Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • w06 1/15 p. 31
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
  • Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?
    Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Irite Uru Site ‘n’Ọka nke Eluigwe’
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—1999
  • Ha Emezughị Nkwa Ha Kwere
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Okooko Osisi Epuo na Mkpanaka Erọn
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
w06 1/15 p. 31

Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ

Ọ̀ bụ nanị mbadamba nkume abụọ ahụ dị n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ka è nwere ihe ndị ọzọ dịrị n’ime ya?

N’oge a raara ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru nye n’afọ 1026 T.O.A., “ọ dịghị ihe dị n’igbe ahụ, ọ bụ nanị mbadamba nkume abụọ nke Mozis tinyere n’ime ha na Horeb, mgbe Jehova na ụmụ Izrel gbara ndụ, mgbe ha siri n’Ijipt pụta.” (2 Ihe E Mere 5:10) Otú ọ dị, ọ dị mgbe ihe ndị ọzọ dịkwa n’ime ya.

“N’ọnwa nke atọ mgbe ụmụ Izrel pụtasịrị n’ala Ijipt,” ha banyere n’ọzara Saịnaị. (Ọpụpụ 19:1, 2) Mgbe nke ahụ gasịrị, Mozis rịgooro n’Ugwu Saịnaị ma weta mbadamba nkume abụọ ahụ ndị e dekwasịrị Iwu ahụ na ha. Mozis kọrọ, sị: “M wee chigharịa si n’ugwu ahụ rịda, tinye mbadamba nkume ahụ n’ime igbe ahụ nke m mererịị; ha dịkwa n’ebe ahụ, dị ka Jehova nyere m iwu.” (Deuterọnọmi 10:5) Nke a bụ igbe ma ọ bụ ihe a ga-eji tinye ihe ruo nwa oge, nke Jehova gwara Mozis ka ọ rụọ iji tinye mbadamba nkume abụọ ahụ e dekwasịrị Iwu ahụ na ha. (Deuterọnọmi 10:1) A rụchara igbe ọgbụgba ndụ ahụ ná ngwụsị afọ 1513 T.O.A.

Ntakịrị oge ka a napụtasịrị ndị Izrel n’Ijipt, ha malitere ime mkpesa banyere nri. N’ihi ya, Jehova nyere ha mana. (Ọpụpụ 12:17, 18; 16:1-5) N’oge ahụ, Mozis nyere Erọn ntụziaka, sị: “Were otu ite, tinye nju omer nke mana n’ime ya, dọba ya n’ihu Jehova ka ọ bụrụ ihe ndebe a na-edebere ọgbọ nile unu.” Ihe ndekọ ahụ kwuru, sị: “Dị ka Jehova nyere Mozis iwu, otú a ka Erọn dọbara ya n’ihu Ihe Àmà, [ebe a na-echekwa ihe odide ndị dị mkpa] ka ọ bụrụ ihe ndebe.” (Ọpụpụ 16:33, 34) Ọ bu ezie na Erọn tinyere mana a n’ime ite ahụ, ma e debeghị ya n’ihu Ihe Àmà ahụ ruo mgbe Mozis rụchara Igbe ahụ ma tinye mbadamba nkume abụọ ahụ n’ime ya.

Dị ka anyị kwurula, a rụrụ igbe ọgbụgba ndụ ahụ ná ngwụsị afọ 1513 T.O.A. E tinyere mkpanaka Erọn n’ime ya ogologo oge ka e mesịrị, mgbe Kora na ndị ọzọ nupụchara isi. Pọl onyeozi kwuru banyere igbe ọgbụgba ndụ . . . bụ́ nke ite ọlaedo mana dị n’ime ya na mkpanaka Erọn nke mara ifuru na mbadamba ide ihe nke ọgbụgba ndụ ahụ dị na ya.”—Ndị Hibru 9:4.

Mana bụ ihe Chineke nyere ụmụ Izrel n’ime afọ 40 ahụ ha nọrọ n’ọzara. A kwụsịrị inye ha mana mgbe ‘ha malitere iri ụfọdụ n’ime ihe mịrị n’ala ahụ’ e kwere ha ná nkwa. (Joshua 5:11, 12) O nwere ihe mere e ji tinye mkpanaka Erọn n’ime igbe ọgbụgba ndụ ahụ—ka ọ bụrụ ihe ịrịba ama nye ma ọ bụ ihe àmà megide ọgbọ ahụ na-enupụ isi. Nke a na-egosi na ọ pụrụ ịbụ na mkpanaka ahụ nọgidere ebe ahụ ya dịkarịa ala n’oge nile ha nọrọ n’ọzara. Ya mere, ọ ga-abụ ihe ezi uche dị na ya ikwubi na n’agbata oge ndị Izrel banyere n’Ala Nkwa ahụ na tupu a rara ụlọ nsọ ahụ Solomọn wuru nye, e wepụrụ mkpanaka Erọn na ite ọlaedo ahụ nke mana dị n’ime ya site n’igbe ọgbụgba ndụ ahụ.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya