Isi 45
Onye Na-eso Ụzọ nke A Na-atụghị Anya Ya
LEE ihe na-atụ egwu a hụrụ ka Jisọs na-arịgote n’elu ala! Ndị ikom abụọ dị oké egwu si n’ebe ili ozu dị nso pụta, gbara ọsọ na-abịa n’ebe ọ nọ. Mmụọ ọjọọ ji ha. Ebe ọ yiri ka otu n’ime ha ọ̀ na-eme ihe ike karịa nke ọzọ, ma taakwa ahụhụ ogologo oge karị n’okpuru nchịkwa ndị mmụọ ọjọọ ọ ghọrọ onye mmadụ nile lekwasịrị anya.
Eri ogologo oge, nwoke nke a kwesịrị imere ebere agbarawo ọtọ na-ebi n’etiti ili ndị ahụ. Mgbe nile, ehihie na abalị, ọ na-eti mkpu ma jiri nkume na-ebekasị ahụ ya. Ọ dị ike nke ukwuu na ọ dịghị onye obi siri ike isi n’ụzọ ebe ahụ gafee. E mewo mgbalị ike ya ụdọ, ma ọ na-adọbisi ụdọ ndị ahụ ma na-adọkapụ ígwè e kegidere ya n’ụkwụ. Ọ dịghị onye nwere ike ijikpa ya ahụ.
Ka nwoke ahụ na-abịakwute Jisọs ma na-ada n’ụkwụ ya, ndị mmụọ ọjọọ ahụ na-enye ya nsogbu mere ka o tie mkpu, sị: “Gịnị ka mụ na gị nwekọrọ, Jisọs, Ọkpara Chineke nke Kachasị Ihe Nile Elu? Ewere m Chineke gbaa gị iyi, emekpala m ahụ.”
Jisọs nọgidere na-asị, “Si n’ime nwoke a pụta, gị mmụọ na-adịghị ọcha.” Ma Jisọs jụrụ ya, sị: “Olee aha gị?”
Nzaghachi ya bụ, “Aha m bụ Legion; n’ihi na anyị dị ọtụtụ.” Ọ na-enye ndị mmụọ ọjọọ oké ọṅụ ịhụ ntaramahụhụ nke ndị ha nwere ike ijide, o yikarịkwara ka ọ na-amasị ha ijikọ aka ọnụ megide ndị ahụ n’ụzọ na-egosipụta mmụọ nke òtù na-eme ihe ike. Ma mgbe ha zutere Jisọs, ha rịọrọ arịrịọ ka a ghara iziga ha n’abyss. Anyị na-ahụkwa ọzọ na Jisọs nwere ike dị ukwuu; o nwere ike imeri ndị mmụọ ọjọọ jọgburu onwe ha. Nke a na-emekwa ka a mara na ndị mmụọ ọjọọ ahụ maara na ikpe Chineke ga-emesị kpee ha bụ ịtụba ha na onye isi ha bụ Setan Ekwensu n’abyss.
Ìgwè nke ihe dị ka 2,000 ezì na-ata nri n’ebe dị nso n’elu ugwu ndị ahụ. Ya mere ndị mmụọ ọjọọ ahụ na-asị: “Ziga anyị n’ime ìgwè ezì ahụ, ka anyị wee baa n’ime ha.” Ihe àmà na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ ahụ na-enwetatụ ihe ụtọ arụrụala na-ekwesịghị ekwesị site n’ịwakpo ahụ nke ihe e kere eke ndị nwere anụ ahụ. Mgbe Jisọs kwere ka ha banye n’ìgwè ezì ahụ, 2,000 ahụ nile si n’ebe ahụ dị elu mabanye n’ime osimiri, mmiri wee gbagbuo ha.
Mgbe ndị na-elekọta ìgwè ezì ahụ hụrụ nke a, ha gbaara ọsọ gaa ịkọ akụkọ ahụ n’obodo na n’ógbè ndị ahụ. Ya mere, ndị mmadụ pụtara ịhụ ihe merenụ. Mgbe ha bịarutere, ha hụrụ nwoke ahụ ndị mmụọ ọjọọ si n’ahụ ya pụọ. Leenụ, o yinyere uwe ma zuo okè n’uche, na-anọdụ n’akụkụ ụkwụ Jisọs!
Ndị hụrụ ihe mere kọrọ otú e si mee ka ahụ dị nwoke ahụ mma. Ha kọkwaara ndị ahụ banyere ọnwụ jọgburu onwe ya nke ìgwè ezì ahụ. Mgbe ndị ahụ nụrụ nke a, oké ụjọ jidere ha, ha wee rịọsie Jisọs arịrịọ ike ka o si n’ókèala ha pụọ. Ya mere o kwere ma banye n’ụgbọ. Onye ahụ mmụọ ọjọọ na-enye nsogbu na mbụ rịọrọ Jisọs ka o kwe ka ya soro ya. Ma Jisọs na-agwa ya, sị: “Laa n’ụlọ gị, lakwuru ndị nke gị, kọọrọ ha ihe nile, ka ha hà, bụ́ nke Onyenwe anyị [“Jehova,” NW] mewooro gị, na otú O meere gị ebere.”
Dị ka o si adịkarị, Jisọs na-agwa ndị ọ gwọrọ ọrịa ka ha ghara ịgwa onye ọ bụla, ebe ọ bụ na ọ chọghị ka ndị mmadụ rute ná nkwubi okwu n’ihi akụkọ ndị na-akpali akpali. Ma ọnọdụ nke a dị iche kwesịrị ekwesị n’ihi na onye ahụ mmụọ ọjọọ na-enyebu nsogbu ga-agba àmà nye ndị ọzọ bụ́ ndị o yikarịrị ka Jisọs agaghị enwe ohere irute. Ọzọkwa, ọnụnọ nwoke ahụ ga-enye ihe àmà banyere ike Jisọs nwere ịrụ ọrụ ọma, na-azaghachi nye akụkọ ọjọọ ọ bụla a pụrụ ịdị na-akọ n’ihi ìgwè ezì ahụ lara n’iyi.
N’ime dị ka Jisọs kwuru, onye ahụ mmụọ ọjọọ na-enyebu nsogbu pụrụ. Ọ na-amalite ikwusa ihe nile Jisọs meere ya na Dikapọlis ahụ nile, ibubo nwụkwara ndị mmadụ n’ahụ nke ukwuu. Matiu 8:28-34; Mak 5:1-20; Luk 8:26-39; Mkpughe 20:1-3.
▪ N’ihi gịnị, ma eleghị anya, ka e ji lekwasị otu onye mmụọ ọjọọ na-esogbu anya, ebe ha dị abụọ nọ n’ebe ahụ?
▪ Gịnị na-egosi na ndị mmụọ ọjọọ ahụ maara banyere ntụba a ga-atụba ha n’abyss n’ọdịnihu?
▪ Olee ihe o yikarịrị ka ọ bụ ya mere ndị mmụọ ọjọọ ji enwe mmasị n’ijigide ụmụ mmadụ na ụmụ anụ?
▪ N’ihi gịnị ka Jisọs ji na-eme ihe dị iche n’ọnọdụ nke onye ahụ mmụọ ọjọọ na-enyebu nsogbu, na-agwa ya ka ọ kọọrọ ndị ọzọ ihe O mewooro ya?