Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • my akụkọ 37
  • Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe
  • Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ụlọikwuu A Ga-anọ Na-efe Chineke
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Ihe Ndị Dị n’Akwụkwọ Ọpụpụ
    Baịbụl Nsọ nke Nsụgharị Ụwa Ọhụrụ
  • Jehova Na-akpọ Anyị Ka Anyị Bụrụ Ndị Ọbịa Ya
    Ụlọ Nche Nke Na-ekwusa Alaeze Jehova (Nke A Na-amụ Amụ)—2024
Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
my akụkọ 37
Ụlọikwuu ma ọ bụ ụlọikwuu nzute ndị Izrel na-anọ efe ofufe

AKỤKỌ NKE 37

Ụlọ Ntu A Na-anọ Efe Ofufe

Ị̀ MA ụlọ dị ihe a? Ọ bụ ụlọ ntu pụrụ iche a na-anọ efe Jehova ofufe. A na-akpọ ya ụlọikwuu. Ụmụ Izrel wuchara ya otu afọ mgbe ha hapụsịrị Ijipt. Ị̀ ma onye kwuru ka e wuo ya?

Ọ bụ Jehova kwuru ya. Mgbe Mozis nọ n’elu Ugwu Saịnaị, Jehova gwara ya otú a ga-esi wuo ya. O kwuru ka e wuo ya otú ọ ga-adị mfe iwepụtagasị akụkụ ya dị iche iche. N’ụzọ dị otú a, a pụrụ iburu akụkụ ya niile jee ebe ọzọ ma jikọtakwa ha ọzọ n’ebe ahụ. Mgbe ụmụ Izrel na-esi n’otu ebe aga ebe ọzọ n’ọzara, ha na-eburu ụlọ ntu ahụ.

Ọ bụrụ na i lee anya n’obere ọnụ ụlọ dị n’isi isi ụlọ ntu a, ị ga-ahụ otu igbe, ma ọ bụ akpati. A na-akpọ ya igbe ọgbụgba ndụ. O nwere ndị mmụọ ozi ma ọ bụ cherub abụọ e ji ọlaedo mee n’isi ya abụọ. Chineke dere Iwu Iri ahụ ọzọ n’elu mbadamba nkume abụọ, n’ihi na Mozis tiwara ndị mbụ O dere. E debere nkume ndị a n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ. Ite e tinyere mana dịkwa n’ime igbe ahụ. Ì chetara ihe mana bụ?

Erọn nwanne Mozis bụ onye Jehova họpụtara ịbụ nnukwu onye nchụàjà. Ọ na-edu ndị Izrel n’ofufe Jehova. Ụmụ ya ndị ikom bụkwa ndị nchụàjà.

Ugbu a, lee anya n’ọnụ ụlọ nke ka ukwuu nke dị n’ụlọ ntu ahụ. Ọ ka obere ọnụ ụlọ ahụ dị n’isi isi ibu okpukpu abụọ. Ị̀ na-ahụ igbe, ma ọ bụ obere akpati ahụ, nke anwụrụ ọkụ si na ya na-akwụgo elu? Nke a bụ ebe ịchụàjà nke ndị nchụàjà na-esure ihe ụtọ a na-akpọ ihe nsure ọkụ na-esi ísì ụtọ. E nwekwara ihe ndọba oriọna nke nwere oriọna asaa. Ihe nke atọ nke dị n’ime ụlọ ahụ bụ tebụl. A na-edebe ogbe achịcha iri na abụọ n’elu ya.

Nnukwu efere a gbajuru mmiri na ebe ịchụàjà

N’ime ogige ụlọikwuu ahụ, e nwere nnukwu ọkwá ma ọ bụ efere nke a na-agbaju mmiri. Ndị nchụàjà na-eji ya asa ihe. E nwekwara nnukwu ebe ịchụàjà. Ọ bụ n’ebe ahụ ka a na-achụrụ Jehova àjà ụmụ anụmanụ e gburu egbu, bụ́ ndị a na-esure n’ọkụ. Ụlọ ntu ahụ dị n’etiti, ụlọ ntu ndị ụmụ Izrel bi na ha adịrị gburugburu ya.

Ọpụpụ 25:8-40; 26:1-37; 27:1-8; 28:1; 30:1-10, 17-21; 34:1, 2; Ndị Hibru 9:1-5.

Ajụjụ Ndị E Ji Amụ Akwụkwọ A

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya