Ụzọ Isi Nọgide Na-enwe Echiche Dị Mma
AHỤ ike anyị na-adabere nke ukwuu n’ihe anyị na-eri. Ọ bụrụ na mmadụ na-eri nri ratụ ratụ mgbe nile, ọ ga-emebi ahụ ike ya n’ikpeazụ. Otu ụkpụrụ a dabara adaba n’ihe banyere ahụ ike uche anyị.
Dị ka ihe atụ, ị pụrụ iji ihe ndị anyị na-ekwe ka ọ bata n’uche anyị tụnyere otu ụdị nke nri uche. Ànyị sịrị nri uche? Ee, ihe ọmụma anyị na-enweta n’akwụkwọ, magazin, ihe ngosi telivishọn, ihe nkiri vidio, egwuregwu vidio, Internet, na n’okwu abụ pụrụ imetụta echiche na àgwà anyị dị nnọọ ka ihe oriri nkịtị na-emetụta ahụ anyi. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa?
Onye bụbu onyeisi ụlọ ọrụ na-akpọsa ngwá ahịa, bụ́ Jerry Mander dere banyere mmetụta telivishọn na-enwe ná ndụ anyị, sị: “Karịa mmetụta ọ bụla ọzọ, telivishọn na-etinye onyinyo n’ụbụrụ anyị.” Otú ọ dị, onyinyo ndị ahụ adịghị abụrụ anyị nanị ihe ntụrụndụ. Magazin bụ́ The Family Therapy Networker na-ekwu, sị: “Asụsụ, onyinyo, ụda, echiche, àgwà, ọnọdụ, ụkpụrụ, echiche ịma mma nke ụlọ ọrụ mgbasa ozi na-emesị bụrụ ihe anyị na-eche, ihe na-emetụta anyị na ihe anyị na-arọ ná nrọ.”
Ee, ma ànyị maara ma ọ bụ na anyị amaghị, ihe anyị na-ekiri na telivishọn na ụdị ihe ntụrụndụ ndị ọzọ pụrụ iji aghụghọ dufuo uche na mmetụta anyị. Nke a bụ ebe ihe ize ndụ dị. Dị ka Mander na-ekwu, “anyị bụ́ ụmụ mmadụ na-eji nwayọọ nwayọọ akpawa àgwà dị ka onyinyo ọ bula anyị bu n’uche si dị.”
Ihe Na-emebi Ụbụrụ
Ọtụtụ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha na-eleru nri ha anya nke ọma na-eri nri uche ọ bụla a na-enye ha site n’usoro mgbasa ozi, n’ụzọ a na-akparaghị ókè. Dị ka ihe atụ, ị̀ nụtụwo ka mmadụ kwuru, sị: “Ọ dịghị ezigbo ihe a na-eme na TV!” Ụfọdụ na-eyi ndị a dọọrọ uche ha kpam kpam, na-agbagharị site n’otu ụlọ ọrụ mgbasa ozi gaa n’ọzọ n’olileanya inweta ebe a na-eme ihe bara uru. Echiche nke ịgbanyụ TV adịtụghị abata ha n’obi!
Gụnyere iri oge dị ukwuu, ọtụtụ ihe ngosi telivishọn bụ ihe ndị Kraịst kwesịrị izere. “E wezụga okwu rere ure,” ka onye na-ede ihe banyere nkà bụ́ Gary Koltookian na-ekwu, “ihe ndị a na-arụrụ ụka na ndị metụtara mmekọahụ na-apụta na telivishọn taa karịa n’oge gara aga.” N’ezie, a chọpụtara n’otu nnyocha e mere na nso nso a na United States na a na-egosi ebe a na-enwe mmekọahụ ná nkezi nke ugboro 27 kwa awa n’oge awa ọtụtụ ndị ji ekiri telivishọn.
Nke a na-eme ka mmadụ na-eche banyere mmetụta nke a na-enwe n’echiche ndị mmadụ. Na Japan otu ihe omume telivishọn a ma ama dọọrọ mmasị ọtụtụ ndị nke na usoro mgbasa ozi nke mba ahụ kwuru na ọ kpaliri “mmụba nke ịkwa iko.” Ọzọkwa, ndị dere akwụkwọ bụ́ Watching America na-ekwu, sị: “Taa a na-ele ihe ka ọtụtụ n’ime ụdị dị iche iche nke mmekọahụ anya . . . dị ka ụzọ ndụ ziri ezi mmadụ na-eji aka ya ahọrọ.”
Ka o sina dị, ihe omume TV ndị na-akpọsa mmekọahụ aghara aghara bụ nanị akụkụ nke nsogbu ahụ. A na-ahụkarịkwa ngosi pụtara ìhè nke ime ihe ike. Nke kasị enye nsogbu bụ mmetụta ọjọọ ihe omume TV na ihe nkiri sịnịma ndị na-egosi ime ihe ike pụrụ inwe n’uche ndị na-eto eto, bụ́ ndị ihe na-emetụta ngwa ngwa. “Mgbe ụmụaka hụrụ ka a gbara mmadụ égbè, a mara mmadụ mma, e dinara mmadụ n’ike, e mekpọrọ mmadụ ọnụ, e wedara mmadụ n’ala, ma ọ bụ e gburu mmadụ na TV,” ka David Grossman, bụ́ onyeisi usuu ndị agha nke laworo ezumike nká nakwa ọkachamara n’akparamàgwà mmadụ n’ebe igbu mmadụ dị, na-ekwu, “nye ha ọ na-adị ka ihe mere eme.” N’ikwu okwu n’otu nsogbu a, magazin bụ́ The Journal of the American Medical Association kwuru, sị: “Malite mgbe a mụrụ ha ruo mgbe ha gbara afọ 3 na 4, ọtụtụ ụmụaka enweghị ike ịma ihe dị iche n’etiti ihe bụ eziokwu na akụkọ ifo n’ihe omume telivishọn, ọ ga-anọgide na-esiri ha ike ime otú ahụ n’agbanyeghị ntụziaka nke ndị toworo eto.” Ikwu ya n’ụzọ ọzọ, ọ bụ ezie na nne ma ọ bụ nna pụrụ ịgwa nwatakịrị, sị, ‘Ndị ahụ anwụghị anwụ n’ezie; ha na-eme nnọọ ka hà nwụrụ anwụ,’ ọ ka ga-esiri uche nwatakịrị ike ịma ihe dị iche. Nye nwatakịrị, ime ihe ike a na-egosi na TV bụ nnọọ ihe na-eme eme.
N’ịchịkọta mmetụta “ime ihe ike a na-egosi n’usoro mgbasa ozi” na-enwe, magazin bụ́ Time kwuru, sị: “Ọ bụ ndị nnyocha ole na ole ka na-enye onwe ha nsogbu ịrụ ụka na mwụfu ọbara a na-egosi na TV na n’ihe nkiri sịnịma na-emetụta ụmụaka na-ekiri ha.” Mmetụta dị aṅaa ka ọ na-enwe? “Ọtụtụ iri afọ nke ntụrụndụ na-egosi ime ihe ike agbanwewo echiche na ụkpụrụ ọha na eze,” ka onye na-akatọ ihe nkiri sịnịma bụ́ Michael Medved na-ekwu. Ọ na-ekwukwasị: “Nke ahụ abụtụghị ọganihu mgbe ihe na-adịghịzi emetụta ọha na eze n’ahụ.” Ka a sịkwa ihe mere otu onye edemede ji kwuo na ịkpọrọ nwata dị afọ anọ aga ikiri sịnịma ndị a na-eme ihe ike na ha “bụ imebi ụbụrụ [ya].”
Otú ọ dị, nke a apụtaghị na ihe omume telivishọn nile dị njọ. Otú ahụ ka ọ dịkwa akwụkwọ, magazin, ihe nkiri vidio, egwuregwu kọmputa, na ụdị ntụrụndụ ndị ọzọ. Otú ọ dị, o doro anya na ọtụtụ ihe a na-akpọ ntụrụndụ ekwesịghị ekwesị nye ndị chọrọ ịnọgide na-enwe echiche dị mma.
Jiri Amamihe Họrọ Ntụrụndụ
Onyinyo ndị si n’anya anyị abanye n’uche anyị na-emetụta echiche na omume anyị n’ụzọ dị ike. Dị ka ihe atụ, ọ bụrụ na anyị na-ekwe ka ntụrụndụ rụrụ arụ bata n’uche anyị mgbe nile, ọ pụrụ ime ka mkpebi anyị irube isi n’iwu Bible ahụ bụ́ “gbanarịnụ ịkwa iko” ghara isikwa ike. (1 Ndị Kọrint 6:18) N’otu aka ahụ, ọ bụrụ na anyị na-ekiri ihe ntụrụndụ na-egosi “mmadụ ndị na-arụ ajọ ihe,” ọ pụrụ isiri anyị ike isoro “mmadụ nile na-adị n’udo.” (Abụ Ọma 141:4; Ndị Rom 12:18) Iji zere nke a, anyị aghaghị iwepụ anya anyị n’ihe “jọgburu onwe ya.”—Abụ Ọma 101:3; Ilu 4:25, 27.
N’eziokwu, n’ihi ezughị okè e ketara eketa, anyị nile aghaghị ịdọlị iji mee ihe ziri ezi. Pọl onyeozi ji obi eziokwu kweta, sị: “Mụ na iwu Chineke na-enwekọ obi ụtọ dị ka mmadụ ime m si dị: ma ana m ahụ iwu dị iche n’ihe nile dị m n’ahụ, na-ebu agha megide iwu nke uche m, na-adọtakwa m n’agha nye iwu nke mmehie nke dị n’ihe nile dị m n’ahụ.” (Ndị Rom 7:22, 23) Nke a ọ̀ pụtara na Pọl kwere ka adịghị ike anụ ahụ ya chịkwaa ya? Ọ dịghị ma ọlị! O kwuru, sị: “Ana m etipụta ahụ m ọnyá, meekwa ya ka ọ bụrụ ohu m: ka mụ onwe m ghara ịghọ onye a jụrụ ajụ n’ụzọ ọ bụla.”—1 Ndị Kọrint 9:27.
N’otu aka ahụ, o kwesịtụghị ekwesị ka anyị jiri ezughị okè anyị mere ihe ngọpụ maka mmehie. Onye so dee Bible bụ́ Jud kwuru, sị: “Ndị m hụrụ n’anya, . . . ọ dị m mkpa idegara unu akwụkwọ na-arịọ unu ka unu na-agbasi mgba ike n’ihi okwukwe ahụ nke e nyere ndị nsọ n’aka nanị otu mgbe idebe.” (Jud 3, 4) Ee, ọ dị anyị mkpa ‘ịgbasi mgba ike’ na izere ihe ntụrụndụ na-akpali anyị ime ihe ọjọọ.a
Chọọ Nduzi Chineke
Inwe echiche dị mma anaghị adị mfe mgbe nile n’usoro ihe a. Otú ọ dị, Bible na-emesi anyị obi ike na anyị pụrụ ịnọgide na-adị ọcha ma n’uche ma n’omume. Ọ̀ bụ n’ụzọ dị aṅaa? N’Abụ Ọma 119:11, anyị na-agụ, sị: “N’obi m ka m zobeworo okwu ọnụ Gị, ka m wee ghara imehie megide Gị.”
Izobe okwu Chineke pụtara ile ya anya dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụ ihe bara ezigbo uru. O doro anya na ọ ga-esiri anyị ike iwere Bible dị ka ihe dị oké ọnụ ahịa ma ọ bụrụ na anyị amaghị ihe ọ na-ekwu. Site n’inweta ezi ihe ọmụma n’Okwu Chineke, anyị na-amata uche Chineke. (Aịsaịa 55:8, 9; Jọn 17:3) Nke a, n’aka nke ya, na-eme ka anyị baa ọgaranya n’ụzọ ime mmụọ ma na-eme ka echiche anyị ka mma.
È nwere ihe ọ̀tụ̀tụ̀ a pụrụ ịdabere na ya a ga-eji na-atụ ihe dị mma n’ụzọ ime mmụọ na n’uche? Ee! Pọl onyeozi dụrụ ọdụ, sị: “Ka ihe bụ eziokwu hà, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị nsọpụrụ, ka ha hà, bụ́ ihe ziri ezi, ka ha hà, bụ́ ihe dị ọcha, ka ha hà, bụ́ ihe kwesịrị ịhụnanya, ka ha hà, bụ́ ihe e kwuru nke ọma; ọ bụrụ na ịdị mma ọ bụla dị, ọ bụrụkwa na otuto ọ bụla dị, na-agụkọnụ ihe ndị a.”—Ndị Filipaị 4:8.
Ma ka anyị wee rite ezigbo uru, a chọrọ ihe karịrị inweta ihe ọmụma banyere Chineke. Aịsaịa onye amụma dere site n’ike mmụọ nsọ, sị: “Mụ onwe m bụ Jehova, Chineke gị, Onye na-ezi gị ime ihe na-aba uru, Onye na-eme ka ị zọọ ije n’ụzọ ị ga-ejeso.” (Aịsaịa 48:17, ọ bụ anyị dere okwu ụfọdụ n’ụdị dị iche.) Ee, ọ bụghị nanị ịchọ nduzi Chineke dị anyị mkpa kama ọ dịkwa anyị mkpa itinye ihe ọmụma ahụ n’ọrụ.
Ụzọ ọzọ isi rite uru n’ụzọ omume na n’ụzọ ime mmụọ bụ ịkpọku Jehova, bụ́ “Onye na-anụ ekpere.” (Abụ Ọma 65:2; 66:19) Ọ bụrụ na anyị ejiri ezi obi na ịdị umeala n’obi jekwuru Onye Okike anyị, ọ ga-anụ arịrịọ anyị. Ọ bụrụkwa na anyị “achọọ Ya, Ọ ga-eme ka [anyị] chọta Ya.”—2 Ihe E Mere 15:2.
Ya mere, ànyị pụrụ ịnọgide na-enwe ahụ ike nke uche n’ụwa a nke ime ihe ike na omume rụrụ arụ jupụtara? N’ezie, anyị pụrụ! Site n’ịghara ikwe ka ntụrụndụ nke ụwa a mee ka obi anyị kpọọ nkụ, site n’iji ọmụmụ nke Okwu Chineke wusie ikike iche echiche anyị ike, na site n’ịchọ nduzi Chineke, anyị pụrụ ịnọgide na-enwe echiche dị mma!
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Iji nwetakwuo ihe ọmụma banyere ịhọrọ ntụrụndụ dị mma, lee Teta!, June 8, 1997, peji nke 8-10.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 9]
“Ọtụtụ ụmụaka enweghị ike ịma ihe dị iche n’etiti ihe bụ eziokwu na akụkọ ifo n’ihe omume telivishọn”
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 11]
“Ọtụtụ iri afọ nke ntụrụndụ na-egosi ime ihe ike agbanwewo echiche na ụkpụrụ ọha na eze”
[Igbe dị na peeji nke 11]
Ibelata Ohere I Nwere Ịrịa Ọrịa Obi
Obere akwụkwọ akụkọ bụ́ Nutrition Action Healthletter na-atụ aro ihe ndị na-esonụ ị ga-eme iji nyere gị aka ibelata ohere i nwere ịrịa ọrịa obi.
• Kwụsị ise siga. Ịkwụsị ya taa pụrụ ibelata ohere i nwere ịrịa ọrịa obi n’ime otu afọ, ọbụna ma ọ bụrụ na i bukwuo ibu.
• Felata. Ọ bụrụ na i bubigara ibu ókè, iwepụ nanị kilogram abụọ ruo ise n’ibu gị pụrụ ime ka ọnọdụ gị ka mma.
• Megaa ahụ. Imega ahụ mgbe nile (ma ọ dịkarịa ala ugboro atọ n’izu) na-enye aka ebelata cholesterol ọjọọ (LDL), na-eme ka ọ̀tụ̀tụ̀ ọbara ji erugharị ghara ịdị ukwuu, na-egbochikwa ibubiga ibu ókè.
• Belata abụba ọjọọ ị na-eri. Ọ bụrụ na LDL dị gị n’ahụ dị ukwuu, na-erizi anụ nwere obere abụba, na-aṅụkwa mmiri ara ehi nwere 1 pasent nke abụba (ntakịrị abụba) ma ọ bụ mmiri ara ehi e wepụrụ abụba dị na ya (na-enweghị abụba) kama ịṅụ mmiri ara ehi nwere pasent abụba 2.
• Belata mmanya na-aba n’anya ị na-aṅụ. E nwere ihe ndị na-egosi na ndị na-adịghị aṅụbiga mmanya ókè pụrụ ibelata ohere ha nwere ịrịa ọrịa obi.
• Na-erikwu mkpụrụ osisi, akwụkwọ nri, na nri ndị ọzọ nwere nnukwu fiber na-agbari agbari.
[Foto dị na peeji nke 8]
Ime ihe ike a na-egosi na TV dị ka ihe na-emebi ụbụrụ nwatakịrị
[Foto dị na peeji nke 9]
Mgbe ụfọdụ ụmụaka na-eṅomi ime ihe ike ha na-ekiri na TV
[Foto dị na peeji nke 10]
Ndị mụrụ ụmụ pụrụ inyere ụmụ ha aka site n’ịzụtara ha ezigbo akwụkwọ ọgụgụ dịgasị iche