Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 32
  • Ihe Otiti Iri Ahụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ihe Otiti Iri Ahụ
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ònye Bụ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Ahụhụ nke Iri
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ahụhụ nke Anọ Ruo nke Itoolu
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 32
Mmiri Osimiri Naịl ghọrọ ọbara, ihe otiti nke mbụ

AKỤKỌ NKE 32

Ihe Otiti Iri Ahụ

LEE anya na foto ndị a. Nke ọ bụla n’ime ha na-egosi ihe otiti Jehova tiri Ijipt. Na foto nke mbụ, ị ga-ahụ Erọn ka o ji osisi na-eti Osimiri Naịl. Mgbe o mere nke ahụ, mmiri osimiri ahụ ghọrọ ọbara. Azụ̀ niile dị na ya wee nwụọ, osimiri ahụ wee malite isi ísì.

Fero na-achụpụ mbàrá ndị juru n’ihe ndina ya n’oge ihe otiti nke abụọ

Ọzọ, Jehova mere ka mbàrá si n’Osimiri Naịl pụta. Ha jupụtara ebe niile—n’ime ekwu ọkụ ha, n’ime ite nri ha, n’elu ihe ndina ha—n’ebe niile. Mgbe mbàrá ndị ahụ nwụrụ, ndị Ijipt chịkọtara ha n’ikpo n’ikpo, ala niile wee na-esi ísì ọjọọ n’ihi ha.

Erọn wee tie mkpanaka ya n’ala, ájá niile wee ghọọ anwụnta. Ha bụ ụmụ ahụhụ na-efe efe ndị na-ata mmadụ. Anwụnta ahụ bụ ihe otiti nke atọ e tiri ndị Ijipt.

Ebe anwụnta na-ata otu nwaanyị n’ihe otiti nke atọ

Ihe otiti ndị ọzọ mekpara naanị ndị Ijipt ahụ́, o metụtaghị ụmụ Izrel. Ihe otiti nke anọ bụ odudu, bụ́ ndị jupụtara n’ụlọ ndị Ijipt niile. Ihe otiti nke ise dakwasịrị ụmụ anụmanụ. Ọtụtụ n’ime ehi na ewu na atụrụ ndị Ijipt, nwụrụ.

Ọzọ, Mozis na Erọn kpooro ntụ ma wụlie ya elu. Ha kpatara ọnyá ọjọọ n’ahụ́ mmadụ na ụmụ anụmanụ. Nke a bụ ihe otiti nke isii.

Mgbe nke a gasịrị, Mozis chịliri aka ya elu n’ihu mbara igwe, Jehova wee zite égbè eluigwe na akụ̀ mmiri igwe. Ọ bụ akụ́ mmiri igwe kasị njọ ndị Ijipt nwetụworo.

Ebe ndị Ijipt na-achọ ka ha gbaara odudu ọsọ n’ihe otiti nke anọ
Ọtụtụ ụmụ anụmanụ ndị Ijipt nwụrụ n’ihe otiti nke ise

Ihe otiti nke asatọ bụ igurube bara ụba. Ọ ka adịbeghị mgbe ọ bụla a hụrụ ọtụtụ igurube dị otú ahụ tupu oge ahụ. Ha ripịara ihe niile akụ́ mmiri igwe mebifọrọ.

Ihe otiti nke itoolu bụ ọchịchịrị. Ruo ụbọchị atọ, oké ọchịchịrị kpuchiri ala ahụ niile, ma ụmụ Izrel nwere ìhè n’ebe ha bi.

N’ikpeazụ, Chineke gwara ndị ya ka ha fesa ọbara nwa ewu ma ọ bụ nwa atụrụ n’ọnụ ụzọ ha. Mgbe ahụ, mmụọ ozi Chineke gabigara n’ala Ijipt. Mgbe mmụọ ozi hụrụ ọbara ahụ, o gbughị onye ọ bụla nọ n’ime ụlọ ahụ. Ma n’ụlọ niile ebe ọbara na-adịghị n’ọnụ ụzọ, mmụọ ozi Chineke gburu ụmụ mmadụ na anụmanụ ndị e buru ụzọ mụọ. Nke a bụ ihe otiti nke iri.

Mgbe ihe otiti ikpeazụ a gasịrị, Fero gwara ụmụ Izrel ka ha laa. Ndị nke Chineke ejikerewo ịla, n’abalị ahụ, ha malitere njem ha ịpụ n’Ijipt.

Ọpụpụ isi 7 ruo 12.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya