“Oghere Na-asawanye Mbara n’Etiti Ndị Ụkọchukwu na Ndị Aghasa”
“E NWERE oghere na-asawanye mbara n’etiti ndị ụkọchukwu na ndị aghasa chọọchị okwuchukwu ndị dị n’America,” ka Robert K. Johnston, prọfesọ nkà mmụta okpukpe na ọdịbendị na-arịba ama. Na Ministerial Formation, bụ́ magazin nke Òtù Kansụl Chọọchị Ụwa, ọ na-ekwu ụfọdụ n’ime ihe ndị na-akpata nkewapụ a: Ka nrụgide ezinụlọ na-arị elu, ndị pastọ chọrọ usoro ihe omume ndị yiri “ọrụ ngwụsị izu onye rụtụ ibe ya arụtụ nke ndị dọkịta.” Ọ bụrụ na pastọ arụọ ọrụ gafee hour ọrụ, ọ na-atụ anya ka e nye ya ihe iti aka n’obi maka mgbalị ya. Ọzọkwa, ka prọfesọ ahụ na-ekwu, “ka a na-enwekwu nrụgide n’ihe bụ ụkpụrụ na ihe iwu kwadoro,” ụlọ akwụkwọ nkà mmụta okpukpe na-adọ ndị gụsịworo akwụkwọ na ha aka ná ntị ka ha gbochie nsogbu site n’inwe “ndị enyi chiri anya nanị n’etiti ndị ‘òtù’ ha bụ́ ndị ụkọchukwu ndị ọzọ,” ma mesoo ndị parish ha dị ka “ndị chọrọ enyemaka ha.” Ọ bụghị ihe ijuanya na ọtụtụ ndị parish, n’aka nke ha, na-ele ndị pastọ ha anya dị ka ndị nọ n’ọkwá dị elu ndị na-adịghị ama mkpa na nsogbu nke onye nkịtị na-aga chọọchị na-enwe.
Olee ụdị pastọ pụrụ imechilata oghere ahụ? Otu ihe ọmụmụ nke nyochara ihe mere na ndị pastọ adịghị eme nke ọma n’ozi ha chọpụtara na ndị parish adịghị ele ihe ọmụma mmụta akwụkwọ na nkà ndị pastọ anya dị ka ihe dị oké mkpa. Ndị òtù chọọchị adịghị atụ anya onye nwere oké ọgụgụ isi, ọkà okwu, ma ọ bụ onye nlekọta nwere nkà. Karịsịa, ha chọrọ ka pastọ ha bụrụ “onye nke Chineke” onye na-eme ihe ọ na-akụzi. Ọ bụrụ na àgwà ahụ kọrọ ụkọ, ka Prọfesọ Johnston na-ekwu, “ọ dịghị ọ̀tụ̀tụ̀ nke ihe ọmụma e nyere ma ọ bụ nkà e gosipụtara” ga-emechi oghere ahụ.
Olee ihe ndị Bible na-asị na ọ bụ ihe ndị a chọrọ n’aka onye okenye n’ọgbakọ? “Ya mere onye na-elekọta nzukọ Kraịst anya aghaghị ịbụ onye a na-adịghị akalụ, di nke otu nwunye, onye anya udo, onye uche ya zuru okè, onye omume ya kwesịrị ekwesị, onye na-ele ndị ọbịa anya nke ọma, onye nwere ike izi ihe; onye na-adịghị ese okwu site n’ịṅụbiga mmanya ókè, onye na-adịghị eti mmadụ aka; kama onye nwere obiọma, onye na-adịghị alụ ọgụ, onye na-adịghị ahụ ego n’anya; onye na-achị ezinụlọ nke aka ya nke ọma, na-enwekwa ụmụ ya n’okpuru ya n’ikwesị nsọpụrụ nile. Ma ọ ghaghịkwa inwe àmà dị mma site n’ọnụ ndị nọ n’èzí; ka ọ ghara ịdaba n’ịta ụta, ya na ịma n’ọnyà ekwensu.”—1 Timoti 3:2-4, 7.