Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g16 nke 4 p. 4
  • 1 Mara Ike Gị

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 1 Mara Ike Gị
  • Teta!—2016
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Kwee Ka Omume Maara Gị Ahụ Baara Gị Uru
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2001
  • Okwu Mmalite
    Teta!—2016
  • Ọ̀ Ga-ekwe Omume Ịkwụsị Àgwà Ọjọọ?
    Teta!—2004
  • 2 Zere Ihe Ndị Na-agaghị Enyere Gị Aka
    Teta!—2016
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2016
g16 nke 4 p. 4
Ebe otu nwaanyị na-ede àgwà ndị ọ chọrọ ịkwụsị na àgwà ndị ọ chọrọ ịkpawa n’akwụkwọ

ISIOKWU TETA! A | OTÚ Ị GA-ESI AKWỤSỊ ÀGWÀ RIRILA GỊ AHỤ́

1 Mara Ike Gị

Ike nwere ike ịgwụ mmadụ ma ọ chọwa ịkwụsịcha àgwà ọjọọ niile riri ya ahụ́ n’otu ụbọchị. Dị ka ihe atụ, mmadụ nwere ike ikpebi na ya ga-akwụsị ịṅụ sịga, ikwu okwu rụrụ arụ, na ehighị ụra n’oge, kpebiekwa na ya ga-amalite imega ahụ́, iri nri na-edozi ahụ́, na ịkpọ nne nne ya na nna nna ya n’ekwentị. Ma, nke bụ́ eziokwu bụ na ọ bụrụ na onye ahụ na-achọ imecha ihe ahụ niile otu mgbe, o nweghị nke ọ ga-emete.

IHE BAỊBỤL KWURU: “Ndị dị obi umeala nwere amamihe.”—Ilu 11:2.

Onye dị obi umeala anaghị eme ihe ọ ma ga-agbaji ya aka. Ọ ma na ọ bụghị ihe niile ka ọ ga-emeli otu mgbe. Ụdị onye a anaghị achọ ịgbanwe ihe niile riri ya ahụ́ n’otu ntabi anya, kama, ọ na-eji nwayọọ nwayọọ agbanwe.

Ọ bụrụ na mmadụ na-achọ imecha ihe niile otu mgbe, o nweghị nke ọ ga-emete

IHE I NWERE IKE IME

Na-agbanwe àgwà ndị riri gị ahụ́ otu otu. Legodị ihe ụfọdụ nwere ike inyere gị aka:

  1. Were otu akwụkwọ dee àgwà ọma ndị ị chọrọ ịna-akpa, werekwa akwụkwọ ọzọ dee àgwà ọjọọ ndị ị chọrọ ịkwụsị. Edekwala naanị ndị nke i chere ị ga-emeli. Dee àgwà ọma niile i kwesịrị ịna-akpa na ndị nke ọjọọ niile i kwesịrị ịkwụsị n’akwụkwọ nke ọ bụla.

  2. Chọpụta àgwà ọma ndị mbụ i kwesịrị ịkpawa na ndị nke ọjọọ i kwesịrị ịkwụsị.

  3. Si n’àgwà ndị ahụ i depụtara họrọ otu àgwà ọma ma ọ bụ abụọ ị ga-akpawa, họrọkwa otu àgwà ọjọọ ma ọ bụ abụọ ị ga-akwụsị. Lekwasị ha anya, ọ marawa gị ahụ́, gị agafee n’otu àgwà ọzọ ma ọ bụ abụọ na-eso ndị nke mbụ.

Bido ozugbo kpawa àgwà ọma ndị ga-amara gị ahụ́. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na otu n’ime àgwà riri gị ahụ́ ị chọrọ ịkwụsị bụ ile tiivi, ya abụrụkwa na otu n’ime àgwà ọma ị chọrọ ịkpawa bụ ịna-akpọtụrụ ndị ikwu na ibe gị. Ọ bụrụ otú ahụ, i nwere ike ikpebi na ihe mbụ ị ga na-eme ma ị lọta ọrụ bụ ịkpọ otu enyi gị ma ọ bụ onye ikwu gị n’ekwentị, ọ bụghị ịgbanye tiivi.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ ỌZỌ GA-ENYERE GỊ AKA

“Chọpụta ihe ndị ka mkpa.”—Ndị Filipaị 1:10.

“Njedebe okwu dị mma karịa mmalite ya.”—Ekliziastis 7:8.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya