Ihe Ụfọdụ Ndị Kweere
Ndị Hindu
kweere na ahụhụ bụ ihe e ji akwụ mmadụ ụgwọ ihe ọjọọ ndị o mere ná ndụ ọ dị ugbu a ma ọ bụ ndị nke o mere n’ụwa ya mbụ. Ma, ọ bụrụ na mmadụ agbalịsie ike wepụchaa uche ya n’ihe nke ụwa, onye ahụ nweziri ike iru moksha, ya bụ, mgbe ọ ga-akwụsị ịlọ ụwa.
Ndị Alakụba
kweere na ahụhụ bụ ihe e ji akwụ ndị na-ekweghị ekwe ụgwọ ihe ọjọọ ha mere nakwa ihe e ji ele okwukwe ndị kwere ekwe ule. Otu nwoke aha ya bụ Sayyid Syeed, bụ́ onyeisi òtù ndị Alakụba a na-akpọ Islamic Society of North America, sịrị na ahụhụ bụ ihe e ji echetara anyị na anyị “kwesịrị ịna-ekele Chineke maka ngọzi ya nakwa na anyị kwesịrị ịna-enyere ndị ogbenye aka.”
Ndị na-eme omenala ndị Juu
kwuru na ọ bụ ihe mmadụ metara na-akpatara ya ahụhụ. Ụfọdụ ndị Juu na-ekwu na a ga-enwe mbilite n’ọnwụ, mgbe a ga-eji ihe ọma kwụọ ndị aka ha dị ọcha tara ahụhụ ụgwọ. E nwekwara ndị na-ekpe okpukpe ndị Juu kweere n’ihe omimi a na-akpọ Kabbalah. Ha kwetakwara na mmadụ na-alọ ụwa. Ha sịrị na ọ na-enye mmadụ ohere imezi ihe ọjọọ ndị o mere n’ụwa ya mbụ.
Ndị Buda
kweere na mmadụ na-ata ahụhụ n’oge niile ọ na-alọ ụwa ruo mgbe echiche ọjọọ na ọchịchọ ọjọọ dị ya n’obi pụchara. Ma, ọ bụrụ na onye ahụ enweta amamihe, na-arụ ọrụ ọma ma na-achịkwa echiche ya, o nwere ike imecha ruo nirvana, ebe ahụhụ ọ bụla na-adịghị.
Ndị okpukpe Kọnfushọs
kweere na ọtụtụ n’ime ahụhụ a na-ata bụ n’ihi “ihe ọjọọ ụmụ mmadụ na-eme.” Ọ bụ ihe a ka otu akwụkwọ aha ya bụ A Dictionary of Comparative Religion kwuru. Ọ bụ eziokwu na ha kwetara na ọ bụrụ na mmadụ ebie ndụ dị mma, ọ ga-eme ka ahụhụ ya belata, ma ha na-ekwu na ụfọdụ ahụhụ anyị na-ata si n’aka “ndị mmụọ karịrị mmadụ ike. N’ihi ya, onye ọ bụla ga-anabatarịrị ihe ndị mmụọ ndị a kpebiri.”
Ụfọdụ ndị omenala
sịrị na ọ bụ ndị amusu na-akpata ahụhụ. Ha kweere na ndị amusu nwere ike iwetara mmadụ ihu ọma ma ọ bụ ọdachi. Ha kwekwaara na mmadụ mee ihe ụfọdụ ndị dibịa ga-asị ya mee, na ahụhụ ya ga-ebelata. N’ihi ya, na ọ bụrụ na mmadụ adaa ọrịa, ime omenala ụfọdụ na ọgwụ ndị dibia ga-enye onye ahụ ga-eme ka ọrịa ahụ laa.
Ndị Kraịst
kweere na ọ bụ mmehie mmadụ abụọ mbụ kpatara ahụhụ, dị ka a kọrọ n’akwụkwọ Baịbụl bụ́ Jenesis. Ma, ọtụtụ chọọchị etinyela nnu na ose n’ihe ahụ Baịbụl kwuru. Dị ka ihe atụ, ụfọdụ ndị Katọlik sịrị na onye nọ n’ahụhụ nwere ike ịrịọ Chineke ka o jiri maka ahụhụ ahụ ọ na-ata gọzie chọọchị ha, ma ọ bụkwanụ ka o jiri maka ya zọpụta onye ọzọ.
MỤTAKWUO IHE NDỊ ỌZỌ
Lee vidio bụ́ Chineke Ọ̀ Na-anabata Otú Ọ Bụla Ndị Mmadụ Si Efe Ya? Ọ dị na jw.org.