Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe—Ngọzi Ka Ọ̀ Bụ Nkọcha?
A malitere echiche nke nnwere onwe ikpe okpukpe n’oké ihe mgbu n’ime Krisendọm. Ọ bụ ọgụ megide echiche ikwesi olu ike, ajọ mbunobi, na ekweghị ibe nọrọ. Ọ tara isi ọtụtụ puku mmadụ n’agha okpukpe ndị a kwafuru ọbara na ha. Gịnị ka akụkọ ihe mere eme a na-egbu mgbu n’obi na-akụziri anyị?
“MKPAGBU anọwo na-abụ eziokwu na-adịgide adịgide n’akụkọ ihe mere eme nke ndị Kraịst,” ka Robin Lane Fox na-ede n’akwụkwọ bụ́ Pagans and Christians. A kpọrọ ndị Kraịst oge mbụ ịrọ òtù, bookwa ha ebubo iyi udo ọha na eze egwu. (Ọrụ 16:20, 21; 24:5, 14; 28:22) N’ihi ya, ụfọdụ diri mmekpọ ọnụ ma bụrụ ndị anụ ọhịa dọgburu n’ọgbọ egwuregwu ndị Rom. N’agbanyeghị ajọ mkpagbu dị otú ahụ, ụfọdụ, dị ka ọkà mmụta okpukpe bụ́ Tertullian (lee foto dị na peji nke 8), rịọrọ maka nnwere onwe ikpe okpukpe. Na 212 O.A., o dere, sị: “Ọ bụ ihe bụ́ isi ruuru mmadụ, ihe ùgwù si n’okike, na mmadụ ọ bụla ga-efe ofufe dị ka nkweta ya si dị.”
Na 313 O.A., n’ihi Iwu nke Milan, bụ́ nke nyere ndị Kraịst na ndị na-ekpere arụsị n’otu aka ahụ nnwere onwe ikpe okpukpe, mkpagbu nke ndị Rom na-akpagbu ndị Kraịst bịara ná njedebe n’oge ọchịchị Constantine. Ime ka “Iso Ụzọ Kraịst” bụrụ ihe iwu kwadoro n’Alaeze Ukwu Rom mere ka ihe tụgharịa. Otú ọ dị, n’ihe dị ka na 340 O.A., otu onye edemede sị na ya bụ onye Kraịst kpọrọ òkù ka a kpagbuo ndị na-ekpere arụsị. N’ikpeazụ, na 392 O.A., n’ihi Iwu nke Constantinople, Eze Ukwu Theodosius nke Mbụ machibidoro ikpere arụsị iwu n’ime alaeze ukwu ahụ, nnwere onwe ikpe okpukpe kwụsịkwara n’anọghị ọdụ. N’inwe “Iso Ụzọ Kraịst” nke Rom dị ka okpukpe Obodo, Chọọchị na ọchịchị malitere mkpagbu nke dịruru ọtụtụ narị afọ, na-eru ọ̀tụ̀tụ̀ ya kasị elu n’Agha Ntụte nke narị afọ nke 11 ruo nke 13 ndị a kwafuru ọbara na ha na ná mmekpọ ọnụ nke Njụta Okwukwe, nke malitere na narị afọ nke 12. A kpọrọ ndị nwara ịgbagha nkwenkwe Ọtọdọks ahụ e guzobeworo, nanị ndị nwere ikike izi ihe, ndị jụrụ okwukwe ma jide ha n’oge ahụ a na-achọgharị ndị na-ekwenyeghị. Gịnị kpaliri ihe omume ndị dị otú ahụ?
E jiri nzọrọ nke bụ́ na ịdị n’otu n’ụzọ okpukpe bụ ebe ndabere sikarịsịrị ike maka ọchịchị nakwa na ndịrịta iche nke okpukpe yiri udo nke ọha na eze egwu, mere ihe ngọpụ maka ekweghị ka okpukpe ọzọ dịrị. N’England, na 1602, otu n’ime ndị minista nke Eze Nwanyị Elizabeth rụrụ ụka, sị: “Ọchịchị adịghị anọ ná nchebe mgbe ọ bụla o kwere ka e nwee okpukpe abụọ.” N’ezie, ọ dị nnọọ mfe karị ịmachibido ndị na-ekwenyeghị n’okpukpe iwu karịa ịchọpụta ma ha bụ ihe ize ndụ n’ezie nye ọchịchị ma ọ bụ okpukpe dị adị. Akwụkwọ bụ́ The Catholic Encyclopedia na-ekwu, sị: “Ma ndị isi ọchịchị ma ndị isi chọọchị adịghị nke kọwapụtara ọdịiche kasị nta dị n’etiti ndị jụrụ okwukwe bụ́ ndị dị ize ndụ na ndị na-adịghị.” Otú ọ dị, a ga-enwe mgbanwe n’oge na-adịghị anya.
Mmalite Na-egbu Mgbu nke Ikwe Ibe Nọrọ
Ihe kpaliri inwe mgbanwe na Europe bụ ọgba aghara nke okpukpe Protestant kpatara, bụ́ ịrọ òtù nke jụrụ ịpụ n’anya. N’ụzọ dị nnọọ oké ngwa, Mgbanwe nke Protestant kewara Europe n’ụzọ okpukpe, na-eme ka echiche nnwere onwe nke akọ na uche pụta ìhè. Dị ka ihe atụ, Ome Mgbanwe ahụ a ma ama bụ́ Martin Luther, gosipụtara izi ezi nke echiche ya na 1521, na-ekwu, sị: “Okwu Chineke na-achịkwa akọ na uche m.” Nkewa kpalikwara Agha Iri Afọ Atọ ahụ (1618-1648), bụ́ ọtụtụ agha okpukpe obi ọjọọ ndị kpara Europe aka ọjọọ.
Otú ọ dị, n’oge agha ahụ, ọtụtụ bịara ghọta na agha abụghị ụzọ isi gaa n’ihu. N’ihi ya, ọtụtụ iwu, dị ka Iwu Nantes e mere na France (1598), nwara iweta udo na Europe nke agha tisasịrị ma ọ kụrụ afọ n’ala. Ọ bụ n’ime iwu ndị a ka echiche nke oge a nke ikwe ibe nọrọ si jiri nwayọọ nwayọọ pụta. Na mbụ, “ikwe ibe nọrọ” na-enye echiche na-adịghị mma. “Ọ bụrụ na anyị ga-ekwe ka ịrọ òtù ndị ahụ dịrị n’okpuru ọnọdụ ụfọdụ . . . , obi abụọ adịghị ya na ọ ga-abụ ihe ọjọọ—oké ihe ọjọọ n’ezie—ma ọ gaghị adịru njọ ka agha,” ka onye ahụ a ma ama na-arụ ọrụ maka ọdịmma ụmụ mmadụ bụ́ Erasmus dere na 1530. N’ihi echiche a na-ezighị ezi, ụfọdụ, dị ka onye France bụ́ Paul de Foix na 1561, họọrọ ikwu banyere “nnwere onwe ikpe okpukpe,” kama “ikwe ibe nọrọ.”
Otú ọ dị, ka oge na-aga, a bịara hụ ikwe ibe nọrọ ọ bụghị dị ka nke ka mma n’ime ihe ọjọọ abụọ, kama dị ka ihe na-echebe nnwere onwe. A dịkwaghị ele ya anya dị ka nkweta adịghị ike kama dị ka nkwekọrịta. Mgbe a malitere iwere inwe nkwenkwe dịgasị iche iche na ikike iche echiche n’ụzọ dị iche dị ka ebe ọha mmadụ nke oge a hiwere isi, a manyere ịnụbigara okpukpe ọkụ n’obi ókè ịkwụsị.
Ná ngwụsị nke narị afọ nke 18, e jikọtara ikwe ibe nọrọ na nnwere onwe na ịha nhata. E gosiri nke a n’ụdị iwu na nkwupụta okwu dị iche iche, dị ka Nkwupụta nke Ihe Ndị Ruuru Mmadụ na Nwa Amaala (1789) ahụ a ma ama, na France, ma ọ bụ Iwu Ihe Ndị Ruuru Mmadụ (1791), na United States. Ka ihe odide ndị a bịara nwee mmetụta n’echiche nke ịsọpụrụ echiche ndị ọzọ malite na narị afọ nke 19 gawa n’ihu, a dịkwaghị ele ikwe ibe nọrọ na nnwere onwe anya dị ka nkọcha kama dị ka ngọzi.
Nnwere Onwe A Kpaara Ókè
N’agbanyeghị otú ọ dịruru n’oké ọnụ ahịa, a kpaara nnwere onwe ókè. N’aha inye mmadụ nile nnwere onwe ka ukwuu, ọchịchị na-eti iwu ndị na-akpara nnwere onwe ụfọdụ nke ndị mmadụ n’otu n’otu ókè. Ihe ndị na-esonụ bụ ụfọdụ okwu ndị metụtara nnwere onwe bụ́ ndị a na-arụ ụka ha ugbu a n’ọtụtụ mba ndị dị na Europe: Ruo ókè ha aṅaa ka e kwesịrị itinyeru iwu gọọmenti n’ọrụ ná ndụ onwe onye? Ruo ókè ha aṅaa ka ọ dịruru irè? Olee otú o si emetụta nnwere onwe?
Usoro mgbasa ozi emewo ka arụmụka banyere nnwere onwe ọha na eze na nke onwe onye pụta ìhè. E bowo ụfọdụ òtù okpukpe ebubo nzighasị uche, nrigbu n’ụzọ ego, mmetọ ụmụaka, na ọtụtụ mpụ ndị ọzọ dị oké njọ, ọtụtụ mgbe n’enweghị ihe àmà ruru eru. Ụlọ ọrụ mgbasa ozi dị iche iche agbasawo akụkọ ndị na-ekwu banyere òtù okpukpe ndị ka nta n’ụzọ sara mbara. Aha mkparị ndị dị ka “ajọ òtù” ma ọ bụ “ịrọ òtù” aghọwo akụkụ nke okwu ndị e ji eme ihe kwa ụbọchị ugbu a. N’ihi nrụgide na-esite n’echiche ọha na eze, gọọmenti ọbụna ewepụtawo ndepụta nke ihe ndị a sị na ha bụ ajọ òtù ndị dị ize ndụ.
France bụ mba na-eji omume ya nke ikwe ibe nọrọ na ikewapụ okpukpe n’ebe ọchịchị dị anya isi. Ọ na-eji nganga akpọ onwe ya ala nke “Nnwere Onwe, Ịha Nhata, Ime Ka Ụmụnne.” Ma, dị ka akwụkwọ bụ́ Freedom of Religion and Belief—A World Report si kwuo, a tụwo aro ná mba ahụ ka e nwee “usoro izi ihe n’ụlọ akwụkwọ iji kwalite ịjụ òtù okpukpe ndị ọhụrụ.” Otú ọ dị, ọtụtụ ndị mmadụ na-eche na ime ihe dị otú a na-eyi nnwere onwe ikpe okpukpe egwu. N’ụzọ dị aṅaa?
Ihe Iyi Egwu Nye Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe
A na-enwe ezi nnwere onwe ikpe okpukpe nanị mgbe ọchịchị na-emeso òtù okpukpe nile na-asọpụrụ ma na-erube isi n’iwu ihe n’ụzọ hà nhata. Ọ na-akwụsị ịdị mgbe ọchịchị ji aka ike kpebie n’ime òtù okpukpe dị iche iche nke na-abụghị okpukpe, si otú a jụ inye ya ihe ọchịchị na-enye okpukpe dị iche iche. “Echiche ahụ e ji akpọrọ oké ihe nke nnwere onwe ikpe okpukpe na-adacha ka ihe na-erijughị afọ mgbe ọchịchị weghaara ikike nke ịnwapụta okpukpe dị iche iche otú o si enye ndị ọkwọ ụgbọala akwụkwọ ikike ịkwọ ụgbọala,” ka magazin Time kwuru na 1997. Na nso nso a otu ụlọikpe mkpegharị ikpe nke France kwuru na ime otú ahụ “na-eduga n’ọchịchị aka ike, ma à ma ụma ma ọ bụ na a maghị ụma.”
A na-eyikwa nnwere onwe ndị bụ́ isi egwu mgbe nanị otu òtù na-eji usoro mgbasa ozi eme ihe. N’ụzọ dị mwute, ọ na-adịwanye otú a n’ọtụtụ mba. Dị ka ihe atụ, ná mgbalị ịkọwa ihe ziri ezi n’ụzọ okpukpe, òtù dị iche iche na-emegide ajọ òtù emewo onwe ha dị ka onye gbara akwụkwọ, ọkàikpe, na ndị òtù ikpe, mgbe ahụ ha anwawokwa ịmanye ọha na eze ịnakwere echiche ha na-ezighị ezi site n’usoro mgbasa ozi. Otú ọ dị, dị ka akwụkwọ akụkọ France bụ́ Le Monde si kwuo, n’ime otú a, mgbe ụfọdụ òtù ndị a na-egosi “otu ụdị ịrọ òtù ahụ a sịrị na ha na-alụso ọgụ ma nọrọ n’ihe ize ndụ nke ịkpata ọnọdụ ‘ịchọgharị ndị na-ekwenyeghị.’” Akwụkwọ akụkọ ahụ jụrụ, sị: “Ọ̀ bụ na ime ka ọha mmadụ kọjọọ òtù okpukpe ndị ka nta adịghị . . . eyi nnwere onwe ndị dị oké mkpa egwu?” Martin Kriele, bụ́ onye e hotara ihe o kwuru na magazin bụ́ Zeitschrift für Religionspsychologie (Magazin Maka Akparamàgwà Okpukpe), sịrị: “Ịchọgharị ịrọ òtù dị iche iche na-akpata nchegbu karịa otú ihe ka nnọọ ọtụtụ n’ihe ahụ ‘a na-akpọ ịrọ òtù na òtù na-achịkwa uche nke ndị òtù ya, na-akpata.’ N’ikwu ya n’ụzọ dị mfe: E kwesịrị ịhapụ ụmụ amaala ndị na-adịghị emebi iwu ka ha nọọrọ onwe ha. Okpukpe na echiche kwesịrị ịnọrọ onwe ha ma nọgide na-anọrọ onwe ha, ma na Germany.” Ka anyị tụlee otu ihe atụ.
A Kpọọ “Ụmụ Amaala Ndị Bụ́ Ihe Nlereanya”—Ndị Dị Ize Ndụ
Olee òtù okpukpe a sịrị na ọ bụ “nke kasị dị ize ndụ n’ime ịrọ òtù nile” n’echiche nke ndị isi Katọlik e hotara ihe ha kwuru n’akwụkwọ akụkọ Spain a ma ama bụ́ ABC? Ọ pụrụ iju gị anya ịmata na ABC na-ekwu banyere Ndịàmà Jehova. Ebubo ndị ahụ e boro ha hà dabeere n’eleghị mmadụ anya n’ihu, na ezi uche? Rịba nkwupụta okwu ndị na-esonụ sitere n’ebe ndị ọzọ ama:
“Ndịàmà na-ezi ndị mmadụ ka ha jiri ịkwụwa aka ọtọ tụọ ụtụ isi ha, ka ha ghara itinye aka n’agha ma ọ bụ ime nkwadebe maka agha, ka ha ghara izu ohi na, n’ozuzu ya, ka ha gbasoo ụzọ ndụ nke ga-eduga n’ime ka ọnọdụ ibikọ ọnụ n’obodo ka mma ma ọ bụrụ na dị ọzọ anakwere ya.”—Sergio Albesano, Talento, November-December 1996.
“N’ụzọ megidere echiche dị iche iche a na-agbasa mgbe ụfọdụ, [Ndịàmà Jehova] adịghị m ka ha bụ ihe ize ndụ ọ bụla nye gọọmenti. Ha bụ ndị amaala hụrụ udo n’anya, ndị akọ na uche na-achị, na-erubekwara ndị ọchịchị isi.”—Otu onye so ná ndị ome iwu nke Belgium.
“A matara Ndịàmà Jehova dị ka ndị kachasị na-akwụba aka ha ọtọ na Federal Republic.”—Akwụkwọ akụkọ Germany bụ́ Sindelfinger Zeitung.
“Ị pụrụ ile [Ndịàmà Jehova] anya dị ka ụmụ amaala a ga na-eṅomi. Ha dị uchu n’ịtụ ụtụ isi, na-elekọta ndị ọrịa, na-alụso amaghị agụ na amaghị ede ọgụ.”—Akwụkwọ akụkọ United States bụ́ San Francisco Examiner.
“Ndịàmà Jehova na-enwe ihe ịga nke ọma ka ukwuu karịa ndị òtù nke okpukpe ndị ọzọ n’ịnọgide na-enwe njikọ alụmdi na nwunye siri ike.”—Magazin bụ́ American Ethnologist.
“Ndịàmà Jehova so ná ndị kachasị akwụba aka ọtọ, na ndị kachasị dị uchu n’ịrụsi ọrụ ike na mba nile nke Africa.”—Dr. Bryan Wilson, Mahadum Oxford.
“Ndị òtù okpukpe ahụ atụnyewo ụtụ dị ukwuu eri ọtụtụ iri afọ n’ịgbasawanye nnwere onwe nke akọ na uche.”—Nat Hentoff, Free Speech for Me—But Not for Thee.
“Ha atụnyewo ụtụ doro anya ná nchekwa nke ụfọdụ n’ihe ndị kasị oké ọnụ ahịa n’ọchịchị anyị nke onye kwuo uche ya.”—Prọfesọ C. S. Braden, These Also Believe.
Dị ka ihe ndị ahụ e hotara n’elu na-egosi, a ma Ndịàmà Jehova n’ụwa nile dị ka ụmụ amaala bụ́ ezi ihe nlereanya. Ọzọkwa, e ji ọrụ mmụta Bible ha na-arụ n’efu na nkwalite nke ụkpụrụ omume ọma nke ezinụlọ mara ha. Usoro ịmụ ka e si agụ na ka e si ede ha enyeworo ọtụtụ narị puku aka, ebe ọrụ ebere ha eri ọtụtụ iri afọ nyewooro ọtụtụ puku aka, karịsịa n’Africa.
Mkpa Ọ Dị Inwe Ezi Uche
Ndị na-enweghị ụkpụrụ bụ́ ndị na-achọ ịnwụde ndị aka ha dị ọcha juru eju n’ọha mmadụ. N’ihi ya, e nwere mkpa doro anya nke ịnọ na nche mgbe a bịara ná nzọrọ banyere okpukpe. Ma olee nnọọ otú o si bụrụ ihe ezi uche dị na ya na nke na-akwalite nnwere onwe ikpe okpukpe mgbe ụfọdụ ndị odeakụkọ, kama ịkpọtụrụ ndị ọkachamara nwere ezi uche, na-adabere n’ihe ọmụma ha nwetara na chọọchị ndị ọnụ ọgụgụ ha na-adalata adalata ma ọ bụ site n’òtù ndị na-emegide ịrọ òtù bụ́ ndị ezi uche ha bụ nke a na-enyo enyo n’ụzọ siri ike? Dị ka ihe atụ, akwụkwọ akụkọ ahụ nke kpọrọ Ndịàmà Jehova òtù “nke kasị dị ize ndụ n’ime ịrọ òtù nile” kwetara na nkọwa ndị o nyere sitere n’aka “ndị ọkachamara nke Chọọchị [Katọlik].” Ọzọkwa, otu magazin France kwuru na ihe ka ukwuu n’isiokwu ndị na-ekwu banyere ihe ndị a sịrị na ha bụ ịrọ òtù sitere n’aka òtù ndị na-emegide ịrọ òtù. Nke a ọ̀ dara gị ka ụzọ kasị bụrụ nke eleghị mmadụ anya n’ihu nke isi nweta ihe ọmụma ezi uche dị na ya?
Ụlọikpe mba nile na òtù dị iche iche na-ahụ banyere ihe ndị bụ́ isi ruuru mmadụ, dị ka òtù UN, na-ekwu na “ịkpa ókè ahụ a kpara n’etiti okpukpe na ịrọ òtù bụ́ nnọọ nke na-ezighị ezi nke na a pụghị ịnakwere ya.” Gịnị meziri ụfọdụ ndị ji nọgide na-eji okwu mweda n’ala ahụ bụ́ “ịrọ òtù” eme ihe? Ọ bụ ihe àmà ọzọ na-egosi na a na-eyi nnwere onwe ikpe okpukpe egwu. Oleezi otú a pụrụ isi chebe nnwere onwe a dị oké mkpa?
[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ndị Gbachiteere Nnwere Onwe Ikpe Okpukpe
Arịrịọ dị ike maka nnwere onwe ikpe okpukpe malitere n’ihi oké nkwafu ọbara ahụ weere ọnọdụ n’agha okpukpe e nwere na Europe na narị afọ nke 16. Arịrịọ ndị a ka dị mkpa ná ntụle nke nnwere onwe ikpe okpukpe.
Sébastien Chateillon (1515-1563): “Ònye bụ onye jụrụ okwukwe? Achọpụtaghị m ihe ọ bụla ọzọ ma e wezụga na anyị na-ewere ndị nile na-ekwenyeghị n’echiche anyị dị ka ndị jụrụ okwukwe. . . . Ọ bụrụ na a na-ewere gị dị ka ezi onye kwere ekwe n’obodo ma ọ bụ n’ógbè a, a ga-ewere gị dị ka onye jụrụ okwukwe n’ọzọ.” Onye nsụgharị Bible bụ́ onye France a ma ama na onye gbachiteere ikwe ibe nọrọ n’ụzọ siri ike bụ́ Chateillon, kwuru banyere otu n’ime ihe ndị bụ́ isi n’arụmụka banyere nnwere onwe ikpe okpukpe: Ònye na-ekpebi onye bụ onye jụrụ okwukwe?
Dirck Volckertszoon Coornhert (1522-1590): “Anyị gụrụ na n’oge gara aga . . . ọbụna Kraịst n’onwe ya n’ime Jerusalem nakwa ọtụtụ ndị nwụrụ n’ihi okwukwe ha n’ime Europe . . . jiri okwu nke eziokwu ha nye [ọha mmadụ] nsogbu. . . . Ọ dị mkpa ka a kọwaa ihe okwu ahụ bụ́ ‘nye nsogbu’ pụtara n’ụzọ ziri ezi na n’ụzọ doro anya.” Coornhert rụrụ ụka na e kwesịghị iji ndịrịta iche okpukpe tụnyere ịkpaghasị udo ọha na eze. Ọ jụrụ, sị: Ndị ahụ ji nlezianya na-erube isi ma na-akwanyere iwu ùgwù hà na-eyi udo ọha na eze egwu n’ezie?
Pierre de Belloy (1540-1611): Ọ bụ “amaghị nke a na-akọ ikwere na ndịrịta iche okpukpe na-akpata ma na-akwalite ọgba aghara n’ọchịchị.” Belloy, bụ́ onye France bụ́ ọkàiwu n’ide ihe n’oge Agha Okpukpe ndị ahụ (1562-1598), rụrụ ụka na ịdị n’otu nke Obodo adabereghị n’inwe otu okpukpe ọ gwụla nnọọ ma gọọmenti ọ̀ na-edo onwe ya n’okpuru nrụgide okpukpe.
Thomas Helwys (c. 1550–c. 1616): “Ọ bụrụ na ndị ya [eze ahụ] bụ ndị a na-achị achị na-erube isi ma na-ekwesị ntụkwasị obi n’iwu nile mmadụ tiri, ọ dịghị ihe ọzọ ọ ga-achọ n’aka ha.” Helwys, bụ́ otu n’ime ndị malitere Baptist nke England, dere ihe iji kwadoo ikewapụ Chọọchị pụọ n’ọchịchị, na-agba eze ahụ ume ka o mee ka chọọchị na ịrọ òtù nile nweta nnwere onwe ikpe okpukpe na ka o nwee afọ ojuju n’ikike ọchịchị o nwere n’ahụ ndị mmadụ na n’ebe ihe onwunwe dị. Ihe odide ya mesiri ajụjụ a na-ajụ n’oge a ike: Ruo ókè ha aṅaa ka ọchịchị kwesịrị ịchịkwaru ọnọdụ ime mmụọ?
Onye edemede na-edeghị aha ya (1564): “Ka e wee nwee nnwere onwe nke akọ na uche, o zughị ezu ikwe ka mmadụ zere ikpe okpukpe na-adịghị ya mma ma ọ bụrụ na, n’ihi otu ihe ahụ, e kweghị ka o nwere onwe ya ikpe nke dị ya mma.”
[Foto]
Tertullian
Chateillon
De Belloy
[Ebe E Si Nweta Foto]
Foto nile: © Cliché Bibliothèque Nationale de France, Paris