Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • g18 nke 2 p. 13
  • 10 Ikwesị Ntụkwasị Obi

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • 10 Ikwesị Ntụkwasị Obi
  • Teta!—2018
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • IHE Ọ PỤTARA
  • IHE MERE O JI DỊ MKPA
  • IHE I NWERE IKE IME
  • Gịnị Mere na Ndị Mụrụ M Atụkwasịghị M Obi?
    Teta!—2008
  • Ntụkwasị Obi Dị Mkpa Iji Bie Ndụ Obi Ụtọ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2003
  • Gịnị Ka M Ga-eme Ka A Hapụ M Ịna-ekpebi Ihe M Ga-eme?
    Ajụjụ Ndị Na-eto Eto Na-ajụ—Azịza Ndị Na-adị Irè, Nke 1
  • Ị Ga-atụkwasịli Ụmụnna Gị Obi
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2022
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Teta!—2018
g18 nke 2 p. 13
Ebe otu nwa agbọghọ na-akwụ ndị ụlọ akụ̀ ego o ji ha

Irubere ndị mụrụ gị isi dị ka ịkwụ ụgwọ i biiri ndị ụlọ akụ̀. Ọ bụrụ na ị na-akwụ ya mgbe gị na ha kwekọrịtara, ha ga na-ebinye gị ego mgbe ọ bụla ị chọrọ

MAKA NDỊ NA-ETO ETO

10 Ikwesị Ntụkwasị Obi

IHE Ọ PỤTARA

Ọ bụrụ na mmadụ bụ onye a ga-atụkwasịli obi, obi ga-esi ndị mụrụ ya, ndị enyi ya na ndị were ya n’ọrụ ike na ọ ga na-eme ihe dị mma. Ụdị onye ahụ na-eme ihe iwu kwuru, na-emezu nkwa ya, na-ekwukwa eziokwu mgbe niile.

IHE MERE O JI DỊ MKPA

Ọtụtụ mgbe, ihe ga-eme ka ndị mụrụ gị na-enye gị ohere ime ihe ị chọrọ bụ ma ọ bụrụ na i gosila ha n’oge gara aga na ha ga-atụkwasịli gị obi.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarahi kwuru, sị: “Otú kacha mma ị ga-esi eme ka ndị mụrụ gị na-atụkwasị gị obi bụ ịna-akpa àgwà ka onye ṅụjuru mmiri ara afọ, ma mgbe gị na ha nọ ma mgbe gị na ha na-anọghị.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Na-akpanụ àgwà dị mma.”—1 Pita 2:12.

IHE I NWERE IKE IME

Ọ bụrụ na ị na-achọ ka ana-atụkwasịkwu gị obi ma ọ bụ ka a maliteghachi ịtụkwasị gị obi, ihe ndị a na-esonụ ga-enyere gị aka.

Na-ekwu eziokwu: Ozugbo i bidoro ịgha ụgha, ndị mmadụ ga-akwụsị ịna-atụkwasị gị obi. Ma, ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, karịchaa ma i mejọọ ihe, ndị ọzọ ga na-atụkwasị gị obi.

Otú nwa okorobịa aha ya bụ Caiman kwuru, sị: “Ọ na-adị mfe mmadụ ikwu eziokwu mgbe ọ na-agaghị eme ka e lewa ya anya ọjọọ. Ma ọ bụrụ na ị na-ekwu eziokwu, ọ bụrụgodị na ọ ga-eme ka e lewa gị anya ọjọọ, ndị mmadụ ga na-atụkwasịkwu gị obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Anyị chọrọ ịna-akwụwa aka ọtọ n’ihe niile.’—Ndị Hibru 13:18.

Na-eme ihe ga-eme ka a tụkwasị gị obi: Otu nchọpụta e mere n’Amerịka gosiri na otu n’ime ihe atọ kacha mkpa ndị na-ewe mmadụ n’ọrụ na-achọ bụ onye ha ga-atụkwasịli obi. Ime ihe ndị ga-eme ka a na-atụkwasị gị obi ugbu a ga-enyere gị aka mgbe i toro.

Otu nwa agbọghọ aha ya bụ Sarah kwuru, sị: “Ndị mụrụ m na-ama mgbe ọ bụla m rụrụ ọrụ ha kenyere m n’ụlọ n’echeghị ka ha chetara m ya echetara. Ka m na-emekwu otú ahụ, ha na-atụkwasịkwu m obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: “Obi siri m ike na ị ga-eme ihe m gwara gị. . . . Amakwa m na ị ga-emedị karịa ihe m gwara gị.”—Faịlimọn 21.

Na-enwe ndidi. Ọ na-adị mfe ịchọpụta na mmadụ na-eto ogologo, ma ọ na-ewe oge ịchọpụta ma mmadụ ò tozuola okè. Ọ bụ ya mere ndị na-eto eto ji kwesị ịna-enwere ndị mụrụ ha na ndị ọzọ ndidi.

Otu nwa okorobịa aha ya bụ Brandon kwuru, sị: “Ọ bụghị i mee otu ihe dị mma, gị atụwa anya ka ndị mụrụ gị na ndị ọzọ jiri maka ya tụkwasịwa gị obi. Kama, ị nọgide na-eme ihe dị mma, ka oge na-aga, ha ga-atụkwasịwa gị obi.”

IHE BAỊBỤL KWURU: ‘Yirinụ ndidi ka uwe.’—Ndị Kọlọsi 3:12.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya