Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • lfb ihe ọmụmụ 21 p. 54-p. 55 para. 2
  • Ahụhụ nke Iri

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ahụhụ nke Iri
  • Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Mozis na Erọn Ejee Ịhụ Fero
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Ahụhụ Atọ Mbụ A Tara Ndị Ijipt
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ònye Bụ Jehova?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1993
  • Chineke Napụtara Ụmụ Izrel
    Baịbụl—Gịnị Ka Ọ Na-ekwu?
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
lfb ihe ọmụmụ 21 p. 54-p. 55 para. 2
Ebe otu nwoke Izrel na-efesa ọbara n’ọnụ ụzọ ya

ISI NKE 21

Ahụhụ Nke Iri

Mosis gwara Fero na ya agaghị anwa anwa bịa ịhụ ya ọzọ. Ma tupu ya alawa, ọ gwara Fero, sị: ‘N’etiti abalị, nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’Ijipt ga-anwụ, malite n’ọkpara Fero ruo n’ọkpara ndị na-eje ozi.’

Jehova gwaziri ndị Izrel ka ha rie nri pụrụ iche. Ọ gwara ha, sị: ‘Gbuonụ otu ebule ma ọ bụ mkpi dị otu afọ, fesakwanụ ọbara ya n’ọnụ ụzọ ụlọ unu. Hụọnụ ya n’ọkụ, riekwanụ ya na achịcha na-ekoghị eko. Yirinụ uwe unu na akpụkpọ ụkwụ, dịrịkwanụ njikere ịla. N’abalị a ka m ga-eme ka unu nwere onwe unu.’ Chegodị otú obi si tọọ ndị Izrel ezigbo ụtọ mgbe Jehova gwara ha ihe a.

N’etiti abalị, mmụọ ozi Jehova gara n’ụlọ niile dị n’Ijipt. Mmụọ ozi ahụ gburu nwa nwoke ọ bụla e bu ụzọ mụọ n’ụlọ ọ bụla a na-efesaghị ọbara n’ọnụ ụzọ ya. Ma, mmụọ ozi ahụ gafere ụlọ ọ bụla e fesara ọbara n’ọnụ ụzọ ya. E nweghị ezinụlọ ndị Ijipt mmadụ na-anwụghị na ya, ma ezinụlọ ndị ọgaranya ma nke ndị ogbenye. Ma, e nweghị nwa ọ bụla nwụrụ n’ezinụlọ ndị Izrel.

Ọkpara Fero nwụdịrị. Ihe a ekweghịzi Fero odidi. Ọ bụ ya mere o ji gwazie Mosis na Erọn ozugbo, sị: ‘Bilienụ, sinụ ebe a pụọ. Gaanụ fee Chineke unu. Chịrịnụ anụ ụlọ unu lawa.’

Ndị Izrel si n’Ijipt pụọ n’oge ọnwa gbazuru agbazu, na-etikwa gbaa. Ha haziri onwe ha n’ezinụlọ n’ezinụlọ nakwa n’ebo n’ebo. Ha dị narị puku ụmụ nwoke isii (600,000) nakwa ọtụtụ ụmụ nwaanyị na ụmụaka. Ọtụtụ ndị na-abụghị ndị Izrel sokwa ha ka ha fewezie Jehova. Ndị Izrel emechaala nwere onwe ha.

N’afọ ọ bụla, ndị Izrel ga na-eri nri ahụ pụrụ iche iji na-echeta otú Jehova si napụta ha. Ihe a na-akpọ ya bụ Ememme Ngabiga.

Ebe ndị Izrel si n’Ijipt na-apụ

“Ọ bụ ihe a mere m ji hapụ gị ndụ: ka m wee jiri gị gosi ike m, ka m wee mee ka a kọsaa aha m n’ụwa niile.” ​—Ndị Rom 9:17

Ajụjụ: Gịnị bụ ahụhụ nke iri Jehova tara ndị Ijipt? Gịnị ka ndị Izrel mere ka ha ghara iso taa ahụhụ nke iri ahụ?

Ọpụpụ 11:1–12:42; 13:3-10

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya