Ndị Nkwusa Alaeze Na-akọ
A Gọzie Ụmụ Akwụkwọ Nigeria Maka Ikwesị Ntụkwasị Obi
PỌL onyeozi dere, sị: “A sị na ọ bụ ihe ga-ekwe unu, ka ihe nke dịịrị unu onwe unu hà, unu na mmadụ nile na-adị n’udo.” (Ndị Rom 12:18) Ụmụ Ndịàmà Jehova na-aga akwụkwọ na Nigeria tinyere ndụmọdụ nke a n’ọrụ, ọbụna mgbe a na-akpagbu ha. Dị ka ihe si na nke a pụta, Jehova gọziri ha.
◻ Otu onye nkụzi kpọrọ Ndịàmà Jehova asị nke ukwuu. N’otu ụtụtụ ha zukọrọ ikpe ekpere, ọ kpọpụtara Ndịàmà nile n’ihu ma nye ha iwu ka ha gụọ ukwe e ji eto mba. Ha jụrụ, na-ekwu na ha chọrọ inye Chineke ofufe a na-akpaghịrị ókè. Onye nkụzi ahụ kpọpụrụ ha èzí ma gwa ha ka sụchaa ahịhịa. Ka ha na-eme nke ahụ, ụmụ akwụkwọ ndị ọzọ nọgidere na-amụ ihe.
Otu Onyeàmà toworo eto wegaara onye nkụzi ahụ akwụkwọ nta ahụ bụ School and Jehovah’s Witnesses, na-akọwa ọnọdụ nnọpụiche nke Ndịàmà Jehova. Otú ọ dị, onye nkụzi ahụ jụrụ ịtụle okwu ahụ ma ọ bụ ịnakwere akwụkwọ nta ahụ. N’ezie, o mere ka ntaramahụhụ nke ụmụaka ahụ kawanye njọ ozugbo.
Ndịàmà ahụ na-eto eto nọgidere na-atachi obi ná ntaramahụhụ nke a ma gaa n’ihu n’ịsụcha ahịhịa ọbụna mgbe onye nkụzi ahụ na-anọghị ya. N’otu ụbọchị onye nkụzi ahụ zoro n’ebe ha na-agaghị ahụ ya wee kirie ka ha nọgidere na-arụ ọrụ ma na-abụ abụ Alaeze. Nke ahụ kpaliri mmasị ya nke ukwuu nke na ọ gwara ha ka ha gaghachi na klasị ha, na-ekwupụta na otú ha si kpaa àgwà tụrụ ya n’anya. Gịnị si na nke ahụ pụta? Ugbu a onye nkụzi ahụ so Ndịàmà Jehova na-enwe ọmụmụ Bible!
N’ezie a gọziri ụmụ akwụkwọ ndị a maka ikwesị ntụkwasị obi ha nye Jehova na ụkpụrụ ya nile.—Ilu 10:22.
◻ A gọzikwara Ruth na ndị enyi ya maka ikwesị ntụkwasị obi ha nye ihe Jehova chọrọ ha n’aka ịbụ ndị ‘na-esiteghị n’ụwa.’ (Jọn 17:16) Ruth, bụ́ onye dị afọ 18, malitere ọrụ ọsụ ụzọ mgbe ọ dị afọ 12. Ya na Ndịàmà ndị ọzọ nwetara mmegide site n’aka ndị so ná ndị ọrụ nke ụlọ akwụkwọ ha n’ihi na ha jụrụ ịgụ ukwe e ji eto mba. Otu onye nkụzi kwuru na ya chọrọ ịhụ ndị mụrụ ụmụ agbọghọ ahụ. Mgbe ha nyesịrị ya nkọwa, na-eji akwụkwọ nta School mee ihe, onye nkụzi ahụ nwere afọ ojuju wee kwụsị inye ụmụ akwụkwọ ahụ nsogbu ọzọ.
Otú ọ dị, n’otu ụbọchị otu onye nkụzi sitere India kparịrị ma taa otu n’ime ụmụ agbọghọ ahụ ahụhụ n’ihu klasị mgbe nwatakịrị nwanyị ahụ na-agụghị ukwe e ji eto mba. Nwatakịrị nwanyị ahụ ji obi ike kọwaa okwukwe ya, onye nkụzi ahụ kpọkwaara ya ịga hụ onye isi ụlọ akwụkwọ. Mgbe ha rutere n’ebe ahụ, Onyeàmà ahụ na-eto eto hụrụ na onye na-esote onye isi ụlọ akwụkwọ nọkwa ya. N’ime ihe juru ya anya, onye isi ụlọ akwụkwọ na onye na-esote onye isi ụlọ akwụkwọ malitere ịchị ọchị. N’iche onye nkụzi ahụ ihu, onye isi ụlọ akwụkwọ ahụ sịrị: “Nne, enyela onwe gị nsogbu banyere ụmụ agbọghọ ndị a. Ọbụna ma ọ bụrụ na ị ga-egbu ha, ọ ga-akara ha mma karịa na ha gụrụ ukwe e ji eto mba. Ị̀ nụtụbeghị banyere ha?” Ya na onye na-esote ya kwuru okwu banyere okwukwe na obi ike nke Ndịàmà Jehova. N’ịgwa nwatakịrị nwanyị ahụ okwu, onye isi ụlọ akwụkwọ kwuru na o wutere ya maka mmechuihu ahụ e mechuru ya. Mgbe ahụ o kwukwara, sị: “Nọgidenụ n’ọrụ unu nke okwukwe. Enwere m mmasị n’okpukpe unu nakwa ná nguzo obi ike unu ma n’ebe ọzọ ma n’ebe a n’ụlọ akwụkwọ.” Mgbe e mesịrị, onye nkụzi ahụ nọworo na-emegide ya rịọrọ Onyeàmà ahụ mgbaghara, na-ekwu na ya aghọtawo ugbu a ọnọdụ nnọpụiche nke Ndịàmà na-ewere.
Ụmụaka ndị a gbasoro ihe nlereanya nke ndị Hibru atọ ahụ na-agaghị emebi iguzosi ike n’ezi ihe ha nye Chineke site n’ịkpọ isi ala nye ihe a tụrụ atụ, nakwa nke Daniel, bụ́ onye jụrụ na ya agaghị akwụsị ikpegara Jehova ekpere. Jehova gọziri ndị ikom ndị a n’ihi na ha kwesịrị ntụkwasị obi nye iwu ezi omume nile nke Chineke.—Daniel, isi 3 na 6.