Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g03 5/8 p. 26-27
  • Ọ Rụzuru Ihe Karịrị Ihe Ọ Tụrụ Anya Ya

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ Rụzuru Ihe Karịrị Ihe Ọ Tụrụ Anya Ya
  • Teta!—2003
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Olee Otú Mụ na Onye Nkụzi Anyị Ga-esi Na-adị ná Mma?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • A Gọzie Ụmụ Akwụkwọ Nigeria Maka Ikwesị Ntụkwasị Obi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1992
  • Ndị Nkụzi—Gịnị Mere Ha Ji Dị Anyị Mkpa?
    Teta!—2002
  • Otu Onye Nkụzi Agbanwee Echiche Ya
    Teta!—2009
Teta!—2003
g03 5/8 p. 26-27

Ọ Rụzuru Ihe Karịrị Ihe Ọ Tụrụ Anya Ya

“AMAARA m na onye nkụzi nke na-akụziri anyị akụkọ ihe mere eme enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ, ọ bụ ezie na amaghị m ihe kpatara ya,” ka Rebekka, bụ́ onye dị afọ 17, nke si Germany na-ekwu. N’ihi ya, mgbe onye nkụzi ahụ jụrụ ma è nwere ndị ga-enwe mmasị ikwu okwu n’ihu ndị klas, obi akachaghị Rebekka ime otú ahụ. Ka o sina dị, o jisiri ike rịọ ka onye nkụzi ahụ nye ya ikike ikwu banyere mkpagbu Ndịàmà Jehova nwetara n’okpuru ọchịchị Nazi n’oge Agha Ụwa nke Abụọ. Echiche ahụ masịrị onye nkụzi ahụ.

Okwu Rebekka tọrọ ndị klas ya ụtọ, ha nakwaara ngụkọta nke magazin na akwụkwọ nta 44 bụ́ ndị na-ekwu banyere isiokwu ahụ. Mgbe nke ahụ gasịrị, Rebekka nyere onye nkụzi ahụ ebe ndị o mere nnyocha banyere ihe o kwuru, bụ́ ndị gụnyere ọtụtụ akwụkwọ na vidio ndị ndị na-abụghị Ndịàmà dere ma ọ bụ mepụta. Otu vidio kọrọ banyere mkpagbu a kpagburu Ndịàmà Jehova n’Ebe Ọwụwa Anyanwụ Germany n’oge Agha Nzuzo. Nke a masịrị onye nkụzi ahụ karịsịa, ebe ọ bụ na ọ machaghị isiokwu ahụ.

Rebekka chọpụtaziri ihe mere na onye nkụzi ya enweghị mmasị n’ebe Ndịàmà Jehova nọ. Ọ kọwara na ya na otu n’ime Ndịàmà Jehova gakọrọ ụlọ akwụkwọ. Nwa okorobịa ahụ adịkarịghị ekwu okwu banyere okwukwe ya ma ọ bụ banyere ndụ ya dị ka Onyeàmà. N’ihi ya, onye nkụzi ahụ kwubiri na ndụ Ndịàmà nwere ka ọ dị, o wee kpebie na ọ dịghị ihe ọ bụla ga-ejikọ ya na ha. Ma okwu Rebekka gbanwere echiche ya. “Mụ na onye nkụzi ahụ dị ná mma ugbu a karị,” ka ọ na-ekwu. “Amụtakwara m na anyị bụ́ ndị ntorobịa kwesịrị ịdị na-enwe nkwuwa okwu n’ịgwa ndị ọzọ banyere okwukwe anyị.”

Ma ọ bụghị ebe ahụ ka okwu ahụ biri. Onye nkụzi ahụ gwara ndị nkụzi ibe ya banyere okwu magburu onwe ya Rebekka kwuru. Ụbọchị ole na ole mgbe e mesịrị, onye nkụzi na-akụzi banyere omume ọma gwara Rebekka ka o kwuo okwu ọzọ, ọ bụghị nanị n’ihu ndị klas ya kama n’oge pụrụ nnọọ iche—ememe mgbaafọ ụlọ akwụkwọ ahụ na-eme iji cheta ntọhapụ a tọhapụrụ ndị mkpọrọ n’ogige ịta ahụhụ dị n’Auschwitz mgbe Agha Ụwa nke Abụọ biri. Ihe dị ka ụmụ akwụkwọ 360 gere ya, gụnyere ihe dị ka ndị nkụzi iri. Mgbe okwu ahụ gasịrị, ndị gere ya naara akwụkwọ nta 50, ụlọ akwụkwọ ahụ rịọkwara ka e nyekwuo ha 150 ha ga-ekesa ma e mesịa.

Rebekka rụzuru ihe karịrị nnọọ ihe ọ tụrụ anya ya. Ọ gbara ezi àmà banyere okwukwe ya nye, ọ bụghị nanị ndị klas ya, kamakwa ụlọ akwụkwọ ahụ dum. Onye nkụzi ya kwụsịkwara inwe obi abụọ ọ na-enwebụ banyere Ndịàmà.

[Foto dị na peeji nke 26]

Ndị Nazi gbupụrụ Heinrich Fundis isi. E gbukwara ọtụtụ narị Ndịàmà ndị ọzọ

[Foto dị na peeji nke 26]

A gwara ọtụtụ Ndịàmà Jehova na a ga-atọhapụ ha ma ọ bụrụ na ha abịanye aka n’akwụkwọ a iji jụ okwukwe ha

[Ebe E Si Nweta Foto]

Site n’ikike nke United States Holocaust Memorial Museum

[Foto dị na peeji nke 27]

A kpọpụrụ ụmụaka ndị dị ka Berthold Mewes n’aka nne na nna ha

[Foto dị na peeji nke 27]

Vidio a na-akọ banyere obi ike nke Ndịàmà Jehova gosipụtara na Nazi Germany

[Foto dị na peeji nke 27]

A dụnyere akara “purple triangle” n’uwe ndị mkpọrọ iji hụwa Ndịàmà Jehova ama

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya