Ụzọ Ndụ Gị—Olee Ihe Ize Ndụ Dị na Ya?
N’ỌTỤTỤ ụzọ ọ dịtụbeghị mgbe e nwere olileanya inwe ahụ ike dị mma karịa ka ọ dị ugbu a. Otu akụkọ sitere n’aka Òtù Ahụ Ike Ụwa (WHO) na 1998 na-ekwu, sị: “Ugbu a karịa mgbe ọ bụla ọzọ ọtụtụ ndị na-enweta ma ọ dịkarịa ala nlekọta ahụ ike bụ́ iwu na a ga-enyerịrị, na-enwe mmiri dị mma na usoro mkpofu ihe.” N’eziokwu, ọtụtụ ndị bi n’ụwa ka na-ebi ndụ n’ọnọdụ ndị dị njọ, ma dị ka Ụlọ Ọrụ Mgbasa Ozi nke Britain si kọọ, “e belatawo ịda ogbenye n’ụwa nile n’ime afọ 50 gara aga karịa ka e belatara ya n’ime afọ 500 bu ụzọ.”
N’ụwa nile ọganihu e nwere n’usoro nlekọta ahụ ike nke ụwa etinyewo ọtụtụ afọ ná nkezi afọ ndụ mmadụ nwere ike iru malite na mgbe a mụrụ ya. Na 1955 nkezi ya bụ afọ 48. Mgbe ọ na-erule 1995 ọ rịruwo afọ 65. Otu ihe kpatara ịrị elu a bụ ọganihu e nwere n’igbochi ọrịa ụmụaka.
Nanị ihe karịrị afọ 40 gara aga, pasent 40 nke ndị nile na-anwụnụ bụ ụmụaka na-erubeghị afọ ise. Otú ọ dị, mgbe ọ na-erule 1998, e chebewo ọtụtụ ụmụaka nọ n’ụwa pụọ n’ọrịa ndị bụ́ isi na-arịa ụmụaka site n’enyemaka nke ọgwụ mgbochi ọrịa. N’ihi ya, ọnụ ọgụgụ nke ụmụaka na-erubeghị afọ ise na-anwụnụ adalatawo ịbụ pasent 21 nke ndị nile na-anwụnụ. Dị ka òtù WHO si kwuo, e nwewo “ọganihu doro anya n’inwekwu ahụ ike, na ndụ dịwanyere ogologo.”
Otú ọ dị, ndụ dịwanyere ogologo nke a na-emeziwanyechaghị ọdịdị ya ga-abụ mmeri na-enweghị isi. N’ịchọ ibi ndụ n’ọnọdụ ka mma, ọtụtụ ndị na-eji ihe ụtọ nke ụwa akpọrọ ihe nke ukwuu. Otú ọ dị, ụzọ ndụ dị otú ahụ pụrụ inwe ọtụtụ ihe ize ndụ ahụ ike nke ya.
Ọ̀ Bụ Ụzọ Ndụ Ka Mma?
Ọganihu e nwere n’ọha mmadụ na n’ọnọdụ akụ̀ na ụba na nso nso a akpatawo mgbanwe dị ukwuu n’ụzọ ndụ nke ndị mmadụ. Ugbu a ọtụtụ ndị nọ ná mba ndị mepere eme pụrụ ịzụta ihe na ịkwụ ụgwọ ozi ndị ọ bụbu nanị ndị bara ọgaranya karị pụrụ inweta. Ọ bụkwa ezie na ụfọdụ n’ime ọganihu ndị a emewo ka atụmanya nke ndụ dịwanyere ogologo rịa elu, a ranyewo ọtụtụ ndị n’ụzọ ndụ nke ibibi onwe onye.
Dị ka ihe atụ, ọtụtụ nde mmadụ ejiriwo nnukwu ego ha zụrụ ihe ndị na-adịghị mkpa dị ka ọgwụ ọjọọ, mmanya na-aba n’anya, na ụtaba. N’ụzọ dị mwute, a pụrụ ịkọ otú ihe nile ha ga-akpata pụrụ ịdị. “Ihe kasị amụba ngwa ngwa nke na-eyi ahụ ike ọha na eze egwu n’ụwa abụghị ọrịa,” ka magazin World Watch na-ekwu, “ọ bụ ihe e mepụtara emepụta.” Magazin ahụ na-agbakwụnye, sị: “N’ime afọ 25, a na-atụ anya na ọrịa ụtaba na-akpata ga-anọchi anya ọrịa na-efe efe dị ka ihe kasị eyi ahụ ike ụmụ mmadụ egwu n’ụwa nile.” Ọzọkwa, magazin bụ́ Scientific American na-ekwu, sị: “A pụrụ ikwu na ọ bụ ise siga kasị akpata ihe dị ukwuu ha ka pasent 30 nke ọrịa cancer na-egbu mmadụ, ọnụ ọgụgụ hakwa ka nke ahụ bụ n’ihi ụzọ ndụ, karịsịa otú e si eri ihe na enweghị mmega ahụ.”
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na nhọrọ anyị na-eme banyere ụzọ anyị si ebi ndụ na-enwe mmetụta dị ukwuu n’ahụ ike anyị. Oleezi otú anyị pụrụ isi nọgide na-enwe ma ọ bụ meziwanye ahụ ike anyị? Ihe oriri na imega ahụ hà zuru? Ọzọkwa, òkè dị aṅaa ka ihe ndị metụtara uche na ihe ime mmụọ na-ekere n’ụzọ ndụ dị mma?