Ndị Mmụọ Ọjọọ Hà Dị Adị n’Ezie?
NA NARỊ afọ nke 17 na 18, ihe omume kpụ ọkụ n’ọnụ nke mkpagbu megide ndị amoosu gbasazuru n’ihe ka ọtụtụ ebe na Europe. Ọtụtụ ndị a sịrị na ha bụ amoosu tara ahụhụ dị egwu. Ụfọdụ ndị e boro ebubo ụgha kwetara na ha na-ata amoosu nanị iji gbanarị mmekpa ahụ ahụ. E gburu ọnụ ọgụgụ dị ukwuu ná ndabere nke kepu kepu ma ọ bụ ịbụ ndị a na-enyo enyo.
Ọ bụ ezie na o yiri ka ọ dabeere n’Akwụkwọ Nsọ, ihe ndị a e mere megide ịta amoosu, bụ́ otu ụdị nke ofufe ndị mmụọ ọjọọ, bụ n’ezie ihe e jiri ịnụbiga ọkụ n’obi ókè mee. E nyeghị ndị Kraịst ọrụ imekpa ndị amoosu ma ọ bụ ndị ọ bụla ọzọ na-eme mgbaasị ahụ ma ọ bụ igbu ha. (Ndị Rom 12:19) Gịnị bụ omume a na-ahụkarị taa?
Omume Ntụsara Ahụ
Taa ihe ka ọtụtụ ná ndị nọ na Krisendọm adịghị eji ime mgbaasị ndị dị otú ahụ akpọrọ ihe. N’ihi ọchịchọ ịmata ihe, ụfọdụ pụrụ itinyetụ aka n’ịgụ kpakpando, majik, ịjụ ndị mmụọ ase, na ịta amoosu, ma ha adịghị ele ime anwansi ndị a anya dị ka ofufe ndị mmụọ ọjọọ. Mgbe ụfọdụ, ndị na-eme ihe ntụrụndụ, ndị na-eme egwuregwu, na ndị ndọrọ ndọrọ ọchịchị na-ekweta n’ihu ọha na ha etinyewo aka n’anwansi. Ụfọdụ akwụkwọ na ihe nkiri sinima na-egosi ndị amoosu na ndị na-agba afa dị ka “ndị na-adọrọ mmasị, ndị a na-adịghị ahụkebe bụ́ ndị ihe omume ha karịrị ike mmadụ na-adịghị emerụ onye ọ bụla ahụ,” ka otu akwụkwọ nkà ihe ọmụma na-ekwu. Ihe ndị e mepụtara maka ntụrụndụ ụmụaka na izi ha ihe pụrụ igosi ime anwansi.
Omume ntụsara ahụ na ejighị ihe kpọrọ ihe dị otú ahụ n’ebe ofufe ndị mmụọ ọjọọ dị pụrụ iduga na-ekwenyeghị n’ịdị adị nke ndị mmụọ ọjọọ. Ì kwenyere na ndị mmụọ ọjọọ dị adị, na-agbalịsikwa ike imerụ anyị ahụ? E kwuwerị, ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ taa ga-ekwu na e nwetụbeghị ihe jikọrọ ha na ndị mmụọ ọjọọ ma ọ bụ na ha ekiribeghị ọrụ ha. Ndị mmụọ ọjọọ hà dị adị n’ezie?
Ekwenyeghị Na-akpata Amaghị Nke A Ga-eme
Ndị na-azọrọ na ha nakweere Bible ma nwee obi abụọ banyere ịdị adị nke ndị mmụọ ọjọọ amaghị ihe ha ga-eme. Ọ bụrụ na ha ekwenyeghị na ndị mmụọ ọjọọ dị adị n’ezie, ha na-egositụ ekwenyeghị na Bible. N’ihi gịnị? N’ihi na a kụziri banyere ndị ajọ mmụọ e kere eke nwere ike karịrị nke mmadụ n’Okwu Chineke, bụ́ Bible.
Akwụkwọ mbụ ya, bụ́ Jenesis, na-akọ otú otu onye e kere eke nwere ọgụgụ isi si jiri agwọ ghọgbuo Iv ma duba ya n’inupụrụ Chineke isi. (Jenesis 3:1-5) Akwụkwọ ikpeazụ nke Bible, bụ́ Mkpughe, na-akọwa ajọ onye aghụghọ a, “bụ́ agwọ ochie ahụ,” dị ka “onye a na-akpọ Ekwensu na Setan, onye na-eduhie ụwa nile mmadụ bi.” (Mkpughe 12:9) Setan nwere ihe ịga nke ọma n’ịraba ndị mmụọ ozi ndị ọzọ ná nnupụisi. (Jud 6) N’ime Bible a na-akpọ ndị mmụọ ozi a dara ada ndị mmụọ ọjọọ. Ha na-arụ ọrụ n’ógbè ụwa, na-ewesokwa Chineke na ndị na-ejere ya ozi oké iwe.—Mkpughe 12:12.
Setan na ndị mmụọ ọjọọ nwere ike imetụta, imerụ ahụ, na isoro ndị mmadụ na-ekwurịta okwu. (Luk 8:27-33) Ha amụwo ọdịdị mmadụ ruo ọtụtụ puku afọ. Ha maara otú a pụrụ isi jiri adịghị ike mmadụ mee ihe. Bible na-akọ ọnọdụ ebe ndị ha jidere, ma ọ bụ chịkwaa ndị ikom, ndị inyom, na ụmụntakịrị n’ụzọ zuru ezu. (Matiu 15:22; Mak 5:2) Ha pụrụ ịkpata ọrịa ma ọ bụ nkwarụ anụ ahụ dị ka ìsì. (Job 2:6, 7; Matiu 9:32, 33; 12:22; 17:14-18) Ha pụkwara ikpuchi uche ndị mmadụ. (2 Ndị Kọrint 4:4) Ndị mmụọ ọjọọ na-akpa ike mgbe nile, dị ka ọ dị onye ndú ha, bụ́ Setan, bụ́ onye dị ka “ọdụm na-agbọ ụja, . . . na-achọ onye ọ ga-elomi.” (1 Pita 5:8) Bible nwere ọtụtụ ihe ndekọ banyere ịdị adị nke ndị mmụọ ọjọọ. Ọ bụrụ na i kwenyere na Bible, mgbe ahụ ị na-ekwenye n’ịdị adị nke ajọ ihe e kere eke ndị a na-adịghị ahụ anya.
Ajọ Ndị Nghọgbu
Ma olee otú ndị mmụọ ọjọọ dị ike pụrụ isi dị taa n’akpataghị ọnọdụ na-emenye ụjọ mgbe nile n’ụwa? Gịnị mere na ọnụnọ ha na ihe ndị ha na-eme apụtakwughị ìhè? Bible na-aza, sị: “Setan onwe ya na-eme onwe ya ka o yie mmụọ ozi nke ìhè.” (2 Ndị Kọrint 11:14) Ekwensu bụ onye nghọgbu. A na-ekpuchikarị ọrụ ndị mmụọ ọjọọ dị ka ihe na-adịghị emerụ ahụ ma ọ bụ ọbụna ihe dị mma. N’ihi ya, o siri ike ịmata.
Setan na ndị mmụọ ọjọọ ya nọgidere na-eti ndị mmadụ ihe otiti n’ụzọ dị iche iche, dị ka ha mere n’oge Bible. Ụfọdụ ndị bụ́ ezigbo ndị Kraịst ugbu a na-emebu anwansi; ha pụrụ ịgba akaebe banyere oké ụjọ nke mwakpo ndị mmụọ ọjọọ na-akpata. Taa, ikekwe n’ọ̀tụ̀tụ̀ ka ukwuu karịa ka ọ dịtụrụla, ndị mmụọ ọjọọ na-eji ike ha karịrị nke mmadụ araba ndị mmadụ n’ime anwansi kpọmkwem. E kwesịghị ileda ike ha anya. Otú ọ dị, ha na-arụzu ihe ka ukwuu site n’ịrafu ndị mmadụ site n’ebe Chineke nọ karịa ka ha na-eme site n’imenye ha egwu. Setan na ndị mmụọ ọjọọ “na-eduhie ụwa nile mmadụ bi,” ka Bible na-ekwu. (Mkpughe 12:9) Ha zubesiri ike iji ụzọ aghụghọ ndị na-adọrọ adọrọ mebie ọnọdụ ime mmụọ.
Ndị mmụọ ọjọọ dị adị n’ezie. Olee ụzọ ọzọ a pụrụ isi kọwaa ọchịchọ a na-apụghị imeju emeju maka ọbara na mbibi nke na-apụta nnọọ ìhè n’etiti ndị mmadụ taa? N’ụzọ dị otú o kwesịrị ndị mmadụ na-achọ ibi n’udo na obi ụtọ. Ma ndị mmụọ ọjọọ na-akwalite ajọ ihe, nweekwa ike ịchịkwa na imerụ uche mmadụ.
Ma, Jehova bụ Chineke nke pụrụ ime ihe nile—dị ike karịa ndị mmụọ ọjọọ. Ọ na-enye ume na nchebe ya megide “ihe nile Ekwensu na-ezupụta.” (Ndị Efesọs 6:11-18) Ọ dịghị anyị mkpa ịtụ ndị mmụọ ọjọọ ajọ egwu, n’ihi na Chineke na-ekwe nkwa, sị: “Ya mere doonụ onwe unu n’okpuru Chineke; ma guzogidenụ ekwensu, ọ ga-agbapụkwa n’ebe unu nọ.”—Jemes 4:7.
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 12]
Sipa Icono