Isi nke 23
Ntachi Obi Dị Unu Mkpa
1. (a) N’ihi gịnị ka Ndịàmà Jehova ji bụrụ ndị nwere obi ụtọ n’ezie? (b) Ma ndụmọdụ dị aṅaa nke dị ná Ndị Hibru 10:36 dịịrị anyị nile?
NDỊ ahụ tụkwasịrị Jehova obi bụ ndị kasị nwee ezi obi ụtọ n’elu ụwa taa. Ha maara ebe a pụrụ isi nweta ndụmọdụ kachasị mma banyere ụzọ ha ga-esi nagide nsogbu nile nke ndụ—n’Okwu Chineke n’onwe ya. Ụjọ adịghị atụ ha mgbe ha na-elepụ anya n’ọdinịhu, n’ihi na ha maara ihe bụ nzube Chineke maka ụwa nke a. (Jeremaịa 17:7, 8; Abụ Ọma 46: 1, 2) N’agbanyeghị nke a, Pọl onye ozi degaara ndị Kraịst ibe ya akwụkwọ, sị: Ntachi obi dị unu mkpa, ka ọ ga-abụ, mgbe unu meworo ihe Chineke na-achọ, ka unu wee nata nkwa ahụ. (Ndị Hibru 10:36) Ọ bụ n’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị mkpa?
2. N’ihi gịnị ka ntachi obi ji dị ndị na-eso ụzọ Jisọs mkpa?
2 Tupu oge ọnwụ ya, Jisọs dọrọ ndị na-eso ụzọ ya aka ná ntị banyere ihe chere ha ihu, na-asị: Ọ bụrụ na unu sitere n’ụwa, ụwa ga-ahụ ihe nke aka ya n’anya: Ma n’ihi na unu esiteghị n’ụwa, kama mụ onwe m họpụtara unu n’ime ụwa, n’ihi nke a ụwa na-akpọ unu asị. Chetanụ okwu mụ onwe m gwara unu, ohu adịghị aka onyenwe ya ukwuu. Ọ bụrụ na ha sogburu m, ha ga-esogbukwa unu; ọ bụrụ na ha debere okwu m, ha ga-edebekwa nke unu. Ma ihe ndi a nile ka ha ga-eme unu n’ihi aha m, n’ihi na ha amataghị onye zitere m. (Jọn 15:19-21) Lee nnọọ otú nke a siworo bụrụ eziokwu!
3. (a) N’ụzọ dị aṅaa ka o si bụrụ ’n’ihi aha Jisọs’ ka e ji na-esogbu ndị na-eso ụzọ ya? (b) N’echiche dị aṅaa ka o ji bụrụ na ndị na-esogbu ha amaghị Onye ahụ zitere Jisọs? (ch) Ònye, n’ụzọ bụ isi, na-akpali nsogbu ahụ?
3 Ụmụazụ Kraịst aghọwo ndị a kpọrọ asị n’ihi na ha bi n’ime ụwa nke jụrụ ịnakwere ihe ezi Iso Ụzọ Kraịst nọchiri anya ya. Kraịst pụtara Onye E Tere Mmanụ. Jisọs Kraịst bụ onye Jehova tere mmanụ ịbụ Eze, nke ga-achị ụwa nile. Ya mere, mgbe Jisọs sịrị na a ga-esogbu ndị na-eso ụzọ ya ’n’ihi aha ya,’ ọ na-egosipụta na mkpagbu ahụ ga-abịa n’ihi na ha na-akwado ya dị ka Eze Mesaịa nke Jehova, n’ihi na ha na-ebute nrubeisi nye Kraịst ụzọ tupu nrubeisi nye ndị ọchịchị ọ bụla nke ụwa, n’ihi na ha ji ikwesị ntụkwasị obi na-akwado Alaeze ya, wee bụrụ ndị na-adịghị ekere òkè n’okwu ndị metụtara ọchịchị dị iche iche nke ụmụ mmadụ. Jisọs kwukwara na mmegide ga-abịa n’ihi na ndị ahụ na-esogbu ha amataghị onye zitere [ya]—nke bụ, na ha jụrụ ịnakwere Jehova Chineke dị ka Eze Eluigwe na Ala. (Tụlee Ọpụpụ 5:2.) Ònye bụ onyeisi na-akpata nsogbu nke a? Setan bụ Ekwensu.—Mkpughe 2:10.
4. (a) Olee otú mmezu nke amụma dị ná Mkpughe 12:17 si emetụta ndụ anyị? (b) Gịnị bụ nzube Setan?
4 Nsogbu na-abịakwasị ndị Kraịst amụbawo, karịsịa kemgbe a chụpụrụ Setan n’eluigwe mgbe a mụpụtasịrị Alaeze Jehova nke dị n’aka Mesaịa na 1914. Agụla ya n’ihe dị nta. Ọ dị agha nke Ekwensu na ndị mmụọ ọjọọ ya ji ike ha nile na-ebu megide ndị nile kwupụtara na ha guzo n’akụkụ Alaeze Chineke nke dị n’aka Jisọs Kraịst. Banyere nke a, Mkpughe 12:17 kwuru, sị: Dragọn ahụ [Setan bụ Ekwensu] wee wesa nwanyị ahụ [nzukọ eluigwe nke yiri nwunye Chineke] iwe, wee pụọ ibu agha megide mkpụrụ ya fọdụrụ [ụmụazụ Kraịst e ji mmụọ nsọ tee mmanụ ndị ka nọ n’ụwa], bụ́ ndị na-edebe ihe nile Chineke nyere n’iwu, ndị na-enwekwa àmà nke Jisọs. Atụrụ ọzọ ahụ, na-achọta onwe ha n’etiti ọgbọ agha ahụ. Site n’ụzọ aghụghọ, Setan na-anwa ịrafu ma ọ bụ manye ha ịkwụsị irubere iwu Chineke nile isi. Ọ chọrọ ime ka ha daa mbà n’ime mmụọ ma ọ bụ bibie ndụ ime mmụọ ha nile kpam kpam. Nzube ya bụ ime ka a kwụsịchaa mkpọsa ọ bụla a na-eme banyere Jisọs dị ka Eze Mesaịa nke Jehova. Ma n’agha ime mmụọ nke a, ezi ndị ohu Chineke na-enwe mmeri.
OLEE OTÚ NDỊ KRAỊST KWESỊRỊ ISI MEGHACHI OMUME?
5. Gịnị ka ọchịchị dị iche iche meworo megide Ndịàmà Jehova?
5 Ọtụtụ ndị nọ n’ọkwá ọchịchị maara na Ndịàmà Jehova bụ ndị na-edebe iwu na ha na-akpakwa àgwà dị mma n’ebe ha bi. Otú ọ dị, ọchịchị nile nke ndị mmadụ bụ akụkụ usoro ihe nke ụwa Setan. (1 Jọn 5:19; Mkpughe 13:2) Ya mere, o kwesịghị ịbụ ihe ijuanya na ụfọdụ ọchịchị machibidoro nzukọ nke ndị ahụ na-efe ezi Chineke ahụ iwu, machibido akwụkwọ nile ndị e ji amụ Bible iwu, machibido nkwusa ha na-ekwusa Alaeze Chineke iwu, ee, ọbụna tụọ ha mkpọrọ, merụọkwa ha ahụ. Ọ bụrụ na nsogbu dị otú a adakwasị gị, gịnị ka ị ga-eme?
6. (a) Gịnị kwesịrị ịbụ omume anyị n’ebe ndị na-achị isi nọ? (b) Ma gịnị ka anyị kpebisịrị ike ime? (ch) Ọbụna ma a sị na e sogbuo anyị, olee ụzọ anyị pụrụ isi nọgide na-enwe obi ụtọ?
6 Ndị ozi Jisọs Kraịst sọpụụrụ ndị nọ n’ọkwa ọchịchị. Mgbe e sogburu ha, ha emegwaraghị. Ma mgbe e nyere ha iwu ịkwụsị ime ihe Chineke nyere ha n’iwu ka ha mee, ha ji nguzosi ike zaa, sị: Anyị aghaghị ikwenyere Chineke karị mmadụ. (Ọrụ 5:29; Ndị Rom 12:19; 1 Pita 3:15) Ọbụna mgbe e yiri ndụ ha egwu, ụjọ ọnwụ emeghị ka ha kwe ime ihe ọjọọ. Ha maara na ha na-efe Chineke onye na-eme ka ndị nwụrụ anwụ si n’ọnwụ bilie. (2 Ndị Kọrint 1:9; Ndị Hibru 2:14, 15) N’agbanyeghị na e sogburu ha, obi dị ha ụtọ—obi ụtọ n’ihi na ha maara na ha na-eme ihe na-atọ Chineke ụtọ, obi ụtọ nke inwe ohere ọma ikere òkè n’ibuli aha Jehova elu na igosipụta ikwesị ntụkwasị obi ha nye Eze ya e tere mmanụ. (Ọrụ 5:41, 42; Matiu 5:11, 12) Ị̀ bụ ụdị onye dị otú a? Ị̀ na-egosipụta onwe gị n’ihu ọha dị ka onye so n’etiti ndị na-enwe ụdị ahụmahụ ahụ? Ebed Melek bụ otu onye nke egwu na-emeghị ka ọ ghara ime ihe. Ònye ka ọ bụ?
7. (a) Ònye bụ Ebed Melek, n’ihi gịnịkwa ka anyị ji nwee mmasị n’ebe ọ nọ ugbu a? (b) Mgbe ọ nụrụ na a tụbawo Jeremaịa n’ime olulu apịtị jupụtara na ya, gịnị ka Ebed Melek mere, n’ihi gịnịkwa?
7 Ebed Melek bụ onye Etiopia na-atụ egwu Chineke, onye bi na Jerusalem n’oge ihe omume nke dubara ná mbibi ndị Babilọn bibiri ya. Ọ na-arụ ọrụ n’ezinụlọ nke Eze Zedekaịa. N’oge ahụ, Jeremaịa na-eje ozi dị ka onye amụma Jehova nye Alaeze Juda na mba ndị dị ya gburugburu. N’ihi na ọ tụghị egwu n’ikwupụta ozi ịdọ aka ná nti nke Chineke, ọ ghọrọ onye e sogburu n’ụzọ dị ukwuu. Site ná nkwali nke ụfọdụ ndị isi nọ na Jerusalem, a tụbara ya n’ime olulu ka o mikpuo n’apịtị wee nwụọ. Ọ bụ ezie na Ebed Melek abụghị onye Israel, ọ ghọtara na Jeremaịa bụ onye amụma Jehova. Mgbe Ebed Melek nụrụ ihe e mere Jeremaịa, ọ chọgara eze ozugbo ahụ n’ọnụ ụzọ ámá nke obodo ahụ ịrịọ arịrịọ maka Jeremaịa. N’ịgbaso iwu nke eze nyere, ọ chịịrị iri ndị ikom atọ, chịrịkwa ụdọ na nkịrịka ákwà. Ọ gwara Jeremaịa ka o tinye nkịrịkwa ákwà ndị ahụ n’okpuru mkpaabu ya abụọ iji wee mee ka ụdọ ahụ ghara ịchịhịasị ya ahụ, ha wee dọpụta onye amụma ahụ n’olulu ahụ.—Jeremaịa 38:4-13.
8. Nkwa dị aṅaa nke na-emesi obi ike ka Jehova kwere EbedMelek, ọ̀ bụkwa n’ihi gịnị?
8 O doro anya na Ebed Melek chegburu onwe ya banyere ihe ndị isi ahụ pụrụ ime ya n’ihi na o mebiwo izu ọjọọ ha, ma nsọpụrụ o nwere maka onye amụma Jehova na ntụkwasị obi ya n’ebe Chineke nọ dị ya mkpa karịa nchegbu ahụ. N’ihi ya, Jehova sitere n’ọnụ Jeremaịa kwe Ebed Melek nkwa, sị: Lee, m gaje ime ka okwu m nile bịaruo obodo a ime ya ihe ọjọọ, ọ bụghị ime ya ezi ihe; ha ga-adịkwa n’ihu gị n’ụbọchị ahụ. Ma m ga-anapụta gị n’ụbọchị ahụ, (ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta): A gaghị enyekwa gị n’aka ndị ahụ gị onwe gị na-atụ egwu ha. N’ihi na aghaghị m ime ka i wepụga onwe gị, ọ bụghịkwa ná mma agha ka ị ga-ada, kama ndụ gị ga-aghọrọ gị ihe nkwata: n’ihi na ị gbabawo n’ime m: ọ bụ ihe si n’ọnụ Jehova pụta.—Jeremaịa 39:16-18.
9. (a) Olee otú ndị atụrụ ọzọ ahụ siworo dị ka Ebed Melek? (b) N’ihi ya, gịnị ka nkwa Jehova kwere Ebed Melek pụtaara atụrụ ọzọ ahụ taa?
9 Lee ka nkwa ahụ si dị oké ọnụ ahịa nye ndị ohu Jehova nile nọ taa! Dị ka Ebed Melek, atụrụ ọzọ ahụ na-ahụ mmegbu nile a na-emegbu òtù Jeremaịa nke oge a, bụ́ ihe fọdụrụ e tere mmanụ, na mgbalị a na-eme ịkwụsị nkwusa nke ozi Jehova. Ha atụfughị oge ọ bụla n’ime ihe ha pụrụ ime iji chebe, kwadookwa òtù nke ndị ahụ e tere mmanụ. N’ihi ya, n’ụzọ ziri ezi, nkwa Jehova kwere Ebed Melek na-agba ha ume, na-emekwa ka olileanya ha sie ike nke bụ na Chineke agaghị ekwe ka ndị mmegide bibie ha n’ihi na Ọ ga-echebe ha dị ka otu òtù gabiga mbibi ụwa nke dị nso wee baa n’ime ụwa ọhụrụ Ya.
10. N’akụkụ ndụ dịgasị aṅaa ka ndị Kraịst na-enweta nsogbu?
10 Ọ bụghị ndị nile na-agbaso nzọụkwụ Jisọs Kraịst ka a ga-atụba n’ụlọ mkpọrọ, ma ha nile na-enwe nsogbu n’otu ụzọ ma ọ bụ n’ụzọ ọzọ. (2 Timoti 3:12) Ọtụtụ puku ndị bụ nwunye, na ndị bụ dị, bụ́ ndị Kraịst anọgidewo jiri ikwesị ntụkwasị obi na-enwe ntachi obi ruo ọtụtụ afọ ná nsogbu ndị tara akpụ kpọmkwem n’ime ụlọ nke aka ha. Ndị mụrụ ụmụ achụpụwokwa ụmụntakịrị ha ụfọdụ n’ihi ọchịchọ ha nwere ife Jehova. (Matiu 10:36-38) Ụmụ okoro na agbọghọ bụ ndị Kraịst pụkwara izute nsogbu n’ụlọ akwụkwọ; ndị okenye, n’ebe ha na-arụ ọrụ. Ndịàmà Jehova nile na-enweta nsogbu mgbe ha na-ekere òkè n’ịgba àmà Alaeze Chineke n’ihu ọha. Nye ndị nile dị otú ahụ, okwu Jisọs ahụ na-emezu, nke bụ: Ná ntachi obi unu, unu ga-anata mkpụrụ obi unu.—Luk 21:19.
11. (a) Ọnọdụ ndị ọzọ dị aṅaa na-eweta ule tara akpụ nye ọtụtụ ndị? (b) Olee ndị ọzọ na-ezute ọnọdụ ndị a, ọ bụkwa n’ihi gịnị?
11 Nye ọtụtụ ndị, e nwere ọnọdụ ndị ọzọ ndị na-etinye ha n’ule. Ha pụrụ inwe ajọ ọrịa, nke na-anapụ ha ọṅụ dị ukwuu ná ndụ. Ma ọ bụ ma eleghị anya, ajọ ọnọdụ akụ na ụba na-eche ha ihụ. Ọ pụrụ ịbụ na mgbe ụfọdụ, na ezi ndị enyi ha na-agwa ha okwu ọjọọ. N’okwu banyere nna ochie ahụ bụ Job, Setan ji ụzọ nile ndị a mee ihe, iji mee ka Job mebie ikwesị ntụkwasị obi ya. Olee otú anyị ga-esi meghachi omume ma ọ burụ na anyị anọrọ n’ọnọdụ yiri ndị a?—Jemes 5:11.
12. (a) N’ihi gịnị ka o ji dị Noa mkpa karịsịa inwe ntachi obi n’ije ozi ya? (b) Olee otú ọnọdụ dị n’oge anyị a siworo yie nke ahụ?
12 N’aka nke ọzọ, oleekwanụ ma ọ bụrụ na anyị achọpụta na ndị mmadụ adịghị enwecha mmasị ná mgbalị anyị na-eme ịgba àmà banyere nzube Jehova? Nke ahụ chọkwara ntachi obi. Chetakwa na n’afọ nile Noa kwusara ozi ọma tupu Iju Mmiri ahụ, ọ bụ nanị nwunye ya na ụmụ ya ndị ikom na ndị nwunye ha sonyeere ya n’ife Jehova. Ndị nile ọzọ fọdụrụnụ amaghịkwa. (Matiu 24:39) N’otu aka ahụkwa taa, ihe ka ukwuu ’adịghị amata ihe na-emenụ. Otú ọ dị, n’akụkụ ụfọdụ n’ebe mmadụ ole na ole na-aṅa ntị n’ozi Alaeze na mbụ, e wetawo ọtụtụ ndị na-efe ezi Chineke dị ka ihe ubi n’ebe ahụ. Ndị nwere obi ụtọ ka ha bụ, bụ́ ndị ahụ tachiri obi n’afọ nile ndị a nke enweghị mmasị na ajọ mmegide, wee mesịa bụrụ ndị na-ekere òkè ugbu a ná nchịkọbata nke a dị ukwuu!
’OBI ỤTỌ NA-ADỊRỊ NDỊ AHỤ NỌGIDERE NA-ATACHI OBI’
13. (a) Iji nọgide ná ntachi obi, gịnị ka o kwesịrị ka anyị debe n’ihu anyị mgbe nile? (b) Gịnị ka ọ dị anyị mkpa ịghọta banyere ụzọ nile Setan si eme ihe?
13 Iji zere ịbụ ndị olileanya dị ebube nke ndụ n’ime ụwa ọhụrụ, ahụ funahụrụ, ọ dị mkpa ka anyị ghọtazie n’onwe anyị ihe iseokwu ahụ nke na-eche ihe nile e kere eke ihu—ihe iseokwu nke onye kwesịrị ịbụ ọkaaka eluigwe na ụwa. Ànyị na-eguzosi ike n’akụkụ Jehova? Ànyị ghọtara nke ọma na ọ bụ nanị akụkụ abụọ dị, na mmadụ aghaghị ịkwado otu akụkụ? Ọ bụrụ na anyị agaghị aghọ ndị e gburu n’agha nke a, ọ dị anyị mkpa ịghọta na ma ibuiro ma ọnwụnwa bụ ụzọ dị iche iche Setan ji eme ihe iji bibie ikwesị ntụkwasị obi anyị, iji mee ka anyị kwụsị irubere Chineke isi, iji wezụga anyị n’ọrụ ahụ dị mkpa nke ịgbara Alaeze Mesaịa ahụ ama.—1 Pita 5:8, 9; Mak 4:17-19.
14. (a) Mmekọrịta dị aṅaa ka o kwesịrị ka anyị zụlite, ọ̀ bụkwa nke anyị na onye? (b) Olee otú ọ ga-esi nyere anyị aka?
14 Anyị aghaghịkwa ịzụlite ndabere zuru ezu n’ebe Jehova nọ. Lee ka ọ ga-esi bụrụ ihe nzuzu ịnwa nanị n’ike nke aka anyị izere ọnyà aghụghọ nile nke Onyeiro ka mmadụ ike! Ma ọ bụrụ na anyị atụkwasị Jehova Chineke obi anyị nile, mgbe anyị nọ n’ihe isi ike, cheekwa ọnwụnwa ihu, anyị ga-abịaru ya nso. (Ndị Efesọs 6:10, 11; Ilu 3:5, 6) Jehova adịghị amanye anyị ịgbaso otu ụzọ ndụ. Ọ gaghị eduzi anyị ịgbaso ụzọ megidere uche anyị. Ma ọ bụrụ na anyị echigharịkwuru Okwu ya iji nweta nduzi, kpekuo ya ekpere maka ikike, nọrọkwa nzukọ ya nso, ọ ga-eduzi nzọụkwụ anyị nile. Ọ ga-ejikwa ihe àmà ọhụrụ nke ịhụnanya ya na-adịghị agwụ agwụ gbaa anyị ume.—Ndị Rom 8:38, 39.
15. (a) Ònye kwesịrị ịnọ n’ọkwá mbụ ná ndụ anyị? (b) Olee otú o kwesịrị ka anyị si lee ọnọdụ ndị na-etinye okwukwe anyị n’ule anya?
15 Ihe isi ike na ọnwụnwa nile ị na-ezute ga-etinye gị n’ule. Ònye ka ị na-edo n’ọkwá mbụ ná ndụ gị? Setan rụrụ ụka na anyị na-echegbukarị onwe anyị banyere ihe nke onwe anyị. Ihe ka ukwuu n’etiti ndị mmadụ dị otú ahụ. Jisọs Kraịst dị iche. Ị̀ dị iche? Ị̀ mụtawo ime ka ihe dị n’ọkwá mbụ bụrụ ibuli aha Jehova elu? Ọ bụrụ otú ahụ, kama ịdị na-ezere ọnọdụ ndị ga-etinye okwukwe gị n’ule, ị ga-enwe ike imeri ha, na-ekpeku Jehova ekpere inye gị amamihe iji ọnọdụ ndị a nye ya nsọpụrụ. Mkpagbu ị na-ezute ga-amụpụta ntachi obi; ntachi obi n’ihi ịhụnanya ị hụrụ Jehova ga-eweta nkwado ya. [Obi ụtọ] na-adịrị nwoke onye na-atachi obi n’ọnwụnwa: n’ihi na mgbe a nwapụtaworo ya, ọ ga-anata okpueze ahụ, bụ́ ndụ, nke [Jehova] kwere nkwa inye ndị hụrụ ya n’anya.—Jemes 1:2-4, 12; Ndị Rom 5:3, 4.
16. Ebe mgbaru ọsọ dị aṅaa ka o kwesịrị ka anyị na-achọsi ike irute?
16 O zughị nanị ịmalite n’ije ozi Jehova ma ọ bụ ịtachi obi nanị ruo nwa oge. Anyị nọ n’ịgba ọsọ, ndị ahụ na-anata ụgwọ ọrụ bụ ndị gbagidere ọsọ ruo akara ikpeazụ. Ha ga-abụ ndị obi ụtọ bụ́ ndị ahụ nile nọgidere na-agbalịsi ike, na-elegidekwa ụgwọ ọrụ ahụ anya mgbe usoro ihe ochie nke a ga-adakpọsị ná mbibi! Lee aha olileanya dị ebube nke na-eche ha ihu!—Ndị Hibru 12:1-3; Matiu 24:13.