Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w92 2/1 p. 24
  • ‘Iwe Ihe Ubi’ na Venezuela

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • ‘Iwe Ihe Ubi’ na Venezuela
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • “Anyị Arụọla Ókèala Anyị Ọtụtụ Ugboro!”
    Ozi Alaeze Anyi—2001
  • Ihe A Kụrụ n’Ubi Achaala Maka Owuwe Ihe Ubi
    Ozi Alaeze Anyi—2010
  • Bụrụnụ Ndị Ọrụ Owuwe Ihe Ubi Na-enwe Ọṅụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Gaanụ N’ihu N’ọrụ Owuwe Ihe Ubi Ahụ!
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
w92 2/1 p. 24

Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ

‘Iwe Ihe Ubi’ na Venezuela

N’otu oge Jisọs ji ọrụ nkwusa ahụ tụnyere owuwe ihe ubi a na-ewe kwa afọ. (Matiu 9:36-38) Onyenwe owuwe ihe ubi ahụ bụ Jehova Chineke, owuwe ihe ubi ahụ hikwara nne n’ezie gburugburu ụwa dum. Nke a gụnyere ókèala a na-adịghị ejechi ozi anya na ya na Venezuela.

Alaka ụlọ ọrụ Watch Tower Society dị na Venezuela na-akọ ihe mere mgbe otu ìgwè Ndịàmà rụrụ ọrụ n’ókèala Sabana Grande, Guárico State. Ndịàmà ahụ na-akọ, sị: “Ụlọ anyị ga-anọ na ya bụ ebe dị mma maka inwe nzukọ, ya mere ozugbo, anyị malitere ịkpọ ndị mmadụ òkù ịbịa nzukọ n’ebe ahụ. Ndị ahụ amaghị banyere Ndịàmà Jehova. Ọ bụ ezie na e nwere òtù ndị okwuchukwu anọ n’obodo ahụ, ndị mmadụ nwere ịnụ ọkụ n’obi ịmụta ihe site na Bible.

“Anyị rụrụ ọrụ hour atọ n’ụtụtụ na hour atọ n’ehihie, na-aga site n’ụlọ ruo n’ụlọ ma na-akpọ ndị mmadụ òkù ịbịa nzukọ a ga-enwe n’anyasị na-esonụ. Anyị enweghị oche, ya mere anyị gwara ha ka ha bute oche ndị nke ha. Mgbe oge ruru ka nzukọ ahụ malite, ndị mmadụ malitere ịbịa, onye ọ bụla na-ebu otu oche. Mgbe e mechiri nzukọ ahụ, anyị gwara ha na anyị ga-achọ idetu aha ndị chọrọ ka e duziere ha ọmụmụ Bible ebe obibi n’efu. Ọnụ ọgụgụ 29 mmadụ nile bịaranụ chọrọ ka e denye aha ha.

“Ka anyị na-emechi ụzọ mgbe onye ikpeazụ bịaranụ na-ala, anyị hụrụ ndị ikom atọ ka ha guzo n’akụkụ ụlọ ahụ. N’ihe dị ka n’elekere anya itoolu, anyị dị njikere ịnọdụ ala rie nri mgbe ha kụrụ aka n’ọnụ ụzọ. Ha jụrụ ajụjụ ndị dị ka: ‘Gịnị bụ nkwusa nke a unu na-eme n’obodo a? Ọ̀ bụ n’ihi gịnị ka unu ji nwee nzukọ n’ebe a n’anyasị a?’

“Anyị jụrụ ma ànyị emebiwo iwu ọ bụla. Ha zara ee e, wee sịkwa na ha bụ ndị pastọ nke atọ n’ime chọọchị ndị okwuchukwu e nwere n’obodo ahụ. Ahụ erughị ha ala n’ihi chọọchị ha nile tọgbọ chakoo n’uhuruchi ahụ. Anyị kpọbatara ha n’ụlọ ma kọwaara ha ọrụ anyị. Anyị nyekwara ha akwụkwọ ụfọdụ ma gwa ha ka ha lọghachi na Thursday na-abịanụ.

“Na Thursday sochirinụ ndị pastọ ahụ bịaghachiri, kpọrọkwa 22 ndị ọzọ bịa bụ́ ndị chọrọ ịnụ ihe anyị ga-ekwu. Ndị pastọ ahụ chere na ebe ọ bụ na anyị bụ ndị inyom, anyị agaghị enwe ike iguzogide ha ná mkparịta ụka. Ka o sina dị, nzukọ ahụ gara nke ọma site n’ụzọ anyị si ele ihe anya. Ná ngwụsị ya anyị kọwara na anyị na-edekọ aha ndị chọrọ ịmụtakwu ihe site na Bible. Ọtụtụ n’ime ndị ha na ndị pastọ ahụ so bịa chọrọ ka e denyekwuo aha ha n’ihe ndekọ ahụ, ọbụna na ụfọdụ kwuru na ha chọrọ isoro anyị gaa ọrụ nkwusa anyị!

“Anyị kọwara na ọ ga-adị ha mkpa inwetakwu ihe ọmụma Bible na ọzụzụ tupu ha enwee ike isonyere anyị n’ọrụ nkwusa. Kwa ụbọchị ndị mmadụ na-abịa n’ụlọ ahụ, na-asị ka anyị kọwaara ha Bible. Mgbe ụfọdụ, mgbe anyị kwuru okwu ruo ime abalị, anyị na-agwa ha ka ha laa. Mgbe oge mesịrị ruo ka anyị hapụ ókèala ahụ, ha nwere mwute nke ukwuu ma gwa anyị na mgbe anyị ga-alọghachite, ha ga-esonyere anyị n’ọrụ nkwusa ahụ. Ha kwere nkwa na mgbe ọ ga-eru oge ahụ ha ga-enwewo ọganihu ahụ a chọrọ.”

Mgbe Ndịàmà ahụ hapụrụ ókèala ahụ, e nwere 40 mmadụ chọrọ ịmụ Bible. E nyere ọgbakọ kasị dị nso ebe ahụ, bụ́ nke dị ihe dị ka 50 kilomita site n’ebe ahụ, aha ndị a nwere mmasị. N’ihi ya, Ndịàmà ụfọdụ site n’obodo ọzọ akwagawo n’obodo nta nke a, e hibewokwa otu ìgwè ndị nkwusa ozi ọma na-anụ ọkụ n’obi.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya