Gburugburu Ebe Obibi—Mmetụta Ọ Na-enwe n’Ahụ Ike Gị
N’OGE na-adịbeghị anya, Dr. Walter Reed, nke Òtù Na-ahụ Maka Akụ̀ Ndị Dị n’Ụwa, gwara Ụlọ Ọrụ Redio nke òtù UN na ihe mmadụ na-eme usoro njikọ gburugburu ebe obibi nke ụwa eruwo ugbu a n’ókè nke na mmadụ “na-emebi usoro njikọ a n’ụzọ dị nnọọ ukwuu.” Dr. Reed na-ekwu na mmebi a a na-emebi gburugburu ebe obibi, n’aka nke ya, so na-eyi ahụ ike egwu n’ụwa nile. N’otu isiokwu nke tụleghachiri akwụkwọ bụ́ World Resources 1998-99, magazin bụ́ Our Planet, nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu bipụtara, depụtara ụfọdụ n’ime ihe ndị a na-eyi ahụ ike mmadụ egwu. N’ime ha ka e nwere ihe ndị na-esonụ:
□ E jikọwo mmetọ ikuku n’ime ụlọ na n’èzí na ọrịa iku ume ndị na-akpata ọnwụ nke ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ nde ụmụaka anọ kwa afọ.
□ Ụkọ mmiri dị ọcha na usoro idebe ihe ọcha na-eso akpata mgbasa nke ọrịa afọ ọsịsa ndị na-egbu nde ụmụaka atọ kwa afọ. Dị ka ihe atụ, ọgbụgbọ na ọnyụnyụ, bụ́ nke e kpochapụrụla kemgbe na Latin America, lọghachiri n’ebe ahụ ma gbuo mmadụ 11,000 na 1997 nanị.
A kọrọ na kwa ụbọchị ọrịa ndị gburugburu ebe obibi na-akpata na-egbu ihe karịrị ụmụaka 30,000 n’ógbè ndị kasị daa ogbenye n’ụwa. Cheedị nnọọ nke ahụ—mmadụ 30,000 otu ụbọchị ọ bụla dị n’afọ, bụ́ ndị pụrụ ịnọchicha oche nile dị n’ihe dị ka nnukwu ụgbọelu 75!
Otú ọ dị, ọ bụghị nanị mba ndị na-emepe emepe ka gburugburu ebe obibi na-eyi ahụ ike ha egwu. Magazin bụ́ Our Planet na-ekwu na “ihe karịrị 100 nde mmadụ na Europe na n’Ebe Ugwu America ka na-ekuru ikuku dị ize ndụ,” bụ́ nke na-eso eme ka ọrịa asthma na-amụba n’ụzọ dị ukwuu. N’otu oge ahụ, ịrị elu nke isi n’otu mba gaa n’ọzọ na azụmahịa mba na mba esowo kpata mmalite nke ọrịa ọhụrụ 30 na-efe efe ná mba ndị mepere emepe. Ọzọkwa, magazin ahụ kọrọ na ọrịa ndị a chịkwaburu achịkwa “abịaghachila ọgụ.”
Ihe dị mwute bụ na a pụrụ iji nkà na ụzụ e nwere ugbu a gbochie ihe ka n’ọtụtụ ọrịa ndị a gburugburu ebe obibi na-akpata nakwa n’ọnụ ego dịtụ ala. Dị ka ihe atụ, a pụrụ imeziwanye nnọọ ahụ ike site n’inye ndị mmadụ mmiri dị ọcha na usoro idebe ihe ọcha. Ego ole ka ọ ga-ewe iji ruo ihe mgbaru ọsọ a? Ụlọ Ọrụ Redio nke òtù UN na-akọ na dị ka Human Development Report 1998 nke òtù Mba Ndị Dị n’Otu si kwuo, inye onye ọ bụla mmiri dị ọcha na usoro idebe ihe ọcha ga-ewe ijeri dollar 11—nke ahụ erughị ego ndị Europe na-emefu na ice cream n’otu afọ!
[Ebe E Si Nweta Foto Dị na peeji 24]
Foto: Casas, Godo-Foto