Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g 3/15 p. 10-11
  • Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata
  • Teta!—2015
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata?
  • Ahụhụ anyị na-ata ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • Ajụjụ nke Atọ: Gịnị Mere I Ji Hapụ M Ka M Na-ata Ahụhụ?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2012
  • Ònye Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2015
g 3/15 p. 10-11
Otu nwoke nọ ọdụ n’ebe ụlọ dara na-ele foto. Obi adịghịkwa ya mma

IHE BAỊBỤL KWURU

Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ọ bụ Chineke na-akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata taa. Ha na-ekwukwa na ọ bụrụgodị na ọ bụghị ya na-akpata ya, ahụhụ ndị mmadụ na-ata anaghị emetụ ya n’obi. Baịbụl ọ̀ kwadoro ihe a ha na-ekwu? Ihe Baịbụl kwuru n’okwu a nwere ike ịdị iche n’ihe i chere.

Ọ̀ bụ Chineke na-akpata ahụhụ anyị na-ata?

“N’eziokwu, Chineke adịghị eme ihe ọjọọ.”—Job 34:12.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ihe ọ bụla merenụ bụ uche Chineke. Ihe a ha na-ekwu pụtara na ha kwetara na ọ bụ Chineke ka ahụhụ anyị na-ata si n’aka. N’ihi ya, ọ bụrụ na e nwee ọdachi, ha na-eche na Chineke ji ya na-ata ndị mmehie ahụhụ.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na aka Chineke adịghị n’ahụhụ anyị na-ata. Dị ka ihe atụ, Baịbụl kwuru na mgbe anyị na-ata ahụhụ, anyị ekwesịghị ikwu na ‘ọ bụ Chineke na-anwa anyị.’ Ọ̀ bụ maka gịnị? Ọ bụ “n’ihi na a pụghị iji ihe ọjọọ nwaa Chineke, ya onwe ya adịghịkwa anwa onye ọ bụla.” (Jems 1:13) Ihe ọ pụtara bụ na ọ bụghị Chineke na-akpata ọnwụnwa ndị na-abịara anyị na ahụhụ ndị na-eso ha. Ọ bụrụ ya na-akpata ha, ọ pụtara na ọ bụ onye ọjọọ. Ma, “Chineke adịghị eme ihe ọjọọ.”—Job 34:12.

Ọ bụrụ na ahụhụ anyị na-ata esighị Chineke n’aka, ònyezi ka o si n’aka? Oleekwa ihe na-akpata ya? Ọ dị mwute na mgbe ụfọdụ, ụmụ mmadụ na-emekpa ibe ha ahụ́. (Ekliziastis 8:9) Ihe ọzọ na-akpatara ụmụ mmadụ ahụhụ bụ “ihe a na-atụghị anya ya.” Ihe ọ pụtara bụ na ihe ọjọọ nwere ike ịdabara onye ọ bụla. (Ekliziastis 9:11) Ma, Baịbụl kwuru na ọ bụ Setan bụ́ Ekwensu kacha akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata taa, n’ihi na ọ bụ ya na-achị ụwa a, ụwa dum adịrịkwa n’aka ya. (Jọn 12:31; 1 Jọn 5:19) Ọ bụ Setan na-eme ka ụmụ mmadụ na-ata ahụhụ, ọ bụghị Chineke.

Ahụhụ anyị na-ata ọ̀ na-emetụ Chineke n’obi?

“N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.”—Aịzaya 63:9.

IHE NDỊ MMADỤ NA-EKWU

Ụfọdụ ndị na-ekwu na ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata adịghị emetụ Chineke n’obi. Dị ka ihe atụ, otu onye na-ede akwụkwọ kwuru na Chineke anaghị emetere anyị ebere ma anyị tawa ahụhụ. O kwukwara na ọ bụrụ na Chineke dị n’eziokwu, ọ ga-abụrịrị na obi tara ya mmiri.

IHE BAỊBỤL KWURU

Ihe Baịbụl kwuru na-egosi na obi ataghị Chineke mmiri nakwa na ọ na-emetere ụmụ mmadụ ebere. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ ya n’obi. N’oge na-adịghị anya, ọ ga-akwụsị ha niile. Baịbụl na-akụziri anyị ihe ndị ga-akasi anyị obi ma anyị na-ata ahụhụ. Ka anyị leba anya n’atọ n’ime ha.

Chineke ma na anyị na-ahụsi anya. Jehovaa ma banyere ahụhụ niile ụmụ mmadụ na-ata kemgbe ụwa n’ihi na “anya ya nke na-enwu gbaa” na-ahụ ihe niile. (Abụ Ọma 11:4; 56:8) Dị ka ihe atụ, mgbe a na-ata ụmụ Izrel ahụhụ n’Ijipt, o kwuru, sị: “Ahụwo m ahụ́ a na-emekpa ndị m.” Ihe ahụ a na-eme ha metụrụ ya n’ahụ́ n’ihi na o kwuru na ya “maara nnọọ ihe mgbu ha na-enwe.” (Ọpụpụ 3:7) Ihe amaokwu a kwuru gosiri na uche Chineke dị n’ahụhụ ọ bụla anyị na-ata, ya sọkwa ya ya bụrụ na ndị ọzọ amaghị ihe anyị na ya na-alụ ma ọ bụkwanụ na ha aghọtachaghị otú o si na-eme anyị. Ihe a Baịbụl kwuru na-akasi ọtụtụ ndị obi.—Abụ Ọma 31:7; Ilu 14:10.

Chineke na-emetere anyị ebere ma anyị na-ata ahụhụ. Ahụhụ anyị na-ata na-emetụ Jehova Chineke n’obi, ọ bụghị naanị na ọ ma na anyị na-ata ahụhụ. Dị ka ihe atụ, mgbe ndị fere ya n’oge ochie nọ ná nsogbu, ọ dịghị ya mma n’obi. Baịbụl kwuru, sị: “N’oge niile ha nọ na-ata ahụhụ, ọ nọ na-ewute ya.” (Aịzaya 63:9) N’agbanyeghị na o nweghị ebe anyị ruru Chineke eru, ọ na-emetere anyị ebere mgbe anyị na-ata ahụhụ. Ọ na-ewere na ọ bụ ya na-ata ahụhụ ahụ. N’eziokwu, “Jehova nwere obi ọmịiko dị ukwuu, na-emekwa ebere.” (Jems 5:11) Ọ na-enyekwara anyị aka idi ahụhụ anyị na-ata.—Ndị Filipaị 4:12, 13.

Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile anyị na-ata. Baịbụl kwuru na Chineke ga-akwụsị ahụhụ niile anyị na-ata. Ọ ga-eji Alaeze ya eme ya. Baịbụl gwara anyị na n’oge ahụ, Chineke ‘ga-ehichapụ anya mmiri niile n’anya ụmụ mmadụ, ọnwụ agaghị adị ọzọ, iru uju ma ọ bụ mkpu ákwá ma ọ bụ ihe mgbu agaghịkwa adị ọzọ. Ihe mbụ niile agabigawo.’ (Mkpughe 21:4) Gịnị ka Chineke ga-eme banyere ndị nwụrụ anwụ? Ọ ga-akpọlite ha ka ha biri n’ụwa ebe a. Ha agaghịkwa ata ahụhụ n’oge ahụ. (Jọn 5:28, 29) N’oge ahụ, ànyị ka ga na-echeta ahụhụ anyị na-ata ugbu a? Mba, maka na Jehova kwere anyị nkwa, sị: “A gaghị echeta ihe mbụ niile, ha agaghị abatakwa n’obi.”—Aịzaya 65:17.b

a Baịbụl kwuru na aha Chineke bụ Jehova.

b Ị chọọ ịma ihe mere Chineke ka ji hapụ anyị ka anyị na-ata ahụhụ na otú ọ ga-esi kwụsị ahụhụ niile anyị na-ata, gụọ akwụkwọ bụ́ Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi? isi nke 8 na nke 11. Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya