Nkà Mmụta Ọgwụ Ọgbara Ọhụrụ—Ókè Ha Aṅaa Ka Ọ Pụrụ Iru?
ỌTỤTỤ ụmụaka na-amụta ihe site na nwata: Iji ghọta oroma n’ebe aka ha na-erughị, ha na-arịgoro n’ubu onye ha na ya na-egwurikọ egwu. Na nkà mmụta ọgwụ, ihe yiri nke ahụ emewo. Ndị na-eme nchọpụta ọgwụ eruwo n’ọ̀tụ̀tụ̀ ọganihu na-arịwanye elu site n’iguzo n’ubu nke ndị ọkà a ma ama n’ọgwụ n’oge gara aga.
N’ime ndị ahụ na-agwọ ọrịa n’oge mbụ, e nwere ndị ikom a ma ama dị ka Hippocrates na Pasteur, tinyere ndị ikom dị ka Vesalius na William Morton—aha ndị dị ọhụrụ ná ntị ọtụtụ ndị mmadụ. Gịnị ka nkà mmụta ọgwụ ọgbara ọhụrụ ga-eji na-echeta ha?
N’oge ochie, ọrụ ịgwọ ọrịa adịghị abụkarị n’ụzọ nkà mmụta sayensị kama ọ na-agụnye nkwenkwe ụgha na ememe okpukpe. Akwụkwọ bụ́ The Epic of Medicine, nke Dr. Felix Marti-Ibañez dere, na-ekwu, sị: “Iji lụsoo ọrịa ọgụ . . . , ndị Mesọpotemia malitere iji ọgwụ na okpukpe na-agwọ ọrịa, ebe ha kweere na ọrịa bụ ntaramahụhụ sitere n’aka ndị bụ́ chi.” Nkà mmụta ọgwụ ndị Ijipt, bụ́ nke sochiri ya, gbanyere mkpọrọgwụ n’okpukpe n’otu aka ahụ. Ya mere, site nnọọ ná mmalite, a na-eji nkwanye ùgwù n’ụzọ okpukpe ele onye na-agwọ ọrịa anya.
N’akwụkwọ ya bụ́ The Clay Pedestal, Dr. Thomas A. Preston na-ekwu, sị: “Ọtụtụ nkwenkwe ndị oge ochie nwere mmetụta siri ike na nkà mmụta ọgwụ nke dịrutere n’oge a. Otu n’ime nkwenkwe ndị dị otú ahụ bụ na ọrịa karịrị ike onye ọrịa, na ọ gwụla site n’ike karịrị ike mmadụ nke onye dibịa ka e nwere olileanya mgbake.”
Ịtọ Ntọala Ya
Ma, ka oge na-aga, ọrụ ịgwọ ọrịa ghọwanyere nke a na-eji nkà mmụta sayensị arụ. Onye a kasị mara n’ịgwọ ọrịa n’ụzọ nkà mmụta sayensị n’oge ochie bụ Hippocrates. A mụrụ ya n’ihe dị ka 460 T.O.A. n’àgwàetiti Gris bụ́ Kos, ọtụtụ ndị na-ewerekwa ya dị ka onye malitere nkà mmụta ọgwụ n’Ebe Ọdịda Anyanwụ. Hippocrates tọrọ ntọala maka iji ezi uche agwọ ọrịa. Ọ jụrụ echiche ahụ bụ́ na ọrịa bụ ntaramahụhụ si n’aka chi, na-arụ ụka na ọ bụ ihe mmadụ bu pụta ụwa na-akpata ya. Dị ka ihe atụ, ọ dịwo anya a na-akpọ àkwụ́kwụ̀ ọrịa metụtara okpukpe n’ihi nkwenkwe bụ́ na ọ bụ nanị ndị bụ́ chi pụrụ ịgwọ ya. Ma Hippocrates dere, sị: “N’ihe banyere ọrịa ahụ a kpọrọ Nke Metụtara Okpukpe: o yiri m ka o sitụghị n’aka ndị bụ́ chi, ọ bụghịkwa ihe metụtara okpukpe dịkwa ka ọrịa ndị ọzọ, kama ọ bụ ihe mmadụ bu pụta ụwa na-akpata ya.” Hippocrates bụkwa onye mbụ a ma ama na-agwọ ọrịa chọpụtara mgbaàmà nke ọrịa dị iche iche ma dekọọ ha maka izo aka na ha n’ọdịnihu.
Ọtụtụ narị afọ ka e mesịrị, Galen, bụ́ onye dibịa Gris a mụrụ na 129 O.A., ji nkà mmụta sayensị mee nchọpụta ọhụrụ n’otu aka ahụ. N’ịdabere ná nnyocha o nyochara ahụ mmadụ na nke anụmanụ, Galen wepụtara otu akwụkwọ ọgụgụ banyere otú ahụ mmadụ na nke anụmanụ dị bụ́ nke ndị dọkịta ji mee ihe ruo ọtụtụ narị afọ! Ọ bụ Andreas Vesalius, onye a mụrụ na Brussels na 1514, dere akwụkwọ bụ́ On the Structure of the Human Body. E megidere akwụkwọ ahụ ebe ọ bụ na o kwugidere ọtụtụ n’ime ihe Galen kwuru, ma ọ tọrọ ntọala maka ihe ọmụmụ nke oge a banyere akụkụ ahụ mmadụ na anụmanụ. Dị ka akwụkwọ bụ́ Die Grossen (Ndị Ukwu Ahụ) si kwuo, Vesalius si otú a ghọọ “otu n’ime ndị nchọpụta ọgwụ kasị mkpa ndị ọ bụla nwetụworo.”
E mesịrị gbaghaa ihe ndị ahụ Galen chepụtara banyere obi na nrugharị ọbara n’otu aka ahụ.a William Harvey, dibịa bụ́ onye England, ji ọtụtụ afọ nyochaa ahụ ụmụ anụmanụ na nnụnụ. Ọ chọpụtara otú ihe ndị na-achịkwa oruru ọbara n’ime obi na-esi arụ ọrụ, chọpụta otú ọbara dị na nke ọ bụla n’ime oghere obi hà, meekwa atụmatụ otú ọbara dị n’ahụ mmadụ hà. Harvey bipụtara ihe ndị ọ chọpụtara na 1628 n’akwụkwọ a kpọrọ On the Motion of the Heart and Blood in Animals. A katọrọ ya, megide ya, wakpoo ya, ma kparịa ya. Ma ọrụ ya kpatara oké mgbanwe na nkà mmụta ọgwụ—a chọpụtawo usoro ọbara ji erugharị n’ahụ!
Site n’Ịkpụ Isi Gaa n’Ịwa Ahụ
A nọkwa na-enwe oké ọganihu n’ọrụ ịwa ahụ. N’oge Ụwa Na-emepechabeghị Anya, ịwa ahụ na-abụkarị ọrụ ndị na-akpụ isi. N’abụghị ihe ijuanya, ụfọdụ na-ekwu na onye malitere ịwa ahụ n’oge a bụ onye France dịrị ndụ na narị afọ nke 16 bụ́ Ambroise Paré—onye mbụ na-akpụ isi ma na-awa ahụ nke rụụrụ ndị eze anọ nke France ọrụ. Paré mepụtakwara ọtụtụ ngwá e ji awa ahụ.
Otu n’ime nsogbu ndị bụ́ isi ka chere dọkịta na-awa ahụ ihu na narị afọ nke 19 bụ ike ọ na-enweghị ibelata ụfụ ịwa ahụ na-afụ. Ma na 1846, onye dọkịta ọrịa ezé aha ya bụ William Morton meghere ụzọ maka ojiji e ji ọgwụ na-akụnwụ ahụ eme ihe n’ebe nile n’ịwa ahụ.b
Na 1895, ka o ji eletrik na-eme nchọpụta, onye Germany bụ́ ọkà n’ihe ọmụmụ physics bụ́ Wilhelm Röntgen hụrụ ka ụzarị ọkụ na-achafere n’anụ ahụ ma ọ bụghị n’ọkpụkpụ. Ọ maghị ebe ụzarị ndị ahụ si, ya mere ọ kpọrọ ha ụzarị X ray, aha a ka na-akpọ ha n’asụsụ Bekee. (Ndị Germany maara ha dị ka Röntgenstrahlen.) Dị ka akwụkwọ bụ́ Die Großen Deutschen (Ndị Germany A Ma Ama) si kwuo, Röntgen gwara nwunye ya, sị: “Ndị mmadụ ga-asị: ‘Ara agbaala Röntgen.’” Ụfọdụ kwuru otú ahụ. Ma ihe ọ chọpụtara mere ka e nwee oké mgbanwe n’ịwa ahụ. Ndị dọkịta na-awa ahụ pụziri ileba anya n’ime ahụ n’awaghị ya awa.
Imeri Ọrịa
N’ọgbọ nile, ọrịa ndị na-efe efe dị ka kịtịkpa kpatara oké ntiwapụ nke ọrịa, oké ụjọ, na ọnwụ, ọtụtụ mgbe. Ar-Rāzī, onye Peasia nke narị afọ nke itoolu, bụ́ onye ụfọdụ ndị weere dị ka dibịa kasịnụ n’ime ndị Alakụba dịrị ndụ n’oge ahụ, dere nkọwa nke kịtịkpa bụ́ nke mbụ kasị zie ezie n’okwu banyere ọgwụ na ahụ ike. Ma, ọ bụ ọtụtụ narị afọ mgbe nke ahụ gasịrị ka otu dibịa bụ́ onye Britain aha ya bụ Edward Jenner chọpụtara ụzọ e si agwọ ya. Jenner chọpụtara na ozugbo mmadụ butere cowpox—ọrịa na-adịghị emerụ ahụ—ọ dịghịzi ihe kịtịkpa na-eme ya. N’ịdabere ná nchọpụta a, Jenner ji ihe ndị si n’ọnyá dị n’akpụkpọ ahụ nwere ọrịa cowpox mepụta ọgwụ e ji egbochi kịtịkpa. O mere nke ahụ na 1796. Dịkwa ka ndị ọzọ bu ya ụzọ mepụta ihe ọhụrụ, a katọrọ Jenner ma megide ya. Ma nchọpụta ọ chọpụtara usoro ịgba ọgwụ mgbochi ọrịa mesịrị duje n’ikpochapụ ọrịa ahụ ma mee ka nkà mmụta ọgwụ nweta ngwá ọrụ ọhụrụ bụ́ ọkpọka.
Onye France bụ́ Louis Pasteur ji ọgwụ mgbochi ọrịa lụsoo ọrịa a na-ebute site ná nkịta na nke a na-ebute site n’ehi, ọgụ. Ọ nwapụtakwara na nje na-ekere òkè bụ́ isi n’ịkpata ọrịa. Na 1882, Robert Koch mere ka a mata nje na-akpata ụkwara nta, bụ́ nke otu ọkọ akụkọ ihe mere eme kọwara dị ka “ọrịa na-egbu egbu kasịnụ e nwere na narị afọ nke iri na itoolu.” Ihe dị ka otu afọ mgbe nke ahụ gasịrị, Koch mere ka a mata nje na-akpata ọrịa ọgbụgbọ na ọnyụnyụ. Magazin bụ́ Life na-ekwu, sị: “Ihe Pasteur na Koch chọpụtara malitere nkà mmụta nke ihe ndị dị ndụ anya nkịtị na-adịghị ahụ ma duje n’inwe ọganihu n’ịmụ banyere ike ahụ mmadụ nwere ịlụso ọrịa ọgụ, idebe ihe ọcha na ịdị ọcha bụ́ ndị meworo ihe dị ukwuu n’ịgbatịkwu afọ ndụ ụmụ mmadụ karịa ka ọganihu ọ bụla ọzọ e nwere na nkà mmụta sayensị mere n’ime 1,000 afọ gara aga.”
Nkà Mmụta Ọgwụ nke Narị Afọ nke Iri Abụọ
Ná mmalite nke narị afọ nke 20, nkà mmụta ọgwụ nọ na-eguzo n’ubu dọkịta ndị a nakwa ndị dọkịta ọzọ ụbụrụ ha na-aghọ nkọ. Eri mgbe ahụ, e nweela ọganihu na nkà mmụta ọgwụ n’ọ̀tụ̀tụ̀ na-eju anya—ọgwụ insulin maka ọrịa shuga, iji ọgwụ agwọ ọrịa cancer, iji mmiri ọgwụ ahụ bụ́ hormone agwọ arụzighị ọrụ nke ihe ndị dị n’ahụ, ọgwụ nje maka ụkwara nta, ọgwụ chloroquine maka ụdị ịba ụfọdụ, na usoro myọcha ọbara maka ọrịa akụrụ, nakwa ịwa obi na idochi akụkụ ahụ mmadụ, n’ịkpọtụ nanị ole na ole aha.
Ma ugbu a anyị nọ ná mmalite narị afọ nke 21, ókè ha aṅaa ka nkà mmụta ọgwụ nọ nso n’ihe mgbaru ọsọ nke ime ka e jide n’aka “ọ̀tụ̀tụ̀ ahụ ike dị mma maka mmadụ nile bi n’ụwa”?
Ọ̀ Bụ Ihe Mgbaru Ọsọ nke Aka Na-apụghị Iru?
Ụmụaka na-achọpụta na ịrịgoro n’ubu onye ha na ya na-egwurikọ egwu adịghị eme ka aka ha ruo n’oroma nile. Ụfọdụ n’ime oroma ndị kasị chaa achaa na-adị n’ebe kasị elu n’osisi oroma, bụ́ ebe aka ha na-enwetụghị ike iru. N’otu aka ahụ, nkà mmụta ọgwụ esitewo n’ịrụzu otu ihe gaa n’ọzọ, na-agakwa n’ihu n’ihu. Ma ihe mgbaru ọsọ a kasị achọsi ike—ezi ahụ ike maka onye ọ bụla—ka dị n’ebe aka ndị mmadụ na-erughị.
N’ihi ya, n’agbanyeghị na n’afọ 1998, Òtù Ndị Europe kọrọ na “ndị Europe enwetụbeghị ogologo ndụ na ahụ ike otú ha nwere ugbu a,” akụkọ ahụ kwukwara, sị: “Otu onye n’ime mmadụ ise ọ bụla ga-anwụchu ọnwụ tupu ya agbaa afọ 65. Ọrịa cancer ga-akpata ihe dị ka 40% n’ime ọnwụ ndị a, ọrịa obi ga-akpata 30% ọzọ . . . A ghaghị ime ka e nwee nchebe ka mma pụọ n’ihe ndị pụtara ọhụrụ na-eyi ahụ ike egwu.”
Magazin ahụ ike a na-ebipụta na Germany bụ́ Gesundheit kọrọ na November 1998 na ọrịa ndị na-efe efe dị ka ọgbụgbọ na ọnyụnyụ nakwa ụkwara nta na-eyi egwu n’ụzọ na-arị elu. N’ihi gịnị? Ọgwụ nje “anaghị adịkwa irè. Ọtụtụ nje bacteria na-eguzogide ma ọ dịkarịa ala otu ọgwụ a na-ejikarị agwọ ọrịa; n’ezie, ọtụtụ na-eguzogide ọgwụ dị iche iche.” Ọ bụghị nanị na ọrịa ndị ochie na-apụtaghachi kama ọrịa ndị ọhụrụ dị ka AIDS apụtawo. Akwụkwọ nkà ọgwụ a na-ebipụta na Germany bụ́ Statistics ‘97 na-echetara anyị, sị: “E nwebeghị ụzọ ọ bụla e si agwọ ihe ndị na-akpata ụzọ abụọ n’ime ụzọ atọ nke ọrịa nile a ma ama—ihe dị ka 20,000.”
Ịgwọ Ọrịa Site n’Itinye Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa n’Ahụ Mmadụ Ọ̀ Pụrụ Ịgwọta Ha?
N’eziokwu, a nọgidere na-ewepụta ụzọ ndị ọhụrụ e si agwọ ọrịa. Dị ka ihe atụ, ọtụtụ ndị na-eche na nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa pụrụ ịbụ ihe bụ́ isi n’inweta ahụ ike ka mma. Mgbe ndị dibịa Bekee dị ka Dr. W. French Anderson mesịrị nchọpụta na United States n’afọ ndị 1990, a kọwara ịgwọ ọrịa site n’itinye mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ahụ mmadụ dị ka “akụkụ ọhụrụ kasị akpali akpali nke nchọpụta ọgwụ na ahụ ike.” Akwụkwọ bụ́ Heilen mit Genen (Iji Mkpụrụ Ndụ Ihe Nketa Agwọ Ọrịa) na-ekwu na site n’ịgwọ ọrịa site n’itinye mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ahụ mmadu, “sayensị ọgwụ na ahụ ike pụrụ imepụta ihe ọhụrụ n’oge na-adịghị anya. Nke a dị otú a karịsịa n’ihe banyere ịgwọ ọrịa ndị a na-apụghị ịgwọ agwọ ka ọ dị ugbu a.”
Ndị ọkà mmụta sayensị na-atụ anya inwe ike ịgwọ ọrịa mkpụrụ ndụ e bu pụta ụwa ka oge na-aga site n’ịgbanye mkpụrụ ndụ ihe nketa ndị na-edozi ihe n’ahụ ndị ọrịa. Ikekwe, a ga-eme ka ọbụna mkpụrụ ndụ ndị na-ebibi ihe, dị ka mkpụrụ ndụ na-akpata ọrịa cancer, na-ebibi onwe ha. Inyocha mkpụrụ ndụ ihe nketa iji chọpụta ma mmadụ ọ̀ pụrụ ịrịa ọrịa ụfọdụ abụrụwo ihe kwere omume ugbu a. Ụfọdụ ndị na-ekwu na nzọụkwụ ọzọ ga-abụ ime ka ọgwụgwọ kwekọọ ná mkpụrụ ndụ ihe nketa nke onye ọrịa. Otu onye nchọpụta a ma ama na-atụ aro na otu ụbọchị ndị dọkịta ga-enwe ike “ịchọpụta ihe na-arịa ndị ha na-agwọ ma nye ha akụkụ DNA kwesịrị ekwesị iji gwọọ ha.”
Otú ọ dị, ọ bụghị mmadụ nile kwenyere na ịgwọ ọrịa site n’itinye mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ahụ mmadụ ga-eweta “ọgwụgwọ ọrụ ebube” n’ọdịnihu. N’ezie, dị ka nchọpụta ndị e mere na-egosi, ọ pụrụ ịbụ na ndị mmadụ agaghịdị achọ ka e nyochaa ihe mejupụtara mkpụrụ ndụ ihe nketa ha. Ọtụtụ ndị na-atụkwa egwu na ịgwọ ọrịa site n’itinye mkpụrụ ndụ ihe nketa n’ahụ mmadụ pụrụ ịbụ itinye aka n’ụzọ dị ize ndụ n’usoro okike.
Mgbe oge na-aga, a ga-ahụ ma nkà mgbanwe mkpụrụ ndụ ihe nketa ma ọ bụ iji ụzọ nkà na ụzụ ndị ọzọ agwọ ọrịa hà ga-emezu oké nkwa ndị ha na-ekwe. Otú ọ dị, e nwere ihe mere a ga-eji zere inwe nchekwube na-ekwesịghị ekwesị. Akwụkwọ bụ́ The Clay Pedestal na-akọwa usoro a na-ahụkarị, sị: “Usoro ọgwụgwọ ọhụrụ na-apụta, a na-eto ya ná nzukọ ahụ ike nakwa n’akwụkwọ ndị ọkachamara. Ndị wepụtara ya na-aghọ ndị a ma ama n’ọrụ ha, usoro mgbasa ozi na-etokwa ọganihu ahụ. Mgbe oge oké mkpali na ihe ndị e dekọrọ nke ọma iji kwado usoro ọgwụgwọ ahụ kasị dị irè gasịrị, ndakpọ olileanya na-amalite, bụ́ nke na-adị site n’ọnwa ole na ole ruo iri afọ ole na ole. A na-achọpụtazi ọgwụ ọhụrụ, ihe fọkwara nke nta ka ọ bụrụ ozugbo ahụ, ọ na-anọchi nke ochie ahụ, bụ́ nke a na-ahapụ n’egbughị oge dị ka ihe na-abaghị uru.” N’ezie, ọtụtụ n’ime ọgwụ ihe ka ọtụtụ n’ime ndị dọkịta hapụworo dị ka ndị na-adịghị irè bụ usoro ọgwụgwọ a na-anakwere n’oge na-adịchabeghị anya gara aga.
Ọ bụ ezie na a dịghịzi akwanyere ndị dọkịta nke oge a ùgwù n’ihe banyere okpukpe dị ka a kwanyeere ndị na-agwọ ọrịa n’oge ochie, ụfọdụ ndị nwere àgwà nke iche na ndị ọrụ ahụ ike nwere ihe fọrọ nta ka ọ bụrụ ike yiri nke ndị bụ́ chi nakwa nke iche na e ji n’aka na sayensị ga-achọta ọgwụgwọ maka ọrịa nile na-arịa ihe a kpọrọ mmadụ. Otú ọ dị, n’ụzọ dị mwute, ihe mgbaru ọsọ a agaghị ekwe oruru. N’akwụkwọ ya bụ́ How and Why We Age (Otú na Ihe Mere Anyị Ji Aka Nká), Dr. Leonard Harflick na-ekwu, sị: “Na 1900, pasent 75 nke ndị bi na United States nwụrụ tupu ha eruo afọ iri isii na ise. Taa, ọ fọrọ nke nta ka ọ bụrụ na ọnụ ọgụgụ a dịzi iche: ihe dị ka pasent 70 nke ndị mmadụ na-anwụ mgbe ha gafesịrị afọ iri isii na ise.” Gịnị kpatara ịrị elu a dị ịrịba ama n’oge ndị mmadụ na-adịru ndụ? Hayflick na-akọwa na ọ “bụ n’ụzọ bụ́ isi n’ihi mbelata e nwere n’ọnụ ọgụgụ ụmụ ọhụrụ na-anwụnụ.” Ugbu a, were ya na sayensị ọgwụ na ahụ ike pụrụ iwepụ ihe ndị bụ́ isi na-akpatara ndị agadi ọnwụ—ọrịa obi, ọrịa cancer, na ọrịa strok. Nke ahụ ọ̀ ga-apụta na e nwetawo anwụghị anwụ? Ọ dịghị ma ọlị. Dr. Hayflick na-ekwu na e megodị nke ahụ, “ihe ka ọtụtụ ná ndị mmadụ ga-adịru ndụ ihe dị ka otu narị afọ.” Ọ na-agbakwụnye, sị: “Ndị a gbaruru otu narị afọ agaghịkwarị abụ ndị na-adịghị anwụ anwụ. Ma gịnị ga-egbu ha? Ha ga na-enwekwu nnọọ ike ọgwụgwụ ruo mgbe ọnwụ bịara.”
N’agbanyeghị mgbalị siri ike nke sayensị ọgwụ na ahụ ike na-eme, iwepụ ọnwụ si otu a ka dịrị n’ebe aka ọgwụ na-apụghị iru. N’ihi gịnị ka o ji dị otu a? Ihe mgbaru ọsọ nke ezi ahụ ike maka mmadụ nile ọ̀ bụ nrọ na-apụghị imezu emezu?
[Ihe ndị e dere n’ala ala peeji]
a Dị ka akwụkwọ bụ́ The World Book Encyclopedia si kwuo, Galen chere na imeju na-agbanwe nri gbariri agbari ịbụ ọbara, bụ́ nke na-erubazi n’akụkụ ahụ ndị ọzọ, e wee mịkọrọkwa ha.
b Lee isiokwu bụ́ “Site n’Oké Ihe Mgbu Gaa ná Nkụnwụ Ahụ,” dị ná mbipụta Teta! (Bekee) nke November 22, 2000.
[Ihe odide gbatụrụ okpotokpo dị na peeji nke 4]
“Ọtụtụ nkwenkwe ndị oge ochie nwere mmetụta siri ike na nkà mmụta ọgwụ nke dịrutere n’oge a.”—The Clay Pedestal
[Foto ndị dị na peeji nke 4, 5]
Hippocrates, Galen, na Vesalius tọrọ ntọala maka nkà mmụta ọgwụ e nwere n’oge a
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Àgwàetiti Kos, Gris
Site n’ikike a natara Ọ́bá Akwụkwọ Nkà Ọgwụ na Ahụ Ike Mba
Onyinyo A. Vesalius bụ́ nke Jan Steven von Kalkar tụrụ, nke e nwetara site n’akwụkwọ bụ́ Meyer’s Encyclopedic Lexicon
[Foto ndị dị na peeji nke 6]
Ambroise Paré bụ onye mbụ na-akpụ isi ma na-awa ahụ nke rụụrụ ndị eze France anọ ọrụ
Ar-Rāzī, dibịa bụ́ onye Peasia (n’aka ekpe), na Edward Jenner, dibịa bụ́ onye Britain (n’aka nri)
[Ebe E Sigasị Nweta Foto]
Paré na Ar-Rāzī: Site n’ikike a natara Ọ́bá Akwụkwọ Nkà Ọgwụ na Ahụ Ike Mba
E nwetara ya site n’akwụkwọ bụ́ Great Men and Famous Women
[Foto dị na peeji nke 7]
Onye France bụ́ Louis Pasteur nwapụtara na nje na-akpata ọrịa
[Ebe E Si Nweta Foto]
© Institut Pasteur
[Foto ndị dị na peeji nke 8]
Ọ bụrụgodị na a pụrụ iwepụ ihe ndị bụ́ isi na-akpata ọnwụ, ịka nká ka ga na-eduga n’ọnwụ