Ndị Nne Na Nna Ochie—Ọṅụ Ha Na Ihe Ịma Aka Ha
“Ịbụ nna ochie dị m ụtọ! Gị na ụmụ ụmụ gị na-akpakọrịta n’enweghị mmetụta nke ịbụ onye ga-aza ajụjụ banyere ha ma ọ bụ onye ga-elekọta ha. Ị na-achọpụta na ị na-emetụta ndụ ha ma n’ụzọ bụ́ isi ị bụghị o kwusịa o bie. Ọ bụ ndị mụrụ ha bụ o kwusịa o bie.”—Gene, nna ochie.
OLEE ihe dị n’ịbụ nne ma ọ bụ nna ochie nke pụrụ ịkpali mmasị dị otú ahụ? Ndị nnyocha na-akọwa na ihe ndị kwesịrị ekwesị ndị nne na nna na-achọ n’aka ụmụ ha pụrụ ịkpata nnukwu esemokwu. Ebe ọ bụ na ọ dịghị adịkarị ndị nne na nna ochie mkpa ịchọ ihe ndị dị otú ahụ, ha pụrụ isoro ụmụ ụmụ ha mekọrịtakwuo ihe n’eseghị okwu. Dị ka Arthur Kornhaber, M.D., si kwuo ya, ha enweghị ihe mgbochi ịhụ ụmụ ụmụ ha n’anya nanị “n’ihi na ha bụ ụmụ ụmụ ha.” Otu nne ochie aha ya bụ Esther na-ekwu, sị: “Mgbe mụ na ụmụ nke aka m nọ, kwa ụbọchị uche m na-adị n’ihe nile ha mere. Dị ka nne ochie, ọ dịghị ihe na-egbochi m isoro ụmụ ụmụ m na-akpakọrịta ma hụ ha n’anya.”
Ọzọkwa, e nwere amamihe na iru eru ka ukwuu na-abịa mgbe mmadụ mewere agadi. (Job 12:12) N’abụkwaghị ndị ntorobịa na ndị na-enweghị ahụmahụ, ndị nne na nna ochie bụ aka ochie n’ịzụ ụmụ. N’ịbụ ndị siteworo ná mmehie ihe ha mụta ihe, ha pụrụ ịka ruo eru ilekọta ụmụaka karịa ka ha mere mgbe ha bụ okoro na agbọghọ.
N’ihi ya Dr. Kornhaber na-ekwubi, sị: “Nkekọ dị mma na nke ịhụnanya aghaghị ịdị n’etiti ndị nne na nna ochie na ụmụ ụmụ ha maka ahụ ike nke mmetụta uche na obi ụtọ nke ọgbọ atọ ahụ nile. Nkekọ a bụ ihe si n’okike nke ruuru ụmụaka, . . . ihe nketa nke ndị ka ha okenye na-enyefe ha bụ́ nke na-abara onye ọ bụla n’ezinụlọ uru.” Magazin bụ́ Family Relations na-ekwu n’otu aka ahụ, sị: “Ndị nne ma ọ bụ nna ochie na-ekere òkè ma ghọta ọrụ nne na nna ochie na-enwe mmetụta nke ahụ ịdị mma na ụkpụrụ omume ka ukwuu.”
Ọrụ Nne Ma Ọ Bụ Nna Ochie
E nwere ọtụtụ ọrụ bara uru ndị nne na nna ochie pụrụ ịrụ. “Ha pụrụ inyere ụmụ ha lụrụ di ma ọ bụ nwunye aka,” ka Gene na-ekwu. “Echere m na site n’ime otú a, ha pụrụ ibelata ọnọdụ ụfọdụ siri ike ndị nne na nna na-akatabeghị ahụ na-eche ihu.” Ndị nne na nna ochie pụkwara ime ihe dị ukwuu n’ịkwado ụmụ ụmụ ha. Ọ na-abụkarị nne ma ọ bụ nna ochie na-akọrọ nwatakịrị ihe ndị mere n’ezinụlọ. Ọtụtụ mgbe, ndị nne na nna ochie na-ekerekwa òkè dị mkpa n’inyefe ụmụ ha ihe nketa okpukpe nke ezinụlọ.
N’ọtụtụ ezinụlọ, ndị nne na nna ochie na-abụ ndị nduzi a tụkwasịrị obi. “Ikekwe ọ dị ihe ndị ụmụaka ga-akọrọ gị bụ́ ndị ha na-enweghị ahụ iru ala ịkọrọ ndị mụrụ ha,” ka Jane, bụ́ onye e kwuru okwu banyere ya n’isiokwu nke mbụ, na-ekwu. Ndị nne na nna na-anabatakarị nkwado ndị dị otú ahụ ha na-enyekwu. Dị ka otu nnyocha gosiri, “ihe karịrị pasent 80 nke ndị nọ n’afọ iri na ụma lere nne na nna ochie ha anya dị ka ndị a pụrụ ịkọrọ ihe nzuzo. . . . Ọnụ ọgụgụ buru ibu nke ụmụ ụmụ toworo eto na nne ma ọ bụ nna ochie ha nke ha na ha kasị akpachi anya na-anọgide na-enwe mmekọrịta mgbe nile.”
Nne ma ọ bụ nna ochie na-ahụ n’anya pụrụ ịdị nwatakịrị na-enweghị ezi ọzụzụ n’ụlọ mkpa karịsịa. “Nne m ochie bụ onye kasị m mkpa n’oge m bụ nwata,” ka Selma Wassermann na-ede. “Ọ bụ nne m ochie wepụtara onwe ya zụọ m. O nwere apata ụkwụ buru ibu karịa Miami Beach, mgbe o kuuru m na ya, m na-amara na ọ dịghị ihe ga-eme m. . . . Ọ bụ nne m ochie kụziiri m ihe ndị kasị mkpa m maara banyere onwe m—na a hụrụ m n’anya, n’ihi ya na m bụkwa onye a pụrụ ịhụ n’anya.”—The Long Distance Grandmother.
Esemokwu Ezinụlọ
Otú ọ dị, e nwere esemokwu na nsogbu ndị pụrụ isi n’ịbụ nne ma ọ bụ nna ochie pụta. Dị ka ihe atụ, otu nne na-echeta oké arụmụka ya na nne ya rụrụ banyere ụzọ kwesịrị ekwesị isi mee ka nwa ọhụrụ bie nkọ. “Ọ kpatara nkewa n’etiti anyị n’oge m chọrọ nnọọ enyemaka.” O kwere nghọta na ndị nne na nna na-akatabeghị ahụ na-achọ ka ndị mụrụ ha kwado otú ha si azụlite ụmụ ha. N’ihi ya, aro ndị sitere n’aka ndị mụrụ ha bụ́ ndị nwere ezi nzube pụrụ ịdị ka ajọ nkatọ.
N’akwụkwọ ya bụ́ Between Parents and Grandparents, Dr. Kornhaber na-ekwu banyere otu nne na otu nna nwere nsogbu ọzọ a na-enwekarị. Otu nne na-ekwu, sị: “Ndị mụrụ m na-anapụ m ihe ruuru m kwa ụbọchị, iwe na-ewekwa ha ma ọ bụrụ na m anọghị n’ụlọ mgbe ha bịara. . . . Ha adịghị eche banyere m—mmetụta m na ihe dịịrị nanị m.” Otu nna na-eme mkpesa, sị: “Ndị mụrụ m na-achọ ime ka obere nwa m nwanyị bụrụ nke ha. Site n’ụtụtụ ruo abalị ihe nile ha na-eme bụ Susie. . . . Anyị na-eche echiche ịkwapụ.”
Mgbe ụfọdụ a na-ebokwa ndị nne na nna ochie ebubo ịzụtọ ụmụ ụmụ ha site n’inyebiga ha onyinye ókè. N’ezie, mmesapụ aka dịkwa ka iku ume bụ ebumpụta ụwa nke ndị nne na nna ochie, ma ụfọdụ yiri ka ha na-emebiga ihe ókè n’akụkụ a. Otú ọ dị, mgbe ụfọdụ, mkpesa ndị nne na nna pụrụ ịbụ n’ihi ekworo. (Ilu 14:30) “Ndị mụrụ m ji aka ike na obi ọjọọ mesoo m omume,” ka Mildred na-ekwu. “Ha na-emesapụrụ ụmụ m aka ma [kwere ka ha na-eme ihe masịrị ha]. Ana m ekwo ekworo n’ihi na ha agbanwebeghị otú ha si emeso m omume.” Ọ pụrụ ịkpata nsogbu ma ọ bụrụ na nne ma ọ bụ nna ochie adịghị akwanyere echiche nke nne na nna ùgwù ma a bịa n’ihe banyere inye onyinye, n’agbanyeghị ihe e bu n’obi ma ọ bụ ihe mere e ji nye ya.
N’ihi ya ọ ga-abụrụ ndị nne na nna ochie amamihe iji ezi uche na-egosi mmesapụ aka ha. Bible na-egosi na ọbụna ihe ọma gabigara ókè pụrụ ịdị njọ. (Ilu 25:27) Ọ bụrụ na i jighị n’aka ụdị onyinye ndị kwesịrị ekwesị, jụọ nne na nna ha. N’ụzọ dị otú a ị ‘ga-amata inye ezi onyinye.’—Luk 11:13.
Ịhụnanya na Nkwanye Ùgwù—Isi Ihe Ndị Dị na Ya!
Ọ dị mwute ikwu na ụfọdụ ndị nne na nna ochie na-eme mkpesa na a dịghị enwe ekele maka ọrụ ha dị ka ndị nlekọta na ndị na-eku nwa. Ndị ọzọ na-eche na a naghị ekwecha ka ha na ụmụ ụmụ ha nọrọ. Ma ndị ọzọ na-ekwu na ụmụ ha ndị toworo eto ezerewo ha n’akọwaraghịdị ha ihe kpatara ya. Mgbe mgbe a pụrụ izere nsogbu ndị dị otú ahụ na-egbu mgbu ma ọ bụrụ na ndị òtù ezinụlọ egosirịta onwe ha ịhụnanya na nkwanye ùgwù. Bible na-ekwu, sị: “Ịhụnanya nwere ogologo ntachi obi, o nwekwara obiọma; ịhụnanya adịghị ekwo ekworo; . . . ọ dịghị achọ ihe nke aka ya, oké iwe adịghị ewe ya, . . . ọ na-anagide ihe nile, na-ekwere ihe nile, na-ele anya ihe nile, na-enwe ntachi obi n’ihe nile.”—1 Ndị Kọrint 13:4, 5, 7.
Ikekwe ị bụ nne ma ọ bụ nna na-akatabeghị ahụ, nne ochie ejirikwa ezi nzube tụọ aro ma ọ bụ kwuo ihe kpasuru gị iwe. Ì nwere n’ezie ihe mere ị ga-eji ‘wee iwe’? E kwuwerị, Bible na-egosi na ọ bụ ọrụ agadi ndị inyom bụ́ ndị Kraịst ịkụziri “ụmụ agbọghọ . . . ịbụ ndị na-ahụ di ha n’anya, ndị na-ahụ ụmụ ha n’anya, ndị uche ha zuru okè, ndị dị ọcha, ndị na-arụ ọrụ n’ụlọ.” (Taịtọs 2:3-5) Ọ̀ bụkwa na gị na nne na nna ochie gị achọghị otu ihe ahụ—ihe kasị mma maka ụmụ gị? Ebe ọ bụ na ịhụnanya ‘adịghị achọ ihe nke aka ya,’ ma eleghị anya ọ kasị mma ilekwasị anya ná mkpa nke nwa ahụ—ọ bụghị ná mmetụta gị. Ime otú ahụ pụrụ inyere gị aka izere “ịmanye ibe unu ịrụ ụka” n’ihi obere ihe mkpasu iwe ọ bụla.—Ndị Galetia 5:26, NW; nkọwa ala ala peji.
N’eziokwu, ị pụrụ ịtụ egwu na mmesapụ aka gabigara ókè ga-emebi nwa gị. Ma dị ka ọ na-adịkarị, nne ma ọ bụ nna ochie adịghị ebu ajọ ihe n’obi mgbe ọ na-emesapụ aka. Ihe ka ọtụtụ ná ndị ọkachamara n’ọrụ ilekọta ụmụaka kwere na otú i si enye nwa gị ọzụzụ ga-enwe mmetụta dị nnọọ ukwuu n’ahụ ya karịa nke nne ma ọ bụ nna ochie ga-enye ya mgbe ụfọdụ. Otu dọkịta na-adụ ọdụ, sị: “Ịnọgide na-enwe omume ọchị na-enye aka.”
Ọ bụrụ na i nwere ezigbo ihe na-ewute gị n’ihe banyere ilekọta nwa, akwụsịla nne ma ọ bụ nna gị ma ọ bụ ọgọ gị isoro ụmụ gị na-enwe mmekọrịta. Bible na-ekwu, sị: “Mmebi echiche nile dị mgbe izu nzuzo na-adịghị.” (Ilu 15:22) Kwurịtanụ okwu ma kpughee nchegbu gị na “mgbe ya.” (Ilu 15:23) Ọtụtụ mgbe, a pụrụ inweta ihe ngwọta ya.
Ị̀ bụ nne ma ọ bụ nna ochie? Mgbe ahụ ịkwanyere ndị mụrụ nwa nwa gị ùgwù dị mkpa. Otú ọ dị, ị ga-eche na ị ga-ekwurịrị okwu ma ọ bụrụ na ọ dị gị ka nwa nwa gị ọ̀ nọ n’ihe ize ndụ. Ma ọ bụ ezie na ọ bụ ihe dị otú o kwesịrị gị ịhụ ụmụ ụmụ gị n’anya na ịlekọta ha, ọ bụ ibu ọrụ dịịrị nne na nna—ọ bụghị nke dịịrị nne na nna ochie—ịzụlite ụmụ ha. (Ndị Efesọs 6:4) Bible nyere ụmụ ụmụ gị iwu ịkwanyere ndị mụrụ ha ùgwù na irubere ha isi. (Ndị Efesọs 6:1, 2; Ndị Hibru 12:9) N’ihi ya gbalịa izere inye ndị mụrụ ha oké ndụmọdụ ha na-arịọghị maka ya ma ọ bụ iji nwayọọ mebie ịchịisi ndị mụrụ ha nwere.—Tụlee 1 Ndị Tesalọnaịka 4:11.
N’eziokwu, ịnọrọ onwe gị, imechi ọnụ—na ikekwe ijide mmụọ gị—na ịhapụ ụmụ gị ka ha rụọ ọrụ ha dị ka nne na nna anaghị adịcha mfe. Ma dị ka Gene si kwuo ya, “ọ gwụla ma ha rịọrọ maka ndụmọdụ, ị ghaghị ịkwado ihe ha chere kasị mma maka ụmụ ha.” Jane na-ekwu, sị: “M na-elezi anya ịghara ikwu sị, ‘Otú a ka e kwesịrị isi mee ya!’ E nwere ọtụtụ ụzọ dị iche iche e si eme ihe, ọ bụrụkwa na ị na-ekwesi olu ike, ọ pụrụ ịkpata nsogbu.”
Ihe Ndị Nne na Nna Ochie Pụrụ Inye
Bible kọwara inwe ụmụ ụmụ dị ka ngozi sitere n’aka Chineke. (Abụ Ọma 128:3-6) Site n’inwe mmasị n’ebe ụmụ ụmụ gị nọ, ị pụrụ inwe mmetụta siri ike ná ndụ ha, na-enyere ha aka ịzụlite ụkpụrụ Chineke. (Tụlee Deuterọnọmi 32:7.) N’oge Bible otu nwanyị aha ya bụ Lọịs keere òkè dị ukwuu n’inyere nwa nwa ya, bụ́ Timoti, aka itopụta bụrụ onye Chineke pụtara ìhè. (2 Timoti 1:5) N’otu aka ahụ, ị pụrụ inwe ọṅụ ka ụmụ ụmụ gị na-anara ọzụzụ Chineke.
Ị pụkwara ịbụ isi iyi nke ịhụnanya na mmetụta ịhụnanya dị mkpa. N’eziokwu, ọ pụrụ ịbụ na ị bụghị ụdị onye na-ekwupụtakarị mmetụta ya, nke na-egosi mmetụta ịhụnanya. Otú ọ dị, ị pụkwara igosi ịhụnanya Chineke site n’iji obi eziokwu nwee mmasị, nke ịchọ ọdịmma onwe onye nanị na-adịghị na ya n’ebe ụmụ ụmụ gị nọ. Onye edemede bụ́ Selma Wassermann na-ekwu, sị: “Inwe mmasị n’ihe nwatakịrị ahụ na-agwa gị . . . ga-egosi n’ezie na ị na-eche banyere ya. Ịbụ onye na-ege ntị nke ọma, na-adịghị anapụ onye ọzọ okwu n’ọnụ, na-adịghị akatọ onye ọzọ—ha nile na-egosi nkwanye ùgwù, mmetụta ịhụnanya, iji mmadụ kpọrọ oké ihe.” Nye nwa nwa, nlekọta ịhụnanya dị otú ahụ pụrụ ịbụ otu n’ime onyinye ndị kasị mma nne ma ọ bụ nna ochie pụrụ inye.
Ihe anyị na-atụle kemgbe elebawo anya n’ọrụ ndị na-adịkarị n’ịbụ nne ma ọ bụ nna ochie. Otú ọ dị, ọtụtụ ndị nne na nna ochie nke taa na-ebu ibu dị nnọọ arọ karị.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 16]
“Ọ bụ nne m ochie kụziiri m ihe ndị kasị mkpa m maara banyere onwe m—na a hụrụ m n’anya, n’ihi ya na m bụkwa onye a pụrụ ịhụ n’anya”
[Igbe dị na peeji nke 16]
Aro Maka Ndị Nne Ma Ọ Bụ Nna Ochie Nọ n’Ebe Dị Anya
• Gwa ndị mụrụ ụmụ ụmụ gị ka ha zitere gị tepụ vidio ma ọ bụ foto ụmụ ụmụ gị.
• Zigara ụmụ ụmụ gị “akwụkwọ ozi” ị gụnyere na tepụ. Maka obere ụmụaka, gụnye akụkọ Bible ma ọ bụ egwú ụra na tepụ.
• Zigara ụmụ ụmụ gị kaadị ozi na akwụkwọ ozi. Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, mee ka gị na ha na-ederịta akwụkwọ ozi mgbe nile.
• Ọ bụrụ na ị ga-akwụli ụgwọ ya, na-akpọtụrụ ụmụ ụmụ gị na telifon mgbe ị nọ n’ebe dị anya. Mgbe ị na-agwa obere ụmụaka okwu, malite mkparịta ụka site n’ịjụ ajụjụ ndị dị mfe, dị ka, “Gịnị ka i riri n’ụtụtụ?”
• Ọ bụrụ na ọ ga-ekwe mee, na-aga nleta dị mkpirikpi na nke ha mgbe nile.
• Gị na ndị mụrụ ụmụ ụmụ gị mee ndokwa ka ụmụ ụmụ gị bịa n’ụlọ gị. Mee ndokwa maka ihe omume mkpori ndụ, dị ka ịga n’ogige a na-edebe anụ ọhịa, ebe ngosi ihe mgbe ochie, na ogige ntụrụndụ.
[Foto dị na peeji nke 15]
Ọtụtụ ndị nne ma ọ bụ nna ochie na-enye aka elekọta ụmụ ụmụ ha
[Foto dị na peeji nke 17]
Esemokwu pụrụ ibilite n’ihi otú e si azụ nwa
[Foto dị na peeji nke 17]
Mgbe mgbe ndị nne ma ọ bụ nna ochie na-ekere òkè n’ịkọrọ ụmụ ha ihe ndị mere n’ezinụlọ