Isi 32
Gịnị Ziri Ezi n’Iwu n’Ụbọchị Izu Ike?
Ọ BỤ n’Ụbọchị Izu Ike ọzọ ka Jisọs gara n’ụlọ nzukọ dị nso Osimiri Galili. Otu nwoke aka nri ya kpọnwụrụ akpọnwụ nọ n’ebe ahụ. Ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-elepụ anya ịhụ ma Jisọs ọ̀ ga-agwọ ya. N’ikpeazụ, ha jụrụ: “Ò ziri ezi n’iwu ime ka ahụ mmadụ dị ike n’ụbọchị izu ike?”
Ndị ndú okpukpe ndị Juu kwere na ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike ziri ezi nanị ma ọ bụrụ na ndụ dị n’ihe ize ndụ. Dị ka ihe atụ, ha na-akụzi na o zighị ezi ịgbazi ọkpụkpụ ma ọ bụ ikechi ọnyá n’Ụbọchị Izu Ike. Ya mere, ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii na-ajụ Jisọs ajụjụ iji nweta ihe ha ga-eji boo ya ebubo.
Ma, Jisọs maara ihe ha na-eche. N’otu oge ahụ, ọ chọpụtara na ha ewebatawo echiche hiere ụzọ, nke na-adịghị n’Akwụkwọ nsọ n’ihe banyere ihe ndị na-emebi Ụbọchị Izu Ike bụ́ nke machibidoro ọrụ n’iwu. Ya mere, Jisọs dokwara ọnọdụ maka oké ihe ịma aka site n’ịgwa nwoke ahụ aka ya kpọnwụrụ akpọnwụ, sị: “Bilie, pụta n’etiti.”
Ugbu a, n’ịtụgharị chee ihu n’ebe ndị odeakwụkwọ na ndị Farisii nọ, Jisọs sịrị: “Olee mmadụ ga-adị n’etiti unu, nke ga-enwe otu atụrụ, ma ọ bụrụ na atụrụ ahụ adaba n’ime olulu n’ụbọchị izu ike, ọ gaghị ejide ya, dọgopụta ya?” Ebe atụrụ nọchiri anya ihe na-enye ego, ha agaghị ahapụ ya n’olulu ruo echi ya, ma eleghị anya ọ ga-arịa ọrịa ma kpatara ha mfu. E wezụga nke ahụ, Akwụkwọ nsọ sịrị: “Onye ezi omume maara ndụ anụ ụlọ ya.”
N’ihota ihe yiri ya, Jisọs gara n’ihu ịsị: “Oleekwa ka ọ ha, bụ́ otú ọnụ ahịa mmadụ karịrị nke atụrụ oké ọnụ! Ya mere o ziri ezi n’iwu ime ihe ọma n’ụbọchị izu ike.” Ndị ndú okpukpe ahụ enweghị ike ịgbagha echiche nke a ziri ezi, nke obi ebere, ha mechikwara ọnụ.
Site n’iwe na mwute n’ihi obi nzuzu ha nke gbara etili, Jisọs lere anya gburugburu. O wee sị nwoke ahụ: “Setịpụ aka gị.” O wee setịpụ ya, aka ya wee dịghachi mma.
Kama inwe obi ụtọ na e mewo ka aka nwoke ahụ dịghachi mma, ndị Farisii pụrụ ma gbaa izu ozugbo ha na ndị na-eso òtù ọchịchị Herọd igbu Jisọs. O doro anya na òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị nke a gụnyere ndị òtù okpukpe Sadusii. Ndị òtù ndọrọ ndọrọ ọchịchị a na ndị Farisii na-emegiderịta onwe ha, ma ha dị n’otu n’ụzọ siri nnọọ ike n’imegide Jisọs. Matiu 12:9-14; Mak 3:1-6; Luk 6:6-11; Ilu 12:10; Ọpụpụ 20:8-10.
▪ Gịnị bụ ọnọdụ ahụ e nwere maka oké ihe ịma aka n’etiti Jisọs na ndị ndú okpukpe Juu?
▪ Gịnị ka ndị ndú okpukpe Juu ndị a kwere banyere ịgwọ ọrịa n’Ụbọchị Izu Ike?
▪ Olee ihe atụ Jisọs ji gosi na echiche ọjọọ ha ezighị ezi?