Agha A Na-ebuso Ọrịa na Ọnwụ—À Na-enwe Mmeri Na Ya?
ỌRỊA agaghị adịkwa, ọnwụ agaghị adịkwa! Nye ihe ka n’ọtụtụ ndị, nke a ga-eyi mmadụ iche echiche banyere otú ọ ga-amasị ya ka ihe dịrị. E kwuwerị, dị ka onye dọkịta, bụkwa prọfesọ ná mmụta ihe banyere ụmụ njé na-ebu ọrịa, bụ́ Wade W. Oliver dere: “Kemgbe mmalite akụkọ e dere ede nke ihe mere eme, ọrịa eduziwo ihe na-eme ihe a kpọrọ mmadụ n’ụzọ a na-apụghị ịtụ n’ihe ọ̀tụ̀tụ̀ . . . Oké ntiwapụ ọrịa dị iche iche ejiwo oké ọsọ bịakwasị mmadụ . . . Ruo mgbe nile, ọrịa anọgidewo na-achụgharị ya n’azụ.”
Ọ̀ dị ihe ọ bụla mere a pụrụ iji kwere na a gaje inwe oké mgbanwe n’isi nso? Nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike ọ̀ bịawo nso ikpochapụ ọrịa nile nakwa ma eleghị anya ọnwụ n’onwe ya?
Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ndị dọkịta na ndị na-eme nnyocha arụwo ọrụ dị ukwuu n’ọgụ a na-alụso ọrịa. Olee onye maara ihe na-aganụ nke na-agaghị enwe ekele maka ngwọta a maliteworo ịgwọta ọrịa cholera, bụ́ nke e mesịrị nweta n’akụkụ ikpeazụ nke narị afọ nke 19, ma ọ bụkwanụ maka mmepụta nke e mepụtara ọgwụ ahụ a na-agbanye n’ahụ iji gbochie ọrịa smallpox ahụ a na-atụ egwu nke ukwuu? Edward Jenner mepụtara ọgwụ ahụ na 1796 site n’ọnyá cowpox nke na-adịchaghị oké njọ. Na 1806, onye isi ala United States bụ Thomas Jefferson kwupụtara echiche ọtụtụ ndị ọzọ mgbe o degaara Jenner akwụkwọ, sị: “Nke gị bụ ntụgharị uche dị mma nke na ọ dịghị mgbe ọ bụla ihe a kpọrọ mmadụ ga-echefu na ị dịrị ndụ; mba ndị na-abịa n’ihu ga-esite n’akụkọ ihe mere eme mara nanị na e nwere mgbe ọrịa smallpox ahụ a na-asọ oyi dịrị adị.”
Ọzọkwa, a ghaghị iji ekele na obi ụtọ kwuo okwu banyere ihe ịga nke ọma nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike nweworo n’ihe banyere ọrịa ndị dị ka diphtheria na ọrịa mkpọnwụ ụkwụ. Ọ bụkwa nanị mmadụ ole na ole taa bụ ndị na-adịghị eto ọganihu ndị e nweworo n’oge ndị na-adịbeghị anya karị n’ịgwọ ọrịa obi na ọrịa cancer. Otú o sina dị, ndị mmadụ ka na-anwụ site n’ọrịa obi na cancer. Ihe mgbaru ọsọ nke ikpochapụ ọrịa nile abụwo nnọọ ihe na-ekweghị omume.
Ọrịa Ndị “Ọhụrụ”
N’ụzọ dị mgbagwoju anya, ọgbọ nke a nke hụworo ọganihu ndị dị ka inwe usoro nnyocha ime ahụ bụ CAT na nkà ịwa ahụ nke a na-eji edozighachi akụkụ ahụ dị iche iche ndị mebiri emebi ahụwokwa mpulite nke ọrịa “ọhụrụ” dị iche iche ndị dị ka ọrịa Legionnaires, toxic shock syndrome, na nke ahụ na-egbu egbu a na-akpọsa hie nne, bụ́ AIDS.
N’eziokwu, ọtụtụ ndị na-arụ ụka ma ọrịa ndị a hà dị ọhụrụ n’ezie. Otu ihe odide dị n’akwụkwọ U.S.News & World Report na-ekwu na, n’ọnọdụ ụfọdụ, ọrịa ndị dịworo ogologo oge abụwo ndị a ka chọpụtara nke ọma karị, wee nyekwa ha aha ọhụrụ. Dị ka ihe atụ, e bu ụzọ mata ọrịa Legionnaires na 1976, ma ọ pụrụ ịbụ na a kọwahiewo ya tupu mgbe ahụ ịbụ ọrịa oyi ime ahụ nke njé ọrịa virus na-akpata. N’otu aka ahụ, ọ pụkwara ịbụ na e lehieburu ọrịa toxic shock syndrome anya dị ka scarlet fever.
Otú o sina dị, ọ bụghị ihe a na-ajụrụ ajụjụ na ọtụtụ ọrịa dị ọhụrụ n’ezie. Ihe ịrụ ụka adịghị ya na AIDS bụ nke a kasị mara amara n’ime ndị a. Mgbe mbụ a chọpụtara ma kpọọ ọrịa nke a na-akụjisị ụkwụ na aka, na-egbukwa egbu, aha, bụ na 1981. Ọrịa “ọhụrụ” ọzọ nke a na-amachaghị ama bụ purpuric fever nke Brazil. A matara ya na Brazil na 1984, a na-echekwa na o nwere ọ̀tụ̀tụ̀ igbu egbu nke 50 pasenti ndị o nwetara.
Ngwọta Adịghị Nso
Ya mere, n’agbanyeghị mgbalị kasị mma mmadụ na-eme, ngwọta zuru ezu nke na-adịgide adịgide nye ọrịa ụmụ mmadụ adịwabeghị nso. Ọ bụ eziokwu na nkezi nke afọ ole a na-atụ anya mmadụ ga-anọru ejiriwo 25 afọ mụbaa kemgbe afọ 1900. Ma mgbanwe nke a abụwo n’ụzọ bụ isi n’ihi nkà mmụta ọgwụ na ahụ ike ndị belataworo ihe ize ndụ nke ịnwụ mgbe a mụrụ mmadụ ọhụrụ ma ọ bụ mgbe ọ dị na nwata. Afọ ole a tụrụ anya mmadụ ga-anọ ka dịkwa nso ihe ahụ e kwuru na Bible, bụ́ “ọgụ afọ atọ na iri.”—Abụ Ọma 90:10.
Otú a, ọ ghọrọ ihe akụkọ mgbe Anna Williams nwụrụ na December 1987 mgbe ọ gbara 114 afọ. Mgbe ọ na-ekwu okwu banyere ọnwụ Nwaada Williams, otu onye odeakụkọ dere, sị: “Ndị ọkà mmụta sayensị na-eche na 115 ruo 120 afọ bụ ọ̀tụ̀tụ̀ kasị elu nke mmadụ pụrụ ịdịru ná ndụ. Ma n’ihi gịnị ka ọ ga-eji dị otú ahụ? N’ihi gịnị ka ike ga-eji gwụ ahụ mmadụ mgbe 70, 80, ma ọ bụ ọbụna 115 afọ gasịrị?”
N’afọ ndị 1960, ndị ọkà mmụta ọgwụ na ahụ ike chọpụtara na mkpụrụ ndụ dị n’ahụ mmadụ yiri ka hà nwere ike ikewa nanị ihe dị ka 50 ugbo. Ozugbo e ruru ná njedebe nke a, o yiri ka ọ̀ bụ na ọ dịghị ihe ọ bụla a pụrụ ime iji mee ka mkpụrụ ndụ ndị ahụ dịgide ndụ. Nke a yiri ka ọ̀ na-emegide echiche nkà mmụta sayensị ndị e nweburu na mbụ nke bụ na mkpụrụ ndụ ndị dị n’ahụ mmadụ pụrụ ịnọgide ndụ ruo ogologo oge a na-akaghị aka ma ọ bụrụ na e debe ya n’ọnọdụ ndị kwesịrị ekwesị.
Tụkwasị na nke ahụ nghọta nke eziokwu ahụ bụ na ihe dị ukwuu n’ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata bụ nke mmadụ kpatara. Dị ka otu onye na-eme nnyocha ji ezi nghọta kwubie: “E jibeghị nanị ọgwụgwọ nke ọgwụ merie ọrịa. Akụkọ ihe mere eme nke ọrịa nwere njikọ chiri anya n’etiti ya na ihe ndị metụtara ọnọdụ ọha mmadụ na akparamagwa.”
Òtù World Health Organization kwuru, sị: “Anyị emerụwo onwe anyị ahụ, n’echiche nke bụ na nkà mmụta sayensị, ndị dọkịta na ụlọ ọgwụ dị iche iche ga-achọta ihe ngwọta, kama igbochi ihe ndị ahụ na-akpata ọrịa akpata. Otú ọ dị, ihe ndị e ji elekọta ahụ ike dị anyị oké mkpa, bụ́ ndị na-azọpụta ndụ n’ezie, ma, ka o doo anyị anya na ha adịghị atụkwasị ihe ọ bụla ‘n’ahụ ike’ anyị—ha na-egbochi anyị ịnwụ anwụ. . . . Mkpali mbibi onwe onye ahụ nke onye na-ese sịga na onye na-aṅụ mmanya, mmetụta enweghị ọrụ na-enwe n’ahụ na n’uche—ndị a bụ ụfọdụ ‘n’ọrịa ọhụrụ’ ndị ahụ. N’ihi gịnị ka anyị ji kwere ka ‘ntiwapụ nke ihe ọghọm okporo ụzọ’ dịrị, bụ́ nke na-ebibisị ndụ, na-erikpọsịkwa ego anyị?”
Otú a, ọrịa, nrịrịa, ịta ahụhụ, na ọnwụ ka na-adịnyesiri anyị ike. Otú o sina dị, anyị nwere ezi ihe mere anyị ga-eji jiri obi ike na-elepụ anya n’ọdịnihu gaa n’oge mgbe a na-agaghị enwekwa ọrịa na ọnwụ. Nke kasị mma bụ na e nwere ezi ihe mere anyị ga-eji kwere na oge ahụ dị ezi nso.
[Igbe dị na peeji nke 4]
“NRỊRỊA ỌJỌỌ NILE NKE IJIPT”
E hotara eziokwu ahụ nke bụ na ụmụ mmadụ anọwo na-alụso ọrịa ọgụ n’enweghị mmeri eri ogologo oge gara aga ọbụna n’ime Bible. Dị ka ihe atụ, Mosis zoro aka n’ụzọ na-akpali mmasị ná “nrịrịa ọjọọ nile nke Ijipt.”—Deuterọnọmi 7:15.
O yiri ka ndị a hà gụnyere ọrịa ụkwụ ọzịza, afọ ọsịsa, ọrịa smallpox, ọrịa bubonic plague, na ophthalmia. Ndị nke Mosis lanarịrị ọrịa ndị dị otú ahụ karịsịa n’ihi ọ̀tụ̀tụ̀ idebe ihe ọcha dị elu ọgbụgba ndụ Iwu ahụ bokwasịrị ha.
Otú ọ dị, iji nlezianya mee nnyocha n’ahụ ozu ndị Ijipt a gbasiri agbasi emewo ka a chọpụta ìgwè ‘nrịrịa ọjọọ ndị ọzọ nke Ijipt.’ Ndị a gụnyere arthritis, spondylitis, ọrịa dị iche iche nke ézé na nke àgbà, ọrịa appendicitis, na ọrịa gout. Ọbụna na otu akwụkwọ metụtara ọgwụ na ahụ ike e dere n’ogologo oge gara aga, nke a maara dị ka Ebers Papyrus, hotara ọrịa ndị dị ka mkpụrụ ihe ndị dị n’ime ahụ, ọrịa afọ na nke imeju, ọrịa mamiri, ekpenta, ọrịa anya bụ conjunctivitis, na ntị ochichi.
Ndị dibia Ijipt oge ochie mere ihe nile ha nwere ike ime iji busoo ọrịa ndị a agha, ụfọdụ n’ime ha ghọkwara ndị ọkà n’ụdị ọrịa dị iche iche ha na-agwọ. Ọkọ akụkọ ihe mere eme bụ Herodotus onye Grik dere, sị: “Mba ahụ [Ijipt] jupụtara ná ndị dibia; otu na-agwọ nanị ọrịa ndị metụtara anya; ọzọ na-agwọ ndị metụtara isi, ndị nke ézé, ndị nke afọ, ma ọ bụ akụkụ ime ahụ dị iche iche.” Otú ọ dị, akụkụ dị ukwuu nke “ọgwụgwọ ọrịa” ndị Ijipt bụ usoro adịgboroja nke okpukpe, ọ dịghị agbasokwa ụkpụrụ nkà mmụta sayensị ma ọlị.
Ndị dibia nke oge a enwewo ihe ịga nke ọma dị ukwuu karị n’ọgụ ha na-alụso ọrịa. Ma n’agbanyeghị nke ahụ, onye na-eme nnyocha n’ihe banyere ọgwụ na ahụ ike, bụ́ Jessie Dobson bịara ná nkwubi okwu nke a na-akpali iche echiche: “Ya mere, gịnị ka a pụrụ ịmụta site n’ịmụ ihe banyere ụdị ọrịa ndị e nwere n’ọgbọ ndị gara aga? Nkwubi okwu bụ isi e ruru na ya site ná nnyocha e mere banyere ihe àmà ndị e nwere yiri ka ọ̀ bụ na ọrịa ndị e nwere n’ogologo oge ndị gara aga adịghị iche nke ukwuu site ná ndị e nwere n’oge a . . . O yiri ka nkà na mgbalị nile e tinyeworo n’iji ndidi na-eme nnyocha emebeghị ihe dị ukwuu n’ikpochapụ ọrịa.”—Disease in Ancient Man.