Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g04 4/8 p. 30-31
  • Ọ̀ Ga-ekwe Omume Ịkwụsị Àgwà Ọjọọ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ọ̀ Ga-ekwe Omume Ịkwụsị Àgwà Ọjọọ?
  • Teta!—2004
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọchịchọ Dị Iche n’Omume
  • Ime Mgbanwe Ga-ekwe Omume
  • Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • 1 Mara Ike Gị
    Teta!—2016
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2016
  • Olee Otú Ị Pụrụ Isi Guzogide Ọchịchọ Na-ezighị Ezi?
    Teta!—2003
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2004
g04 4/8 p. 30-31

Echiche nke Bible

Ọ̀ Ga-ekwe Omume Ịkwụsị Àgwà Ọjọọ?

N ’OTU oge, otu onye edemede bụ́ Mark Twain kwuru n’ụzọ na-atọ ọchị, sị: “Ịkwụsị ise siga bụ ihe kasị mfe omume n’ụwa. Amaara m ya n’ihi na emewo m ya ọtụtụ puku ugboro.” Ihe ịrụ ụka adịghị ya na ọtụtụ mmadụ ga-aghọta okwu ahụ na-atọ ọchị nke Twain kwuru. Ọ bụ ezie na ha pụrụ ịghọta nke ọma na àgwà ụfọdụ dị njọ, ọbụnakwa na-emerụ ahụ́, ha makwaara na o siri ike iguzogide na ịkwụsị ha. Ọtụtụ àgwà pụrụ ịghọ ihe gbanyesiri mkpọrọgwụ ike n’ime mmadụ ruo ọtụtụ afọ, ha pụrụ iguzogide n’ụzọ gabigara ókè, mgbalị ndị a na-eme ịgbanwe ha. Ịgbalị ịchịkwa ọchịchọ ndị dị otú ahụ pụrụ ịbụ ihe na-agwụ ike, ọbụna na-egbu mgbu.

Dr. Anthony Daniels, bụ́ dọkịta na-arụ ọrụ n’otu ụlọ mkpọrọ, na-ekwu na ndị dara iwu na-azọrọkarị na ha tọrọ atọ n’omume nakwa n’ọchịchọ ọjọọ. Ozugbo ihe riri mmadụ ahụ́, ka ha na-ekwu, “ọ na-abụ onye mkpali dị egwu, nke ọ na-agaghị eguzogideli, jisiri aka ike.” Ọ bụrụ na echiche dị otú ahụ bụ eziokwu, ụta agaghịnụ adịrị anyị maka ime ihe dị ka mkpali anyị nwere si dị. Ma, ọ̀ bụ eziokwu na anyị bụ ndị na-apụghị ime ihe ọ bụla banyere mkpali na ọchịchọ ndị anyị na-enwe? Ka à pụrụ ịkwụsị àgwà ọjọọ n’ezie? Iji nweta azịza rijuru afọ, ka anyị hụ ihe Bible na-ekwu.

Ọchịchọ Dị Iche n’Omume

Bible na-eme ka o doo anya na anyị ga-aza Chineke ajụjụ maka omume anyị. (Ndị Rom 14:12) Ọzọkwa, ọ na-achọ ka anyị na-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ ezi omume ya si dị. (1 Pita 1:15) Dị ka Onye Okike anyị, ọ maara ihe kasị mma maka anyị, ụkpụrụ ya na-emegidekwa ọtụtụ n’ime àgwà ndị jupụtara n’ụwa taa. (1 Ndị Kọrint 6:9, 10; Ndị Galeshia 5:19-21) Otú ọ dị, ọ na-egosi ezi uche na ọmịiko n’ihe ndị ọ na-atụ anya n’aka ụmụ mmadụ na-ezughị okè.—Abụ Ọma 78:38; 103:13, 14.

Ya mere, ọbụ abụ ahụ dere, sị: “Ọ bụrụ na Ị rịba ajọ omume nile ama, Jaa, Onyenwe anyị, ònye ga-eguzo?” (Abụ Ọma 130:3) Ee, Jehova maara nnọọ nke ọma na “nchepụta nke obi mmadụ dị njọ site na nwata.” (Jenesis 8:21) Ihe ndị anyị bu pụta ụwa na ahụmahụ ndị anyị nwere n’oge ndị gara aga, na-eme ka ọ ghara ikwe anyị omume izere echiche na ọchịchọ ọjọọ nile. Ya mere, n’ụzọ ịhụnanya, Jehova adịghị achọ izu okè n’aka anyị.—Deuterọnọmi 10:12; 1 Jọn 5:3.

Otú ọ dị, nchebara echiche a Chineke na-egosi anyị adịghị anapụ anyị ibu ọrụ nke ịchịkwa ọchịchọ na-ezighị ezi ndị anyị na-enwe. Ọ bụ ezie na Pọl onyeozi kwetara na ya onwe ya na-alụ ọgụ megide ọchịchọ ndị na-ezighị ezi, ọ daghị mbà. (Ndị Rom 7:21-24) “M na-etipụta ahụ́ m ọnyá,” ka o kwuru, “ma na-achịkwa ya dị ka ohu.” N’ihi gịnị? “Ka a ghara inwe ụzọ ọ bụla m ga-esi bụrụ onye a jụrụ ajụ.” (1 Ndị Kọrint 9:27) Ee, njide onwe onye dị oké mkpa n’ịlụso ọchịchọ na àgwà ọjọọ ndị anyị na-enwe ọgụ na imesị kwụsị ha.

Ime Mgbanwe Ga-ekwe Omume

Ndị ọkà mmụta akparamàgwà mmadụ na-ekwu na dị ka ọ dị n’ebe àgwà ọma dị, a pụrụ ịmụta ma zụlite àgwà ọjọọ ka oge na-aga. Ọ bụrụ na nke ahụ bụ eziokwu, a pụkwara n’ezie ịmụta ịkwụsị àgwà ọjọọ! N’ụzọ dị aṅaa? “Chee echiche banyere uru dị n’ịkwụsị àgwà ochie ahụ,” ka ndị dere otu akwụkwọ banyere ịnagide nrụgide na-ekwu. Mgbe ahụ, “depụta ụzọ ịgbanwe àgwà gị pụrụ isi mee ka ndụ gị ka mma.” Ee, ilekwasị anya n’uru ndị anyị ga-erite site n’ịgbanwe àgwà ọjọọ anyị, pụrụ ịkpali anyị ime mgbanwe.

Tụlee ndụmọdụ Pọl onyeozi nyere nke bụ́ ka e ‘mee ka anyị dị ọhụrụ n’ikike nke na-akwali uche anyị.’ (Ndị Efesọs 4:22, 23) Ikike ahụ bụ ụzọ bụ́ isi anyị si eche echiche. Ị pụrụ ịgbanwe ikike ahụ site n’ịbịarukwu Chineke nso nakwa ịghọta ma nwee ekele maka ụkpụrụ ya nile. Ịmara na ị na-eme ihe na-atọ Jehova ụtọ ga-enye aka kwalie gị ime mgbanwe ndị dị mkpa.—Abụ Ọma 69:30-33; Ilu 27:11; Ndị Kọlọsi 1:9, 10.

N’eziokwu, ọ ga-esi ike ịkwụsị àgwà ọjọọ ndị ọ pụrụ ịbụ na ha eriwo anyị ahụ́ ruo ọtụtụ afọ. Anyị ekwesịghị ileda ọgụ anyị ka ga-alụ n’ihu anya. A ga-enwerịrị ihe ndọghachi azụ. Ma nwee obi ike, ihe na-adịkarị mfe karị ka oge na-aga. Ka ị na-etinyekwu mgbalị, otú ahụ ka àgwà ọhụrụ ahụ ga-amarakwu gị ahụ́.

Obi pụkwara isi onye hụrụ Chineke n’anya ike na ọ ga-enweta enyemaka na ngọzi ya. “Chineke na-ekwesị ntụkwasị obi,” ka Pọl na-ekwe ná nkwa, “ọ gaghịkwa ekwe ka a nwaa unu gabiga ihe unu pụrụ ịnagide, kama . . . ọ ga-emekwa ụzọ mgbapụ ka unu wee nwee ike idi ya.” (1 Ndị Kọrint 10:13) N’oge na-adịghị anya site n’ugbu a, Jehova Chineke ga-ebibi ajọ usoro ihe a na ọnwụnwa nakwa ọchịchọ ya nile ndị dị njọ. (2 Pita 3:9-13; 1 Jọn 2:16, 17) A pụrụ imesị gwọchapụ n’ụzọ na-adịgide adịgide, nsogbu nile—nke anụ ahụ́, nke uche, na nke mmetụta uche—bụ́ nke mmadụ nile na-ezughị okè bụ́ ndị ga-alanahụ ihe omume a na-enwe. “A gaghị echetakwa ihe mbụ nile, ha agaghị abatakwa n’obi,” ka Chineke na-ekwe ná nkwa. (Aịsaịa 65:17) Obi abụọ adịghị ya na agụụ na ọchịchọ ndị na-akpata nsogbu ga-eso n’ime “ihe mbụ nile” ndị a. Nke a, ọ́ bụghị ihe magburu onwe ya mere anyị ga-eji na-eme ike anyị nile taa iji guzogide ma na-alụ ọgụ megide àgwà ọjọọ?

[Igbe/Foto ndị dị na peeji nke 31]

ỊKWỤSỊ ÀGWÀ ỌJỌỌ

1. Mata ihe ndị bụ́ àgwà ọjọọ ahụ ma kweta na i nwere ha. Jụọ onwe gị, sị, ‘Ọ̀ dị uru m na-erite n’àgwà a n’ezie? Ọ̀ na-akpasu ndị ọzọ iwe? Ọ̀ na-emetụta ahụ́ ike m, ego m na-akpata, ọdịmma m, ezinụlọ m, ma ọ bụ obi iru ala m?’ Olee otú ndụ m ga-esi ka mma ma m kwụsị ya?

2. Jiri ihe dị mma dochie àgwà ọjọọ ahụ. Dị ka ihe atụ, ị̀ na-etinye oge buru ibu n’ịchọ ihe n’Intanet, ikekwe na-ekiri ihe ndị na-adịghị ewuli elu? Ọ bụrụ otú ahụ, jiri oge ahụ na-agụ ma na-amụ ihe ndị na-ewuli elu, ma ọ bụ jiri ya na-enwe mmega ahụ́.

3. Na-atụle ọganihu ị na-enwe. Kwa ụbọchị, jiri minit ole na ole tụgharịa uche n’ọganihu ị na-enwe. Ọ bụrụ na i nwee ihe ndọghachi azụ, chọpụta ọnọdụ ndị dubara gị ná nsogbu ahụ.

4. Nweta enyemaka nke ndị ọzọ. Gwa ndị enyi na ndị ezinụlọ gị na ị na-agbalịsi ike ịkwụsị àgwà a, gwakwa ha ka ha na-echetara gị mgbe ọ bụla o yiri ka ị̀ chọwala ịlaghachi na ya. Soro ndị nweworo ihe ịga nke ọma n’ịkwụsị otu ụdị àgwà a kwurịta banyere ya.—Ilu 11:14.

5. Nwee echiche ziri ezi na ezi uche. Atụla anya inwe ihe ịga nke ọma ozugbo. Ụfọdụ àgwà mmadụ ji ọtụtụ afọ zụlite pụrụ iwe oge ịkwụsị.

6. Na-ekpegara Chineke ekpere. Site n’enyemaka Chineke, ị pụrụ ịkwụsị àgwà ọjọọ ọ bụla.—Abụ Ọma 55:22; Luk 18:27.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya