AKỤ̀ NDỊ SI N’OKWU CHINEKE | JEREMAYA 35-38
Ibed-melek—Nwoke Nwere Obi Ike na Obiọma
Ibed-melek, bụ́ ọnaozi nke bi n’ụlọ Eze Zedekaya, kpara àgwà e ji mara ndị Chineke
Ọ katara obi gakwuru Eze Zedekaya rịọ ya ka o nye ya ikike ịga kpọpụta Jeremaya n’olulu apịtị a tụbara ya
O gosiri na o nwere obiọma n’ihi na o wetara nkịrịka ákwà na iberibe ákwà kegide ha n’eriri ebe mkpaabụ Jeremaya ga-adị ka eriri ahụ ghara imerụ ya ahụ́