Ụzọ Isi Chebe Ahụ Ike Gị
IHE ịma aka e nwere taa bụ ikpebi ihe ga-akasị metụta ahụ ike anyị. Usoro mgbasa ozi emewo ka ụwa jupụta n’ọtụtụ ihe ọmụma banyere ịkpara nri ókè, mmega ahụ, ihe ndị na-edozi ahụ, na ọtụtụ ihe ndị ọzọ metụtara ahụ ike. Ọ dị mwute na ọtụtụ n’ime ha na-emegiderịta onwe ha. Denise Grady na-ede akwụkwọ sayensị na-ekwu, sị: “Ndụmọdụ a na-enye ọha na eze banyere ihe ha ga-eri, ọgwụ ha ga-aṅụ, na n’ụzọ bụ́ isi, otú ha ga-esi na-ebi ndụ, yiri ka ọ na-agbanwe oge ọ bụla e bipụtara ihe ọhụrụ n’akwụkwọ ahụ ike.”
Ndị dọkịta ụfọdụ na-adụ ọdụ na ọ bụ ihe ezi uche dị na ya ịnọgide na-eme ihe ndị bụ́ isi a na-emebu karịa ịnwale ihe ọhụrụ ọ bụla pụtaranụ e ji akwalite ahụ ike. Dị ka ihe atụ, The American Medical Association Family Medical Guide na-ekwu, sị: “Ị pụrụ inwe ahụ ike ka mma n’oge ndụ gị nile site n’ime mgbanwe ndị dị mma n’ụzọ ndụ gị na site n’ịga ka e lee gị ahụ mgbe mgbe, ka e wee chọpụta ọrịa ọ bụla maliterenụ ma gwọọ ya ngwa ngwa.” Ma olee ụdị “mgbanwe ndị dị mma n’ụzọ ndụ” bụ́ ndị kasị aba uru? Ka anyị tụlee atọ n’ime ha.
Họrọ Ihe Oriri Ndị Na-akwalite Ahụ Ike
Ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike na-atụ aro ka anyị na-eri ihe oriri dịgasị iche, na-enweta calorie anyị karịsịa site na carbohydrate ndị nwere ọtụtụ ngwakọta, nke ka nke ndị dị ná mkpụrụ akụ́kụ́ ndị na-adịghị ihe ọ bụla e wepụrụ na ha, àgwà, akwụkwọ nri, na mkpụrụ osisi.a Otú ọ dị, ọ bụghị nanị ihe anyị na-eri na-emetụta ahụ ike anyị kamakwa ókè anyị na-eriru ha. Ọ dị mkpa ka anyị ghara iribiga nri ókè. Ịnọgide na-enweta calorie karịa ole ahụ anyị pụrụ ịgbari na-akpata ibubiga ibu ókè. Nke a, n’aka nke ya, pụrụ ime ka obi na-arụbiga ọrụ ókè, ịkụgwo ahụ, ma mee ka mmadụ “nwekwuo ike ịrịa ọrịa obi, ọrịa shuga, ọrịa rheumatoid arthritis, na ọtụtụ ọrịa ndị ọzọ,” ka otu akwụkwọ banyere ọgwụ na-ekwu.
N’afọ ndị a e lebarawo okwu banyere abụba sitere n’ihe oriri anya nke ukwuu. Ọtụtụ ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike na-ekwu na ihe oriri abụba ọjọọ dị na ya nke ukwuu na-amụba ohere e nwere ịrịa ọrịa obi na ụdị ọrịa cancer ụfọdụ. Otú ọ dị, nke a apụtaghị na anyị kwesịrị iwepụ abụba nile dị n’ihe oriri anyị. “Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, ị pụrụ iwebatatụ ihe ndị na-amasị gị n’ime nri ndị na-akwalite ahụ ike ị na-eri,” ka Mary Abbott Hess, bụbu onyeisi Òtù Na-ahụ Maka Ihe Oriri n’America na-ekwu. Ihe dị mkpa bụ iritụ ha nke nta ma kpaara ihe ndị ọzọ na-enye abụba ókè.
N’ezie, ịgbanwe otú i si eri nri adịghị mfe. N’eziokwu, ụfọdụ pụrụ iche na ndụ agaghị adị ụtọ ma ọ bụrụ na ha aghaghị ịmachibido onwe ha mgbe nile iri ihe oriri ndị na-atọ ha ụtọ. Ma kama ịgbaso nanị otu ụzọ, gbalịa imeru ihe n’ókè. Ọ bụ okwu banyere iwelata aka karịa izere ha kpam kpam. Family Medical Guide e hotara mbụ na-ekwu, sị: “Ịgbaso ụzọ ndụ na-akwalite ahụ ike apụtaghị na ị ghaghị ịkwụsị ịnụ ụtọ ndụ.”
Ndị ọkà n’ihe oriri na-atụ aro na ị pụrụ ibelata mmetụta nke ịgbanwe ihe oriri na-enwe n’ahụ gị site n’iji nwayọọ nwayọọ kwụsị iri ihe oriri ndị na-adịghị akwalite ahụ ike. Dị ka ihe atụ, na-agbanwe ihe oriri gị n’ime izu, ọ bụghị nanị otu ụbọchị. Ọ bụrụ na ị na-eri anụ ehi kwa ụbọchị ugbu a, nwalee ibelata ya ka ọ bụrụ ugboro atọ n’izu. Otú ahụ ka ọ dịkwa ihe oriri ndị abụba ọjọọ dị na ha nke ukwuu, dị ka bọta, cheese, ice cream, na nri mgbadume ndị abụba dị na ha nke ukwuu. Nzube ya kwesịrị ịbụ ibelata abụba ị na-eri ka ọ ghara ịkarị pasent 30 nke calorie nile ị na-enweta.
Dr. Walter Willett nke Mahadum Harvard na-adọ aka ná ntị megide iwelata aka n’ihe oriri nwere abụba ma jirizie ihe oriri ndị carbohydrate na shuga dị na ha nke ukwuu dochie anya ha. Nke a na-akpatakarị ibu ibu. Ihe ka mma ị ga-eme bụ iwelata aka n’ihe oriri nwere ma abụba ma carbohydrate.
Mmega Ahụ Na-agabigaghị Ókè
Ụzọ ndụ na-akwalite ahụ ike gụnyere usoro imega ahụ mgbe nile. Dr. Steven Blair, bụ́ onye chịkọtara akụkọ banyere ahụ ike nke sitere n’aka dọkịta ukwu nke United States na-ekwu, sị: “Ndị hapụrụ ụzọ ndụ nke ịnọ otu ebe ma megawa ahụ n’ụzọ na-agabigaghị ókè na-egbubilata ohere ha nwere ịrịa ọrịa obi ruo ọkara.” N’ụzọ dị mwute, ọtụtụ ndị taa adịghịdị emegatụ ahụ. Dị ka ihe atụ, na United States, e kwuru na 1 onye n’ime mmadụ 4 adịghị emega ahụ ma ọlị. Na Canada otu nnyocha isiokwu ya bụ́ 1997 Physical Activity Benchmarks chọpụtara na “pasent 63 nke ndị Canada na-eji ihe na-erughị otu awa n’ụbọchị emega ahụ,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Toronto Star na-ekwu. Ndị nnyocha nọ na Britain na-ekwukwa na otu ìgwè ụmụaka ha nyochara “adịghị nnọọ emega ahụ nke na otiti obi ha mgbe ha mụ anya adịchaghị nnọọ iche na mgbe ha na-ehi ụra.”—The Sunday Times.
Na mbụ e chere na ọ bụ nanị imega ahụ n’ụzọ siri ike na-enye ahụ ike. Ma mmega ahụ gabigara ókè adịghị mkpa iji meziwanye ahụ ike. N’eziokwu, “iwepụ calorie dị nanị 150 n’otu ụbọchị [site n’obere mmega ahụ] pụrụ ibelata ohere ịrịa ọrịa obi, ọbara mgbali elu, ọrịa cancer na ọrịa shuga,” dị ka akụkọ dọkịta ukwu ahụ si kwuo.
Mgbe ị na-ahọrọ mmega ahụ, ọ dị mkpa ka ị họrọ ihe na-atọ gị ụtọ ime. Ma ọ bụghị ya, ị gaghị eme ya akụkụ nke ụzọ ndụ gị. Ihe dị mkpa abụghị nnọọ ihe ị na-eme iji megaa ahụ kama ugboro ole ị na-eme ya. Ụlọ Ọrụ Ndị Na-ahụ Maka Ahụ Ike na United States na-atụ aro na dị ka ụkpụrụ nduzi dịịrị mmadụ nile, “ma ụmụaka ma ndị toworo eto kwesịrị isetịpụ ihe mgbaru ọsọ nke imega ahụ n’ụzọ na-agabigaghị ókè ruo ma ọ dịkarịa ala minit 30 n’ihe ka ọtụtụ n’ụbọchị ndị dị n’izu, ọ ga-akasịkwa mma ma ọ bụrụ n’ụbọchị nile n’izu.”
Ụdị ihe omume dị aṅaa ka a na-ewere ịbụ nke na-agabigaghị ókè? Igwu mmiri, ịga ije ọsọ ọsọ, ịgba ígwè, ịsa ụgbọala na ite ya wax, ịrịgo stepụ, na ịza èzí. Ọ dịghị gị mkpa ịbanye n’òtù mmega ahụ iji chebe ahụ ike gị. Otú ọ dị, e nwere otu ihe a ga-akpachapụrụ anya: Ndị ọkachamara n’ihe banyere ahụ ike na-atụ aro na ọ bụrụ na ị rịatụwo ọrịa obi ma ọ bụ bụrụ nwoke gafeworo afọ 40 ma ọ bụ nwanyị gafeworo afọ 50, i kwesịrị ịhụ na ị gwara dọkịta gị tupu ị malite usoro mmega ahụ ọ bụla.
Gịnị Banyere Ise Siga, Ọgwụ Ọjọọ, na Mmanya Na-aba n’Anya?
Ise Siga: Anwụrụ siga nwere ihe ndị na-eyi ahụ ike egwu karịrị 4,000, bụ́ ndị 200 n’ime ha bụ nsí a ma ama. Otú ọ dị, n’agbanyeghị ókè nsí dị na ya ha, a dịchaghị agbagha mmetụta ọjọọ ise siga na-enwe n’ahụ mmadụ. Ọ bụ ihe ole na ole ndị ọzọ a na-azụ azụ ka a pụrụ ijitụ tụnyere siga ma a bịa n’ọnụ ọgụgụ mmadụ ha na-egbu. Dị ka ihe atụ, na United States, ọrịa siga na-akpata na-egbu ndị mmadụ karịa ihe mberede ụgbọala okpukpu iri. N’ụwa nile, Òtù Ahụ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na ise siga na-egbu nde mmadụ atọ kwa afọ!
Tụkwasị n’ohere dị ukwuu ha nwere ịrịa ọrịa cancer na ọrịa obi, ndị na-ese siga na-enwekarị àzụ̀zụ̀, ọnyá afọ, ọzịza nke opi akpa ume, na ọbara mgbali elu karịa ndị na-adịghị ese siga. Ise siga na-ebelatakwa ikike ịnụ ísì na ịnụ ụtọ ihe nke mmadụ. N’ụzọ doro anya, ịkwụsị ise siga bụ otu n’ime ihe ndị dị kasị mkpa mmadụ pụrụ ime iji chekwaa ahụ ike. Ma gịnị banyere ọgwụ ọjọọ na mmanya na-aba n’anya?
Ọgwụ Ọjọọ: N’ụwa nile ịṅụ ọgwụ ọjọọ egbuwo ọtụtụ mmadụ. Ngalaba Ahụ Ike na Ije Ozi Ọha na Eze na United States na-ekwu, sị: “Kwa afọ, ịṅụ ọgwụ ọjọọ na-egbu ndị America 14,000.” Ma ọ bụghị nanị ndị na-aṅụ ọgwụ ọjọọ ka ịzụ ahịa ọgwụ ọjọọ na-emetụta. Iji nweta ego maka àgwà ha, ọtụtụ n’ime ndị o riri ahụ na-amalite ime ihe ike ma biwezie ndụ ime mpụ. Akwụkwọ bụ́ The Sociology of Juvenile Delinquency na-ekwu, sị: “Asọmpi dị n’usoro nkesa nke ọgwụ cocaine emewo ka ógbè ụfọdụ ndị mmadụ bijupụtara ghọọ ebe ndị mepere emepe ‘dị ize ndụ,’ bụ́ ebe igbu ọchụ dị oké elu nke na ndị uwe ojii weere ha dị ka ógbè ọjọọ na-enweghị nchịkwa.”
Otú ọ dị, ịṅụ ọgwụ ọjọọ abụtụghị nsogbu dị na United States nanị. Dị ka otu atụmatụ e mere gosiri, kwa afọ n’ụwa nile ịgba ọgwụ ọjọọ na-egbu malite na mmadụ 160,000 ruo 210,000. Ọzọkwa, ọtụtụ nde mmadụ na-eji ụdị ọgwụ ọjọọ ndị ọzọ, dị ka khat (akwụkwọ ndụ na-eme ka e nwee mkpali), akị osisi betel, na cocaine eme ihe.
Mmanya Na-aba n’Anya: Ọ bụ ezie na ọgwụ ọjọọ ndị dị ka cocaine na herion na-adọrọ uche ọha na eze, ịnụbiga mmanya ókè na-emebi ihe ọbụna karị. Aṅụrụma “na-akpatara otu onye n’ime ndị Canada 10 nsogbu,” ka akwụkwọ akụkọ bụ́ The Medical Post na-akọ, “na-efukwa ijeri $10 n’usoro nlekọta ahụ ike kwa afọ.” Na United States, a na-eme atụmatụ na mmanya na-aba n’anya so na-akpata pasent 50 nke ajọ ihe mberede ụgbọala na ọkụ ọgbụgba, pasent 45 nke ndị mmiri na-eri, na pasent 36 nke ihe mberede ndị ji ụkwụ aga. Ịṅụbiga mmanya ókè na-akpatakwa ọtụtụ ime mpụ obi ọjọọ. Mmanya na-aba n’anya na-abụkarị ihe inyeaka zoro ezo nye ndị na-egbu ọchụ, ndị na-awakpo mmadụ, ndị na-edina mmadụ n’ike, ndị na-emetọ ụmụaka, ma ọ bụ ndị na-egbu onwe ha.
Ọ bụrụ na onye ị hụrụ n’anya na-adabere na mmanya na-aba n’anya, siga, ma ọ bụ ọgwụ ọjọọ, chọọ enyemaka.b Okwu Chineke, bụ́ Bible, na-ekwu “na mgbe nile ka enyi na-ahụ n’anya, a na-amụkwa nwanne banyere ahụhụ.” (Ilu 17:17) Ee, inwe obi ike ná nkwado ịhụnanya nke ma ezinụlọ ma ndị enyi pụrụ inyere gị nnọọ aka ịnagide ọnọdụ siri ike.
Ma ka i wee nwee ahụ ike n’ezie, ọ bụghị nanị ezi ahụ ike dị gị mkpa. Ihe ndị metụtara uche na ihe ime mmụọ dị mkpa n’ịnọgide na-agbaso ụzọ ndụ dị mma. Isiokwu na-esonụ ga-atụle nke a.
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Maka nkọwa zuru ezu banyere ihe oriri na-akwalite ahụ ike, lee Teta!, nke July 8, 1997, peji nke 7-13.
b Lee usoro isiokwu bụ́ “Enyemaka Maka Ndị Aṅụrụma na Ezinụlọ Ha,” dị ná mbipụta Teta! August 8, 1992.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 5]
“Ịgbaso ụzọ ndụ dị mma apụtaghị na ị ghaghị ịkwụsị ịnụ ụtọ ndụ”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 6]
Òtù Ahụ Ike Ụwa na-eme atụmatụ na ise siga na-egbu nde mmadụ atọ kwa afọ
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 7]
“Ihe fọrọ nke nta ka ọ bụrụ kwa ụbọchị, ị pụrụ iwebatatụ ihe ndị na-amasị gị n’ime nri ndị na-akwalite ahụ ike ị na-eri”
[Foto dị na peeji nke 5]
Imega ahụ oge nile pụrụ iso n’ụzọ ndụ dị mma
[Foto dị na peeji nke 6]
Zere ụtaba na ọgwụ ọjọọ
[Foto dị na peeji nke 7]
Ahụ gị chọrọ mkpụrụ osisi na akwụkwọ nri
[Foto dị na peeji nke 7]
Ọbụna ọrụ ụlọ ndị a na-arụ kwa ụbọchị pụrụ ịbụ mmega ahụ na-akwalite ahụ ike