Ụdị Ndị Nne Na Nna Ochie “Ọgbara Ọhụrụ”
“Nke A Bụ Ụlọ Nne na Nna Ochie—A Ga-elekọta Ụmụ Gị Ka Ị Na-echere.” Nke ahụ bụ ihe e dere n’ọnụ ụzọ ụlọ Gene na Jane.
OTÚ ọ dị, ị banye n’ime ụlọ ahụ ị gaghị ahụ di na nwunye meworo agadi nọ n’oche ndabere. Kama nke ahụ, ị ga-ahụ di na nwunye na-emebeghị agadi ndị nọ n’afọ ndụ 40 ha, ndị gbasikwara ike. N’abụtụghị ndị na-agbara ọrụ ha dị ka ‘ndị aka ochie’ ọsọ, Gene na Jane ejiriwo ịnụ ọkụ n’obi nabata ịbụ nne na nna ochie. “N’eziokwu, ọ bụ otu n’ime ihe ole na ole ná ndụ ndị na-egosi na i mewela agadi,” ka Gene na-ekwu, “ma nke a bụ otu n’ime ụgwọ ọrụ, nkwụghachi ụgwọ nke ịzụlite ụmụ gị—ụmụ ụmụ.”
Otu ilu ochie na-ekwu, sị: “Okpueze ndị okenye ka ụmụ ụmụ bụ.” (Ilu 17:6) Ndị nne na nna ochie na ụmụ ụmụ ha na-enwekarị nkekọ pụrụ iche nke ịhụnanya na ịkpachi anya. Dịkwa ka magazin bụ́ Generations si kwuo, “ọnụ ọgụgụ mmadụ a na-enwetụbeghị mbụ n’America bụ ndị nne na nna ochie.” Gịnị kpatara ya? “Afọ ndụ rịrị elu na ụkpụrụ ndị ọhụrụ e nwere n’usoro ndụ ezinụlọ,” ka isiokwu ahụ na-akọwa. “Mgbanwe ndị e nwere n’ọnụ ọgụgụ ndị na-anwụ anwụ na ndị a na-amụ amụ na-egosi na ihe e mere atụmatụ ya ịbụ ụzọ atọ n’ime ụzọ anọ nke ndị toworo eto ga-anọ ndụ bụrụ ndị nne ma ọ bụ nna ochie . . . Ọnụ ọgụgụ ka ukwuu nke ndị na-akatabeghị ahụ na-aghọ ndị nne na nna ochie mgbe ha gbara ihe dị ka afọ 45.”
E nwewo ụdị ndị nne na nna ochie ọzọ n’ala ụfọdụ. Otú ọ dị, ọtụtụ n’ime ha na-elekọtazi ụmụ ụmụ ha karị. Dị ka ihe atụ, nwa nwoke nke Gene na Jane na onye bụbu nwunye nwa ha agbawo alụkwaghịm, e nyekọkwara ha ikike ịkpọrọ nwa ha. “Anyị na-agbalị inye aka site n’ilekọta nwa nwa anyị ka nwa anyị nwoke na-arụ ọrụ,” ka Jane na-akọwa. Dị ka otu nnyocha e mere sị gosi, ndị nne na nna ochie nọ na United States bụ́ ndị na-elekọta ụmụ ụmụ ha na-etinye nkezi nke awa 14 n’otu izu n’ime otú ahụ. Nke a ruru nnọọ ijeri dollar 29 nke ụgwọ ọrụ otu afọ!
Olee ọṅụ ndị nne na nna ochie nke taa na-enwe? Olee ihe ịma aka ndị ha na-enwe? Isiokwu ndị na-esonụ ga-atụle ajụjụ ndị a.