Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 7/14 p. 12-13
  • Otú Unu Ga-esi Ghara Ịna-emefusị Ego

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Otú Unu Ga-esi Ghara Ịna-emefusị Ego
  • Teta!—2014
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE BỤ́ NSOGBU
  • Ijizi Ego Ejizi
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Olee Otú M Pụrụ Isi Kwụsịlata Imefu Ego?
    Teta!—2006
  • Olee Otú M Ga-esi Eji Ego M Na-eme Ihe Bara Uru?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 2
  • Otú Unu Ga-esi Hazie Ihe Unu Na-eji Ego Unu Eme
    Unu Ga-enweli Obi Ụtọ n’Ezinụlọ Unu
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2014
g 7/14 p. 12-13
Di na nwunye gara zụkọta ihe

IHE NDỊ GA-ENYERE EZINỤLỌ AKA | DI NA NWUNYE

Otú Unu Ga-esi Ghara Ịna-emefusị Ego

IHE BỤ́ NSOGBU

Ka e were ya na ị gbakọọla ego ole unu nwere wee chọpụta na ọ na-agbada n’ike n’ike ka a ga-asị na akpa unu puru epu. O tebeghịkwanụ aka unu gbara akwụkwọ, ma ego unu na-emefu karịrị akarị. Ọ̀ bụ nwunye gị na-emefusị ego unu? Kama ichewe otú ahụ, burunụ ụzọ chọpụta ebe mmiri si baa n’opi ụgbọgụrụ. Ka anyị kwuo ụfọdụ ihe ndị nwere ike ịbụ ha kpatara ya.a

IHE NA-AKPATA YA

Ihe maara mmadụ ahụ́. Ọ bụrụ na gị na nne gị na nna gị bibu tupu ị lụọ nwunye, o nwere ike ịbụ na ị naghị akwụ ụgwọ ụlọ, ụgwọ ọkụ na ihe ndị yiri ha. O nwekwara ike ịbụ na ọ bụghị otú i si ele ego anya ka nwunye gị si ele ya. Dị ka ihe atụ, o nwere ike ịbụ na ị na-azụkarị ihe ma nwunye gị na-achọ ka unu na-edebe ego unu. Ọ gaghị adịrị unu mfe ịgbanwe ma ọ bụ kwekọrịta otú unu ga-esi jiri ego unu na-azụ ihe.

Di na nwunye ahịhịa kekọrọ n’ụkwụ

Otú ahụ ahịhịa a na-asụghị asụ ga na-eto, ụgwọ ọ bụla mmadụ ji ọ na-akwụghị ga na-amụ ọmụrụ nwa

Emeghị ihe n’oge ya. Otu nwoke ji ego achụ ego aha ya bụ Jim kwuru na mgbe ọ lụrụ nwaanyị ọhụrụ, ọ fọrọ obere ka ego ya gwụ n’ihi na ha anaghị eme ihe ụfọdụ mgbe ha kwesịrị. Ọ sịrị, “Anyị kwụrụ nnukwu ọmụrụ nwa n’ihi na anyị akwụghị ụgwọ ndị anyị ji n’oge. Ihe malitere isiri anyị ike.”

Ịzụ ihe n’aka. Ị ga na-emefu nnukwu ego ma ọ bụrụ na ị naghị akwụ ụgwọ ihe ọ bụla ị zụrụ ozugbo. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ na-abụ ha zụọ ihe n’Ịntanet ma ọ bụ na nnukwu ụlọ ahịa, ha enye ha nọmba ha ga-eji dọrọ ego n’ụlọ akụ̀. Ịzụ ihe otú a nwere ike ime ka mmadụ na-emefusị ego n’ihi na o nwere ike ịna-eche na ọ bụghị n’akpa ya ka ego ahụ si apụta. Ịzụ ihe n’aka nwekwara ike ime ka ndị lụrụ di na nwunye ọhụrụ banye n’ụgwọ.

Ihe ọ sọrọ ya bụrụ ya mere unu ji emefu ego, okwu ego nwere ike ịkpatara unu nsogbu. Otu akwụkwọ kwuru gbasara di na nwunye sịrị na ihe na-esekarịrị di na nwunye okwu bụ ego, ma hà nwere ego ma ọ bụ na hà enweghị. Ọ na-eme ka ha na-arụ ụka.

IHE I NWERE IKE IME

Kpebienụ ihe ndị unu na-agaghị na-azụ. Kama ịtawa nwunye gị ụta na ọ na-emefusị ego, gbakọọnụ aka chọpụta ihe na-eri unu ego nakwa ihe unu ga-eme ka unu kwụsị ịna-emefusị ego. Kpebiekwanụ na ego agaghị esere unu okwu.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Ndị Efesọs 4:32.

Kpebienụ ego ole unu ga-eji azụ ihe. A banye ọnwa ọhụrụ, dee ihe ndị unu ga-azụ n’akwụkwọ nakwa ego ole unu ga-eji azụ ha, ya sọkwa ihe ahụ ya dịrị obere. Ime otú a ga-enyere unu aka ịmata ihe na-eri ego unu. Ọ ga-emekwa ka unu mata ihe ndị unu na-ekwesịghị ịna-azụ.

Depụta ihe ndị unu kwesịrị iji ego eme dị ka ịzụ nri, ịzụ ákwà, ịkwụ ụgwọ ụlọ, ịzụ mmanụ ụgbọala na ihe ndị ọzọ. Dee ego ole i chere nke ọ bụla ga-eri unu kwa ọnwa.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: Luk 14:28.

‘Onye gbaziiri ihe bụ ohu onye gbazinyere ya ihe.’—Ilu 22:7

Wepụta ego unu ga-eji azụ ihe ndị ahụ i depụtara. Ụfọdụ na-etinye ego nke ọ bụla n’envelopu nke ya, dee ihe a ga-eji ego ahụ eme n’elu ya. Ọ bụrụ na ego dị n’envelopu nke ọ bụla agwụ, ha nwere ike kwụsị ịzụ ihe ahụ ma ọ bụkwanụ ha amanye aka n’ego dị n’envelopu ọzọ.

Chebaranụ otú unu si ele ihe onwunwe anya echiche. Ọ bụghị ịzụ ihe ọ bụla gbara n’ahịa na-eme ka mmadụ nwee obi ụtọ. Cheta na Jizọs sịrị: “Ọbụna mgbe mmadụ nwere ọtụtụ ihe, ihe o nwere adịghị eme ka ọ dị ndụ.” (Luk 12:15) Ọ bụ otú i si azụ ihe ga-egosi ma ì kwetara ihe a Jizọs kwuru.—Amaokwu Baịbụl ga-enyere gị aka: 1 Timoti 6:8.

Kwụsịnụ ịzụ ihe ndị na-adịchaghị mkpa. Otu nwoke lụrụla nwaanyị afọ abụọ aha ya bụ Aaron kwuru, sị: “Onye lụrụ nwaanyị ọhụrụ nwere ike iche na itinye steshịọn tiivi a na-akwụ ụgwọ ya na iri nri ahịa agaghị efu ya nnukwu ego, ma e mechaa, kpọtọkpọtọ agbaa n’ihu ehi. Mmadụ kwesịrị ịna-ekowe akpa ya ebe aka ya ga-eru.”

a N’agbanyeghị na ọ bụ nwoke lụrụ nwaanyị ọhụrụ ka anyị ga-agwa okwu n’isiokwu a, ihe anyị ga-ekwu ga-abara nwaanyị lụrụ di ọhụrụ uru, bakwaara di na nwunye ndị lụrụ kemgbe uru.

AMAOKWU BAỊBỤL NDỊ Ị GA-ECHEBARA ECHICHE

  • “Nweenụ obiọma n’ebe ibe unu nọ, na-enwekwanụ obi ọmịiko, na-agbagharanụ ibe unu kpamkpam.”—Ndị Efesọs 4:32.

  • “Ọ̀ dị onye n’ime unu nke chọrọ iwu ụlọ elu, nke na-agaghị ebu ụzọ nọdụ ala gbakọọ ihe ọ ga-efu?”​—Luk 14:28.

  • “Ebe anyị nwere ihe oriri na uwe, anyị ga-enwe afọ ojuju.”​—1 Timoti 6:8.

Micah na Megan

MICAH NA MEGAN

“Ọ bụrụgodị na ọ bụ otu onye na-ejide ego, na-akwụkwa ụgwọ ihe niile, ha abụọ kwesịrị ịma otú ego si abata na otú o si apụ. Ego agaghị na-esere ha okwu ma ọ bụrụ na ha na-agwa ibe ha ihe ndị ha ga-eji ego eme.”

David na Nataleine

DAVID NA NATALEINE

“Cheta na echi dị ime. Echekwala na ego ọ bụla batara gị n’aka bụ oriri oriri. Ọ bụrụ na ị naghị edebe ego, gịnị ka ị ga-eme ma ihe gbata gbata mee?”

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya