Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g98 1/8 p. 30-31
  • Ikiri Ụwa

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ikiri Ụwa
  • Teta!—1998
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Aṅụrụma na Mexico
  • Aro Maka Ndị Njem Ụgbọelu
  • Ụgbala Tokyo Na-eme Njem
  • E Yie Akụ̀ Si n’Okike Egwu
  • Meri Ọ̀ Bụ Onye Mbụ Hụrụ Kraịst ahụ Si n’Ọnwụ Bilie?
  • Ihe Ize Ndụ Oge Okpomọkụ n’Ebe Ndịda
  • “Ịta Ahụhụ” n’Ọrụ
  • Ịdọ Aka ná Ntị Oge Oyi
  • Ụdị Ihe Ndị Nọ n’Ihe Ize Ndụ—Ọ̀tụ̀tụ̀ nke Nsogbu Ahụ
    Teta!—1996
  • Mmadụ Ọ̀ Na-ebibi Ebe O Si Enweta Ihe Oriri?
    Teta!—2001
  • Mmetụta Ịṅụ Mmanya Na-aba n’Anya n’Ụzọ Na-adịghị Mma Na-enwe n’Ahụ́
    Teta!—2005
  • Nchekwa Megide Mkpochapụ
    Teta!—1996
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—1998
g98 1/8 p. 30-31

Ikiri Ụwa

Aṅụrụma na Mexico

Ihe ọmụmụ nke Ụlọ Ọrụ Nchebe Mmekọrịta Ọha na Eze nke Mexico duziri gosiri na e nwere ihe karịrị nde ndị aṅụrụma anọ na Mexico na 1991. Ma ka ọ na-erule 1997, ọnụ ọgụgụ ahụ pụrụ ịmụbaworị okpukpu abụọ, ka akwụkwọ akụkọ Mexico City bụ́ El Universal na-akọ. Ọ na-ehota òtù Alcoholics Anonymous dị ka nke na-asị na n’ime nde ndị aṅụrụma asatọ na Mexico, a na-achọta nde atọ na Mexico City. Dị ka El Universal si kwuo, ihe ka ukwuu na mpụ a na-eme na Mexico bụ ndị a na-eme n’okpuru mmetụta nke mmanya na-aba n’anya. Iji mmanya na-aba n’anya eme ihe n’ụzọ na-ezighị ezi na-arụpụta ịgha ọrụ na emeghị nke ọma n’ụlọ akwụkwọ. José Manuel Castrejón, onye nnọchiteanya nke Kansụl Mba Megide Ihe Iri Ahụ, na-ekwu na “e jikọtara 50 pasent nke ime ihe ike n’ezinụlọ na otu ụzọ n’ime ụzọ ise nke ihe ọghọm n’ọrụ n’ụzọ chiri anya n’iji mmanya na-aba n’anya eme ihe.”

Aro Maka Ndị Njem Ụgbọelu

Iji ụgbọelu mee ogologo njem na-etinye nrụgide n’uche na n’ahụ, akwụkwọ akụkọ London bụ́ The Times na-atụkwa aro ụfọdụ maka ahụ efe. Ndị a na-agụnye “izere mmanya na-aba n’anya ma na-aṅụ nnukwu mmanya ọtọ bịrịbịrị, iri nanị nri na-agbari ngwa ngwa na iji uche hụ onwe gị n’ebe mara mma.” Ịnọ ọdụ otu ebe ruo ogologo oge pụrụ ịkpata ụkwụ ịza aza, ọ pụkwara ime ka uwe na-akpa akpa karị. N’ihi ya, ka The Times na-akọ, “ndị dọkịta na-atụ aro ịkpọghesị uwe, iyipụ akpụkpọ ụkwụ na ikwu ka e nye gị oche nọpụtara n’ụzọ nkebi ka i nwee ike ịdị na-agaru n’ụlọ mposi.” Ịgbatị ogwe aka na ụkwụ gị n’oge njem ahụ na-enye aka igbochi nsogbu nrugharị ọbara. Iji merie ike ọgwụgwụ ụgbọelu, “mgbe ụfọdụ ndị bụ aka ochie n’ime njem na-agbanwe usoro ihe omume kwa ụbọchị ha tupu oge njem ha eruo. Ndị na-eje ebe ọwụwa anyanwụ na-ebili ngwa ngwa karị ruo otu izu, ndị na-ejekwa ọdịda anyanwụ na-alakpu ụra n’azụ oge.”

Ụgbala Tokyo Na-eme Njem

Ụgbala ndị dị na Tokyo, Japan, amalitewo àgwà nke ime njem site n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ gaa n’obodo ukwu kwa ụbọchị, ka The Daily Yomiuri na-akọ. Ndị ọkachamara banyere nnụnụ na-ekwu na nke a malitere afọ ole na ole gara aga mgbe ọnụ ọgụgụ ụgbala ndị bi n’ogige ntụrụndụ na n’ogige ụlọ nsọ nke Tokyo mụbara nke ukwuu nke na a manyere ụgbala iwu akwụ́ ebe ọzọ. Ọ bụ mgbe ahụ ka ha chọpụtara ntụsara ahụ nke ndụ ógbè dịpụrụ adịpụ. Ma otu ihe na-efunahụ ha bụ nri na-adọrọ adọrọ nke obodo ukwu—ihe mkpofu na nri fọrọ afọ a tụfuru atụfu. Ha meriri nsogbu a site n’imepụta “usoro ime njem nke yiri nke ndị ọrụ a na-akwụ ụgwọ. Ha na-efega n’ógbè ndị mepere emepe n’ụtụtụ ije chọọ nri,” ka The Daily Yomiuri na-ekwu, “e mesịa laghachi n’ógbè ndị dịpụrụ adịpụ ná mgbede.”

E Yie Akụ̀ Si n’Okike Egwu

◆ Ógbè ebe ugwu ọwụwa anyanwụ nke India, nke jupụtara n’ihe ọkụkụ na anụmanụ, na-edepụta ugbu a ụdị ihe ọkụkụ 650 na ụdị anụmanụ 70 dị ka ndị nọ n’ihe ize ndụ. A chọpụtawo usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha nke dị mfe mbibi na steeti Meghalaya, n’ókèala ya na Bangladesh, dị ka otu n’ime ‘ebe 18 chọrọ ime ihe ozugbo’ bụ́ ebe ihe ndị dị ndụ nọ n’ihe ize ndụ. Dị ka a kọrọ na The Asian Age, tụkwasị n’ihe ndị ọzọ, usoro njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha abụrụwo nke mbibi na ịgba nta nke ndị mmadụ kpara aka ọjọọ. A na-agụ ihe ndị dịgasị ndụ dị na steeti asaa nke ebe ugwu ọwụwa anyanwụ India dị ka ndị dị mfe mbibi ma dị mfe mmetụta n’ụzọ njikọ nke ihe ndị dị ndụ na gburugburu ha karịa akụkụ ndị ọzọ nke mba ahụ.

◆ N’Itali, ọnụ ọgụgụ nke ụdị ihe ọkụkụ a na-eyi egwu na-arịkwa elu. Na 1992, e weere 458 dị ka ndị nọ n’ihe ize ndụ, ma ka ọ na-erule 1997, ọnụ ọgụgụ ahụ arịwo elu ruo 1,011. “Ihe dị ka otu ụzọ n’ime ụzọ asaa nke ihe dị iche iche mejupụtara ihe ọkụkụ Itali nwere ụzọ ha si nọrọ n’ihe ize ndụ, ihe rukwara ụdị 29 aghọwo ihe na-adịghị adị n’afọ ole na ole gara aga,” ka Corriere della Sera na-akọwa. Ihe karịrị ụdị 120 “nọ n’oké ihe ize ndụ nke mkpochapụ n’ọdịnihu dị nso,” ihe fọkwara nke nta ka o ruo 150 pụrụ iche ihe ize ndụ ahụ ihu n’ọdịnihu dị nso. N’echiche ọkà mmụta ihe ọkụkụ bụ́ Franco Pedrotti, nke Mahadum nke Camerino, “ọnụ ọgụgụ ndị a na-ekpughe ọnọdụ na-atụ ụjọ.” Otu ihe ọkụkụ ghọrọ nke na-adịkwaghị n’ebe ọ na-adị site n’okike mgbe a tụgharịrị nanị ebe ọ na-eto na ya ịghọ ebe a na-agba bọl.

◆ N’Argentina 500 n’ime ụdị anụmanụ 2,500 ndị sitere ebe ahụ nọ n’ihe ize ndụ, ka akwụkwọ akụkọ Buenos Aires bụ́ Clarín na-akọ. “Ọ bụ ezie na ichekwa ihe ndị dị ndụ bụ ụzọ isi jide ọdịmma nke ugbu a na nke ọdịnihu nke ndị mmadụ n’aka, ọtụtụ anụmanụ nọ n’ihe ize ndụ nke ịpụ n’anya,” dị ka Claudio Bertonatti, onye nhazi nke ngalaba nchekwa nke Òtù Na-ahụ Maka Anụ Ọhịa, si kwuo. N’ime anụmanụ ndị nọ n’ihe ize ndụ n’Argentina, e nwere ụdị armadillo, jaguar, vicuña, azụ̀ whale, na mbe dị iche iche. “N’agbanyeghị [eziokwu ahụ] bụ na a machibidoro ire ha iwu,” ka akụkọ ahụ na-arịba ama, n’ihe ka ukwuu na Buenos Aires “a na-ere ihe dị ka mbe 100,000 kwa afọ.” Bertonatti kwuru, sị: “Mmadụ, nke kwesịrị ịbụ onye bụ́ isi nwere mmasị n’ichebe ebe a e si enweta akụ̀ na ụba, bụ ya na-akpata ihe ka ukwuu n’ime ihe iyi egwu nke na-eme ka ọtụtụ ụdị fọ nke nta ka e kpochapụ ha.”

Meri Ọ̀ Bụ Onye Mbụ Hụrụ Kraịst ahụ Si n’Ọnwụ Bilie?

Popu John Paul nke Abụọ ekwuwo na “o ziri ezi iche na Nne [Jisọs, bụ́ Meri] bụ ma eleghị anya onye mbụ Jisọs ahụ si n’ọnwụ bilie gosiri onwe ya.” (L’Osservatore Romano) Ọ dịghị nke ọ bụla n’ime ihe ndekọ Oziọma anọ ahụ kwuru na nne Jisọs nọ ya mgbe a hụrụ na ili ya tọgbọ chakoo. Otú ọ dị, popu ahụ kwukwara, sị: “Olee otú Nwanyị Na-amaghị Nwoke A Gọziri Agọzi, so n’ìgwè ndị na-eso ụzọ mbụ ahụ (cf. Ọrụ 1:14), ga-esi bụrụ onye a gụpụrụ ná ndị zutere Ọkpara ya dị nsọ mgbe o siworo n’ọnwụ bilie?” Popu ahụ jiri arụmụka dị iche iche nwaa ịkọwa ihe mere o ji bụrụ na e nweghị ihe ndekọ n’Oziọma ndị ahụ banyere nzute ọ bụla n’etiti Jisọs na nne ya. Nke bụ eziokwu bụ na mmụọ nsọ akpalighị ndị dere Oziọma ndị ahụ ikwute banyere ihe dị otú ahụ. A kpọtụghịkwa ya aha n’akwụkwọ ozi nke ndị ozi.—2 Timoti 3:16.

Ihe Ize Ndụ Oge Okpomọkụ n’Ebe Ndịda

N’Ebe Ndịda Ụwa, January bụ otu n’ime ọnwa kasị ekpo ọkụ. Mgbe okpomọkụ na-eme ọ dị mkpa ichebe onwe onye megide ọrịa oké okpomọkụ, ka magazin FDA Consumer na-akọwa. Ọ bụ ezie na ọrịa oké okpomọkụ na-akpata ọtụtụ narị ọnwụ kwa afọ, a pụrụ igbochicha ya, ka ọkà mmụta mmiri ọgwụ ahụ bụ́ Dr. Elizabeth Koller na-ekwu. Ọrịa oké okpomọkụ pụrụ iwere ọnọdụ n’ihi ndọlị n’okpomọkụ, ma ọ na-adakwasịkwa ndị toworo eto ka mee okenye bụ́ ndị na-enweghị ígwè ntụoyi na ndị nwere nsogbu ahụ ike zoro ezo, dị ka ọrịa shuga ma ọ bụ ọrịa obi. Mgbe ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ rịrị elu, FDA Consumer na-adụ ọdụ ịṅụ nnukwu mmiri—otu lita kwa hour ma ọ bụrụ na a na-emega ahụ. Mgbe anwụ na-acha, kpuru ugegbe anya, okpu ọnụ ya sara mbara, ma yiri ákwà na-akpagideghị gị akpagide n’ahụ. Ọ bụrụ na i nweghị ígwè ntụoyi ma e nwere ihe ize ndụ nke ọrịa oké okpomọkụ, “saa mmiri oyi, kwọsa onwe gị mmiri ugboro ugboro, ma nọdụ ala n’ihu fan. Ọ bụrụ na ọ dị gị ka ị na-atụbọ, kpọọ òkù maka nlekọta ahụ ike mberede.” Dr. Koller na-adọ aka ná ntị, sị: “Ọ bụrụ na ahụ na-ekpobiga mmadụ ọkụ ókè, i nwere nanị nkeji ole na ole ime ihe banyere ya.”

“Ịta Ahụhụ” n’Ọrụ

“Isi ọwụwa, ike ọgwụgwụ, mmebi nke ikike ncheta, nsogbu ịhụ ụzọ, ajụ obubu, nsogbu iku ume, ntị ochichi sitere n’azụzụ, ụzụ n’ime ntị, [na] ọrịa akpụkpọ ahụ”—ha dum pụrụ isite na mgbaàmà nke ọrịa ihe owuwu na-adịghị mma, ma ọ bụ SBS, ka onye nnyocha nke Mahadum John Moores bụ́ Jack Rostron na-ekwu. SBS, nke Òtù Ahụ Ike Ụwa matara na 1986, pụrụ “ịgbanwe ihe omume na-agwụ ike nke ịga ọrụ gaa n’ihe ruwere ịta ahụhụ,” ka ọ na-azọrọ. Ụlọ ndị nwere ígwè ntụoyi na-agazu ebe nile, ndị nwere window e mechiri emechi pụrụ ijupụta n’ihe ndị na-emetọ ikuku, dị ka gas na-egbu egbu na irighiri ihe ndị na-esi n’ígwè photocopier na ígwè na-ebi akwụkwọ apụta, ka The Independent nke London na-akọ. Iji zere SBS, a ghaghị ihicha usoro ígwè ntụoyi nke ọma nakwa mgbe mgbe. Rostron na-ekwu, sị: “A na-arụpụta ihe ka ukwuu mgbe obere ìgwè mmadụ na-ekerịta obere ọfịs ndị nwere window ndị na-emepe emepe.”

Ịdọ Aka ná Ntị Oge Oyi

Onye ọ bụla nke na-anọ n’èzí n’oyi na ifufe nke oge oyi nọ n’ihe ize ndụ nke inwe hypothermia, mbelata dị ize ndụ nke ọ̀tụ̀tụ̀ okpomọkụ ahụ, ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-ekwu. Nke a na-ewere ọnọdụ “mgbe okpomọkụ na-apụ n’ahụ karịa ka ọ pụrụ imepụta ya,” ka akụkọ ahụ na-ekwu, na-agbakwụnye na “ọ bụghị iwu na ọ̀tụ̀tụ̀ ịjụ oyi ga-adị ala karịa ọ̀tụ̀tụ̀ mkpụkọta mmiri ka hypothermia wee were ọnọdụ.” Ọ na-esikarịrị usoro ịrụ ọrụ nke ahụ ndị meworo okenye ike idochi okpomọkụ na-apụ n’ahụ. Ha, tinyere ụmụaka, nọ n’ihe ize ndụ kasịnụ. Mgbe ‘oyi na-atụ mmadụ, ahụ ya dere mmiri, ike gwụrụ ya, agụụ na-agụ ya, ahụ na-ama ya jijiji, ọ na-eme mkpesa, [nakwa] mgbe ọ na-adịghị anụ ụtọ ịnọ n’èzí,’ ọ pụrụ ịnọ n’ihe ize ndụ nke inwe hypothermia, ka Wilderness First Aid Handbook na-ekwu. E kwesịrị ịkpọba onye dị otú ahụ n’ụlọ, nye ya uwe gbakọrọ agbakọ, nri, na ihe ọṅụṅụ ma ọ bụghị mmanya na-aba n’anya ma ọ bụ caffeine. Ọ bụrụ na o gosighị ihe àmà nke mgbake, e kwesịrị ịchọ nlekọta ahụ ike ozugbo.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya