Isi nke 18
Ị̀ Na-ekwesị Ntụkwasị Obi nye Eze Ọhụrụ nke Ụwa?
1. Mgbe e wepụtara Jisọs dị ka Eze n’afọ 33 O.A., olee otú ndị mmadụ si meghachi omume?
NA NAỊSAN 9 nke afọ 33 O.A., Jizọs Kraịst gosiri onwe ya nye ndị Juu dị ka Eze ha, bụ́ Mesaja ahụ e buru amụma ya. Ka ọ na-agbadata site n’Ugwu Olive na-aga Jerusalem, ìgwè ndị na-eso ụzọ ya na-aṅụrị ọṅụ, na-etokwa Chineke n’ihi ọrụ ebube nile ndị Jisọs rụworo. (Luk 19:37, 38; Zekaraịa 9:9) Ma, hà ga-ekwesị ntụkwasị obi nye Onye ahụ, nke ha buliworo elu dị ka Eze? E tinyere ikwesị ntụkwasị obi ha n’ule n’oge na-adịghị anya.
2. (a) Olee otú ndị mmadụ taa si azaghachi n’ịma ọkwa nke bụ na Kraịst bụ Eze ọhụrụ nke ụwa? (b) Ma ajụjụ dịgasị aṅaa kwesịrị ka a tụlesie ike?
2 Kemgbe 1914, e chewo n’ihu mmadụ nile, Jisọs Kraịst ahụ e mere ka ọ dị ebube, bụ́ onye na-achị achị site n’eluigwe dị ka Eze ọhụrụ nke ụwa. Olileanya nke ndụ n’okpuru ọchịchị dị n’aka Kraịst, nke nwere ngwọta ziri ezi maka nsogbu nile nke mmadụ, emewo ka ndị mmadụ sitere ná mba nile ṅụrịa. Ma, hà ga-ekwesị ntụkwasị obi? Gịnị banyere onye ọ bụla n’ime anyị n’otu n’otu?
IHE NDEKỌ IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI NKE EZE AHỤ N’ONWE YA
3. (a) N’ihi gịnị ka e ji rụtụ Jisọs aka dị ka ’onye na-ekwesị ntụkwasị obi’ nke Jehova? (b) Gịnị bụ ikwesị ntụkwasị obi?
3 Jisọs enyewo ihe àmà dị ukwuu na ikwesị ntụkwasị obi nke ya nye Jehova, bụ́ Eze eluigwe na Ala, adịghi ada ada. E zoro ya aka n’ụzọ kwesịrị ekwesị n’Akwụkwọ nsọ dị ka ‘onye na-ekwesị ntụkwasị obi’ nke Jehova. (Abụ Ọma 16:10, NW; Ọrụ 2:24-27) Okwu Hibru e ji mee ihe n’ebe a maka ’ikwesị ntụkwasị obi’ nwere echiche nke iji ịhụnanya nwee obi ebere. Ọ bụghị ihe jụrụ oyi, nke dabeere nanị n’iwu ma ọ bụ ụkpụrụ ikpe zịrị ezi, kama ọ bụ nke ịhụnanya na ekele na-akwali.—Tụlee Abụ Ọma 40:8; Jọn 14:31.
4, 5. (a) Olee otú e si gosi ikwesị ntụkwasị obi Jisọs n’elụigwe, mgbe Setan nupụrụ isi? (b) Olee otú e sikwa gosi ikwesị ntụkwasị obi ahụ n’elu ụwa?
4 N’eluigwe, mgbe Setan malitere ịchọ otuto nke onwe ya, bụ́ nke dịịrị nanị Chineke, na mgbe ndị ọzọ n’etiti ndị mmụọ ozi hapụrụ ebe ha kwesịrị inọ ná nzukọ eluigwe nke Jehova, Ọkpara Chineke bụrụ ụzọ mụọ eṅomighị mmụọ ha. Ime otú ahụ bụụrụ ya ihe a na-apụghị icheta n’echiche! Nrara ọ raara onwe ya nye iji onwe ya chụọ àjà dị ukwuu nke na, n’ime uche Nna ya, Ọkpara ahụ kwesịrị ntụkwasị obi hapụrụ ebube eluigwe ya, gbọọ mmadụ, ọbụna nyekwa onwe ya n’ọnwụ n’elu osisi ịta ahụhụ. O ji ịhụnanya mee ihe iji hụ na, ruo n’òké ọ dabeere na ya onwe ya, ọ dịghị ihe ọ bụla e dere n’kwụkwọ nsọ banyere ya nke na-agaghị emezu.—Ndị Filipai 2:5-8; Luk 24:44-48.
5 Mgbe Jisọs nọ n’elu ụwa, Setan wetara oké nrụgide dị ukwuu n’ebe ọ nọ iji dọpụ ya n’ọrụ Chineke nyere ya ịrụ—ọ bụrụkwa na o kwe mee, ịrara ya banye n’ime ihe Chineke n’onwe ya ga-eji jụ Ọkpara ya. Ọ gbara Jisọs ume ime ihe ndị pụrụ ime ka ọ ghọọ onye a ma ama, nyekwa ya ike—ma bụrụ akụkụ nke ụwa nke Setan bụ onye ọchịchị ya. Jisọs jụrụ, na-ehota Akwụkwọ Nsọ dị ka ihe na-eduzi ya. (Matiu 4:1-10) Jisọs nwere ikike ndị pụtara ìhè, o jikwa ha rụọ ọrụ nke ọma, ma mgbe ọ bụla o mere nke a, ọ na-ekwekọ n’uche nke Nna ya. O mikpuru onwe ya n’ụzọ zuru ezu n’ịrụ ọrụ ahụ Chineke zitere ya ịrụ. (Jọn 7:16-18; 8:28, 29; 14:10) Lee nnọọ ezi ihe nlereanya nke ikwesị ntụkwasị obi ọ bụ!
6. N’ụzọ dị aṅaa ka ụgwọ ọrụ e nyere Jisọs ji chọọ ikwesị ntụkwasị obi n’aka anyị?
6 N’ihi ikwesị ntụkwasị obi Jisọs nke a nwapụtaworo, Jehova kpọlitere ya site n’ọnwụ, weliekwa ya elu nke ukwuu, werekwa amara nye ya aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu; ka ọ ga-abụ n’aha Jisọs ka ikpere nile wee gbuo n’ala, . . . ka ire nile ọ bụla wee kwupụtakwa na Jisọs Kraịst bụ Onyenwe anyị, ka e wee nye Chineke bụ Nna otuto. (Ndị Filipaị 2:9-11) Aha ahụ nke karịrị aha nile ọ bụla elu nọchiri anya ike na ichi isi e nyere Jisọs ka o wee nwee ike imezu uche Jehova. ‘Igbu ikpere n’ala nye ya’ pụtara ịghọta ọnọdụ ya na ido onwe onye n’okpuru ịchị isi ya. Ọ gụnyere mmadụ iji ikwesị ntụkwasị obi na-edo onwe ya n’okpuru ya dị ka Eze.
EZI ỊHỤNANYA NYE NDỊ JEHOVA E TERE MMANỤ
7. Banyere ihe ndị dị aṅaa ka a nwara ikwesị ntụkwasị obi ndị na-eso ụzọ Jisọs?
7 ziokwu ahụ bụ na, mgbe Jisọs gbagosịrị n’eluigwe, anya mmadụ efu apụghịkwa ịhụ ya ga-apụta ule ikwesị ntụkwasị obi nke e ji ama ihe dị mmadụ n’obi nye ndị na-eso ụzọ ya. Hà ga-ebi ndụ dị ka ụkpụrụ nile ndị ọ kụziiri ha si dị? Hà ga-anọpụ iche site n’ụwa? Hà ga-asọpụrụ ndị ahụ mmụọ nsọ nyeworo ibu ọrụ nke nlekọta? Hà ga-eji obi ha nile rụọ ọrụ ahụ o kenyere ha?
8. Gịnị ka e sere onyinyo ya n’ezi ịhụnanya nke dịrị n’etiti Jonatan na Devid?
8 Mgbe oge ya ruru, a ga-akpọbata atụrụ ọzọ isonyere ìgwè atụrụ nta nke ndị nketa Alaeze eluigwe ahụ. Hà ga-enwe ekele n’ezie maka ọnọdụ e kenyere ha ná mmekọrịta ha na Kraịst dị ka Eze na n’ebe ibe ha nọ. Ihe ndị mere eme egosiwo na a zụlitewo ezi ịhụnanya miri emi n’etiti ndị nile bụ akụkụ nke otu ìgwè atụrụ ahụ n’okpuru Jisọs Kraịst. E sere onyinyo nke a n’ịhụnanya a na-apụghị ikewa ekewa nke Jonatan, diọkpara Eze Sọl nwere n’ebe Devid nọ. Mgbe ọ hụsịrị na Devid raara onwe ya kpam kpam nye Jehova na ndabere ọ dabeere n’ebe Chineke nọ n’igbu oké dimkpa ahụ bụ Goliat, a kpaliri Jonatan nke ukwuu nke na “e kekọtara mkpụrụ obi Jonatan na mkpụrụ obi Devid, Jonatan wee hụ ya n’anya dị ka mkpụrụ obi ya.” Ịhụnanya ya ebelataghị mgbe o doro anya na Jehova ga-enye Devid ọbụbụeze ahụ, ọ bụghị Jonatan. Ọbụna na Jonatan tinyere ndụ ya n’ihe ize ndụ ọtụtụ ugbo maka Devid.—1 Samuel 17:45-47; 18:1; 23:16, 17
9. Olee otú ndị na-abụghị ndị Israel, ndị jere ozi n’usuu ndị agha Devid si gosipụta otu ikwesị ntụkwasị obi ahụ?
9 E wezụga Jonatan, e nwere ndị na-abụghị ndị Israel rapagidere onwe ha n’ahụ Devid. Ha abụghị ndị e goro ego ime ihe, kama ha bụ ndị dike, ndị sitere ná nrara ha raara onwe ha nye Devid dị ka onye Jehova e tere mmanụ wee mee ihe. Ndị Keret, ndị Pelet, na ndị bibu n’obodo ndị Filistia bụ Gat so ná ndị a. Ikwesị ntụkwasị obi ha nọgidere nye Devid mgbe ọkpara ya bụ Absalọm ji aghụghọ chọọ izuru obi ndị Israel n’ohi. N’agbanyeghị na Absalọm bụ onye a ma ama na aghụghọ ya, e dubaghị ha n’ụzọ ekwesịghị ntụkwasị obi site n’okwu ire ụtọ ya.—2 Samuel 15:6, 10, 18-22.
10. (a) È si aṅaa kọwaa mmekọrịta chiri anya dị n’etiti Kraịst, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ n’Abụ Ọma 45? (b) N’echiche dị aṅaa ka ‘ụmụ agbọghọ na-amaghị nwoke si aba n’ulọ ukwu Eze’?
10 A na-achọta nkọwa ọzọ na-enye obi utọ nke mmekọrịta dị n’etiti Kraịst, ihe ahụ fọdụrụ e tere mmanụ na “atụrụ ọzọ” ahụ n’Abụ Ọma 45. Nke a abụghị nanị abụ efu dị ụtọ ná ntị, kama ọ bụ amuma nke metụtara Alaeze Mesaịa ahụ. —Chineke n’onwe ya bụ “ocheeze” ahụ, ya bụ, ntọala na ihe nkwado nke ọbụbụeze Jisọs. (Abụ Ọma 45:1-7; Ndị Hibru 1:8, 9) Onye ọbụ abụ ahụ kọwara nwanyị Kraịst ahụ a na-alụ ọhụrụ, bụ́ “ada eze,” ka a na-ekutere ya Eze ahụ n’ụbọchị agbamakwụkwọ ya. “Ụmụ agbọghọ ndị na-amaghị nwoke . . . bụ ndị ibe ya,” na-eso ya. Olee ndị bụ ndị a? Ọ bụ ndị nwere olileanya ịbụ ndị Alaeze Chineke ga-achị n’elu ụwa. Ha “ji ọṅụ na otite egwu ọṅụ” na-eso òtù “nwanyị a na-alụ ọhụrụ” ahụ ruo mgbe nke ikpeazu n’ime ndị a lakwuuru Kraịst n’eluigwe. Ha na-esoro ha ‘banye n’ụlọ ukwu eze,’ ọ bụghị site n’ịrịgo n’eluigwe, kama site n’inye onwe ha maka ije ozi Alaeze. Ị̀ ghọwo otu akụkụ nke ndị ahụ ji obi utọ na-azọ ije?—Abụ Ọma 45:13-15.
GỊNỊ KA IKWESỊ NTỤKWASỊ OBI CHỌRỌ ANYỊ N’AKA?
11. Ọnọdụ dịgasị aṅaa na-etinye anyị n’ule banyere ịbụ ndị ‘na-abụghị akụkụ nke ụwa’?
11 Ọtụtụ ọnọdụ ná ndụ na-egosi ụdị ndị mmadụ anyị bụ. Ànyị kwere n’ezie n’Alaeze Mesaịa ahụ? Ọ dị adị n’ezie nye anyị? Jisọs kwuru na ezi ndị na-eso ụzọ ya ‘abụghị akụkụ nke ụwa.’ Nke ahụ ọ̀ bụ eziokwu banyere gị?—Jọn 17:15, 16.
12. Ọ bụ ezie na anyị ezughị okè, n’ụzọ ndị ọzọ dị aṅaa ka anyị pụrụ isi nye ihe àmà nke ikwesị ntụkwasị obi?
12 N’ihe banyere anyị bụ ndị mmadụ na-ezughị okè, ikwesị ntụkwasị obi adịghị arụgide anyị ime dị ka ndị zuru okè. Ma ọ chọrọ anyị izere iji nlezianya na-emebi iwu nile nke Bible, ma ndị mmadụ ọzọ hà hụrụ anyị ma ọ bụ na ha ahụghị. Ọ ga-akwali anyị ime mgbalị itinye ụkpụrụ nile nke Bible n’ọrụ n’uzọ zuru ezu, kama ihụ otú anyị pụrụ isi bịaruo nso karị n’ụzọ nile nke ụwa. Ọ ga-eme ka anyị zụlite ịkpọasị ziri ezi maka ihe ọjọọ.—Abụ Ọma 97:10.
13. Olee otú ikwesị ntụkwasị obi ga-esi chebe anyị n’okwu ire ụtọ nke ndị si n’ezi ofufe dapụ?
13 Ọ bụrụ na anyị kpọrọ ihe ọjọọ asị n’ezie, anyị agaghị ekwe ka ọchịchọ nke ịmata ihe na-aganụ nwaa anyị ịga ya nso. Inwe ọchịchọ ịmata ihe na-aga ná ndụ ndị na-enwe mmekọahụ rụrụ arụ pụrụ iduba mmadụ n’ịla n’iyi. (Ilu 7: 6-23) Otú ahụkwa, ha pụrụ izute ịla n’iyi ime mmụọ, bụ́ ndị ahụ sitere n’ọchịchọ ịma ihe na-aganụ na-azụrụ, na-agụkwa akwụkwọ ndị si n’esi ofufe dapụ na-ebipụta, bụ́ mmadụ ndị gbakụtaworo Jehova na nzukọ ya azụ, ma jiri ọnụ “na-eti” ndị òtù ha mbụ ihe. (Matiu 24:48-51) Ilu 11:1 na-adọ aka ná nti, sị: “Ọnụ ya ka onye e merụrụ emerụ ji ebibi mmadụ ibe ya.” Ma ikwesị ntukwasị obi ga-echebe anyị ka a ghara iduhie anyị site n’okwu ire utọ ha.—2 Jọn 8-11.
14. (a) Gịnị bụ otu ụzọ kasị mkpa anyị pụrụ isi gosi ikwesị ntụkwasị obi anyị nye Kraịst dị ka Eze? (b) Gịnị mere ọrụ a ji dị mkpa ugbu a?
14 Otu ụzọ kasị mkpa nke igosipụta ikwesị ntukwasị obi anyị bụ site n’iji obi anyị nile na-arụ ọrụ ahụ Jisọs kụziiri ndị na-eso ụzọ ya ịrụ. O setipụrụ ihe nlereanya n’onwe ya site n’ịga site n’obodo ukwu ruo n’obodo ukwu, sitekwa n’otu obodo nta ruo obodo nta ọzọ, na-ekwusa ozi ọma nke Alaeze Chineke. (Luk 8:1) Jisọs buru amụma ihe ezi ndị Kraịst ga na-eme taa mgbe ọ sịrị: “A ga-ekwusakwa ozi ọma nke a nke Alaese eluigwe n’elu ụwa dum mmadụ bi ka ọ bụrụ àmà nye mba nile; mgbe ahụ ka ọgwugwu ihe nile ga-erukwa.” (Matiu 24:14) Ọ bụ site n’izisa ozi ọma nke a ka a na-eche ihe iseokwu nke Alaeze ahụ n’ihu ndị mmadụ n’ebe nile ka ha wee nwee ike ime mkpebi nke onwe ha. Nye oké ìgwè mmadụ bara ụba, mkpebi ahụ ga-eduga n’ịbụ ndị e chebere ndụ gabiga oké mkpagbu ahụ. (Mkpughe 7:9, 10) Ì ji ikwesị ntụkwasị obi na-ekere òkè n’ọrụ nke a dị ngwa?
15. (a) Banyere gịnị ka Abụ Ọma 145:10-13 kwuru na ndị Jehova na-ekwesị ntụkwasị obi ga na-ekwu? (b) Olee otú nke ahụ si metụta anyị?
15 Ogologo oge gara aga, onye ọbụ abụ bụ Devid dere, sị: “Ọrụ gị nile na-ekele gị Jehova; ndị ebere gị na-agọzikwa gị. Nsọpụrụ nke alaeze gị ka ha na-ekwupụta, ọ bụ ịdị ike gị ka ha na-ekwu okwu banyere ya; ime ka ụmụ mmadụ mara ịdị ike ya nile, na nsọpụrụ nke ịma mma nke alaeze ya. Alaeze gị bụ alaeze ruo mgbe nile ebighị ebi, ọchịchị gị dịkwa n’ọgbọ nile. (Abụ Ọma 145:10-13) Ọbụbụeze ahụ ka a na-egosipụta ugbu a site n’Alaeze Mesaịa ahụ dị n’aka onye na-ekwesị ntukwasị obi bụ Jisọs Kraịst, anyị na-egosikwa ikwesị ntụkwasị obi anyị nye ma Chineke ma Kraịst site n’iji ịnụ ọku n’obi na-ekwupụta ya.
16. Olee otú ikwesị ntụkwasị obi kwesịrị isi metụta otú anyị na-ekereru òkè ná nkwusa Alaeze ahụ na ihe anyị bu n’uche na-eme ya?
16 Ọnọdụ dị aṅaa ná ndụ gị ka i nyeworo ọrụ a nke ịgba àmà Alaeze? Ị̀ na-etinye ya n’ezie n’ihu ọchịchọ ndị ọzọ? Ihe i mere n’onwe gị pụrụ ịdị elu ma ọ bụ dị ala kari ihe ndị ọzọ mere. Ọnọdụ ndị mmadụ na-adị iche iche. Ma anyị nile pụrụ irite uru site n’ịjụ onwe anyị ajụjụ ndị dị ka ndị a: ’Òkè m na-ekere ọ̀ na-egosi nanị omume onye a manyere amanye, onyinye elu ọnu efu? Àna m ele ya anya dị ka nanị ihe a chọrọ maka nlanarị? Ka ịhụnanya maka Jehova, nrara m raara onwe m nye Eze Mesaịa ya na ezi nchegbu m na-enwe maka mmadụ ibe m ọ̀ na-akwali m inye ya ọnọdụ mbụ nke na m na-ewulite ọchịchọ ndị ọzọ ná ndụ m gburugburu ya?’ Ikwesị ntụkwasị obi ga-akwali anyị ichọ ụzọ igosi na ọrụ a dị anyị mkpa dị ka ọ dị Eze anyị.
17. Ole ndị ka Jisọs ‘ga-agwa okwu udo’ mgbe ọ ga-ebibi ndị ajọ mmadụ?
17 N’oge na-adịghị anya ugbu a, Onye ahụ nke ndị na-eso ụzọ ya toro dị ka Eze mgbe ọ na-abanye Jerusalem n’afọ 33 O.A. ga-ebibi ndị nile jụrụ ọkaaka Jehova dị ka e gosipụtara ya site n’Eze Mesaịa Ya. Ma ọ ’ga-ekwu okwu udo’ nye oké ìgwẹ mmadụ ahụ nke ndị si ná mba nile, bụ́ ndị ṅomiworo ihe nlereanya nke ya onwe ya nke ikwesị ntụkwasị obi. Ị̀ ga-eso n’ime ha?—Zekaraịa 9:10; Ndị Efesọs 4:20-24.