Ọ́bá Akwụkwọ Anyị NKE DỊ N'ỊNTANET
Ọ́bá Akwụkwọ Anyị
NKE DỊ N'ỊNTANET
Igbo
Ọ
  • Á
  • á
  • À
  • à
  • É
  • é
  • È
  • è
  • Ì
  • ì
  • Í
  • í
  • Ị
  • ị
  • Ị̀
  • ị̀
  • Ị́
  • ị́
  • Ḿ
  • ḿ
  • M̀
  • m̀
  • Ṅ
  • ṅ
  • Ò
  • ò
  • Ó
  • ó
  • Ọ
  • ọ
  • Ọ̀
  • ọ̀
  • Ọ́
  • ọ́
  • Ù
  • ù
  • Ú
  • ú
  • Ụ
  • ụ
  • Ụ̀
  • ụ̀
  • Ụ́
  • ụ́
  • BAỊBỤL
  • AKWỤKWỌ NDỊ ANYỊ NWERE
  • ỌMỤMỤ IHE
  • ijwbq isiokwu 118
  • Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?

O nweghị vidio dị maka ihe a ị họọrọ.

Ewela iwe, o nwetụrụ nsogbu gbochiri vidio a ịkpọ.

  • Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?
  • Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
  • Isiokwu Nta
  • Isiokwu Ndị Ọzọ Yiri Nke A
  • Ihe Baịbụl kwuru
  • Ajụjụ Ndị Na-agụ Akwụkwọ Anyị Na-ajụ
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2006
  • Chineke Chebere Mmadụ Asatọ
    Ihe Ị Ga-amụta n’Akụkọ Baịbụl
  • Ị̀ Maara?
    Ụlọ Nche Ikwupụta Alaeze Jehova—2009
  • Oké Iju Mmiri Ahụ
    Akwụkwọ M nke Akụkọ Bible
Lee Ihe Ndị Ọzọ
Ajụjụ Ndị Baịbụl Zara
ijwbq isiokwu 118
Igbe ọgbụgba ndụ ahụ

Gịnị Bụ Igbe Ọgbụgba Ndụ?

Ihe Baịbụl kwuru

Igbe ọgbụgba ndụ bụ igbe dị nsọ Chineke nyere ndị Izrel iwu ka ha rụọ, ọ gwakwara ha otú ha ga-esi arụ ya. Ọ bụ n’ime ya ka e tinyere “ihe àmà ahụ” ka ọ ghara imebi, ya bụ iwu iri ahụ e dere na mbadamba nkume abụọ ahụ.—Ọpụpụ 25:8-10, 16; 31:18.

  • Otú Ọ ha na Ihe E Ji Rụọ Ya. Igbe ahụ dị kubit abụọ na ọkara n’ogologo, otu kubit na ọkara n’obosara nakwa otu kubit na ọkara n’ịdị elu (111 x 67 x 67cm; 44 x 26 x 26 in.). E ji osisi akeshịa rụọ ya, jirikwa ọlaedo machie ime na azụ ya. E ji ọlaedo kpụọ ihe e ji chọọ gburugburu ọnụ ya mma. E jikwa ọlaedo a na-agwaghị agwa rụọ ihe e ji ekpuchi ya, kpụọ cherọb abụọ e ji ọlaedo mee n’akụkụ abụọ nke ihe ahụ e ji ekpuchi ya. Ha chere ibe ha ihu, kpudo ihu n’ihe e ji ekpuchi ya, chịlie nku ha elu ma gbasaa ya n’elu ihe ahụ e ji ekpuchi ya. E ji ọlaedo kpụọ ihe anọ yiri mgbaaka ma rụnye ya n’akụkụ ya anọ. E jikwa osisi akeshịa rụọ okporo osisi e ji ọlaedo machie ma tinye ya n’ihe ahụ yiri mgbaaka ka e jiri ya na-ebugharị ya.—Ọpụpụ 25:10-21; 37:6-9.

  • Ebe E Busara Ya. Ebe mbụ e busara Igbe ahụ bụ n’ebe Kasị Nsọ n’ụlọikwuu. A rụrụ ụlọikwuu ahụ a na-anọ efe ofufe otú a ga na-ebugharị ya ebugharị. A rụrụ ya mgbe a rụrụ Igbe ahụ. E ji àkwà mgbochi sachie ebe e busara igbe ahụ ka ndị nchụàjà na ndị ọzọ ghara ịhụ ya. (Ọpụpụ 40:3, 21) Ọ bụ naanị nnukwu onye nchụàjà na-abanye n’ebe Igbe ahụ dị otu ugboro n’afọ n’ụbọchị a na-achụ àjà mkpuchi mmehie. (Levitikọs 16:2; Ndị Hibru 9:7) E mechara buga Igbe ahụ n’ebe kasị nsọ n’ụlọ nsọ ahụ Sọlọmọn rụrụ.—1 Ndị Eze 6:14, 19.

    Ebe e busara Igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’ime ebe kasị nsọ n’ụlọikwuu
  • Ihe Mere E ji Rụọ ya. Ọ bụ n’ime Igbe ahụ ka e debere arịa ndị dị nsọ ga na-echetara ndị Izrel ọgbụgba ndụ ha na Chineke gbara n’Ugwu Saịnaị. Igbe ahụ na-aba ezigbo uru n’ụbọchị a na-achụ àjà mkpuchi mmehie.—Levitikọs 16:3, 13-17.

  • Ihe Ndị E Tinyere n’Ime Igbe Ahụ. Ihe mbụ e tinyere n’ime Igbe ahụ bụ mbadamba nkume abụọ ahụ e dere iwu iri na ya. (Ọpụpụ 40:20) E mechakwara tinye ya ite ọlaedo mana dị n’ime ya nakwa “mkpanaka Erọn nke wara okooko.” (Ndị Hibru 9:4; Ọpụpụ 16:33, 34; Ọnụ Ọgụgụ 17:10) Ọ ga-abụ na e mechara wepụ ite ahụ na mkpanaka Erọn n’ime ya n’ihi na ọ dịghị n’ime Igbe ahụ mgbe e bugara ya n’ụlọ nsọ.—1 Ndị Eze 8:9.

  • Otú E Si Ebugharị Ya. Ndị Livaị na-eji okporo osisi akeshịa ebu Igbe ahụ n’ubu ha. (Ọnụ Ọgụgụ 7:9; 1 Ihe E Mere 15:15) A runyere okporo osisi e ji ebu Igbe ahụ ka ndị Livaị ghara imetụ ya aka mgbe ha na-ebu ya. (Ọpụpụ 25:12-16) A na-eji “àkwà mgbochi” nke kewara ebe Nsọ na ebe Kasị Nsọ ekpuchi Igbe ahụ mgbe ọ bụla a na-ebu ya.—Ọnụ Ọgụgụ 4:5, 6.a

  • Ihe Igbe Ahụ Nọchiri Anya Ya. Igbe ahụ mere ka a mata na Jehova nọnyeere ndị Izrel. Dị ka ihe atụ, ígwé ojii ahụ pụtara n’elu Igbe ahụ dị n’ebe Kasị Nsọ nakwa n’ebe ụmụ Izrel mara ụlọikwuu na-egosi na Jehova nọnyeere ha ma na-agọzi ha. (Levitikọs 16:2; Ọnụ Ọgụgụ 10:33-36) Mgbe Baịbụl kwuru na Jehova “nọ ọdụ n’elu cherọb,” ihe ọ na-ekwu gbasara ya bụ Cherọb abụọ ahụ a kpụrụ n’elu ihe e ji kpuchie Igbe ahụ. (1 Samuel 4:4; Abụ Ọma 80:1) Cherọb abụọ ahụ bụ “ihe nnọchianya ụgbọ ịnyịnya” Jehova. (1 Ihe E Mere 28:18) Ọ bụ n’ihi ihe Igbe ahụ nọchiri anya ya mere Devid ji dee na Jehova “bi na Zayọn” mgbe e bugara Igbe ahụ ebe ahụ.—Abụ Ọma 9:11.

  • Aha Ụfọdụ A Kpọrọ Ya. E nwere ọtụtụ aha Baịbụl kpọrọ Igbe ahụ dị nsọ, dị ka, “Igbe ihe àmà,” “Igbe ọgbụgba ndụ,” “Igbe Jehova” nakwa “Igbe nke ike [Jehova] gị.”—Ọnụ Ọgụgụ 7:89; Jọshụa 3:6, 13; 2 Ihe E Mere 6:41.

    A kpọrọ ihe e ji kpuchie Igbe ahụ “ihe mkpuchi mmehie” ma ọ bụ “ebe mkpuchi mmehie.” (1 Ihe E Mere 28:11; Union Version) Aha a a kpọrọ ya mere ka o doo anya na ihe e ji kpuchie Igbe ahụ nwere ihe pụrụ iche a na-eji ya eme n’ụbọchị mkpuchi mmehie. Nnukwu onye nchụàjà n’Izrel na-efesa ọbara anụ ndị e ji chụọ àjà n’ihu ihe mkpuchi ahụ. Ọbara ahụ o fesara na-aghọ ihe mkpuchi mmehie ‘maka yanwa, ezinụlọ ya nakwa maka ọgbakọ Izrel dum.’—Levitikọs 16:14-17.

Igbe ọgbụgba ndụ ahụ ọ̀ ka dị ruo taa?

E nweghị ihe na-egosi na Igbe ahụ ka dị ruo taa. Baịbụl kwuru na Igbe ahụ abaghịzi uru n’ihi na àjà Jizọs chụrụ mere ka e nwee ọgbụgba ndụ ọhụrụ e ji dochie ọgbụgba ndụ ahụ mere e ji rụọ ya. (Jeremaya 31:31-33; Ndị Hibru 8:13; 12:24) Baịbụl buru amụma na e nwere mgbe Igbe ọgbụgba ndụ ahụ na-agaghịzi adị, ndị na-efe Chineke agaghịkwa na-echeta ya.—Jeremaya 3:16.

Mgbe a malitechara ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ, Jọn onyeozi nọ n’ọhụụ hụ Igbe ọgbụgba ndụ ahụ n’eluigwe. (Mkpughe 11:15, 19) Igbe ahụ ọ hụrụ n’ọhụụ mere ka a mata na Chineke gọziri ma nabata ọgbụgba ndụ ọhụrụ ahụ.

Igbe ahụ ọ̀ bụ ọtụmọkpọ?

Mba. Ọ bụghị Igbe ahụ na-eme ka ihe gaziere mmadụ. Di ka ihe atụ, Igbe ahụ dị n’ebe ndị Izrel mara ụlọikwuu mgbe ha gara ibuso E-aị agha, ma e meriri ha n’ihi ihe ọjọọ otu onye Izrel mere. (Jọshụa 7:1-6) E nwekwara mgbe ndị Izrel bu Igbe ahụ gaa ịlụso ndị Filistia agha. E meriri ha n’ihi arụrụala Họfnaị na Finihas bụ ndị nchụàjà nọ na-arụ. (1 Samuel 2:12; 4:1-11) Ndị Filistia mechara buru Igbe ahụ laa, ma Chineke tagidere ha ahụhụ rụọ mgbe ha bughachitere ya ndị Izrel.—1 Samuel 5:11–6: 5.

Akụkọ gbasara Igbe ọgbụgba ndụ ahụ

Afọ (T.O.N.K.)

Ihe merenụ

1513

Bezalel na ndị ọzọ ji ihe ndị Izrel tụkọtara rụọ Igbe ahụ.—Ọpụpụ 25:​1, 2; 37:1.

1512

Mgbe Mozis doro Igbe ọgbụgba ndụ ahụ, ụlọikwuu nakwa ndị nchụàjà nsọ.—Ọpụpụ 40:​1-3, 9, 20, 21.

1512—Ruo mgbe afọ 1070 gachara

E bugara ya ebe dị iche iche.—Jọshụa 18:1; Ndị Ikpe 20:26, 27; 1 Samuel 1:​24; 3:3; 6:​11-​14; 7:​1, 2.

Mgbe afọ 1070 gachara

Eze Devid bubatara ya na Jeruselem.​—2 Samuel 6:​12.

1026

E bugara ya n’ụlọ nsọ Sọlọmọn wuru na Jeruselem.—1 Ndị Eze 8:​1, 6.

642

Eze Josaya bughachiri ya n’ụlọ nsọ.—2 Ihe E Mere 35:3.b

Tupu afọ 607

Ọ ga-abụ na e bupụrụ ya n’ụlọ nsọ. O soghị n’ihe ndị a kpọrọ aha na a kwaara laa Babịlọn mgbe e bibiri ụlọ nsọ ahụ na 607 T.O.N.K. ma ọ bụ ihe ndị e bughachiri na Jerusalem mgbe ha lọghachiri.—2 Ndị Eze 25:13-17; Ezra 1:​7-​11.

63

Mgbe Ọchịagha ndị Rom bụ Pompey merichara Jerusalem ma banye n’Ebe Kasị Nsọ n’ụlọ nsọ ahụ, ọ chọpụtara na Igbe ahụ adịghịzi ebe ahụ.c

a Mgbe ọ bụla ndị Izrel na-emeghị ihe Chineke gwara ha gbasara otú ha ga-esi ebugharị Igbe ahụ nakwa otú a ga-esi na-ekpuchi ya, ọ na-akpatara ha ezigbo nsogbu.—1 Samuel 6:19; 2 Samuel 6:2-7.

b Baịbụl e kwughị mgbe e bupụrụ ya, ihe mere e ji bupụ ya nakwa onye bupụrụ ya.

c Lee akwụkwọ bụ The Histories, nke Tacitus, Book V dere, na paragraf nke 9.

    Akwukwo Igbo (1984-2025)
    Pụọ
    Banye
    • Igbo
    • Ziga ya
    • Ịgbanwe Ihe
    • Copyright © 2025 Watch Tower Bible and Tract Society of Pennsylvania
    • Ihe Ị Ga-eme na Ihe Ị Na-agaghị Eme
    • Ihe Anyị Ji Ihe Ị Gwara Anyị Eme
    • Kpebie Ihe Ị Ga-agwa Anyị
    • JW.ORG
    • Banye
    Ziga ya