndị ọkà ná mmụta nhazi ụmụ mmadụ na-azọrọ na agha bụ ihe a na-apụghị izere ezere—ọbụna nke dị mkpa—nanị n’ihi na ha bụ akụkụ nke usoro ịgba mgba maka nlanarị. N’ịbụ onye echiche dị otú ahụ kwaliri, onye na-eme ntụle banyere agha bụ́ Friedrich von Bernhardi rụrụ ụka n’afọ 1914 na a na-alụ agha “n’ihi ọdịmma nke ọganihu usoro ndụ, ọha na eze, na omume.” Nchepụta ahụ bụ na agha bụ otu ụzọ isi kpochapụ ndị ma ọ bụ mba ndị na-adịghị ike, ma na-ahapụ ndị kasị ike.
Arụmụka dị otú ahụ agaghị akasi ọtụtụ nde ndị agha mere ndị inyom di ha nwụrụ na ụmụ mgbei obi ma ọlị. E wezụga ịbụ ihe na-asọ oyi n’ụzọ omume, echiche nke a na-eleghara ihe obi ọjọọ mburịta agha ọgbara ọhụrụ na-akpata anya. Égbè ukwu na-awụpụ mgbọ adịghị asọ ndị ka ike anya, bọmbụ na-ekpochapụkwa ma ndị dị ike ma ndị na-adịghị ike.
N’ileghara ihe ndị na-emetụ n’obi Agha Ụwa Mbụ kụziri anya, Adolf Hitler rọrọ nrọ ihiwe agbụrụ ọkaibe site ná mmeri n’agha. N’akwụkwọ ya bụ́ Mein Kampf, o dere: “Ihe a kpọrọ mmadụ abụwo dike n’ịgba mgba na-adịghị agwụ agwụ, ọ bụkwa nanị n’udo na-adịgide adịgide ka ọ na-ala n’iyi. . . . Ndị ka ike aghaghị ịchị, ha agaghịkwa ejikọta onwe ha n’etiti ndị na-adịchaghị ike.” Ma, kama ibuli ihe a kpọrọ mmadụ elu, Hitler chụrụ ọtụtụ nde ndụ mmadụ n’àjà, tikpọsịakwa otu kọntinent dum.
Ma, ọ bụrụ na agha abụghị ihe dị mkpa maka usoro ndụ, gịnị na-akwali ihe a kpọrọ mmadụ gaa n’ibibi onwe ya? Ikike ndị dị aṅaa na-achịkọrọ mba dị iche iche banye n’ime “azụmahịa ndị arụrụala”?a Ihe na-esonụ bụ ndepụta nke ihe ụfọdụ bụ isi na-egbochi mgbalị ndị kasị mma nke ndị na-eme udo.
Ihe Ndị Na-akpata Agha
Ịhụ mba n’anya. N’ịbụ ihe ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na ndị ọchịagha na-akpalikarị, ịhụ mba n’anya bụ otu n’ime ikike ndị kasị ike n’ịkwalite ibu agha. A malitewo ọtụtụ agha iji chebe “ọdịmma mba” ma ọ bụ ịgbachitere “nsọpụrụ nke mba.” Mgbe echiche nke ịkwado mba m ma ọ dị mma ma ọ dị njọ na-achị, ọbụna ịchọ okwu doro anya bụ nke a pụrụ ịkọwa dị ka ịwakpo onye iro ná mberede.
Ibu iro megide agbụrụ. A na-akpali ọtụtụ agha ógbè, na-akwanyekwa ha ọkụ site ná mkpọrọmasị dịteworo anya n’etiti agbụrụ na ebo dị iche iche. Agha obodo ndị na-eweta ọdachi n’ebe bụbu Yugoslavia, na Liberia, nakwa na Somalia bụ ihe atụ ndị e nwere n’oge a.
Ịmarịta aka akụ na ụba na nkwadebe agha. N’ụbọchị ndị o yiri ka e nwere udo tupu Agha Ụwa Mbụ, ndị ike ọchịchị Europe n’ezie wulitere nnukwute ìgwè ndị agha. Germany na Great Britain nọ n’ịsọ mpi nke iwu ụgbọ mmiri agha. Ebe mba nke ọ bụla bụ isi nke mesịrị tinye aka n’oké mgbupịa ahụ kwenyere na agha ga-eme ka ike ya ka ukwuu ma weta ọtụtụ uru akụ na ụba, ọnọdụ ruru eru maka ịlụ ọgụ.
Esemokwu okpukpe. Karịsịa mgbe nkewa nke agbụrụ mere ka ọ ka njọ, ọdịiche okpukpe pụrụ ịkpata ngwakọta na-agbọwa agbọwa. Ọgụ ndị a na-alụ na Lebanọn na Ebe Ugwu Ireland, nakwa agha ndị dị n’etiti India na Pakistan, agbawo mkpọrọgwụ n’esemokwu okpukpe.
Otu onye agha na-egbu ka mmanya nke a na-adịghị ahụ anya. Bible na-ekpughe na “chi nke oge a,” Setan Ekwensu, na-arụsi ọrụ ike ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ebe oké iwe jupụtara ya n’obi, o nweekwa nanị “nwa oge,” ọ na-akpalite ọnọdụ ndị, gụnyere agha, na-eme ka ọnọdụ dị mwute nke ụwa kawanye njọ.—Mkpughe 12:12.
Isi ihe ndị a na-akpata agha adịghị mfe ikpochapụ. N’ihe karịrị 2,000 afọ gara aga, Plato sịrị na “nanị ndị nwụrụ anwụ hụworo ngwụsị nke agha.” Ọ̀tụ̀tụ̀ ya nke olileanya na-adịghị ya ọ̀ bụ eziokwu dị ilu anyị na-aghaghị ịnakwere? Ka ànyị nwere ihe mere anyị ga-eji lee anya na n’otu ụbọchị a ga-enwe ụwa nke agha na-adịghị na ya?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Ọ bụ Napoléon kọwara agha dị ka “azụmahịa ndị arụrụala.” Ebe ọ nọworo ihe ka ná ndụ ya dị ka onye toruru ogo mmadụ n’ọrụ agha na ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ 20 afọ dị ka ọchịagha kasị elu, o ji anya ya hụ arụrụala dị iche iche nke ịlụ ọgụ.
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 2]
Peji ihu: Ihe osise John Singer Sargent bụ́ Gassed (nkọwa zuru ezu), Imperial War Museum, London
[Ebe e si nweta foto dị na peeji 3]
Instituto Municipal de Historia, Barcelona