Okwu Mmalite
Ọ bụghị iwu na ị ga-abụ onye ọkà mmụta sayensị tupu gị amata na ụwa anyị a nọ n’ezigbo nsogbu. A na-emebi ezigbo mmiri anyị na-aṅụ, oké osimiri, oké ọhịa, na ikuku anyị na-ekuru. Ụwa anyị a ọ̀ ga-adịgide? Gụọ akwụkwọ a ka ị mata ihe mere obi ga-eji esi anyị ike na ọ ga-adịgide.