Mgbe Ndị Nne Na Nna Ochie Ghọrọ Nne Na nna
“M ka si nnọọ nzukọ e nwere n’Ụlọ Nzukọ Alaeze lọta. A kụrụ aka dara oké ụda n’ụzọ, ndị uwe ojii abụọ kpọ ụmụaka abụọ ruru unyi bụ́ ndị ntutu ha tụhịchara atụhị na ndị yiri ka a sabeghị ha ahụ kemgbe ọtụtụ ọnwa guzo n’èzí. Ọ ga-esiri gị ike ịmata na ha bụ ụmụaka! Ọ bụ ụmụ ụmụ m, nne ha kwa—onye ọgwụ ọjọọ riri ahụ—elegharawo ha anya. Abụ m nwanyị di ya nwụrụ, enwekwara m ụmụ isii nke m. Ma apụghị m nnọọ ịjụ ha.”—Sally.a
“Nwa m nwanyị rịọrọ m ma m ga-enwe ike ịkpọrọ ụmụ ya ruo mgbe o doziri ndụ ya. Amaghị m na ọ na-aṅụ ọgwụ ọjọọ. M mesịrị zụwa ụmụ ya abụọ. Ka ọtụtụ afọ gasịrị, nwa m nwanyị mụrụ nwa ọzọ. Achọghị m ịkpọrọ ya, ma nwa nwa m rịọrọ m, sị, ‘Nne m ochie, ọ̀ bụ na anyị apụghị ịnabatakwu nanị otu?’”—Willie Mae.
A NA-ADỊ akọwa ịbụ nne ma ọ bụ nna ochie dị ka “ihe ụtọ na-enweghị ibu ọrụ.” Ma ọ bụkwaghị ugbu a. Ụfọdụ na-eme atụmatụ na na United States nanị, ihe karịrị nde ụmụaka atọ na nne ma ọ bụ nna ochie ha bi. Ọnụ ọgụgụ ahụ na-arịkwa elu n’ike n’ike.
Gịnị na-akpata omume a na-akpaghasị ihe? Ụmụaka ndị nne na nna ha gbara alụkwaghịm pụrụ imesị soro nne ma ọ bụ nna ochie ha biri. Otú ahụ ka ọ pụkwara ịdị ụmụaka ndị nne na nna ha leghaara anya ma ọ bụ metọọ. Akwụkwọ bụ́ Child Welfare na-ekwu na ‘cocaine na-akpata ọgbọ furu efu,’ n’ihi na ọ na-eme ka ndị nne na nna o riri ahụ ghara imeli ihe ọ bụla. E nwekwara ọtụtụ nde ụmụaka “na-enweghị nne ma ọ bụ nna” n’ihi mgbahapụ, ọnwụ nke nne ma ọ bụ nna, na isi mgbaka. Ụmụaka ndị ọrịa AIDS gburu nne ha pụkwara imesị bụrụ ndị nne ma ọ bụ nna ochie ha na-elekọta.
Iburu ibu ọrụ nke ịzụ nwa n’oge mmadụ katatụrụla ahụ ma ọ bụ n’oge “ụbọchị ihe ọjọọ” nke agadi pụrụ isi ike. (Eklisiastis 12:1-7) Ọtụtụ ndị enweghịdị ume iji leruo obere ụmụaka anya. Ndị nne ma ọ bụ nna ochie ụfọdụ na-elekọtakwa nne na nna ha meworo agadi. Ma ndị ọzọ bụ ndị di ma ọ bụ nwunye ha nwụrụ ma ọ bụ ndị gbara alụkwaghịm, ha aghaghịkwa ịnọrọ n’enweghị nkwado nke onye òtù ọlụlụ ha. Ọtụtụ na-achọpụtakwa na ha enweghị ego iburu ibu dị otú ahụ. N’otu nnyocha e mere, mmadụ 4 n’ime ndị nne ma ọ bụ nna ochie 10 e nyere ikike ịkpọrọ nwa na-akpata ego dị nnọọ ala. “Ụmụaka ahụ dara ọrịa,” ka Sally na-echeta. “Aghaghị m ịkwụ nnukwute ego maka ọgwụ. Gọọmenti enyecharaghị m aka n’ụzọ ego.” Otu agadi nwanyị na-echeta, sị: “Aghaghị m iji ego ezumike nká m lekọta ụmụ ụmụ m.”
Nrụgide na Ndọlị Dị na Ya
N’abụghị ihe ijuanya, otu nnyocha gosiri na “ilekọta ụmụ ụmụ kpataara ndị nne ma ọ bụ nna ochie nrụgide dị ukwuu, pasent 86 nke ndị nne ma ọ bụ nna ochie 60 so ná nnyocha ahụ kọrọ na ha ‘dara mbà n’obi ma ọ bụ na ha nwere nchegbu ọtụtụ mgbe.’” N’ezie, ọtụtụ na-ekwu na ha nwere nsogbu ahụ ike. “O metụtara m n’ụzọ anụ ahụ, n’uche, na n’ụzọ ime mmụọ,” ka Elizabeth, bụ́ nwanyị lekọtara nwa nwa ya nọ n’afọ iri na ụma, na-ekwu. Willie Mae, bụ́ onye na-arịa ọrịa obi na ọbara mgbali elu, na-ekwu, sị: “Dọkịta m kwere na ọ bụ nrụgide nke ịzụlite ụmụ kpataara m ya.”
Ọtụtụ adịghị njikere maka ime mgbanwe n’ụzọ ha si ebi ndụ nke ịzụlite ụmụ ụmụ na-achọ. “A na-enwe oge ndị m na-apụghị ịga ebe ụfọdụ,” ka otu nna ochie na-ekwu. “Obi m ga-ama m ikpe . . . n’ihi ịhapụrụ ha onye ọzọ, ya mere kama ịga ihe ma ọ bụ ime ihe, adịghị m aga ma ọ bụ eme ihe.” Onye ọzọ kọwara oge nke onwe ya dị ka nke “na-adịghị adị.” Ikewapụ onwe onye n’ebe ọha mmadụ nọ na owu ọmụma na-emekarị. Otu nne ochie kwuru, sị: “Ihe ka ọtụtụ ná ndị enyi anyị bụ́ ndị ọgbọ anyị enweghị [obere] ụmụaka, n’ihi ya anyị adịghị aza òkù a na-akpọ anyị ọtụtụ mgbe n’ihi na a kpọghị ụmụ anyị [ụmụ ụmụ anyị].”
Nrụgide mmetụta uche dị na ya na-egbukwa mgbu. Otu isiokwu dị na magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu, sị: “Ihere na-emegbu ọtụtụ n’ime ha [nne na nna ochie], ha na-enwekwa obi amamikpe n’ihi eziokwu ahụ bụ́ na ụmụ ha adawo dị ka nne na nna—ọtụtụ na-atakwa onwe ha ụta, na-eche ebe ha na-emezighị ihe dị ka nne na nna. Iji mee ka ụmụ ụmụ ha nwee ebe obibi na-enweghị ihe ize ndụ na nke ịhụnanya dị na ya, ụfọdụ aghaghị iwepụ ụmụ ha ndị omume ha retọrọ eretọ ma ọ bụ ndị ọgwụ ọjọọ riri ahụ n’obi ha.”
Otu nnyocha na-egosi na: “Ihe karịrị otu ụzọ n’ime ụzọ anọ . . . kwuru na afọ ojuju ha na-enweta ná mmekọrịta alụmdi na nwunye ha ebelatawo n’ihi inye nlekọta.” Ọ na-adịkarị ndị di, karịsịa, ka e leghaara ha anya ebe nwunye ha na-ekere òkè kasị ukwuu n’ilekọta nwa. Ọ na-adị ndị di ụfọdụ ka ha apụghị nnọọ ịnagide nrụgide ahụ. Otu nwanyị na-ekwu banyere di ya, sị: “Ọ gbahapụrụ anyị. . . . Echere m na ọ dị ya nnọọ ka e jichiri ya ejichi.”
Ụmụaka Iwe Na-ewe
Magazin bụ́ U.S.News & World Report na-ekwu, sị: “Eziokwu ahụ bụ́ na ụfọdụ n’ime ụmụaka ndị a na-akpọnye [ndị nne na nna ochie] ilekọta so n’ime ndị kasị nọrọ ná mkpa, ndị a kasị mejọọ n’ụzọ mmetụta uche na ndị iwe kasị ewe ná mba ahụ, na-akpatakwu nrụgide.”
Tụlee nwa nwa Elizabeth. Papa nwa ahụ gbahapụrụ ya n’akụkụ okporo ámá ebe Elizabeth na-arụ ọrụ dị ka onye na-enyere ụmụaka aka ịgafe okporo ụzọ. “Ọ bụ nwatakịrị iwe na-ewe,” ka Elizabeth na-ekwu. “A kpasuru ya iwe.” Ụmụ ụmụ Sally bu mmejọ dị otú ahụ n’obi. “Iwe na-ewe nwa nwa m. Ọ na-eche na ọ dịghị onye chọrọ ya.” Inwe nne na nna na-ahụ n’anya bụ ikike ebumpụta ụwa ruuru nwatakịrị. Cheedị otú ọ na-adị nwatakịrị ma a gbahapụ ya, leghara ya anya, ma ọ bụ jụ ya! Ịghọta mmetụta ndị a pụrụ ịbụ isi ihe ga-eme ka e jiri ndidi na-emeso ụmụaka ndị na-amalite inwe nsogbu akparamàgwà. Ilu 19:11 na-ekwu, sị: “Ezi uche mmadụ na-eme ka ọ ghara iwe iwe ọsọ ọsọ.”
Dị ka ihe atụ, nwatakịrị a gbahapụrụ agbahapụ pụrụ iguzogide mgbalị ị na-eme ilekọta ya. Ịghọta egwu na nchegbu nwa ahụ pụrụ inyere gị aka iji ọmịiko mesoghachi ya. Ikekwe ịghọta egwu ya na imesi ya obi ike na ị ga-eme ihe nile i nwere ike ime iji lekọta ya ga-eme ihe dị ukwuu n’ime ka egwu ya dajụọ.
Ịnagide Nrụgide Ndị Ahụ
‘Anọwo m na-ewesa onwe m iwe, na-emekwara onwe m ebere. Ihe a ekwesịghị nnọọ ime anyị.’ Otú a ka otu nne ochie e nyere ikike ịkpọrọ nwa kwuru. Ọ bụrụ na ị nọ n’ọnọdụ ahụ, ị pụrụ inwe mmetụta yiri nke ahụ. Ma ọnọdụ ahụ abụtụghị nke olileanya na-adịghị na ya. Otu ihe bụ na afọ ndụ pụrụ ime ka ị ghara inwecha ume, ma afọ ndụ bara uru mgbe a bịara n’ihe banyere amamihe, ndidi, na nkà. N’abụghị ihe ijuanya, otu nnyocha gosiri na “ụmụaka ndị nanị nne ma ọ bụ nna ochie ha zụrụ mere nnọọ nke ọma ma e jiri ha tụnyere ụmụaka nọ n’ezinụlọ ndị e nwere nanị nne ma ọ bụ nna mụrụ nwa.”
Bible na-agba anyị ume ‘ịtụkwasị Jehova nchegbu nile anyị na-echegbu onwe anyị, n’ihi na ihe nile banyere anyị na-emetụ Ya n’obi.’ (1 Pita 5:7) N’ihi ya na-ekpegara ya ekpere mgbe nile maka ume na nduzi, dị ka ọbụ abụ ahụ mere. (Tụlee Abụ Ọma 71:18.) Lebara mkpa ime mmụọ nke gị anya. (Matiu 5:3) “Nzukọ ndị Kraịst na ime nkwusa nye ndị ọzọ nyeere m aka ịnagide,” ka otu nwanyị bụ́ onye Kraịst na-ekwu. N’ebe o kwere mee, gbalịa ịkụziri ụmụ ụmụ gị ụzọ Chineke. (Deuterọnọmi 4:9) N’ezie Chineke ga-akwado mgbalị gị ịzụlite ụmụ ụmụ gị “n’ọzụzụ na ịdụ ọdụ nke Onyenwe anyi.”—Ndị Efesọs 6:4.b
Atụla egwu ịchọ enyemaka. Mgbe mgbe ndị enyi pụru inye aka, karịsịa n’ọgbakọ ndị Kraịst. Sally na-echeta, sị: “Ụmụnna nwoke na ụmụnna nwanyị nọ n’ọgbakọ nyere m nnọọ nkwado. Mgbe m dara mbà n’obi, ha nọ ya ịkwalite m. Ọbụna ụfọdụ nyeere m aka n’ụzọ ego.”
Elegharala enyemaka a pụrụ inweta n’aka gọọmenti anya. (Ndị Rom 13:6) N’ụzọ na-akpali mmasị, dị ka otu nnyocha e mere ndị nne na nna ochie si gosi, “ihe ka ọtụtụ amaghị ihe e nwere ma ọ bụ ebe a ga-aga maka enyemaka.” (Child Welfare) Ndị ọrụ ebere na ụlọ ọrụ ógbè ndị na-enyere ndị agadi aka pụrụ inwe ike ịkọrọ gị ụlọ ọrụ ndị na-enye aka.
N’ọtụtụ ọnọdụ, ọ na-abụ ‘oge ndị a dị oké egwu’ na-akpata inwe ndị nne ma ọ bụ nna ochie e nyere ikike ịkpọrọ nwa. (2 Timoti 3:1-5) Ihe ọma merenụ bụ na oge ndị a siri ike bụ ihe na-egosi na n’oge na-adịghị anya Chineke ga-eme ihe ma kee “ụwa ọhụrụ” ebe ọnọdụ ọjọọ ndị na-eti ọtụtụ ezinụlọ ihe otiti taa ga-abụ ihe gara aga. (2 Pita 3:13; Mkpughe 21:3, 4) Ka ọ dịgodị, ndị nne na nna ochie e nyere ikike ịkpọrọ nwa aghaghị ime ihe ha nwere ike ime iji jiri ọnọdụ ha mee ihe kasị mma. Ọtụtụ na-enwe ihe ịga nke ọma dị ukwuu ná mgbalị ha! Cheta mgbe nile na n’agbanyeghị nkụda mmụọ dị na ya, a pụrụ inweta ọṅụ. Ee, ị pụrụ ọbụna inweta ọṅụ nke ịhụ ka ụmụ ụmụ gị na-aghọ ndị ziri ezi hụrụ Chineke n’anya! Nke ahụ ọ́ gaghị eme ka ịrụsi ọrụ ike gị nile bụrụ ihe bara uru?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a A gbanwewo aha ụfọdụ.
b Akwụkwọ bụ́ Isi Ihe Na-akpata Obi Ụtọ Ezinụlọ (nke Watchtower Bible and Tract Society of New York, Inc., bipụtara) nwere ọtụtụ ụkpụrụ Bible ndị nne ma ọ bụ nna ochie e nyere ikike ịkpọrọ nwa pụrụ iji mee ihe n’ịzụ ụmụ ụmụ ha.
[Igbe dị na peeji nke 20]
Okwu Ikpe
Ma à ga-enweta ikike ịkpọrọ ụmụ ụmụ n’ụzọ iwu kwadoro ma ọ bụ na a gaghị enweta bụ ajụjụ na-adịghị mfe ọzịza na nke dị mgbagwoju anya. Mary Fron, bụ́ ọkachamara n’okwu ahụ na-akọwa, sị: “N’otu akụkụ, i nwere ikike ole na ole iwu kwadoro ma ọ bụrụ na e nyeghị gị ikike ịkpọrọ nwa. N’ọnọdụ ka ukwuu, nne na nna nwa ahụ pụrụ ịlọghachi oge ọ bụla ma kpọrọ nwa ahụ ma ọ bụ ụmụaka ahụ. N’aka nke ọzọ, ọtụtụ ndị nne na nna ochie na-ala azụ ịchọ inweta ikike ịkpọrọ nwa, n’ihi na nke ahụ pụtara iguzo n’ụlọikpe ma kwuo na nwa gị abụghị nne ma ọ bụ nna ruru eru.”—Good Housekeeping.
Ndị nne na nna ochie na-enwekarị ihe isi ike itinye ụmụ ụmụ ha n’ụlọ akwụkwọ ma ọ bụ ọbụna inwetara ha nlekọta ahụ ike ma ọ bụrụ na ha enweghị ikike ịkpọrọ nwa n’ụzọ iwu kwadoro. Otú ọ dị, inweta ikike ịkpọrọ nwa pụrụ ịbụ ahụmahụ na-egbu mgbu nke na-eri oké ego, na-eri oge, na nke na-agwụ ike n’ụzọ mmetụta uche. Ọbụna ọ bụrụkwa na e nweta ya, ndị nne ma ọ bụ nna ochie nwere ike ha agaghị enweta nkwado gọọmenti n’ụzọ ego. N’ihi ya, akwụkwọ bụ́ Child Welfare na-adụ ndị nne na nna ochie ọdụ ka ha “jekwuru ọkàiwu nọ n’ógbè ha bụ́ onye nwere ahụmahụ n’iwu ezinụlọ nke obodo, ikpe inweta ikike ịkpọrọ nwa, na ọdịmma nwatakịrị, maka ndụmọdụ iwu.”
[Igbe dị na peeji nke 21]
Ịgụkọ Ihe Ọ Ga-ewe
Ịhụ nwatakịrị nọ ná mkpa—nke ka nke onye ikwu mmadụ—na-agbawa obi. Bible nyekwara ndị Kraịst iwu ilekọta ‘ndị nke aka ha.’ (1 Timoti 5:8) Ka o sina dị, n’ọtụtụ ọnọdụ ọ ga-abụrụ ndị nne na nna ochie ihe amamihe ichesi echiche ike tupu ha eburu ibu ọrụ dị otú ahụ. (Ilu 14:15; 21:5) Mmadụ aghaghị ịgụkọ ihe ọ ga-ewe.—Tụlee Luk 14:28.
Jiri ekpere tụlee: Ị̀ nọ n’ezie n’ọnọdụ igbo mkpa nwa a n’ụzọ anụ ahụ, n’ụzọ mmetụta uche, n’ụzọ ime mmụọ, na n’ụzọ ego? Olee otú onye òtù ọlụlụ gị si ele ọnọdụ ahụ anya? Ọ̀ dị ụzọ ọ bụla nke isi gbaa ndị mụrụ nwa ahụ ume ma ọ bụ nyere ha aka ka ha nwee ike ilekọta nwa ha n’onwe ha? N’ụzọ dị mwute, ụfọdụ ndị nne na nna na-enupụ isi na-anọgide nnọọ na-achụso ụzọ ndụ rụrụ arụ. Otu nne ochie na-echeta n’ụzọ dị ilu: “Akpọọrọ m ọtụtụ n’ime ụmụ ya. Ma ọ nọgidere na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ma na-amụkwu ụmụ. Emegidere m ruo ebe m na-aghaghị ịsị mba!”
N’aka nke ọzọ, ọ bụrụ na i lekọtaghị ụmụ ụmụ gị, gịnị ga-eme ha? Ị̀ pụrụ ịnagide nrụgide nke ịmata na ndị ọzọ, ikekwe ọbụna ndị ị na-amabughị, na-elekọta ha? Gịnị banyere mkpa ime mmụọ nke ụmụaka ahụ? Ndị ọzọ hà ga-enwe ike ịzụlite ha dị ka ụkpụrụ Chineke si dị? Ụfọdụ pụrụ ikwubi na n’agbanyeghị ihe isi ike ndị ọ gụnyere, ọ dịghị ihe ọzọ ha ga-eme karịa iburu ibu ọrụ ahụ.
Ndị a bụ oké nchegbu, onye nke ọ bụla aghaghị ime mkpebi nke ya.
[Foto dị na peeji nke 19]
Ọ na-esiri ọtụtụ ndị nne na nna ochie ike imezu ihe ịzụlite obere ụmụaka na-agụnye
[Foto dị na peeji nke 20]
Ndị nne na nna ochie na-atụ egwu Chineke pụrụ inwe obi ike na Jehova ga-akwado ha ná mgbalị ha