Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • wp18 nke 3 p. 12
  • Ònye Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ònye Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?
  • Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Mere Ndị Mmadụ Ji Atagbu Onwe Ha n’Ahụhụ?
    Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị?
  • Ahụhụ Ụmụ Mmadụ Na-ata
    Teta!—2015
  • Gịnị Ka Baịbụl Kwuru?
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2017
  • N’ihi Gịnị Ka Chineke Ji Kwere Ka Nhụjuanya Dịrị?
    Gịnị n’Ezie Ka Bible Na-akụzi?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke Ọhaneze)—2018
wp18 nke 3 p. 12
Ndị gbatara inyere ndị nwere ihe mberede okporo ụzọ aka

Ònye Ka Ahụhụ Anyị Na-ata Si n’Aka?

Ọ bụrụ na ahụhụ anyị na-ata esighị Chineke n’aka, gịnịzi na-akpata agụụ, ogbenye ọnụ ntụ, agha, ọrịa, na ọdachi ndị na-emere onwe ha? Okwu Chineke bụ́ Baịbụl mere ka anyị mata ihe atọ kacha akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata:

  1. Mmadụ Ịchọ Ihe Ga-abara Naanị ya Uru, Anyaukwu, na Ịkpọasị. ‘Mmadụ chịrị mmadụ ibe ya ọchịchị nchịgbu.’ (Ekliziastis 8:9) Ụmụ mmadụ na-atakarị ahụhụ n’ihi ezughị okè ndị mmadụ, ndị na-eche naanị gbasara onwe ha ma ọ bụ ndị obi fere azụ.

  2. Oge Ọdachi na Ihe A Na-atụghị Anya Ya. Ụmụ mmadụ na-atakarị ahụhụ n’ihi na “oge ọdachi na ihe a na-atụghị anya ya na-abịakwasị ha niile.” (Ekliziastis 9:11) Ihe ọ pụtara bụ na mmadụ nwere ike ịdaba ná nsogbu n’ihi ịnọ ebe na-ekwesịghị ekwesị n’oge na-ekwesịghị ekwesị, akpachapụghị anya ma ọ bụkwanụ imehie ihe.

  3. Ajọ Onye Ahụ Na-achị Ụwa. Baịbụl gwara anyị isi sekpụ ntị na-akpata ahụhụ ụmụ mmadụ na-ata. O kwuru, sị: “Ụwa dum dị n’aka ajọ onye ahụ.” (1 Jọn 5:19) Ajọ onye ahụ bụ Ekwensu. Ọ bụbu mmụọ ozi Chineke, ma, ‘o guzosighị ike n’eziokwu.’ (Jọn 8:44) Ndị mmụọ ozi ụfọdụ sooro Ekwensu nupụrụ Chineke isi n’ihi na ha na-achọ ihe ga-abara naanị ha uru. Ha si otú a ghọọ ndị mmụọ ọjọọ. (Jenesis 6:1-5) Kemgbe ha nupụchara isi, Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya na-emezi ka ihe ọjọọ ju ebe niile n’ụwa. Ihe a ha na-eme na-akakwu njọ n’oge a. Ugbu a, ezigbo iwe na-ewe Ekwensu, ya emee ka ‘ọ na-eduhie elu ụwa dum mmadụ bi.’ Nke a emeela ka ‘ahụhụ dịrị ụwa.’ (Mkpughe 12:9, 12) N’eziokwu, Ekwensu bụ onye ọchịchị obi tara mmiri. Obi na-atọ ya ụtọ ma ndị mmadụ na-ata ahụhụ. Ọ bụ Setan na-akpata ahụhụ ndị mmadụ na-ata, ọ bụghị Chineke.

CHEGODỊ IHE A: Ọ bụ naanị onye ọjọọ obi fere azụ ga-eme ka ndị aka ha dị ọcha na-ata ahụhụ. Ma, Baịbụl kwuru, sị: “Chineke bụ ịhụnanya.” (1 Jọn 4:8) Ebe ọ bụ na Chineke bụ ịhụnanya, ‘ọ bụụrụ Chineke ihe arụ ime ihe ọjọọ, bụrụkwa Onye Pụrụ Ime Ihe Niile ihe arụ ime ihe n’ụzọ na-ezighị ezi!’—Job 34:10.

Ma, i nwere ike ịna-ajụ, sị: ‘Ruo ole mgbe ka Chineke Pụrụ Ime Ihe Niile ga-ahapụ Ekwensu ka ọ na-achị ọchịchị nchịgbu ya a?’ Dị ka anyị hụrụ, Chineke kpọrọ ihe ọjọọ asị, ahụhụ anyị na-ata na-ewutekwa ya nke ukwuu. Baịbụl gwakwara anyị, sị: “Na-atụkwasịnụ ya nchegbu unu niile, n’ihi na ihe banyere unu na-emetụ ya n’obi.” (1 Pita 5:7) Dị ka anyị ga-ahụ n’isiokwu na-esonụ, Chineke hụrụ anyị n’anya, ọ ga-eme ka ahụhụ na mmegbu niile kwụsị n’ihi na o nwere ikike ime ya.a

a Ị chọọ ịmatakwu ihe mere Chineke ji kwe ka ahụhụ dịrị, gụọ isi nke 11 n’akwụkwọ Gịnị Ka Baịbụl Na-akụziri Anyị? Ọ bụ Ndịàmà Jehova bipụtara ya. I nwekwara ike ịga na www.jw.org/ig danloduo ya n’efu.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya